Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 2/15 p. 4-7
  • Mgbe Ahụhụ Na-agaghị Adịkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe Ahụhụ Na-agaghị Adịkwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Ọ Manyeghị Ime Uche Ya Amanye Ozugbo?
  • Gịnị Mere na O Meghị Ka Ndị Mmadụ Na-eme Ezi Ihe?
  • Olee Banyere Ndị Nile Aka Ha Dị Ọcha Ihe Ọjọọ Dakwasịrị?
  • È Nwere Ezi Ngụgụ Obi Maka Ndị Na-ata Ahụhụ?
  • ‘Ime Ka Ihe Nile Dị Ka Ha Dị na Mbụ’
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Nkasi Obi Maka Ndị Na-ahụju Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ajụjụ nke Atọ: Gịnị Mere I Ji Hapụ M Ka M Na-ata Ahụhụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 2/15 p. 4-7

Mgbe Ahụhụ Na-agaghị Adịkwa

AHỤHỤ abụghị akụkụ nzube mbụ nke Chineke maka ezinụlọ mmadụ. Ọ kpaghị nkata ya, nke ọ na-achọkwanụ ya. ‘Ọ bụrụ otú ahụ,’ ka ị pụrụ ịjụ, ‘olee otú o si bido, n’ihi gịnịkwa ka Chineke ji kwere ka ọ dịgide ruo ugbu a?’—Tụlee Jemes 1:13.

A na-ahụ azịza ya n’ihe ndekọ kasị ochie nke akụkọ ihe mere eme mmadụ, bụ́ Bible, karịsịa akwụkwọ Jenesis. Ọ na-ekwu na nne na nna anyị mbụ, Adam na Iv, gbasoro Setan Ekwensu ná nnupụisi ya megide Chineke. Ihe ha mere welitere oké ihe iseokwu gbara ọkpụrụkpụ ndị metụtara kpọmkwem ntọala nke iwu na usoro eluigwe na ala. Mgbe ha zọọrọ ikike nke ikpebiri onwe ha ihe ọma na ihe ọjọọ, ha mara ọbụbụeze Chineke aka. Ha mara iru eru ya ịchị achị na ya ịbụ onye nanị ya na-ekpebi “ezi ihe na ihe ọjọọ” aka.—Jenesis 2:15-17; 3:1-5.

Gịnị Mere Ọ Manyeghị Ime Uche Ya Amanye Ozugbo?

‘Gịnị meziri Chineke amanyeghị ime uche ya amanye ozugbo?’ ka ị pụrụ ịjụ. Nye ọtụtụ ndị, okwu ahụ dị nnọọ mfe. ‘Chineke nwere ike ya. O kwesịrị ijiwo ya bibie ndị nnupụisi ahụ,’ ka ha na-ekwu. (Abụ Ọma 147:5) Ma jụọ onwe gị nke a, ‘Àna m eji obi m nile akwado ndị nile na-eji ọkịka nke ike amanye mmadụ ime uche ha? Ọ̀ bụ na n’amaghị ama adịghị m enwe ọnụma mgbe onye ọchịchị aka ike ji ìgwè ndị ogbugbu na-egbukpọ ndị iro ya?’ Ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị nwere ezi uche na-asọ ihe dị otú ahụ oyi.

‘Aa,’ ka ị na-ekwu, ‘ma ọ bụrụ na Chineke ejiri ike ahụ mee ihe, ọ dịghị onye ga-agba ya ajụjụ banyere ihe o mere.’ Ì ji n’aka? Ọ́ bụghị eziokwu na ndị mmadụ na-agba ajụjụ banyere Chineke iji ike mee ihe? Ha na-agba ajụjụ banyere ihe mere o jibeghị ya mee ihe mgbe ụfọdụ, dị ka na ya ikwere ka ihe ọjọọ dịrị. Ha na-agbakwa ajụjụ banyere ihe mere o jiworo jiri ya mee ihe n’oge ndị ọzọ. Ọbụna Abraham kwesịrị ntụkwasị obi nwere nsogbu banyere Chineke iji ike mee ihe megide ndị iro Ya. Cheta mgbe Chineke kpebiri ibibi Sọdọm. Abraham hiere ụzọ n’ịtụ egwu na ndị ezi mmadụ ga-eso ndị ọjọọ nwụọ. O tiri mkpu, sị: “Ya bụrụ Gị ihe arụ ime dị ka ihe a si dị, ime ka onye ezi omume so onye na-emebi iwu nwụọ.” (Jenesis 18:25) Ọbụna ndị obi ha ziri ezi dị ka Abraham nwere mkpa maka mmesi obi ike na a gaghị eji ike kasịnụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.

N’ezie, Chineke pụrụ ibibiwo Adam, Iv, na Setan n’egbughị oge. Ma chee otú nke ahụ pụrụ isiwo metụta ndị mmụọ ozi ndị ọzọ ma ọ bụ ihe ndị a ga-eke n’ọdịnihu, ndị pụrụ imesịa mara ihe o mere. Nke a ọ̀ pụrụ ime ka ha na-enwe ajụjụ ndị na-akpasu iwe banyere izi ezi nke ịchịisi Chineke? Ọ́ gaghị ekpughe Chineke nye ebubo nke na ọ bụ, n’ezie, ụdị onye ọchịchị aka ike obi kpọrọ nkụ, dị ka Nietzsche kọwara ya, Chineke nke na-eji obi ịta mmiri egbu onye ọ bụla guzogidere ya?

Gịnị Mere na O Meghị Ka Ndị Mmadụ Na-eme Ezi Ihe?

‘Ọ̀ bụ na Chineke apụghị nnọọ ime ka ndị mmadụ na-eme ezi ihe?’ ka ụfọdụ pụrụ ịjụ. Ọ dị mma, tụleekwa nke a. N’akụkọ ihe mere eme nile, gọọmenti anwaala ime ka ndị mmadụ kwekọọ n’ụzọ iche echiche ha. Gọọmenti ma ọ bụ ndị ọchịchị ụfọdụ n’otu n’otu emewo ụdị dị iche iche nke nchịkwa uche, ikekwe na-eji ọgwụ ma ọ bụ ịwa ahụ na-eme ihe, na-apụnara ndị ha wakporo onyinye dị ebube nke nnwere onwe ime nhọrọ. Ọ̀ bụ na anyị adịghị ewere ịbụ ndị nweere onwe ha ime nhọrọ akpọrọ oké ihe, ọbụna ma ọ bụrụ na e kpughepụrụ onyinye ahụ nye iji ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi? Ànyị na-anakwere mgbalị gọọmenti ma ọ bụ onye ọchịchị ọ bụla ịnapụ anyị nke ahụ?

Mgbe ahụ, olee nhọrọ e nwere kama Chineke iji ike eme ihe ozugbo ịmanye ndebe nke iwu ahụ? Jehova Chineke kpebiri na ọ ga-akasị mma ime ihe banyere nnupụisi ahụ site n’ikwere ka e nwee nwa oge nke nnwere onwe pụọ n’ịchịisi ya maka ndị jụrụ iwu ya. Nke a ga-enye ezinụlọ mmadụ, nke sitere n’Adam na Iv, oge dị mkpirikpi ịchị onwe ha n’anọghị n’okpuru iwu Chineke. N’ihi gịnị ka o ji mee nke a? N’ihi na ọ maara na, ka oge na-aga, ihe akaebe na-enweghị mgbagha ga-arị elu, na-anwapụta na ụzọ ịchịisi ya ziri ezi mgbe nile, bụrụkwa nke ezi ikpe, ọbụna mgbe o jiri ike ya na-enweghị njedebe na-eme ka e mee uche ya, nakwa na nnupụisi ọ bụla megide ya ga-eduje, n’oge na-adịghị anya n’ọdịnihu, n’ọdachi.—Deuterọnọmi 32:4; Job 34:10-12; Jeremaịa 10:23.

Olee Banyere Ndị Nile Aka Ha Dị Ọcha Ihe Ọjọọ Dakwasịrị?

‘Ka ọ dị ugbu a, olee banyere ndị nile aka ha dị ọcha ihe ọjọọ dakwasịrị?’ ka ị pụrụ ịjụ. ‘Ò ruru eru ha inwe ihe mgbu iji nwapụta otu isi ihe nke iwu?’ Chineke ekwebeghị ka ihe ọjọọ dịrị nanị iji nwapụta otu isi ihe na-edoghị anya n’iwu. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ bụ iji guzobe ruo mgbe nile eziokwu gbara ọkpụrụkpụ nke na nanị ya bụ eze nakwa na nrubeisi nye iwu ya dị mkpa maka udo na obi ụtọ na-aga n’ihu nke ihe nile o kere.

Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ a ga-eburu n’uche bụ na Chineke maara na ya pụrụ idozi ihe ọjọọ ọ bụla nke a pụrụ iwetara ezinụlọ mmadụ. Ọ maara na n’ime oge dị ogologo, nwa oge nke ihe mgbu na ahụhụ ga-arụpụta ihe bara uru. Chee banyere nne nke na-ejidesi nwa ya ike mgbe dọkịta na-enye ihe mgbu nke ịgba ọgwụ ọkụ aka iji nye nchebe megide otu ọrịa nke ga-egbu nwa ahụ ma a gbaghị ya. Ọ dịghị nne chọrọ ka nwa ya nwee ihe mgbu. Ọ dịghị dọkịta chọrọ iwetara ndị ọ na-agwọ ihe mgbu. N’oge ahụ, nwa ahụ adịghị aghọta ihe kpatara ihe mgbu ahụ, ma e mesịa ọ ga-aghọta ihe mere e ji kwere ka ọ dịrị.

È Nwere Ezi Ngụgụ Obi Maka Ndị Na-ata Ahụhụ?

Ụfọdụ pụrụ iche na nanị ịmara ihe ndị a pụrụ ịbụ nanị ntakịrị ihe ngụgụ obi maka ndị na-ata ahụhụ. Hans Küng na-ekwu na nkọwa ezi uche dị na ya nke ịdị adị nke ahụhụ “fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe enyemaka nye onye na-ata ahụhụ dị ka okwu banyere ngwakọta ihe ndị e ji esi nri nye onye na-anwụ n’agụụ.” Ọ na-ajụ: “Echiche akọ dum ọ̀ pụrụ n’ezie inye mmadụ, nke fọrọ nke nta ka ahụhụ rikpuo ya, obi ọhụrụ?” Ma, “echiche akọ” dum nke ụmụ mmadụ na-eleghara Okwu Chineke, bụ́ Bible, anya enyebeghị ndị na-ata ahụhụ obi. Nanị ihe echiche mmadụ dị otú ahụ meworo bụ itinye ihe ná nsogbu ahụ site n’ịtụ aro na Chineke zubere ka mmadụ taa ahụhụ nakwa na a haziri ụwa ịbụ ndagwurugwu nke anya mmiri ma ọ bụ ala nnwale maka ndị ga-emesịa nweta ndụ n’eluigwe. Ajọ nkwulu!

Ma, Bible n’onwe ya na-enye ezi ngụgụ obi. Ọ bụghị nanị na ọ na-enye nkọwa kwekọrọ ekwekọ maka ịdị adị nke ahụhụ kamakwa ọ na-ewulite obi ike ná nkwa Chineke e ji n’aka na ọ ga-edozi ihe ọjọọ nile nkwere nwa oge nke a e kwere ka ahụhụ dịrị kpatara.

‘Ime Ka Ihe Nile Dị Ka Ha Dị na Mbụ’

N’oge dị nnọọ nso ugbu a Chineke ga-eweghachi ihe n’otú o zubere ka ha dị tupu mmadụ mbụ ndị o kere enupụ isi. Oge ya a kara aka maka ịchịisi nnwere onwe mmadụ fọrọ nke nta ka ọ gwụsịa. Anyị na-ebi n’oge mgbe ọ ga-ezipụ “Jisọs: Onye eluigwe aghaghị ịnara nke ọma ruo oge a ga-eme ka ihe nile dị ka ha dị na mbụ, bụ́ oge nke Chineke kwuru okwu banyere ha site n’ọnụ ndị amụma Ya dị nsọ ndị sitere ná mmalite oge a.”—Ọrụ 3:20, 21.

Gịnị ka Jisọs Kraịst ga-eme? Ọ ga-ekpochapụ ndị iro Chineke nile n’ụwa. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10) Nke a agaghị abụ mgbukpọsị mmadụ nile, dị ka nke ụmụ mmadụ na-achị ọchịchị aka ike na-eme. Ihe akaebe dị nnọọ ukwuu na-anwapụta ajọ ihe sitere n’ajọ ọchịchị nke mmadụ ga-egosi na Chineke ziri nnọọ ezi n’iji ike ya a na-akparaghị ókè mee ka e mee uche ya n’isi nso. (Mkpughe 11:17, 18) Ná mmalite, nke a ga-apụta “mkpagbu” ụdị nke ụwa na-ahụtụbeghị na mbụ, nke yiri ma karịa Iju Mmiri nke ụbọchị Noa nke ukwuu. (Matiu 24:21, 29-31, 36-39) Ndị lanarịrị “oké mkpagbu” a ga-enwe “oge inwe ume ndụ” mgbe ha na-ahụ mmezu nke nkwa Chineke nile e kwere “site n’ọnụ ndị amụma Ya dị nsọ.” (Ọrụ 3:19; Mkpughe 7:14-17) Gịnị ka Chineke kweworo ná nkwa?

Ndị amụma Chineke n’oge ochie kwuru na a ga-enwe nkwụsị nye ahụhụ agha na mwụfu ọbara na-akpata. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 46:9 na-agwa anyị, sị: “[Ọ] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.” A gaghị enwekwa ndị aka ha dị ọcha e gburu na ndị ọsọ ndụ dị imere ebere, ndị e dinara n’ike, mee ọrụsị, ma gbuo n’agha obi ọjọọ! Aịsaịa onye amụma na-asị: “Mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aịsaịa 2:4.

Ndị amụma bukwara amụma nkwụsị nye ahụhụ nke mpụ na ikpe na-ezighị ezi na-akpata. Ilu 2:21, 22 na-ekwe nkwa na “ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa” nakwa na ndị na-akpata ihe mgbu na ahụhụ “ka a ga-ebipụ na ya.” ‘Mmadụ agakwaghị enwe ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.’ (Eklisiastis 8:9) A ga-ewepụ ndị ọjọọ nile ruo ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:10, 38) Onye ọ bụla ga-enwe ike ibi ndụ n’udo na ntụkwasị obi, nwere onwe ya pụọ n’ahụhụ.—Maịka 4:4.

Ọzọkwa, ndị amụma kwekwara nkwa na a ga-enwe nkwụsị nye ahụhụ nke nrịanrịa elu ahụ na ndị nke mmetụta uche na-akpata. (Aịsaịa 33:24) Aịsaịa na-ekwe nkwa na a ga-agwọ ndị ìsì, ndị ntị chiri, ndị ọrụsị, na ndị nile ọrịa na ahụ esighị ike na-eti ihe otiti. (Aịsaịa 35:5, 6) Ọbụna na Chineke ga-echigharị mmetụta nile nke ọnwụ isi. Jisọs buru amụma na “ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) N’ọhụụ ya nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” a gwara Jọn onyeozi na “Chineke Onwe ya . . . ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” (Mkpughe 21:1-4) Cheedị nnọọ! Ahụ ụfụ agaghị adịkwa, anya mmiri agaghị adịkwa, ịkwa ákwá agaghị adịkwa, ọnwụ agaghị adịkwa—ahụhụ agaghị adịkwa!

A ga-agwọta ọdachi ọ bụla pụrụ imewo n’ime nwa oge a nke ikwe ka ihe ọjọọ dịrị. Ọbụna na a ga-ehichapụ kpam kpam ncheta nke ihe mgbu na ahụhụ mmadụ—ndị ọ na-adịghị mgbe Chineke zubere ha. “E chezọwo ahụhụ mbụ nile . . . A gaghị echetakwa ihe mbụ nile,” ka Aịsaịa buru n’amụma. (Aịsaịa 65:16, 17) A ga-emezu nzube mbụ nke Chineke maka ezinụlọ mmadụ zuru okè nke na-ebi nnọọ n’udo na obi ụtọ zuru ezu n’elu ụwa paradaịs. (Aịsaịa 45:18) Obi ike n’ọbụbụeze ya agaghị enwe mgbagha. Lee aha ihe ùgwù ọ bụ ịdị ndụ n’oge mgbe Chineke ga-eweta ahụhụ dum nke mmadụ ná njedebe, oge mgbe ọ na-egosi na ya abụghị ụdị “onye aka ike, onye nduhie, onye wayo, ogbu mmadụ,” dị ka Nietzsche boro ya ebubo, kama na mgbe nile ọ na-ahụ n’anya, nwee amamihe, na-ekpekwa ikpe ziri ezi n’otú o si eji ọkịka nke ike ya eme ihe!

[Foto dị na peeji nke 5]

Ụfọdụ ndị ọchịchị ejiwo nchịkwa uche mee ihe, na-apụnara ndị ha wakporo nnwere onwe ime nhọrọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

UPI/Bettmann

[Foto dị na peeji nke 7]

Mgbe ahụhụ na-adịkwaghị, mmadụ nile ga-anụ ụtọ ndụ ruo n’uju ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya