Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 11/8 p. 26-27
  • Ịda Ogbenye Ọ̀ Na-eme Ka Izu Ohi Zie Ezi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịda Ogbenye Ọ̀ Na-eme Ka Izu Ohi Zie Ezi?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka Chineke Na-ekwu?
  • Gịnị Ka Ndị Ogbenye Pụrụ Ime?
  • N’ihi Gịnị Ka Izu Ohi Ji Na-amụba?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ya Adịla Mgbe Ị Ga-aghọ Onye Ohi!
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ụzọ A Ga-esi Merie Ihe Ịma Aka Omume nke Ịda Ogbenye Na-eweta
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ì Kwesịrị Ịkwụwa Aka Ọtọ Mgbe Niile?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 11/8 p. 26-27

Echiche nke Bible

Ịda Ogbenye Ọ̀ Na-eme Ka Izu Ohi Zie Ezi?

“Ịda ogbenye bụ nnukwute onye iro nke obi ụtọ mmadụ; n’ezie ọ na-emebi nnwere onwe, ọ na-emekwa ka ịkpa àgwà ọma ụfọdụ ghara ikwe omume, na-emekwa ka ndị ọzọ sibiga ike ókè.”—Samuel Johnson, onye na-ede akwụkwọ na narị afọ nke 18.

ONYE Rom ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị bụ́ Magnus Aurelius Cassiodorus kwuru, sị: “Ịda ogbenye bụ ihe na-akpata ime mpụ.” Echiche ndị a yiri ka ha na-atụ aro na ime mpụ ụfọdụ bụ ihe na-esikarị n’ịda ogbenye pụta. O doro anya na ọtụtụ ndị taa kwere, karịsịa mgbe mpụ ahụ bụ izu ohi.

Nkwenkwe ahụ bụ na mmegbu na ịda ogbenye na-eme ka izu ohi zie ezi na-ewu nnọọ ewu. Tụlee akụkọ n’egwú Bekee na-ewu ewu nke narị afọ nke 14 banyere Robin Hood, nke kọwara onye na-emebi iwu dị n’akụkọ mgbe ochie bụ́ onye zuru ndị ọgaranya ohi ma kesaara ndị ogbenye ihe ndị o nwetara. Ruo ọtụtụ narị afọ e werewo ya dị ka dike.

N’eziokwu, ọtụtụ ndị taa na-enwe oké ihe isi ike akụ̀ na ụba. Ụlọ Akụ̀ Ụwa kọrọ na nso nso a na e nwere ijeri 1.3 mmadụ ndị na-eji ihe na-erughị otu dollar ebi ndụ kwa ụbọchị. N’otu nnyocha e mere 70 pasent nke ndị Philippines kwuru na ha gụrụ onwe ha ná ndị ogbenye. Na Brazil 20 pasent ndị kasị nwee ego na-akpata okpukpu 32 nke ihe 20 pasent ndị kasị daa ogbenye na-akpata. Ọnọdụ ndị dị otú ahụ pụrụ ịkụda ụfọdụ mmụọ ruo n’ókè nke na ha pụrụ iji ụzọ ọ bụla mee ihe, ọbụnadị izu ohi, nanị iji gboo mkpa ha kwa ụbọchị maka ịdịgide ndụ.

Bible na-akatọ izu ohi n’ụzọ doro anya. Nke asatọ n’ime Iwu Iri ahụ na-ekwu, sị: “Gị ezula ohi.” (Ọpụpụ 20:15) Ma, ọtụtụ ndị kwere na Bible na-agọpụkarị izu ohi mgbe ihe kpaliri onye ohi ahụ bụ ọnọdụ akụ̀ na ụba dị njọ.

Nke a na-ewelite ajụjụ ndị dị oké mkpa: Ịda ogbenye ọ̀ na-eme n’ezie ka izu ohi zie ezi? Gịnị ka mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ nọ n’oké nsogbu akụ̀ na ụba? Gịnị ma ọ bụrụ na o nwere ụmụaka na-arịa ọrịa ma ọ bụ ndị agụụ ji ilekọta? Jehova Chineke ọ̀ ga-enye ohere maka izu ohi n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ihe e weere adịghị ndị nwe ha mkpa?

Gịnị Ka Chineke Na-ekwu?

Ebe Jisọs gosipụtara ụdị onye Nna ya bụ, ihe nlereanya ya pụrụ inyere anyị aka ịghọta echiche Chineke. (Jọn 12:49) Mgbe ọ nọ n’elu ala, Jisọs nwere ọmịiko hie nne ná mmeso ya n’ebe ndị nọ ná mkpa nọ. Bible na-asị na “mgbe Ọ hụrụ ìgwè mmadụ nile, O nwere ọmịiko n’ahụ ha.” (Matiu 9:36) Otú o sina dị, ọ dịghị mgbe ọ nabatara izu ohi n’ọnọdụ ọ bụla. N’otu aka ahụ, ọ bụ ezie na Chineke nwere nchegbu maka ndị ogbenye, ọ dịghị ele ịda ogbenye anya ịbụ ihe ga-eme ka izu ohi zie ezi. N’Aịsaịa 61:8, Bible na-agwa anyị na Chineke ‘na-akpọ nnapụ n’ihe ike n’ajọ omume asị.’ Pọl onyeozi na-ekwukwa n’ụzọ doro anya na ndị ohi agaghị eketa Alaeze Chineke. Ya mere a hapụghị anyị n’obi abụọ banyere echiche Chineke.—1 Ndị Kọrint 6:10.

Otú ọ dị, Ilu 6:30 na-asị na “mmadụ adịghị eleda onye ohi anya, mgbe ọ na-ezu ohi imeju mkpụrụ obi ya mgbe agụụ na-agụ ya.” Okwu a ọ̀ na-agọpụ izu ohi? Ọ dịghị ma ọlị. Okwu ndị gbara ya gburugburu na-egosi na Chineke ka na-agụ onye ohi ahụ n’onye a ga-ata ahụhụ maka njehie ya. Amaokwu na-esochi na-asị: “Ma a sị na a chọta ya, ọ ga-akwụghachi okpukpu asaa; akụ̀ nile nke ụlọ ya ka ọ ga-enye.”—Ilu 6:31.

Ọ bụ ezie na a gaghị ata onye zuru ohi n’ihi agụụ ụta otú a ga-ata onye na-ezu ohi n’ihi anyaukwu ma ọ bụ n’ihi nzube imesi onye o zuru ohi ike, ndị na-achọ nnwapụta nke Chineke ekwesịghị ka ikpe ụdị ohi ọ bụla maa ha. Ọbụna n’ọnọdụ oké ịda ogbenye, izu ohi adịghị asọpụrụ Chineke. Ilu 30:8, 9 si otú a tinye ya: “Mee ka m rie nri ruuru m: . . . ka e wee ghara ịnapụ m ihe nile, m wee zuo ohi, wee were aha Chineke m mee ihe ọjọọ.” Ee, onye ohi na-akọcha aha Chineke. Ebe izu ohi bụ omume enweghị ịhụnanya, ọ bụ mmehie n’agbanyeghị ma e zuru ya ọgaranya ma ọ bụ ogbenye. Nye ndị hụrụ Chineke na ndị agbata obi n’anya, ọ dịghị mgbe izu ohi ziri ezi.—Matiu 22:39; Ndị Rom 13:9, 10.

Ezi uche adịghị n’arụmụka ahụ bụ na onye nọ n’ọnọdụ ọjọọ nwere ikike izu ohi. Ikwu nke a ga-adị nnọọ ka ikwuwe na onye na-eme egwuregwu nke na-enwechaghị ahụ nwere ikike ịṅụ ọgwụ a machibidoro iwu iji merie. Ọ bụrụgodị na o merie, o jiriwo ụzọ akwụwaghị aka ọtọ mee ihe. Ndị ọzọ ga-eche n’ụzọ ziri ezi na ọ napụwo ha mmeri ha site n’ụzọ megidere iwu. Otú ahụ ka ọ dịkwa onye ohi. Ọ na-eji ụzọ akwụwaghị aka ọtọ ewere ihe dịịrị ndị ọzọ. Ọnọdụ ọjọọ ya adịghị eme ka ụzọ ahụ zie ezi.

Onye ohi ọ bụla na-achọ nnwapụta nke Chineke aghaghị ichegharị site n’ụzọ o si akpa àgwà. Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ: kama ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ, na-eji aka ya abụọ rụọ ezi ihe.” (Ndị Efesọs 4:28) Ndị na-ezubu ohi bụ́ ndị nwere ezi nchegharị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-agbaghara ha.—Ezikiel 33:14-16.

Gịnị Ka Ndị Ogbenye Pụrụ Ime?

Bible na-ekwe nkwa, sị: “Jehova agaghị ekwe ka agụụ gụgbuo mkpụrụ obi onye ezi omume: ma ọchịchọ nke ndị na-emebi iwu na-achọsi ike ka Ọ na-akwapụ.” (Ilu 10:3) Chineke agaghị enyere ndị ma ụma na-emebi iwu ya aka imeju ọchịchọ ha. Ma ọ na-enwe ọmịiko maka ndị ji obi eziokwu na-agbalị irubere ya isi, ọ ga-agọzikwa mgbalị ha inweta ihe ndị dị mkpa.—Abụ Ọma 37:25.

Ọtụtụ nde mmadụ achọpụtaworị na mgbe ha gbasoro ụkpụrụ Chineke, ọnọdụ ha ná ndụ na-aka mma. Dị ka ihe atụ, itinye ndụmọdụ Bible nke ịrụsi ọrụ ike na izere ihe ọjọọ n’ọrụ, dị ka ịgba chaa chaa, mmanya ogbugbu, ise siga, na ịṅụ ọgwụ ọjọọ, enyeworo ha aka inwekwu ihe ndị dị ha mkpa n’ezie. (Ndị Galetia 5:19-21) Nke a na-achọ na ha ga-egosipụta okwukwe, ndị mewokwara otú ahụ amụtawo na “Jehova dị mma” nakwa na ọ na-enyere ndị na-atụkwasị ya obi aka n’ezie.—Abụ Ọma 34:8.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

Robin Hood: General Research Division/The New York Public Library/Astor, Lenox and Tilden Foundations

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya