N’ihi Gịnị Ka Izu Ohi Ji Na-amụba?
RIO DE JANEIRO—Sunday, October 18, 1992. Ụsọ osimiri ndị ahụ a ma ama nke Copacabana na Ipanema jupụtara ná ndị mmadụ. Na mberede, ìgwè ndị ntorobịa wabatara n’ụsọ osimiri ahụ, na-alụso onwe ha ọgụ ma na-ezunara ihe ọ bụla bara uru site n’aka ndị mmadụ nọ n’ụsọ osimiri ahụ. Ndị uwe ojii ahụ a ka n’ọnụ ọgụgụ guzo n’ebe ahụ—n’enyeghị aka ọ bụla. Nye ndị Rio de Janeiro na ndị na-eme mkpagharị, ọ bụ ajọ nrọ n’oge ehihie.
N’ezie, mpụ ndị metụtara ihe onwunwe adịwo ọtụtụ. N’ọtụtụ nnukwu obodo, ndị ohi abụwo ndị a maara dị ka ndị na-ezu ndị ntorobịa ohi—mgbe ụfọdụkwa ọbụna gbuo ha—iji pụnara ha akpụkpọ ụkwụ sneaker ha. Ndị ohi na-abanye n’ụlọ ndị mmadụ ma hà nọ ya ma ọ bụ na ha anọghị. Ndị inyom na-eje ozi dị n’ụlọ bụ́ ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu, mgbe ha matasịrị ebe ihe dị iche iche na-adị n’ụlọ, na-ezu ọla na ego, ma gbafuo. Ìgwè mmadụ na-ezukọrọ ihe dị n’ụlọ ahịa. Ìgwè ndị a haziri nke ọma na-ezu ọbụna ndị mmadụ, dị ka a hụworo n’ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ịtọrọ ndị mmadụ na Brazil. Eleghịkwa anya ị pụrụ inye ihe atụ ndị ọzọ site n’ahụmahụ nke gị ma ọ bụ site n’ihe werewooro ọnọdụ n’ógbè gị. Ma n’ihi gịnị ka e ji nwee ọtụtụ izu ohi?
N’ihi Gịnị Ka Ndị Mmadụ Ji Ezu Ohi?
Ọ bụ ezie na ịrị elu nke ịda ogbenye na iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe bụ isi ihe abụọ kpatara ya, azịza ya edochaghị anya. Akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ọchịchọ a na-achọ otu mkpụrụ ihe na-akpata mpụ abụwo n’ụzọ dị ukwuu nke a hapụrụ dị ka nke na-adịghị amịpụta mkpụrụ.” Otú ọ dị, otu akwụkwọ ahụ na-atụ aro na nsogbu ndị dị otú ahụ dị ka izu ohi “bụ nke mmetụta abaghị n’ihe nke ndị ntorobịa na iwe iwe n’ihi ịbụ ndị a gụpụrụ n’ọganihu na nkwụghachi ụgwọ ihe onwunwe ndị dị ná ndụ nkịtị na-akpata kpọmkwem.” Ee, n’ihi oké nrụgide nke mkpọsa ọdịmma ndị a na-eresị ihe, ọtụtụ amaghị ụzọ ha ga-esi nweta ihe ndị ha chọrọ e wezụga site n’izu ohi.
Otú ọ dị, n’ụzọ na-adọrọ mmasị, The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “E jiri ya tụnyere ebe ndị ọzọ, ọ̀tụ̀tụ̀ ime mpụ adịghị arị elu n’etiti ọha mmadụ na-adị ndụ ọdịnala bụ́ ebe ndị mmadụ kwetara na ụzọ ndụ ha ga-adịgide. Ọ̀tụ̀tụ̀ ime mpụ yiri ka ọ na-arị elu n’ọha mmadụ ebe mgbanwe dị ngwa na-ewere ọnọdụ n’ihe banyere ebe ndị mmadụ bi na ihe ha na-eme iji nweta ihe e ji adị ndụ—nakwa n’olileanya ha maka ọdịmma nke ọdịnihu ha.” Akwụkwọ ọkà ihe ọmụma ahụ na-ekwukwa, sị: “Ndị na-eto eto nwere ohere ọrụ ole na ole. Ọrụ ndị dị adị nke na-achọghị nkà yiri ndị na-agwụ ike mgbe e ji ya tụnyere uru na-akpali akpali ma dị ngwa nke na-esite n’izu ohi. Ndị na-eto eto dị njikere ịbụ ndị e jidere n’ihi na ọ dịghị ihe ha ji ndụ ha kpọrọ.”
Ma, ọtụtụ ndị na-enweghị ọrụ ma ọ bụ ndị nwere ọrụ a na-akwụ ụgwọ dị ala na ya adịghị ezu ohi, ebe ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ọrụ ọfịs na ndị ọrụ aka na-eme aka ntụtụ n’ọrụ ha dị ka à ga-asị na ọ bụ akụkụ nke ụgwọ ọnwa ha. N’ezie, maka omume aghụghọ ụfọdụ, ịnọ n’ọkwá ụfọdụ ná ndụ dị mkpa. Ị́ nụtụbeghị banyere omume ihere nke metụtara ego buru ibu nke ndị aka ha dị na ya bụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ gọọmenti, na ndị azụmahịa? Ihe ịrụ ụka adịghị ya, ọ bụghị nanị ndị dara ogbenye na-ezu ohi.
Chetakwa na sinima na ihe omume TV na-ejikarị izu ohi eme ihe egwuregwu (onye bụ dike na ya pụrụ ọbụna ịbụ onye ohi), nke yiri ka ọ na-eme ka izu ohi bụrụ ihe a na-anakwere. N’ikwu eziokwu, a pụrụ ịkpọ ikiri ihe dị otú ahụ ntụrụndụ, ma n’otu oge ahụ, a na-egosi ndị na-ekiri ya ụzọ e si ezu ohi. Ọ̀ bụ na e jighị ụzọ aghụghọ na-egosipụta echiche nke bụ na ma eleghị anya mpụ na-akwụghachi ụgwọ? Obi abụọ adịghị ya na anyaukwu, umengwu, na echiche ahụ bụ na onye ọ bụla na-eme ya n’abụghị ndị e jidere socha na-akpata ịrị elu nke izu ohi. N’ụzọ na-enweghị mgbagha, anyị na-ebi n’ime “oge dị oké egwu” nke e buru n’amụma, mgbe ọdịmma onwe onye na ịhụnanya ego jupụtara n’ebe nile.—2 Timoti 3:1-5.
Gị Ezula Ohi
N’agbanyeghị ụkpụrụ omume gbagọrọ agbagọ nke ụwa, ọ dị mkpa irube isi n’iwu ahụ bụ: “Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ.” (Ndị Efesọs 4:28) Onye na-eji ihe onwunwe na ihe ụtọ kpọrọ ihe gabiga ókè pụrụ ịghọ onwe ya aghụghọ ikwere na izu ohi kwesịrị ihe ize ndụ dị na ya. Ma izu ohi dị oké njọ n’anya Chineke, na-ekpughekwa na mmadụ enweghị ịhụnanya maka ibe ya. E wezụga nke ahụ, ọbụna izu ohi aka ntụtụ pụrụ iduba n’obi ịta mmadụ mmiri. Oleekwa banyere ịbụ onye a na-ele anya dị ka onye na-adịghị eme ihe n’eziokwu? Ònye ga-atụkwasị onye ohi obi? N’ụzọ amamihe, Okwu Chineke na-asị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu ghara ịhụ ahụhụ dị ka ogbu mmadụ, ma ọ bụ onye ohi, ma ọ bụ onye na-eme ihe ọjọọ.”—1 Pita 4:15.
N’ezie ị na-akatọ ịrị elu nke izu ohi, ma olee ụzọ ndị nọ n’ógbè mpụ jupụtara si anagide ya? Olee ụzọ ụfọdụ ndị bụbu ndị ohi siworo gbanwee ụzọ ndụ ha? Ọ̀ dị mgbe izu ohi ga-akwụsị n’ụwa nile? Anyị na-akpọ gị òkù ịgụ isiokwu na-esonụ, bụ́ “Ụwa nke Ndị Ohi Na-anọghị na Ya.”