Ọ̀ Bụ Ohi n’Ezie?
ABIODUN so ná ndị gbagotere n’ọkwá ná ndị na-eke nri n’otu nnukwute họtel dị na Nigeria. Mgbe ọ na-akpọchi nnukwu ọnụ ụlọ ebe a na-eri nri n’otu mgbede, ọ hụrụ otu akpa ego nke ₦13,500 dị na ya. N’egbughị oge o nyefere ego ahụ, bụ́ nke onye nwe ya, bụ́ onye naara otu ọnụ ụlọ na họtel ahụ, mesịrị gbara. Ndị nwe họtel ahụ ji mbuli n’ọkwá okpukpu abụọ kwụghachi Abiodun ụgwọ ma nye ya ihe nrite ha nke “onye ọrụ [ha] kasị mma n’afọ.” Onye nwe ego ahụ kwụghachikwara ya ụgwọ.
Quality, magazin akụkọ e nwere ná mba a, buru akụkọ ahụ, na-akpọ Abiodun “Ezi Onye Sameria.” Mgbe Quality jụrụ ya ma a nwara ya ọnwụnwa idebere onwe ya ego ahụ, Abiodun sịrị: ‘Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova. Ya mere m hụ ihe na-abụghị nke m, m na-enyeghachi ya onye nwe ya.’
Ngosipụta nke ịkwụwa aka ọtọ nke Abiodun tụrụ ndị bi n’ógbè ahụ n’anya. Ndịàmà ibe Abiodun nwere obi ụtọ n’ihi ihe merenụ, ma ọ tụghị ha n’anya. Gburugburu ụwa, a ma Ndịàmà Jehova ama maka ụkpụrụ ha ndị dị elu. N’etiti ha ịkwụwa aka ọtọ abụghị ihe pụrụ iche; ọ bụ ụkpụrụ, akụkụ dị mkpa nke ezi Iso Ụzọ Kraịst.
Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ọnọdụ pụrụ iyi ka ọ na-eme ka ọdịiche dị n’etiti ịkwụwa aka ọtọ na akwụwaghị aka ọtọ ghara ido anya. Tụlee ọnọdụ nke a. Festus, onye na-ahụ maka onyinye na ihe ndekọ ego n’otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’Ọdịda Anyanwụ Africa, nọ n’oké mkpa maka ego.a Nwunye ya nwere mkpa nke ịwa ahụ siri ike nke ndị dọkịta ya sịrị na e kwesịghị igburu oge. Ụlọ ọgwụ ahụ chọrọ ka a kwụọ ọkara ụgwọ ya tupu a malite.
Festus enweghị ego ahụ. Mgbe o jekwuuru ọtụtụ ndị maka ịgbazite ego, ha jụrụ inye ya. Mgbe ahụ o chere banyere ego dị ya n’aka ma chee sị, ‘Ò ziri ezi ka m hapụ nwunye m ka ọ nọrọ n’ihe ize ndụ ịnwụ mgbe ọ dị ihe m pụrụ ime iji gbochie ya? Gịnị ma m “gbaziri ego” site n’ego ọgbakọ? M pụrụ iweghachi ya mgbe ụfọdụ ndị kwụrụ m ụgwọ ha ji m.’
Festus jiri ego ahụ na-abụghị nke ya kwụọ ụlọ ọgwụ ahụ ụgwọ. Echiche ya ò ziri ezi? À pụrụ ịsị na ihe o mere ziri ezi n’ihi ọnọdụ ọnwụ na ndụ nke chere ya ihu?
Ego Ònye Ka Ọ Bụ?
N’inyocha ajụjụ ndị a, ka anyị tụlee isi ihe ole na ole banyere ebe ego ahụ Festus weere sitere na nzube ya. Ego ahụ sitere n’onyinye afọ ofufo nke ndị nọ n’ọgbakọ nyere, bụ́ ndị chọrọ ka ofufe dị ọcha nke Jehova na-aga n’ihu. (2 Ndị Kọrint 9:7) E jighị ya akwụ ụgwọ ọnwa, ebe ọ bụ na ọ dịghị onye a na-akwụ ụgwọ maka ihe ọ na-eme n’ọgbakọ. N’ụzọ megidere nke ahụ, e ji ego ahụ a tụtara eme ihe n’ụzọ bụ isi maka inweta na ilekọta ebe nzukọ, nke na-abụkarị Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nke a na-eme ka e nwee ebe dị mma ma na-edo ahụ ebe ndị mmadụ—ndị na-eto eto na ndị agadi, ndị ọgaranya na ndị ogbenye—pụrụ izukọ maka ozizi Bible.
Ego ònye ka ọ bụ? Ọ bụ nke ọgbakọ ahụ dum. Ọ dịghị otu onye ọ bụla nọ na ya na-ekpebi ụzọ a ga-esi jiri ego ahụ mee ihe. Ọ bụ ezie na òtù ndị okenye na-eduzi usoro mmefu ọgbakọ, mgbe a chọrọ ùkwù ego buru ibu, ndị okenye na-ewepụtara ọgbakọ dum okwu ahụ maka nkwado.
Ọ̀ Bụ Mgbaziri ka ọ bụ Ohi?
N’ihi atụmatụ ya nke idochi ego ahụ ngwa ngwa o kwere omume, Festus lere ihe o mere anya dị ka mgbaziri. Otú ọ dị, akwụkwọ Webster’s New Dictionary of Synonyms na-eji okwu ndị ọzọ metụtara “iwere na iwepụ ihe onye ọzọ karịsịa site n’iwere ná nzuzo ma ọ bụ n’emeghị ka ọ mara nakwa mgbe nile na-enweghị nkweta ya” eme ihe. Okwu ndị ahụ bụ “ohi” na “onye ohi.” N’anataghị ikike ma ọ bụ nkwado, Festus weere ego bụ nke ọgbakọ. Ya mere, ee, ikpe izu ohi mara ya. Ọ bụ onye ohi.
Otú ọ dị, e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche nke ịta ụta ná nkwali maka izu ohi. Anyị pụrụ ịhụ nke ahụ site n’ihe atụ nke Judas Iskarịọt, onye e nyere ọrụ ilekọta ego Jisọs na ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi nwere. Bible na-asị: “[Judas] bụ onye ohi, na ebe o ji akpa ego, ọ na-ewepụ ihe a na-etinye n’ime ya.” (Jọn 12:6) N’ịbụ onye obi ọjọọ na anyaukwu doro anya kwaliri, Judas jọwanyere njọ. N’ikpeazụ o retọrọ gaa n’ịrara Ọkpara Chineke nye—maka 30 ego ọlaọcha.—Matiu 26:14-16.
Otú ọ dị, nchegbu maka nwunye ya ahụ na-adịghị ike kwaliri Festus. Nke a ọ̀ pụtara na ụta adịghịrị ya? Ee e ma ọlị. Tụlee ihe Bible na-ekwu banyere izu ohi n’ọnọdụ ọzọ yikwara nke ọnwụ na ndụ: “Mmadụ adịghị eleda onye ohi anya, mgbe ọ na-ezu ohi imeju mkpụrụ obi ya mgbe agụụ na-agụ ya: ma a sị na a chọta ya, ọ ga-akwụghachi okpukpu asaa; akụ̀ nile nke ụlọ ya ka ọ ga-enye.” (Ilu 6:30, 31) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mgbe e jidere ya, onye ohi ahụ aghaghi iche ntaramahụhụ zuru ezu nke iwu ihu. Dị ka Iwu Mosis si dị, onye ohi ga-akwụ ụgwọ maka mpụ ya. Ya mere kama ịgba ume ma ọ bụ inye ihe ngọpụ maka izu ohi, Bible na-adọ aka ná ntị na ọbụna n’ọnọdụ ọnwụ na ndụ, izu ohi pụrụ ịkpata mfu akụ̀ na ụba, mmechuihu, na nke kasị nnọ, ntụfu nke nnwapụta Chineke.
Dị ka Ndịàmà Jehova, ezi ndị Kraịst nile, karịsịa ndị a tụkwasịrị ibu ọrụ n’ime ọgbakọ, aghaghị ịdị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya, “ndị a na-apụghị ibo ebubo.” (1 Timoti 3:10) Festus enwetaghị ego ọ na-atụ anya ya, n’ihi ya kwa o nweghị ike idochi ego ahụ o weere. A chọpụtara ihe o mere. Gịnị mere ya? À sị na ọ bụ onye ohi na-enweghị nchegharị, a gaara achụpụwo ya n’ọgbakọ ndị Kraịst dị ọcha. (1 Pita 4:15) Ma ọ dụrụ ya n’obi nke ukwuu, o chegharịkwara. Ya mere, ọ pụrụ ịnọgide n’ọgbakọ, ọ bụ ezie na ihe ùgwù ije ozi ndị o nwere funahụrụ ya.
Ịtụkwasị Chineke Obi
Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị na onye na-azọrọ na ya na-efe Jehova izu ohi pụrụ iwetara aha Chineke na ndị a kpọkwasịrị aha Ya nkọcha. Pọl dere, sị: “Gị onye na-ezi mmadụ ibe gị ihe, ị̀ dịghị ezi onwe gị? gị onye na-ekwusa ka mmadụ ghara izu ohi, ị̀ na-ezu ohi? N’ihi na a na-ekwulu aha Chineke n’etiti ndị mba ọzọ n’ihi unu.”—Ndị Rom 2:21, 24.
Agur, onye amamihe n’oge ochie, kwuru otu isi ihe ahụ. N’ekpere ya ọ rịọrọ ka ‘a ghara ịnapụ ya ihe nile, ya ewee zuo ohi, wee were aha Chineke ya mee ihe ọjọọ.’ (Ilu 30:9) Rịba ama na nwoke amamihe a matara na ịbụ onye a napụrụ ihe nile pụrụ iweta ọnọdụ ndị pụrụ ịnwa ọbụna onye ezi omume izu ohi. Ee, oge ndị siri ike pụrụ ịnwale okwukwe onye Kraịst n’ikike Jehova nwere ịhụ maka mkpa ndị ya.
Ma, Ndịàmà Jehova na-eguzosi ike n’ihe, gụnyere ndị dara ogbenye, nwere okwukwe na Chineke “na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ha maara na Jehova na-enyeghachi ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ site n’inyere ha aka ịhụ maka mkpa ha. Jisọs mere ka nke ahụ pụta ìhè n’Ozizi Elu Ugwu ya, na-asị: “Echegbula onwe unu, sị, Gịnị ka anyị ga-eri? ma ọ bụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ? ma ọ bụ, Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị? . . . N’ihi na Nna unu nke eluigwe na-amata na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—Matiu 6:31-33.
Olee otú Chineke si enye ndị nọ ná mkpa n’ime ọgbakọ ndị Kraịst ihe na-akpa ha? N’ọtụtụ ụzọ. Otu bụ site ná ndị kwere ekwe ibe ha. Ndị Chineke na-egosipụta ezigbo ịhụnanya maka ibe ha. Ha na-eji okwu ịdọ aka ná ntị nke Bible kpọrọ ihe, nke bụ́: “Onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa nke a o ji biri, nke hụkwara nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa, o wee mechigide ya obi ebere ya, ịhụnanya Chineke si aṅaa dịgide n’ime ya? Ụmụntakịrị m, ka anyị ghara ịhụ n’anya n’okwu, ma ọ bụ n’ire; kama ka anyị na-ahụ n’anya n’ọrụ na eziokwu.”—1 Jọn 3:17, 18.
Gburugburu ụwa, n’ihe karịrị 73,000 ọgbakọ, ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova anọ na ọkara ji ịdị uchu na-agbalịsi ike ife Chineke dị ka ụkpụrụ ezi omume ya nile si dị. Ha maara na Chineke adịghị mgbe ọ ga-agbahapụ ndị ya na-eguzosi ike n’ihe. Ndị jewooro Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ na-eweli olu ha elu n’ikwenyere Eze Devid, bụ́ onye dere, sị: Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụru ya ka ha na-arịọ nri.”—Abụ Ọma 37:25.
Lee ka o si ka mma itinye okwukwe n’ebe Chineke nọ bụ́ onye nyere mmụọ maka okwu ndị ahụ, kama ikwe ka mmadụ bụrụ onye a nwara izu ohi na ma eleghị anya ịtụfu ihu ọma Chineke ruo mgbe ebighị ebi!—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ya.