Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 11/15 p. 3-6
  • Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Ego Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Ego Anya
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • EGO NA-EME KA NDỊ MMADỤ NA-ELE IBE HA ANYA ỌJỌỌ
  • IHE BAỊBỤL KWURU
  • OLEE OTÚ I SI ELE EGO ANYA?
  • Ego Ọ̀ Bụ Mkpọrọgwụ nke Ihe Ọjọọ Niile?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ego
    Teta!—2014
  • Otú Unu Ga-esi Hazie Ihe Unu Na-eji Ego Unu Eme
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Olee Ụzọ Amamihe Dị na Ya Isi Na-ele Ego Anya?
    Teta!—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 11/15 p. 3-6
Ebe otu nwoke nọ na-ele mkpumkpu ego anya

ISIOKWU TETA! A

Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Ego Anya

NDỊ mmadụ na-asị na “akụ̀ na-esi obi ike.” Okwu a abụchaghị asị n’ihi na ego bara uru. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ego ka anyị ji azụ nri ma ọ bụ ákwà. Ọ bụkwa ya ka anyị ji akwụ ụgwọ ụlọ. Anyị chọọkwa inwe ụlọ nke anyị, ọ bụ ya ka anyị ga-eji arụ ya. Ọ bụ ya mere otu nwoke ihe gbasara ego doro anya ji dee, sị: “Ọrụ ego na-arụrụ ndị mmadụ enweghị atụ. Ọ bụrụ na e nwee otú e si mechie ego, ọ gaghị eru otu ọnwa ọgba aghara adị ebe niile.”

Ma, e nwere ihe ego na-agaghị emeliri mmadụ. Otu nwoke onye Nọọwee dere, sị: “Mmadụ nwere ike iji ego zụta nri, ma ọ gaghị emeli ka agụụ gụwa ya. Ego ga-azụtali ọgwụ, ma ọ bụghị ahụ́ ike. Ọ ga-azụtali ezigbo àkwà, ma ọ gaghị azụtali ụra. Mmadụ ga-ejili ego gụọ akwụkwọ, ma ọ gaghị ejili ya zụta amamihe. E nwere ike iji ya zụta ihe e ji achọ mma, ma ọ gaghị azụtali mma. Ego nwere ike ime ka a na-akwanyere mmadụ ùgwù, ma ọ gaghị emeli ka onye ahụ dị obi ebere. Mmadụ nwere ike iji ya na-achọ ime onwe ya obi ụtọ, ma ọ gaghị azụtali obi ụtọ. Mmadụ nwere ike iji ya na-azụrụ ụtọ, ma ọ gaghị azụtali ezigbo ndị enyi. Mmadụ nwere ike iji ya nweta ndị na-ejere ya ozi, ma ọ gaghị emeli ka ha jiri obi ha na-ejere ya ozi.”

Ego ole ọ bụla anyị nwere ga na-eju anyị afọ ma ọ bụrụ na anyị ejighị ego mere chi. Baịbụl kwuru, sị: ‘Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile. Site n’ịchụso ụdị ịhụnanya a, ụfọdụ ndị ejirila ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.’—1 Timoti 6:10.

Ihe bụ́ nsogbu abụghị ego n’onwe ya, kama ọ bụ ịhụ ya n’anya. Ịhụ ego n’anya nwere ike ime ka mmadụ na ndị enyi ya ghara ịdị ná mma. O nwekwara ike ịkpata nsogbu n’ezinụlọ. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Ebe ego si n’elu na-awụdata

Chibuike:a “Aha enyi m nwoke bụ Emeka. M na-ewere ya ka ezigbo mmadụ na onye na-ekwu eziokwu. Mụ na ya esetụbeghị okwu ruo mgbe m resịrị ya ụgbọala. O nweghị ihe m ma mere ụgbọala ahụ mgbe ọ zụrụ ya. O kwetara na ya agaghị ebughachite ya ma o mechaa nwee nsogbu. Anyị bịanyekwara aka n’akwụkwọ. Mgbe ọnwa atọ gachara, ụgbọala ahụ mebiri. Emeka kwuru na m ghọgburu ya ma sị m nyeghachi ya ego ya. Ihe a o mere juru m anya. Ọ chọdịrị ịba m ọgụ mgbe m chọrọ ka mụ na ya kpezie. Ego mere ka enyi m gbanwee.”

Chioma: “Amarachi bụ naanị nwanne m nwere. Mụ na ya dị ná mma, amaghịkwa m na ego ga-esere anyị okwu. Papa anyị na mama anyị keere mụ na Amarachi ego ha nwere tupu ha anwụọ ma kwuo na nke Amarachi ga-aha ka nke m. Ma, Amarachi chọrọ ka nke ya kara nke m. Mụ na ya sere ezigbo okwu n’ihi na m chọrọ ka anyị mee ihe ahụ papa anyị na mama anyị kwuru. Ihe a mekwara ka ọ ghara ịna-eji anya ahụ m.”

EGO NA-EME KA NDỊ MMADỤ NA-ELE IBE HA ANYA ỌJỌỌ

Mmadụ nwere ike ịna-akatọ ndị ọzọ ma ọ bụrụ na ọ naghị ele ego anya otú kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, ọgaranya nwere ike ịna-eche na ihe mere ndị ọzọ ji bụrụ ogbenye bụ na ha dị umengwụ. Ogbenye nwekwara ike ịna-eche na ndị niile bara ọgaranya bụ ndị anyaukwu. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Nkechi kwuru otú ndị enyi ya si eme ya akaje n’ihi na papa ya nwere ego. O kwuru, sị:

Ihe Baịbụl kwuru gbasara otú anyị kwesịrị isi na-ele ego anya ka bara uru taa otú ahụ ọ bara mgbe e dere ya

“Ha na-akpọ m nwa ọgaranya. Ha na-ekwukarị na mụ enweghị nsogbu, na papa m na-enye m ihe ọ bụla m chọrọ. Ha na-agwakwa m na ha enweghị ego ka anyị nakwa na ha agaghị azụtali ụdị ụgbọala ndị ahụ juru n’ụlọ anyị. Agwara m ha ka ha kwụsị ikwu ụdị ihe ahụ, gwakwa ha ihe mere ihe a ha na-ekwu ji ewe m iwe. Achọghị m ka a mara m ka onye nna ya ji ego. Kama, achọrọ m ka a mara m dị ka ezigbo mmadụ.”

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl ekwughị na ego dị njọ. O kwughịkwa na ndị nwere ego bụ ndị ọjọọ. Ihe bụ nsogbu abụghị ego ole mmadụ nwere. Kama, ọ bụ otú o si ele akụnụba anya na otú o si achụ ya. Ihe Baịbụl kwuru gbasara otú anyị kwesịrị isi na-ele ego anya doro anya. Ọ bakwara uru taa otú ọ bara mgbe e dere ya. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Adọgbula onwe gị n’ọrụ inweta akụnụba.”—Ilu 23:4.

Otu akwụkwọ kwuru na isi anaghị akpakọcha ndị na-achụ ego ọnwụ ọnwụ ọnụ. O kwukwara na ha na-arịakarị ọnyá akpịrị, azụ mgbu, na isi ọwụwa. Ihe ọzọ o kwuru bụ na ha nwere ike ịna-aṅụ oké mmanya, na-aṅụkwa ọgwụ ọjọọ. Ihe ndị a gosiri na ahụ́ anaghị afọ onye ọ bụla na-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ.

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a.”—Ndị Hibru 13:5.

Na ihe mmadụ nwere juru ya afọ apụtaghị na o nweghị mgbe ego ga-adị ya mkpa. Onye ihe o nwere juru afọ ma ihe dị ya mkpa, ma ọ naghị ekwe ka ego chegbuwe ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nnukwu ego efunahụ ya, ọ gaghị adị ya ka nke ya agwụla. Kama, ọ na-eme ka Pọl onyeozi. Pọl dere, sị: “Amaara m otú e si ebi ndụ mgbe ihe dị ụkọ, amaara m otú e si ebi ndụ mgbe ihe dị n’ụba. N’ihe niile nakwa n’ọnọdụ niile, amụtawo m ma otú e si eriju afọ ma otú e si anọ agụụ, ma otú e si enwe ihe n’ụba ma otú e si anọ n’ụkọ.”—Ndị Filipaị 4:12.

BAỊBỤL KWURU, SỊ: ‘Onye tụkwasịrị obi n’akụnụba ya ga-ada.’—Ilu 11:28.

Ndị ọkachamara na-ekwu na ihe na-esere ọtụtụ ndị di na nwunye okwu, nke na-emekwa ka ha na-agba alụkwaghịm bụ ego. Ụfọdụ ndị egbuokwala onwe ha n’ihi ego. Ihe a na-egosi na ụfọdụ ndị ji ego kpọrọ ihe karịa ndụ ha, nwunye ha ma ọ bụkwanụ di ha. Ma, ndị na-ele ego anya otú kwesịrị ekwesị anaghị ewere obi ha niile tinye na ya. Kama, ha ma na ihe Jizọs kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.”—Luk 12:15.

OLEE OTÚ I SI ELE EGO ANYA?

Ebe otu nwoke kposara ego n’ihu ya na-ele onwe ya n’enyo

Ọ bụrụ na anyị eleruo onwe anyị anya, anyị ga-achọpụta ebe ndị anyị ga-arụkwu ọrụ ka anyị nwee ike ịna-ele ego anya otú kwesịrị ekwesị. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị a:

  • Àna m etinye aka n’ihe ọ bụla ga-eme ka m nwee ego ngwa ngwa?

  • Ọ̀ na-esiri m ike iji ego m enyere ndị ọzọ aka?

  • Ndị enyi m hà bụ ndị na-ekwu okwu ego mgbe niile, ndị na-ejikwa ihe ndị ha nwere etu ọnụ?

  • M̀ na-akwụwa aka ọtọ ka m̀ na-egwu ndị mmadụ wayo iji nweta ego?

  • Ọ̀ bụ naanị mgbe ego dị m n’akpa ka ọ na-adị m ka m̀ bara uru?

  • M̀ na-echekarị gbasara ego?

  • Otú m si achụ ego ọ̀ na-akpa ma ezinụlọ m ma ahụ́ m aka ọjọọ?

    Jiri ego gị na-enyere ndị ọzọ aka

Ọ bụrụ na o nwere nke metụtara gị n’ajụjụ ndị a, gbalịa gbanwee otú i si ele ego anya. Emetela onye ọ bụla na-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ enyi. Kama, mete ndị na-eme ihe Chineke chọrọ enyi.

Gbaa mbọ ka ị ghara ịhụ ego n’anya. Na-ele ego anya otú kwesịrị ekwesị. Ekwela ka ego dịrị gị mkpa karịa ndị enyi gị, ndị ezinụlọ gị, ma ọ bụkwanụ ahụ́ ike gị. Ị ga-esi otú a gosi na ị na-ele ego anya otú kwesịrị ekwesị.

a Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

Ebe ụmụ nwaanyị abụọ nọ na-ele ibe ha anya ọjọọ

EZINỤLỌ ỊDỊ N’OTU DỊ MKPA KARỊA EGO

Otu nwoke dị iri afọ ise na ise aha ya bụ Josué kwuru, sị: “Mgbe papa m na-ede otú mụ na ụmụnne m ga-esi eke ihe onwunwe ya ma ọ nwụọ, o dere na òkè ụmụnne m niile ga-akacha nke m. Emechara m gakwuru ya ka mụ na ya kwurịta ya. Mgbe m ghọtara ihe mere o ji mee mkpebi a, akwadoro m ya. Agaghị m ekwe ka ego tisaa udo dị n’ezinụlọ anyị.”

EGO NWERE IKE ỊKPATA ỊKPA ÓKÈ

“Onye dara ogbenye ka mmadụ ibe ya na-akpọ asị, ma ndị enyi ọgaranya na-adị ọtụtụ.”—Ilu 14:20.

Ihe a Baịbụl kwuru na-egosi na ego nwere ike ime ka mmadụ na-emeso ndị mmadụ otú na-ekwesịghị ekwesị. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-eleda ogbenye anya n’ihi na o nweghị ihe ọ ga-emeliri anyị. Ma, anyị hụ onye ji ego, anyị ana-aja ya mma, na-akpakwa ya nso ka anyị mara ma ò nwere ihe anyị ga-erite n’aka ya.

Chineke kpọrọ onye ọ bụla na-eleda onye na-enweghị ego anya asị. Ndị ọzọ ọ kpọrọ asị bụ ndị na-aja ndị nwere ego mma ka ha nweta ihe n’aka ha. (Jud 16; Aịzaya 10:1, 2) Otú anyị si were onye nwere ego ka anyị kwesịrị isi were ogbenye.

IHE ỤFỌDỤ BAỊBỤL KWURU GA-ENYERE ANYỊ AKA

Baịbụl kwuru, sị:

  • “Ego bụ ihe nchebe.”—EKLIZIASTIS 7:12.

Ma, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị:

  • “Onye ọ dị ngwa ngwa ịba ọgaranya agaghị abụ onye aka ya dị ọcha.”—ILU 28:20.

  • “Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha, ndị na-emerụkwa ahụ́.”—1 TIMOTI 6:9.

Ọ bụ ihe ndị a mere Baịbụl ji kwuo, sị:

  • “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya.”—NDỊ HIBRU 13:5.

  • “Lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla, n’ihi na ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.”—LUK 12:15.

  • “Unu echefukwala ime ihe ọma na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe.”—NDỊ HIBRU 13:16.

Olee uru ha ga-abara anyị?

  • “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—ỌRỤ NDỊOZI 20:35.

  • “Mkpụrụ obi nke na-emesapụ aka ka a ga-eme ka ọ maa abụba, onye na-emekwa ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ.”—ILU 11:25.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya