Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hf nkebi 4 p. 12-14
  • Otú Unu Ga-esi Hazie Ihe Unu Na-eji Ego Unu Eme

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Unu Ga-esi Hazie Ihe Unu Na-eji Ego Unu Eme
  • Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1 KPEBIENỤ IHE UNU GA-AZỤ NA IHE UNU NA-AGAGHỊ AZỤ
  • 2 NA-AGWANỤ IBE UNU OTÚ EGO UNU SI AGA
  • Ijizi Ego Ejizi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Ego Anya
    Teta!—2015
  • Ego
    Teta!—2014
  • Ego Ọ̀ Bụ Mkpọrọgwụ nke Ihe Ọjọọ Niile?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
hf nkebi 4 p. 12-14
Ebe otu di na nwunye na-ede otú ha ga-esi na-emefu ego ha

ISIOKWU NKE 4

Otú Unu Ga-esi Hazie Ihe Unu Na-eji Ego Unu Eme

“A na-eji ndụmọdụ eme ka atụmatụ guzosie ike.”—Ilu 20:18

Ọ bụ ego ka anyị ji egbo mkpa ezinụlọ anyị. (Ilu 30:8) A sị ka e kwuwe, “ego bụ ihe nchebe.” (Ekliziastis 7:12) Ma, ọ na-esekarịrị ụfọdụ di na nwunye okwu. N’ihi ya, ekwela ka o seere unu okwu. (Ndị Efesọs 4:32) Di na nwunye kwesịrị ịtụkwasị ibe ha obi, na-akparịtakwa ihe ndị ha ga-eji ego ha na-eme.

1 KPEBIENỤ IHE UNU GA-AZỤ NA IHE UNU NA-AGAGHỊ AZỤ

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ̀ dị onye n’ime unu nke chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka o wee hụ ma ò nwere ihe ga-ezu iji wuchaa ya?” (Luk 14:28) Unu abụọ kwesịrị ịnọkọ kpaa ihe ndị unu ga-azụ na ihe ndị unu na-agaghị azụ. (Emọs 3:3) Kpebienụ ihe ndị dị unu mkpa unu kwesịrị ịzụ nakwa ego ole unu ga-eji azụ ha. (Ilu 31:16) Ọ bụghị ihe ọ bụla unu hụrụ, unu azụrụ n’ihi na unu nwere ego ya. Gbalịanụ ka unu ghara ịna-eji ụgwọ. Na-ekonyekwanụ akpa unu ebe aka unu ga-eru.—Ilu 21:5; 22:7.

IHE I NWERE IKE IME:

  • Ọ bụrụ na unu emechaa ihe unu kwesịrị iji ego eme n’ọnwa, ego aka fọ unu n’aka, kpebienụ ihe unu ga-eji ya eme

  • Unu mechaa ihe ndị ahụ ma jiri ụgwọ, kwuonụ otú unu ga-esi wetulata aka n’ego unu na-emefu. Dị ka ihe atụ, unu nwere ike iji aka unu na-esi ihe unu na-eri kama ịna-eri nri ahịa

Ebe di na nwunye na-echebara ihe ndị kacha eri ha ego echiche

2 NA-AGWANỤ IBE UNU OTÚ EGO UNU SI AGA

IHE BAỊBỤL KWURU: Na-eme ihe niile n’eziokwu, “ọ bụghị naanị n’anya Jehova, kamakwa n’anya ụmụ mmadụ.” (2 Ndị Kọrịnt 8:21) Na-agwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ego ole na-abata gị n’aka nakwa ego ole ị na-emefu.

Mgbe ọ bụla ị chọrọ ime ihe ga-eri gị nnukwu ego, mee ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mara. (Ilu 13:10) Ọ bụrụ na ọ mara otú gị na ego si na-aga, ihe gbasara ego agaghị na-esere unu okwu. Echefula na ego ọ bụla batara gị n’aka abụghị ego gị, kama, ọ bụ ego unu.—1 Timoti 5:8.

Ebe otu di na nwunye na-ele akwụkwọ ha ji depụtasịa ihe ndị ha ga-azụ mgbe ha nọ n’ahịa

IHE I NWERE IKE IME:

  • Kpaanụ ego ole onye ọ bụla n’ime unu nwere ike iji zụọ ihe n’agwaghị onye nke ọzọ

  • Ọ bụghị mgbe ego seere unu okwu ka unu ga-ekpebi ihe unu ga na-eme. Unu kwesịrị ibu ụzọ hazie nke ga-aga ebe ọ ga-aga

OTÚ I SI ELE EGO ANYA

Anyị ma na ego dị mkpa n’ezinụlọ, ma ekwela ka okwu ego kpatara unu nghọtahie ma ọ bụkwanụ mee ka unu chegbuwe onwe unu. (Matiu 6:25-34) Ọ bụghị inweju ego ebe niile ga-eme ka unu na-ebi n’udo. Cheta na Baịbụl sịrị: “Lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla.” (Luk 12:15) O nweghị ihe a ga-eji ego azụta nke karịrị ezinụlọ unu. N’ihi ya, ka obere ego ọ bụla unu nwere ju unu afọ. Gbaakwanụ mbọ ka unu na Chineke nọgide na-adị ná mma. Ọ bụrụ na unu emee ihe a niile, udo ga-adị n’ezinụlọ unu, Jehova ga-ahụkwa unu n’anya.—Ndị Hibru 13:5.

JỤỌ ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A . . .

  • Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịna-eji ụgwọ?

  • M̀ nwere ike icheta ụbọchị ikpeazụ mụ na di m ma ọ bụ nwunye m kparịtara otú ego anyị si aga?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya