Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 166
  • Ego Ọ̀ Bụ Mkpọrọgwụ nke Ihe Ọjọọ Niile?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ego Ọ̀ Bụ Mkpọrọgwụ nke Ihe Ọjọọ Niile?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ego?
  • Gịnị mere Baịbụl ji dọọ aka ná ntị gbasara ịhụ ego n’anya?
  • Olee otú ndụmọdụ Baịbụl nyere gbasara ego ga-esi baara anyị uru?
  • Ego
    Teta!—2014
  • Otú E Kwesịrị Isi Na-ele Ego Anya
    Teta!—2015
  • Olee Ụzọ Amamihe Dị na Ya Isi Na-ele Ego Anya?
    Teta!—2007
  • Ị̀ Pụrụ Isi Aṅaa Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Ego?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 166
Ebe otu nwoke na-achọ ikpokọta ego buru ibu.

Ego Ọ̀ Bụ Mkpọrọgwụ nke Ihe Ọjọọ Niile?

Ihe Baịbụl kwuru

Mba. Baịbụl ekwughị na ego bụ ihe ọjọọ, o kwughịkwanụ na ọ bụ ego mere e ji nwee ọtụtụ ihe ọjọọ juru n’ụwa. Ndị mmadụ na-ekwukarị na “ego bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ niile,” ma nke a abụghị otú Baịbụl si kwuo ya, ọ na-emekwa ka a ghọtahie ihe Baịbụl kwuru. N’eziokwu, ihe Baịbụl kwuru bụ na ‘ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ niile.’a​—⁠1 Timoti 6:​10, Bible Nsọ nke Union Version.

  • Gịnị ka Baịbul kwuru banyere ego?

  • Gịnị mere Baịbụl ji dọọ aka ná ntị gbasara ịhụ ego n’anya?

  • Olee otú ndụmọdụ Baịbụl nyere gbasara ego ga-esi baara anyị uru?

  • Amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara ego

Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ego?

Baịbụl kwuru na ego na-egbo mkpa ma e jiri ya mee ihe bara uru. O nwedịrị ike ịbụ “ihe nchebe.” (Ekliziastis 7:12) Ihe ọzọ bụ na Baịbụl jara ndị na-emesapụ aka mma, ego nwekwara ike iso n’ihe e ji emesapụ aka.​—⁠Ilu 11:⁠25

N’otu oge ahụ, Baịbụl dọkwara aka nà ntị gbasara mmadụ iwere ịchụ ego ka ihe kacha mkpa ná ndụ. O kwuru, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a.” (Ndị Hibru 13:⁠5) Ihe anyị mụtara ebe a bụ na anyị ekwesịghị ikwe ka ego bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị, ma ọ bụ chọwa ịba ọgaranya. Kama nke ahụ, anyị ga-agbalị ka ihe ndị dị anyị mkpa anyị na-enweta ju anyị afọ, dị ka nri, uwe na ebe obibi.​—⁠1 Timoti 6:⁠8.

Gịnị mere Baịbụl ji dọọ aka ná ntị gbasara ịhụ ego n’anya?

Ndị anyaukwu agaghị enweta ndụ ebighị ebi. (Ndị Efesọs 5:⁠5) Otu ihe kpatara ya bụ na anyaukwu dị ka mmadụ ikpere arụsị. (Ndị Kọlọsi 3:⁠5) Ihe ọzọ bụ na, ka ndị anyaukwu na-agbalị inweta ihe ndị ha chọrọ, ha anaghị eme ihe ndị ha maara dị mma. Ilu 28:20 kwuru na “onye ọ dị ngwa ngwa ịba ọgaranya agaghị abụ onye aka ya dị ọcha.” Ha nwedịrị ike ime ihe ọjọọ ndị dị ka igwu mmadụ wayo, ịpụnara mmadụ ihe, ịtọrọ mmadụ, ma ọ bụ igbu mmadụ.

Ọ bụrụgodị na ịhụ ego n’anya emeghị ka mmadụ kpawa àgwà ọjọọ, o nwere ike inwe nsogbu ndị ọzọ ọ ga-akpata. Baịbụl kwuru na “ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha, ndị na-emerụkwa ahụ́.”​—⁠1 Timoti 6:⁠9.

Olee otú ndụmọdụ Baịbụl nyere gbasara ego ga-esi baara anyị uru?

Ọ bụrụ na anyị ejighị n’ihi ego kwụsị ime ihe ndị anyị ma na ọ dị mma nakwa ihe ndị na-atọ chineke ụtọ, anyị ga-enwe ùgwù, Chineke ga-elekwa anyị anya ọma ma na-akwado anyị. Chineke kwere ndị na-agbalịsi ike ime ihe ndị dị ya mma nkwa, sị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:​5, 6) O kwekwara anyị nkwa na “onye na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi ga-enweta ọtụtụ ngọzi.”​—⁠Ilu 28:⁠20..

Amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara ego

Ekliziastis 7:12: “Ego bụ ihe nchebe.”

Ihe ọ pụtara: E jiri ego mee ihe bara uru, ọ na-egbo mkpa n’ihi na o nwere ike ichebe mmadụ.

Luk 12:15: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.”

Ihe ọ pụtara: Ego abụghị ihe kacha mkpa ná ndụ, ọ gaghịkwanụ azọpụta anyị.

1 Timoti 6:10: “Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile. Site n’ịchụso ụdị ịhụnanya a, e duhiewo ụfọdụ, ha wee dapụ n’okwukwe. Ha wee jiri ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.”

Ihe ọ pụtara: Ego n’onwe ya adịghị njọ. Ma ndị hụrụ ego n’anya, ndị weere na inwe ego bụ ihe kacha mkpa ná ndụ, na-akpatakarịrị onwe ha nsogbu. Nsogbu ndị dị ka ezinụlọ ha itisa nakwa ịkpatara onwe ha ọrịa n’ihi ịrụgbu onwe ha n’ọrụ.

Ndị Hibru 13:5: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a.”

Ihe ọ pụtara: Kama ịna-achụ ego ọnwụ ọnwụ, ọ dị mma ka ihe anyị nwere ju anyị afọ.

Matiu 19:24: “Ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga gafere karịa ọgaranya ịba n’alaeze Chineke.”

Ihe ọ pụtara: Jizọs gwara nwa okorobịa bara ọgaranya ka ọ bịa bụrụ onye na eso ụzọ ya. Nwoke ahụ ekweghị n’ihi na obi ya dị n’ọtụtụ ihe ndị o nwere. Ọ bụ ya mere Jizọs ji dọọ anyị aka ná ntị. Onye hụrụ akụnụba n’anya karịa Chineke agaghị enweta ndụ ebighị ebi.

a Na Baịbụl ụfọdụ, otú e si sụgharịa amaokwu a bụ: “Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya