Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 24 p. 127-131
  • Ya Adịla Mgbe Ị Ga-aghọ Onye Ohi!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ya Adịla Mgbe Ị Ga-aghọ Onye Ohi!
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ọ̀ Bụ Ohi n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Olee Akwụkwọ Bụ́ “Oziọma Judas”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • A Raara Kraịst Nye ma Jide Ya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 24 p. 127-131

ISI NKE 24

Ya Adịla Mgbe Ị Ga-aghọ Onye Ohi!

MMADỤ ò zutụwo ihe gị?— Olee otú obi dị gị?— Onye ọ bụla zuuru ya bụ onye ohi, ọ dịghịkwa onye na-enwe mmasị n’ebe onye ohi nọ. Olee otú i chere mmadụ si aghọ onye ohi? À na-amụ onye ahụ ịbụ onye ohi?—

Anyị ka mụsịrị na ndị mmadụ na-eketa mmehie mgbe a mụrụ ha. Ya mere, anyị nile bụ ndị na-ezughị okè. Ma ọ dịghị onye na-abụ onye ohi mgbe a mụrụ ya. Onye ohi pụrụ isite n’ezinụlọ na-akpa ezi àgwà. Ndị mụrụ ya na ụmụnne ya pụrụ ịbụ ndị na-akwụwa aka ọtọ. Ma agụụ mmadụ nwere inweta ihe ndị dị ka ego na ihe ndị a pụrụ iji ego zụta pụrụ ime ka ọ ghọọ onye ohi.

Ònye ka ị ga-asị na ọ bụ ya bụ onye mbụ ghọrọ onye ohi?— Ka anyị cheere ya echiche. Onye Ozizi Ukwu ahụ ma onye ahụ mgbe Ọ nọ n’eluigwe. Onye ohi ahụ bụbu mmụọ ozi. Ma ebe ọ bụ na Chineke mere ndị mmụọ ozi nile ka ha bụrụ ndị zuru okè, olee otú mmụọ ozi ahụ si ghọọ onye ohi?—Dị ka anyị mụtara n’Isi nke 8 nke akwụkwọ a, ọ chọrọ inweta ihe na-abụghị nke ya. Ì chetara ihe ahụ ọ chọrọ inweta?—

Mgbe Chineke kesịrị nwoke na nwanyị mbụ, mmụọ ozi ahụ chọrọ ka ha fee ya ofufe. O kwesịghị ka ha fee ya ofufe n’ihi na ọ bụghị ihe ruuru ya. Ọ bụ Chineke ka ha kwesịrị ife ofufe. Ma o zuuru ya n’ohi! Site n’ime ka Adam na Iv na-efe ya, mmụọ ozi ahụ ghọrọ onye ohi. Ọ ghọrọ Setan bụ́ Ekwensu.

Gịnị na-eme ka mmadụ ghọọ onye ohi?— Ọchịchọ inweta ihe na-abụghị nke ya. Ọchịchọ a pụrụ isi nnọọ ike nke na ọ pụrụ ime ka ọbụna ndị bụ́ ezi mmadụ mee ihe ọjọọ. Mgbe ụfọdụ, ndị na-aghọ ndị ohi adịghị echegharị malite mewekwa ezi ihe. Otu onye n’ime ndị dị otú ahụ bụ onyeozi Jizọs. Aha ya bụ Judas Iskarịọt.

Judas ma na izu ohi adịghị mma n’ihi na a kụziiri ya Iwu Chineke malite n’oge ọ bụ obere nwa. Ọ ma na Chineke ọbụna si n’eluigwe kwuo okwu n’otu oge gwa ndị ya, sị: “Ezula ohi.” (Ọpụpụ 20:15) Mgbe Judas tolitere, ya na Onye Ozizi Ukwu ahụ zutere, ọ ghọkwara otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya. Ka oge na-aga, Jizọs ọbụna họọrọ Judas ịbụ otu n’ime ndịozi 12 ya.

Jizọs na ndịozi ya na-eso eme njem. Ha na-erikọ nri ọnụ. Ha na-etinye ego nile ha nwere n’otu igbe. Jizọs buuru igbe ahụ bunye Judas ka o jide. Otú ọ dị, ọ bụghị Judas nwe ego ahụ. Ma, ị̀ ma ihe Judas mere mgbe nwa oge gasịrị?—

[Foto dị na peeji nke 129]

N’ihi gịnị ka Judas ji zuo ohi?

Judas malitere iwere ego n’ime igbe ahụ ọ bụ ezie na o kwesịghị ịdị na-ewere ego na ya. Ọ na-ewere ya mgbe ndị nke ọzọ na-adịghị ele ya anya, ọ gbalịkwara ọbụna ịchọ ụzọ ọ ga-esi na-ewere ego buru ibu karị. Ọ malitere ịdị na-eche echiche banyere ego mgbe nile. Ka anyị lee ihe ọchịchọ ọjọọ a dugara ya ime nanị ụbọchị ole na ole tupu e gbuo Onye Ozizi Ukwu ahụ.

Meri, bụ́ nwanne nwanyị Lazarọs, onye bụ́ enyi Jizọs, wụsara mmanụ mara nnọọ mma n’ụkwụ Jizọs. Ma Judas mere mkpesa. Ị̀ ma ihe mere o ji mee mkpesa?— Ọ sịrị na ọ bụ n’ihi na a gaara ere mmanụ ahụ were ego ya nye ndị ogbenye. Ma ọ chọrọ n’ezie inwetakwu ego n’ime igbe ahụ ka o wee nwee ike izuru ya.—Jọn 12:1-6.

Jizọs gwara Judas ka ọ ghara inye Meri nsogbu, bụ́ onye mewooro ya oké ihe ọma. Judas enweghị obi ụtọ mgbe Jizọs gwara ya nke ahụ, ya mere, ọ gakwuuru ndị isi nchụàjà, ndị bụ́ ndị iro Jizọs. Ha chọrọ ijide Jizọs, ma ha chọrọ ime ya n’abalị ka ndị mmadụ wee ghara ịhụ ha.

Judas gwara ndị nchụàjà ahụ, sị: ‘M ga-agwa unu otú unu ga-esi nweta Jizọs ma unu nye m ego. Ego ole ka unu ga-enye m?’

Ndị isi nchụàjà ahụ zara ya, sị: ‘Anyị ga-enye gị mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.’—Matiu 26:14-16.

Judas weere ego ahụ. Ọ dị nnọọ ka a ga-asị na ọ na-eresị ndị ahụ Onye Ozizi Ukwu ahụ! Ị̀ ga-ekweta na mmadụ ga-eme ihe ọjọọ dị otú a?— N’ụzọ dị mwute, ọ bụ ụdị ihe na-eme mgbe mmadụ ghọrọ onye ohi ma na-ezu ohi ego. Ọ na-ahụ ego n’anya karịa otú ọ hụrụ ndị ọzọ ma ọ bụ ọbụna Chineke n’anya.

Ma eleghị anya, ị ga-asị, ‘Agaghị m ahụ ihe ọ bụla n’anya karịa otú m hụrụ Jehova Chineke n’anya.’ Ọ dị mma na i nwere echiche dị otú ahụ. Mgbe Jizọs họọrọ Judas ịbụ onyeozi, ma eleghị anya Judas nwere echiche dị otú ahụ. Ndị ọzọ, bụ́ ndị ghọrọ ndị ohi pụkwara inwewo echiche dị otú ahụ. Ka anyị kwuo banyere ụfọdụ n’ime ha.

[Foto ndị dị na peeji nke 130]

Olee ihe ọjọọ Ekan na Devid nọ na-eche maka ya?

Otu onye n’ime ha bụ ohu Chineke aha ya bụ Ekan, onye dịrị ndụ ogologo oge tupu a mụọ Onye Ozizi Ukwu ahụ. Ekan hụrụ otu uwe nwụda mara mma, otu mkpirikpi ọlaedo, na ụfọdụ mkpụrụ ego ọlaọcha. Ha abụghị nke ya. Bible na-ekwu na ọ bụ Jehova nwe ha n’ihi na a napụtara ha site n’aka ndị iro nke ndị Chineke. Ma ọ gụsiri Ekan agụụ ike iwere ha nke na o zuuru ha.—Joshua 6:19; 7:11, 20-22.

Lee ihe atụ ọzọ. Ogologo oge gara aga, Jehova họọrọ Devid ịbụ eze ndị Izrel. Otu ụbọchị, Devid malitere ile nwanyị ahụ mara mma bụ́ Bat-sheba anya. Ọ nọgidere na-ele Bat-sheba anya ma na-eche echiche otú ọ ga-esi kpọrọ ya laa n’ụlọ ya ka ọ bụrụ nwunye ya. Otú ọ dị, ọ bụ nwunye Yuraịa. Gịnị ka Devid gaara emeworị?—

Devid gaara akwụsịworị iche echiche banyere ịkpọrọ Bat-sheba ka ọ bụrụ nwunye ya. Ma ọ kwụsịghị. Ya mere, Devid kpọọrọ ya laa n’ụlọ ya. Mgbe ahụkwa, o mere ndokwa ka e gbuo Yuraịa. Gịnị mere Devid ji mee ihe ọjọọ ndị a?— Ọ bụ n’ihi na ọ nọgidere na-enwe agụụ maka nwanyị onye ọzọ.—2 Samuel 11:2-27.

[Foto dị na peeji nke 130]

N’ụzọ dị aṅaa ka Absalọm si bụrụ onye ohi?

N’ihi na Devid chegharịrị, Jehova kwere ka ọ dị ndụ. Ma malite mgbe ahụ gaa n’ihu, Devid nwere ọtụtụ nsogbu. Nwa ya nwoke bụ́ Absalọm chọrọ iweghara ọkwá Devid dị ka eze. Ya mere, mgbe ndị mmadụ bịara ịhụ Devid, Absalọm ga-ekonye ha aka, sutụ ha ọnụ. Bible na-ekwu, sị: ‘Absalọm wee zuru obi ndị ikom Izrel n’ohi.’ O mere ka ndị ahụ chọọ ka ọ bụrụ ya ga-abụ eze kama ịbụ Devid.—2 Samuel 15:1-12.

Ọ̀ dịtụwo mgbe ị chọsiri nnọọ ike inweta ihe ụfọdụ dị ka Ekan, Devid, na Absalọm chọrọ?— Ọ bụrụ na ihe ahụ bụ nke onye ọzọ, iwere ya n’anataghị ikike bụ izu ohi. Ì chetara ihe onye ohi mbụ bụ́ Setan chọrọ?— Ọ chọrọ ka ndị mmadụ na-efe ya ofufe kama ife Chineke. Ya mere, Setan nọ na-ezu ohi mgbe o mere ka Adam na Iv rubere ya isi.

Mgbe mmadụ nwere ihe, o nwere ikike ikwu onye nwere ike iji ya mee ihe. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịga soro ụmụaka ndị ọzọ gwurie egwú n’ụlọ ha. Ọ̀ dị mma isi ebe ahụ were ihe laa n’ụlọ unu?— Ọ dịghị mma, ọ gwụla ma nne ha ma ọ bụ nna ha ọ gwara gị na i nwere ike iwere ya. Ọ bụrụ na i were ihe ọ bụla laa n’ụlọ unu n’agwaghị ha, ọ bụ ohi.

N’ihi gịnị ka i nwere ike iji chọọ izu ohi?— Ọ bụ n’ihi na ị chọrọ inweta ihe na-abụghị nke gị. Ọ bụrụgodị na ọ dịghị onye ọzọ hụrụ gị mgbe ị na-ewere ya, ònye hụrụ gị?— Ọ bụ Jehova Chineke. Ọ dịkwa mkpa ka anyị cheta na Chineke kpọrọ izu ohi asị. Ya mere, ịhụnanya maka Chineke na maka ndị agbata obi gị ga-enyere gị aka ka ọ ghara ịdị mgbe ị ga-aghọ onye ohi.

Bible mere ka o doo anya na izu ohi dị njọ. Biko gụọ Mak 10:17-19; Ndị Rom 13:9; nakwa Ndị Efesọs 4:28.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya