ISI NKE 8
Ndị Ọzọ Dị Elu Karịa Anyị
AMA m na ị ga-ekweta na ndị ọzọ dị elu, ma ọ bụ dị ukwuu, dịkwa ike karịa mụ na gị. Olee onye ị ga-asị dị elu karịa anyị?— Jehova Chineke dị elu karịa anyị. Olee banyere Ọkpara ya, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ? Ọ̀ dị elu karịa anyị?— Eenụ, ọ dị.
Jizọs na Chineke ebiela n’eluigwe. Ọ bụ Ọkpara bụ́ mmụọ, ma ọ bụ mmụọ ozi. Chineke ò kere ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ụmụ ndị ọzọ bụ́ mmụọ?— Ee, o kere ọtụtụ nde n’ime ha. Ndị mmụọ ozi ndị a dịkwa elu ma dị ike karịa anyị.—Abụ Ọma 104:4; Daniel 7:10.
Ì chetara aha mmụọ ozi ahụ gwara Meri okwu?— Ọ bụ Gebriel. Ọ gwara Meri na nwa ya ga-abụ Ọkpara Chineke. Chineke tinyere ndụ nke Ọkpara ya bụ́ mmụọ n’ime akpa nwa Meri ka e wee nwee ike ịmụ Jizọs dị ka nwa ọhụrụ n’ụwa.—Luk 1:26, 27.
Olee ihe Meri na Josef kọọrọ Jizọs ma eleghị anya?
Ì kwere na ọrụ ebube ahụ mere eme? Ì kwere na Jizọs na Chineke ebiela n’eluigwe?— Jizọs kwuru na ya na Chineke ebiela n’eluigwe. Olee otú Jizọs si mara ihe ndị ahụ? Ma eleghị anya, mgbe ọ bụ nwata, Meri kọọrọ ya ihe Gebriel kwuru. Ọzọkwa, ma eleghị anya Josef gwara Jizọs na ọ bụ Chineke bụ Nna ya n’ezie.
Mgbe e mere Jizọs baptizim, Chineke ọbụna si n’eluigwe kwuo okwu, sị: “Nke a bụ Ọkpara m.” (Matiu 3:17) N’abalị ikpeazụ ya tupu ya anwụọ, Jizọs kpere ekpere, sị: “Nna, jiri ebube m nwere n’akụkụ gị tupu ụwa amalite ịdị mee ka m dị ebube n’akụkụ gị.” (Jọn 17:5) Ee, Jizọs rịọrọ ka ya laghachi ma soro Chineke biri ọzọ n’eluigwe. Olee otú ọ ga-esi biri n’ebe ahụ?— Ọ bụ nanị ma Jehova Chineke mee ya ka ọ ghọghachi onye bụ́ mmụọ ma ọ bụ mmụọ ozi a na-adịghị ahụ anya.
Ugbu a, achọrọ m ịjụ gị otu ajụjụ dị mkpa. Ndị mmụọ ozi nile hà bụcha ndị ọma? Olee ihe i chere?— N’otu oge ha nile bụcha ndị ọma. Nke a bụ n’ihi na ọ bụ Jehova kere ha, ihe nile o kere dịchakwa mma. Ma, otu n’ime ndị mmụọ ozi ahụ ghọrọ onye ọjọọ. Olee otú o si mee?
Iji mata azịza ya, anyị aghaghị ịlaghachi azụ n’oge Chineke kere nwoke na nwanyị mbụ, bụ́ Adam na Iv. Ụfọdụ ndị na-ekwu na akụkọ banyere ha bụ akụkọ na-emeghị eme. Ma Onye Ozizi Ukwu ahụ ma na o mere eme.
Mgbe Chineke kere Adam na Iv, o tinyere ha n’ubi mara mma, n’ebe a na-akpọ Iden. Ọ bụ ogige, paradaịs. Ha gaara amụworị ọtụtụ ụmụ, nwee ezinụlọ buru ibu ma biri na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Ma e nwere otu ihe dị mkpa nke ha na-aghaghị ịmụta. Ọ bụ ihe ahụ anyị kwuworo banyere ya. Ka anyị lee ma anyị chetara ya.
Olee otú Adam na Iv gaara esiworị dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime Paradaịs?
Jehova gwara Adam na Iv na ha pụrụ iri mkpụrụ osisi nile ha chọrọ iri site n’osisi ndị dị n’ogige ahụ. Ma ọ dị otu osisi ha na-agaghị eri mkpụrụ sitere na ya. Chineke gwara ha ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ha erie ya. Ọ sịrị: ‘Unu aghaghị ịnwụ.’ (Jenesis 2:17) Gịnịzi bụ ihe ahụ ọ dị Adam na Iv mkpa ịmụta?—
Ọ bụ nrubeisi. Ee, ndụ dabeere n’irubere Jehova Chineke isi! Adam na Iv nanị ikwu na ha ga-erubere ya isi ezughị. Ha kwesịrị igosi na ha ga-erubere ya isi site n’ihe ndị ha na-eme. Ọ bụrụ na ha erubere Chineke isi, ha ga-egosi na ha hụrụ ya n’anya, chọọkwa ka ọ bụrụ Onye Ọchịchị ha. Mgbe ahụ, ha gaara adịworị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs. Ma ọ bụrụ na ha erie mkpụrụ sitere n’osisi ahụ, gịnị ka ọ ga-egosi?—
Ọ ga-egosi na ha enweghị ekele n’ezie maka ihe ndị Chineke nyere ha. A sị na ị nọ n’ebe ahụ, ị̀ gaara erubere Jehova isi?— Ná mmalite, Adam na Iv rubeere ya isi. Mgbe ahụzi, otu onye ka ha elu ghọgburu Iv. O mere ka o nupụrụ Jehova isi. Ònye bụ onye ahụ?—
Ònye nọ na-eme ka agwọ ahụ gwa Iv okwu?
Bible na-ekwu na otu agwọ gwara Iv okwu. Ma, ị ma na agwọ apụghị ikwu okwu n’onwe ya. Oleezi otú o si nwee ike ikwu okwu?— Otu mmụọ ozi mere ka o yie ka ọ bụ agwọ ahụ na-ekwu okwu. Ma, ọ bụ mmụọ ozi ahụ na-ekwu okwu n’ezie. Mmụọ ozi ahụ amaliteworị iche echiche ihe ọjọọ. Ọ chọrọ ka Adam na Iv na-efe ya ofufe. Ọ chọrọ ka ha na-eme ihe ndị o kwuru. Ọ chọrọ iweghara ọnọdụ Chineke.
Ya mere, mmụọ ozi ọjọọ ahụ tinyere echiche na-ezighị ezi n’uche Iv. Site n’ọnụ agwọ ahụ, ọ sịrị ya: ‘Chineke agwaghị unu eziokwu. Unu agaghị anwụ ma unu rie mkpụrụ osisi ahụ. Unu ga-abịa mara ihe dị ka Chineke.’ Ị̀ gaara ekwetaworị ihe olu ahụ na-ekwu?—
Iv malitere inwe agụụ maka ihe Chineke na-enyeghị ya. O riri mkpụrụ osisi sitere n’osisi ahụ a machibidoro iwu. Mgbe ahụ, o nyere Adam ụfọdụ. Adam ekwetaghị ihe agwọ ahụ kwuru. Ma ọchịchọ ya iso Iv nọrọ siri ike karịa ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ. Ya mere, ya onwe ya kwa riri mkpụrụ sitere n’osisi ahụ.—Jenesis 3:1-6; 1 Timoti 2:14.
Gịnị si na ya pụta?— Adam na Iv ghọrọ ndị na-ezughị okè, kaa nká, ma nwụọ. N’ihi na ha bụkwa ndị na-ezughị okè, ụmụ ha nile bụkwa ndị na-ezughị okè, ha mesịkwara kaa nká ma nwụọ. Chineke aghaghị ụgha! Ndụ dabeere n’ezie n’irubere ya isi. (Ndị Rom 5:12) Bible na-agwa anyị na a na-akpọ mmụọ ozi ahụ ghaara Iv ụgha Setan bụ́ Ekwensu, a na-akpọkwa ndị mmụọ ozi ndị ọzọ ghọrọ ndị ọjọọ, ndị mmụọ ọjọọ.—Jems 2:19; Mkpughe 12:9.
Gịnị mere Adam na Iv mgbe ha nupụsịịrị Chineke isi?
Ugbu a, ị̀ ghọtala ihe mere mmụọ ozi ahụ bụ́ onye Chineke kere ji ghọọ onye ọjọọ?— Ọ bụ n’ihi na ọ malitere iche echiche ihe ọjọọ. Ọ chọrọ ịghọ Onye Kachasịnụ. Ọ ma na Chineke gwara Adam na Iv ka ha mụọ ụmụ, na ọ chọkwara ka ha nile na-efe ya ofufe. Ekwensu chọrọ ime ka mmadụ nile nupụrụ Jehova isi. Ya mere, ọ na-agbalị itinye echiche ọjọọ n’uche anyị.—Jems 1:13-15.
Ekwensu na-ekwu na ọ dịghị onye hụrụ Jehova n’anya n’ezie. Ọ na-ekwu na mụ na gị ahụghị Chineke n’anya nakwa na anyị achọghị n’ezie ime ihe Chineke kwuru. Ọ na-ekwu na anyị na-erubere Jehova isi nanị mgbe ihe nile na-aga otú anyị chọrọ. Ihe Ekwensu kwuru ọ̀ bụ eziokwu? Ànyị dị otú ahụ?
Onye Ozizi Ukwu ahụ kwuru na Ekwensu bụ onye ụgha! Jizọs gosiri na ya hụrụ Jehova n’anya n’ezie site n’irubere Ya isi. Jizọs erubereghị Chineke isi nanị mgbe ọ dịịrị ya mfe. O rubeere ya isi mgbe nile, ọbụna mgbe ndị ọzọ mere ka o siere ya ike ime otú ahụ. O guzosiri ike n’ihe nye Jehova ruo n’ọnwụ ya. Ọ bụ ya mere Chineke ji kpọlite ya n’ọnwụ ka ọ dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Ya mere, ònye ka ị ga-asị na ọ bụ ya bụ onye iro kachasịnụ anyị nwere?— Ee, ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Ị̀ pụrụ ịhụ ya anya?— Ọ dịghị ma ọlị! Ma anyị ma na ọ dị adị nakwa na ọ dị elu, dịkwa ike karịa anyị. Ma, ònye dị elu karịa Ekwensu?— Ọ bụ Jehova Chineke. Ya mere, anyị ma na Chineke pụrụ ichebe anyị.
Gụọ banyere Onye ahụ anyị kwesịrị ife ofufe: Deuterọnọmi 30:19, 20; Joshua 24:14, 15; Ilu 27:11; nakwa Matiu 4:10.