Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 3 p. 14-p. 15 para. 3
  • Adam na Iv Nupụụrụ Chineke Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Adam na Iv Nupụụrụ Chineke Isi
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere E Ji Chụpụ Ha n’Ebe Obibi Ha
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ndị Ọzọ Dị Elu Karịa Anyị
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Olee Ụdị Ndụ Adam na Iv Biri na Paradaịs?
    Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi
  • Ndụ Ahụhụ Amalite
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 3 p. 14-p. 15 para. 3
Ebe Adam na Iv na-apụ n’ogige Iden

ISI NKE 3

Adam na Iv Nupụụrụ Chineke Isi

Ebe Adam ji mkpụrụ osisi Iv nyere ya, nke Chineke sịrị ha erila

Otu ụbọchị, mgbe Iv nọ naanị ya, otu agwọ gwara ya okwu. Ọ sịrị ya: ‘Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ osisi niile dị n’ubi a?’ Iv gwara ya, sị: ‘Anyị nwere ike iri mkpụrụ osisi si n’osisi niile ma e wezụga otu. Ọ bụrụ na anyị erie nke ahụ, anyị ga-anwụ.’ Agwọ ahụ gwara ya, sị: ‘Unu agaghị anwụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na unu rie ya, unu ga-adị ka Chineke.’ Ihe a agwọ ahụ gwara Iv, ọ̀ bụ eziokwu? Mba, ọ bụ ụgha. Ma, Iv kwetara ihe a ọ gwara ya. Ka Iv na-ele mkpụrụ osisi ahụ anya, ọ nọ na-adọkwu ya akpịrị. Iv riri mkpụrụ osisi ahụ, mechaa nye di ya ka o rie. Adam ma na ha ga-anwụ ma ọ bụrụ na ha enupụrụ Chineke isi. Ma, o riri mkpụrụ osisi ahụ.

Ka Adam na Iv si n’ogige Iden pụọ, Chineke ji ndị mmụọ ozi na mma agha na-enwu ọkụ, nke na-atụgharị atụgharị, na-eche ọnụ ụzọ ya nche

Jehova mechara gwa Adam na Iv okwu n’ụbọchị ahụ. Ọ jụrụ ha ihe mere ha ji nupụrụ ya isi. Iv sịrị na ọ bụ agwọ ahụ kpatara ya, Adam asịkwanụ na ọ bụ Iv. Jehova chụpụrụ Adam na Iv n’ogige Iden n’ihi na ha nupụụrụ ya isi. Jehova dowere ndị mmụọ ozi na mma agha na-enwu ọkụ, nke na-atụgharị atụgharị, n’ụzọ e si abanye n’ogige ahụ ka Adam na Iv ghara ịbanye na ya ọzọ.

Ma, ọ bụghị agwọ nkịtị gwara Iv okwu. Jehova ekeghị agwọ ka ha na-ekwu okwu. Ọ bụ mmụọ ozi ọjọọ mere ka agwọ ahụ kwuo okwu. A na-akpọ ya Setan bụ́ Ekwensu. O mere ihe a ka ọ ghọgbuo Iv. Jehova kwuru na ọ ga-ata onye ahụ ghaara Iv ụgha ahụhụ. N’ọdịnihu, Jehova ga-ebibi Setan ka ọ ghara ịna-eme ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ.

“Ekwensu . . . bụ ogbu mmadụ mgbe ọ malitere, o guzosighịkwa ike n’eziokwu n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya.”​—Jọn 8:44

Ajụjụ: Gịnị mere Iv ji rie mkpụrụ osisi ahụ? Gịnị mere Adam na Iv mgbe ha nupụchaara Jehova isi? Ònye bụ Setan bụ́ Ekwensu?

Jenesis 3:1-24; Jọn 8:44; 1 Jọn 3:8; Mkpughe 12:9

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya