Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 5
  • Ndụ Ahụhụ Amalite

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ Ahụhụ Amalite
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere E Ji Chụpụ Ha n’Ebe Obibi Ha
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Olee Ụdị Ndụ Adam na Iv Biri na Paradaịs?
    Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi
  • Adam na Iv Nupụụrụ Chineke Isi
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Chineke Kere Nwoke Mbụ na Nwaanyị Mbụ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 5
Iv na ụmụ ya mgbe ha na-anọghịzi n’ogige Iden

AKỤKỌ NKE 5

Ndụ Ahụhụ Amalite

MGBE ha si n’ogige Iden pụta, Adam na Iv nwere ọtụtụ nsogbu. Ha rụsiri ọrụ ike iji nweta ihe ha ga-eri. Kama ịhụ osisi mara mma ndị na-amị mkpụrụ, ha hụrụ ọtụtụ ogwu na uke ndị na-eto gburugburu ha. Nke a bụ ihe mere mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi wee kwụsị ịbụ ndị enyi Ya.

Ma nke ka njọ bụ na Adam na Iv malitere ịnwụ anwụ. Cheta na Chineke dọrọ ha aka ná ntị na ha ga-anwụ ma ha rie mkpụrụ nke otu osisi. Ha malitere ịnwụ kpọmkwem n’ụbọchị ahụ ha riri ya. Lee ka ha si bụrụ ndị iberibe ịjụ ige Chineke ntị!

Adam na Iv mụrụ ụmụ ha niile mgbe Chineke chụpụsịrị ha n’ogige Iden ahụ. Ihe ọ pụtara bụ na ụmụ ha ga-akakwa nká wee nwụọ.

A sị na Adam na Iv gere Jehova ntị, ha na ụmụ ha gaara enwe obi ụtọ ná ndụ. Ha niile gaara adị ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ n’elu ala. Ọ dịghị onye gaara aka nká, rịa ọrịa, ma nwụọ.

Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ dị ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ, ọ na-ekwekwa nkwa na otu ụbọchị, ha ga-adị ndụ ebighị ebi. Ọ bụghị naanị na ala niile ga-ama mma, kamakwa mmadụ niile ga-enwe ahụ́ ike. Onye ọ bụla nọ n’ụwa na mmadụ niile ọzọ ga-abụ ezigbo enyi, ha na Chineke ga-abụkwa enyi.

Ma Iv abụghịzi enyi Chineke. N’ihi ya, mgbe ọ mụrụ ụmụ ya, ọ dịghịrị ya mfe. O nwere ihe mgbu. Inupụrụ Jehova isi wetaara ya oké iru újú, í kweghị nke a?

Adam na Iv nwere ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị. Mgbe ha mụrụ nwa nwoke mbụ ha, ha kpọrọ ya Ken. Ha kpọrọ nwa nwoke ha nke abụọ Ebel. Gịnị mere ha? Ị̀ maara?

Jenesis 3:16-23; 4:1, 2; Mkpughe 21:3, 4.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya