Ụzọ A Ga-esi Merie Ihe Ịma Aka Omume nke Ịda Ogbenye Na-eweta
OTU onye dọkịta bụ onye Africa kwuru, sị, “Ụmụ mmadụ na-ada ogbenye n’ihi na ha bụ ndị umengwụ. Obodo ukwu jupụtara ná ndị ogbu oge. Ọ bụrụ na ha chọrọ ịrụ ọrụ n’ezie, ha pụrụ ịchọta ya. Ọ dịghị mkpa na onye ọ bụla ga-anọ n’ịda ogbenye n’oge a.”
A naghị ajụkwa ajụ ma ụfọdụ ndị hà bụkwa ndị umengwụ, na ịdị umengwu pụkwara iduje n’ịda ogbenye. Bible na-asị: “Nwa ụra nta, nwa iro ụra nta, nwa ịkpakọba aka nta idina ala: ogbenye gị ewee bịa dị ka onye na-ejegharị ịpụnara mmadụ ihe; ihe ụkọ gị kwa, dị ka nwoke ji ọta.” (Ilu 24:33, 34) Otú ọ dị, ọtụtụ ndị dara ogbenye abụghị ndị umengwụ ma ọlị. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere otu nwoke onye dere, sị: “Wee ruo oge hour dị ugbu a agụụ na-agụ anyị, akpịrị na-akpọkwa anyị nkụ, anyị na-agbakwa ọtọ, a na-etikwa anyị aka, anyị enweghịkwa ebe obibi.” (1 Ndị Kọrint 4:11) Nke a ọ̀ bụ ogbu oge a na-apụghị ịgwọta agwọta? Ọ dịghị ma ọlị. Ọ bụ Pọl onyeozi dere okwu ndị ahụ. Ọ họọrọ ịdị ndụ nke ọnọdụ akụ na ụba a kpaara ókè ka o nwee ike ịgbaso ije ozi ya dị ka onye Kraịst n’ụzọ ka mma. Ọ bụkwa ọnọdụ ndị ọ na-apụghị ime ihe ọ bụla banyere ha, dị ka mkpagbu nke ndị okpukpe, kpatara akụkụ ụfọdụ nke ụkọ ihe ọ nọ na ya.
Taa, ihe ka ọtụtụ ná ndị ogbenye nọ n’ụwa bụ ndị ihe ndị ha na-apụghị ime ihe ọ bụla banyere ha tinyere n’ọnọdụ ahụ—ma eleghị anya agụghị akwụkwọ, ọnọdụ akụ na ụba ndị na-ada ada, ma ọ bụ ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọtụtụ ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ site n’isi ụtụtụ ruo etiti abalị ma na-enweta nanị ihe ha ga-eri. Otú a, ohere ndị a ga-eji nweta uru ego site n’emeghị ihe n’eziokwu pụrụ iyi ihe na-adọrọ mmasị ha, ọbụna ihe dị mkpa ime. Ee, ụfọdụ n’ime ha pụrụ iche na Bible na-akwado ịdaba n’omume ọjọọ mgbe ụfọdụ! E kwuwerị, ọ̀ bụ na ọ sịghị: “Mmadụ adịghị eleda onye ohi anya, mgbe ọ na-ezu ohi imeju mkpụrụ obi ya mgbe agụụ na-agụ ya.” Otu nwoke onye amamihe kpekwara ekpere, sị: ‘Ekwela ka m daa ogbenye wee zuo ohi.’—Ilu 6:30; 30:8, 9.
Ime Ihe n’Eziokwu—Echiche nke Bible
Akụkụ Bible ndị a hà na-enye emeghị ihe n’eziokwu nkwado n’ezie n’ekwupụtaghị otú ahụ hoo haa? Ọ dị mma, ka anyị tụlee ha dị ka amaokwu ndị gbara ha gburugburu si dị. Mgbe o kwusịrị na ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya, bụ́ onye zuru ohi iji mejuo afọ ya nke tọgbọrọ chakoo, Ilu 6:31 gara n’ihu ịsị: “Ma a sị na a chọta ya, ọ ga-akwụghachi okpukpu asaa; akụ nile nke ụlọ ya ka ọ ga-enye.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mgbe e jidere onye ohi ahụ, ọ na-eche ahụhụ zuru ezu nke iwu ihu. Ọ na-akwụ ụgwọ maka mpụ ahụ o mere! Ya mere, kama ịbụ ihe na-agba izu ohi ume, okwu ndị a na-adọ ndị ogbenye aka ná ntị na izu ohi pụrụ iduje ha ná mfù akụ na ụba ka ukwuu, mmechu ihu nye onwe ha na ezinụlọ ha, na ntụfu nke ùgwù onwe onye.
Ma gịnị banyere ekpere nwoke onye amamihe ahụ? Ọ rịọrọ ka ya ghara ịbanye n’ịda ogbenye, “[o] wee zuo ohi, wee were aha Chineke [ya] mee ihe ọjọọ” (Ilu 30:9) Ee, onye nke na-ekwu na ya na-ejere Jehova ozi ịghara ime ihe n’eziokwu pụrụ iwetara aha Chineke nkọcha, wetakwara ọgbakọ nke ndị Ya. Pọl onyeozi dere, sị: “Gị onye na-ekwusa ka mmadụ ghara izu ohi, ị̀ na-ezu ohi?” Ọ bụrụ na ụfọdụ ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst ezuo ohi, nke a pụrụ ime ka ‘e kwuluo aha Chineke n’etiti ndị mba ọzọ.’—Ndị Rom 2:21, 24.
Ya mere, e nwere ezi ihe mere Bible ji kwuo, sị: “Ọ dị mma, bụ ogbenye nke na-eje ije n’izu okè ya, karịa onye gbagọrọ agbagọ n’ụzọ ya abụọ, ọ bụ ezie na onye ahụ bụ ọgaranya.” (Ilu 28:6) Ọ bụ ezie na ihe kọrọ ya onwe ya mgbe ụfọdụ, ọ dịghị mgbe ọ bụla Pọl onyeozi kwadoro ma ọ bụkwanụ tinye aka n’emeghị ihe n’eziokwu. Kama nke ahụ, o dere, sị: “Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ: kama ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ, na-eji aka abụọ rụọ ezi ihe, ka o wee nwee ihe ya na onye nọ ná mkpa ga-eketa.”—Ndị Efesọs 4:28.
Ihe Ngwọta Ya: Ịtụkwasị Chineke Obi
Gịnịkwanụ banyere ndị ahụ na-arụsi ọrụ ike ma ha apụghị ịchọta ihe ga-ezuru ha iji lekọta ezinụlọ nke aka ha? Emeghị ihe n’eziokwu ma ọ bụ ọbụna izu ohi ò kwesịrị ekwesị n’ọnọdụ nke ha, karịsịa ma ọ bụrụ na ọrịa adakwasị onye nọ n’ezinụlọ ahụ ma ọ bụ ọnọdụ mberede ndị ọzọ ebilite? Ụfọdụ ndị na-eche otú ahụ. Otu onye bi n’otu ala dị n’Africa kwuru, sị: “N’ime mba nke anyị, ọ bụrụ na ị bụ onye na-eme ihe n’eziokwu, ị gaghị adị ndụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịnọgide na-adị ndụ, ị ghaghị inwe ebe ụfọdụ gbagọrọ agbagọ n’ụzọ ndụ gị.”
Ma n’agbanyeghị nke ahụ, n’Africa dum, mmadụ na-ahụkarị okwu ndị ahụ bụ “Tụkwasị Chineke Obi” ka e dekwasịrị ha n’ahụ moto dị iche iche, dekwasị ha n’ibé osisi ndị e kobere n’ahụ ụlọ, biekwa ha n’ihe dị iche iche a na-amapawa n’ihe ma ọ bụ n’ahụ moto. Bible n’onwe ya na-asị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile.” (Ilu 3:5) Ọ dịghị ụzọ ọ bụla emeghị ihe n’eziokwu pụrụ isi kwekọọ n’agbamume Bible ahụ. Ma ịtụkwasị Chineke obi ọ̀ bụ n’ezie azịza kwere omume nye ihe ịma aka omume nke ịda ogbenye na-akpata?
Dị ka onye na-ejere Chineke ozi Pọl onyeozi zutere ihe isi ike ndị dị ka ‘agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, ịnọ n’erighị nri, oyi ọtụtụ, na ịgba ọtọ.’ (2 Ndị Kọrint 11:27) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na Pọl aghaghị icheworịị echiche banyere otú ya ga-esi nọgide na-adị ndụ! Ma mgbe ihe dị ka 25 afọ nke inwe ahụmahụ dị ka onye Kraịst gasịrị, ọ pụrụ ide, sị: “Amatara m ụzọ iweda onwe m, amatakwara m ụzọ ịbabiga ókè: n’ihe ọ bụla na n’ihe nile e ziwo m ihe omimi a, bụ́ ịnọ n’afọ ojuju na ịnọkwa n’agụụ, ịbabiga ókè na ịnọkwa ná mkpa. Enwere m ike n’ihe nile n’ime onye ahụ nke na-eme m ka m dị ike.” (Ndị Filipaị 4:12, 13) Ee, Pọl tụkwasịrị Chineke obi.
Pọl ghọtara na ụkpụrụ Akwụkwọ nsọ dị iche iche abụghị ihe ndị tọgbọrọ n’efu, okwu ọma efu dị iche iche. Ha bụ ntụziaka ndị sitere n’aka Chineke nke dị ndụ, onye nwere ọchịchọ inyere ndị ahụ chọrọ itinye ha n’ọrụ aka, na-akwadokwa ha. Otu onye amụma oge ochie kwuru, sị: “N’ihi na Jehova, anya ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe ọ nọ.”—2 Ihe Emere 16:9.
Ndị A Gọziri n’Ihi Ịtụkwasị Chineke Obi
N’ihi gịnị ka ọ na-eji esiri ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ike ịtụkwasị Chineke obi? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ n’ihi na okpukpe ha enwebeghị ike inye ha ezi ihe mere ha ga-eji mee otú ahụ. Chọọchị dị iche iche emewo ka Chineke yie nke na-enweghị aha, ihe na-adịghị adị n’ezie, nke na-abụghị onye, nke karịkwara nghọta mmadụ. Ma site n’ọmụmụ Bible, Ndịàmà Jehova amatawo Chineke, ọ bụghị dị ka ike nke na-adịghị adị n’ezie, kama dị ka Onye nke nwere aha. (Abụ Ọma 83:18; Ndị Hibru 9:24) Ha amụtawo na o nwere àgwà ndị na-eme ka ọ bụrụ onye kwesịrị ekwesị anyị ịtụkwasị ya obi. Dị ka ihe atụ, dị ka Ọpụpụ 34:6 si kwuo, Jehova bụ “Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” Ndịàmà ahụ na-atụkwasị Chineke obi, ha na-aghọtakwa na ọ ‘bara ụba n’eziokwu.’ N’ihi ya, ha nwere obi ike zuru ezu ná nkwa ya nke iwebata ụwa ọhụrụ nke ọnọdụ ogbenye ọnụ ntụ́ nke na-emekpa akụkụ dị ukwuu nke agbụrụ mmadụ ahụ ugbu a na-agaghị adị na ya.—2 Pita 3:13.
N’ihi nke a, ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova anwa-pụtawo na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịtụkwasị Chineke obi. Dị ka ihe atụ, Rosaline, bú Onye-àmà nke bi na Sierra Leone, na-arụsi ọrụ ike site n’elekere ise nke ụtụtụ ruo mgbe chi jimiworo iji wee chọtara onwe ya na ụmụ ya isii ihe oriri na uwe ha ga-eyi. Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụ ihe na-agaghị ekwe omume ibi ndụ nke ime ihe n’eziokwu, ma amaara m na nke a abụghị eziokwu. Mgbe ụfọdụ ana m enwe ihe isi ike ndị m na-amaghị otú a ga-esi dozie ha. Ma amaara m na ọ bụrụ na m nọgide na-ebi ndụ nke ime ihe n’eziokwu, ihe nile ga-agachara m nke ọma. Ya mere, ana m agbalịsi ike ịghara ime ihe na-agaghị adị Jehova mma.”
Otu onye edemede dere, sị: “Onye bụ ogbenye nke na-enweghị ihe ọ bụla dị ya n’afọ nwere mkpa nke olileanya . . . karịa nke ihe oriri.” Ee, enweghị olileanya, obi nkoropụ, na enweghị obi ụtọ nke na-adịgide adịgide bụ mmekpa ahụ ndị pụrụ iweta ihe mgbu karịa agụụ. Ma onye nke mataworo Chineke, na-atụkwasịkwa ya obi, ekwesịghị ịdaba n’obi nkoropụ. Rosaline kwukwara, sị: “Ana m arụsi ọrụ ike ugbu a, ma enwere m ọnụ n’ihi na amaara m na oge na-abịa mgbe m na-agaghị adị na-adọgbu onwe m n’ọrụ n’ụzọ dị otú a. Ugbu a, ana m arụ ọrụ iji chọta ihe mụ na ezinụlọ m ga-eri, ma n’ime ụwa ọhụrụ nke Jehova, a ga-enwe ihe oriri bara ụba a ga-eri. Ya mere, ugbu a, enwere m olileanya na ọṅụ nke m na-enweghị mgbe ọ bụla na mbụ tupu m mara Jehova.”—Tụlee Aịsaịa 25:6; Mkpughe 21:3, 4.
N’eziokwu, ndị ahụ. na-atụkwasị Chineke obi ka pụkwara inwe ihe isi ike akụ na ụba, dị ka Pọl onyeozi nwere. Ma ọ dịghị mkpa mgbe ọ bụla ka ha chigharịkwuru imebi iwu Chineke ka ha wee nọgide na-adị ndụ n’ụzọ akụ na ụba. Onye ọbụ abụ bụ Devid kwuru, sị: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Abụ Ọma 37:25) Ee, Chineke na-elekọta, na-agọzikwa ndị ahụ na-edebe ọdịmma ya nile n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha.—Matiu 6:25-33.
Ya mere, ọ bụrụ na ị bụ ogbenye, “ike agwụla [gị] n’obi n’ime ihe ọma.” (2 Ndị Tesalọnaịka 3:13) Adabala n’imebi omume ọma gị mgbe ọ bụla. Wulite mmekọrịta nke gị na Chineke, na-adaberekwa n’ebe ọ nọ inyere gị aka ịnagide nsogbu na ihe isi ike nile nke ndụ. A na-agba ndị ahụ na-ejere Jehova ozi, na-atụkwasịkwa ya obi n’ụzọ zuru ezu ume, sị: “Wedanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka o wee welie unu n’oge nke ya; na-atụkwasịnụ ya nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:6, 7.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
“Onye bụ ogbenye nke na-enweghị ihe ọ bụla dị ya n’afọ nwere mkpa nke olileanya . . . karịa nke ihe oriri.”
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndịàmà Jehova na-enyere ndị mmadụ aka ịtụkwasị Chineke obi