Ịda Ogbenye Ma Baa Ọgaranya Olee Otú Ọ Pụrụ Isi Mee?
ỌTỤTỤ narị afọ gara aga, otu onye amamihe kpere ekpere ka ọ ghara ịda ogbenye. N’ihi gịnị ka o ji rịọ ụdị arịrịọ ahụ? N’ihi na ọ tụrụ ụjọ na ịda ogbenye pụrụ ịkpali àgwà na omume ndị ga-eyi mmekọrịta ya na Chineke egwu. Nke a pụtara ìhè site n’okwu ya: “Mee ka m rie nri ruuru m . . . ka e wee ghara ịnapụ m ihe nile, m wee zuo ohi, wee were aha Chineke m mee ihe ọjọọ.”—ILU 30:8, 9.
NKE A ọ̀ pụtara na ọ gaghị ekwe omume ogbenye iji ikwesị ntụkwasị obi jeere Chineke ozi? Ọ dịghị ma ọlị! N’akụkọ ihe mere eme nile, ọtụtụ ndị ohu Jehova Chineke ejigidewo ikwesị ntụkwasị obi ha n’ebe ọ nọ n’agbanyeghị ihe isi ike ịda ogbenye na-eweta. N’aka nke ya, Jehova na-ahụ ndị tụkwasịrị ya obi n’anya, na-enyekwa ha ihe na-akpa ha.
Ndị Oge Ochie Kwesịrị Ntụkwasị Obi
Pọl onyeozi n’onwe ya nọrọ n’oge mkpa. (2 Ndị Kọrint 6:3, 4) Ọ kọwakwara ‘oké ìgwè’ nke ndị àmà kwesịrị ntụkwasị obi nke ndị Kraịst oge mbụ, nke ụfọdụ n’ime ha “[yiiri] akpụkpọ atụrụ na akpụkpọ ewu na-ejegharị; ebe ha nọ ná mkpa . . . na-awagharị n’ọhịa na ugwu na ọgba na ọnụ nke ala.”—Ndị Hibru 11:37, 38; 12:1.
Elaịja onye amụma bụ otu n’ime ndị a kwesịrị ntụkwasị obi. N’ime afọ atọ na ọkara nke ụkọ mmiri ozuzo, Jehova nọgidere na-enye ya ihe oriri. Nke mbụ, Chineke mere ka ugoloọma butere onye amụma ahụ achịcha na anụ. (1 Ndị Eze 17:2-6) E mesịa, Jehova ji ụzọ ọrụ ebube mee ka ntụ ọkà na mmanụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ ji enye Elaịja ihe oriri ghara ịgwụ. (1 Ndị Eze 17:8-16) E jighị ọtụtụ ihe sie nri ahụ, ma o debere onye amụma ahụ, nwanyị ahụ na nwa ya nwoke ndụ.
N’otu aka ahụ, Jehova kwagidere onye amụma ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Jeremaịa n’oge ihe isi ike akụ̀ na ụba. Jeremaịa lanarịrị mwakpo Babilọn wakporo Jerusalem, mgbe ndị mmadụ na-aghaghị ‘iri achịcha n’ọ̀tụ̀tụ̀ na n’ime nchegbu.’ (Ezikiel 4:16) N’ikpeazụ, ụnwụ nri nke dị n’obodo ukwu ahụ siri ike nke ukwuu nke na ụfọdụ ndị inyom riri anụ ahụ nke ụmụ ha. (Abụ Ákwá 2:20) Ọ bụ ezie na Jeremaịa nọ na mkpọrọ n’ihi nkwusa ọ na-eme n’atụghị egwu, Jehova hụrụ na e nyere ya “otu ogbe achịcha” kwa ụbọchị “ruo mgbe achịcha nile nke dị n’obodo gwụsịrị.”—Jeremaịa 37:21.
Ya mere, dị ka Elaịja, Jeremaịa nwere ntakịrị ihe ọ ga-eri. Akwụkwọ Nsọ agwaghị anyị ihe ma ọ bụ ugboro ole Jeremaịa riri nri mgbe achịcha dị na Jerusalem gwụsịrị. Ma, anyị maara na Jehova kwagidere ya nakwa na ọ dịgidere ndụ gabiga oge ụnwụ ahụ dị oké njọ.
Taa, ịda ogbenye dị n’akụkụ nile nke ụwa. Dị ka Òtù Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, ebe e nwekarịsịrị ịda ogbenye bụ n’Africa. Okwu òtù UN wepụtaara ụlọ ọrụ mgbasa ozi na 1996, kwuru, sị: “Ọ dịkarịa ala, ọkara nke ndị Africa nile dara ogbenye.” N’agbanyeghị mmụba nke ọnọdụ akụ̀ na ụba dị oké njọ, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị Africa na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ, jirikwa ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi, na-enwe obi ike na ọ ga-akwagide ha. Tụlee ụfọdụ ihe atụ site n’otu akụkụ nke ụwa anyị nọ ná nsogbu.
Ịnọgide Na-eme Ihe n’Eziokwu
Michael,a onye bi na Nigeria, bụ́ onye ọrụ ugbo nwere ụmụ isii ọ ga-elekọta. “O siri ike ime ihe n’eziokwu mgbe ị na-enweghị ego iji lekọta ezinụlọ gị,” ka ọ na-ekwu. “Otú ọ dị, mgbe a nwara m ọnwụnwa ịghara ime ihe n’eziokwu, m na-echetara onwe m Ndị Efesọs 4:28, nke na-asị: ‘Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ, kama ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ, na-eji aka ya abụọ rụọ ezi ihe.’ Ya mere ọ bụrụ na a nwaa m ọnwụnwa, m na-ajụ onwe m, sị: ‘M̀ rụwo ọrụ maka ego a?’”
“Dị ka ihe atụ,” ka Michael na-agbakwụnye, “ka m na-aga n’ụzọ otu ụbọchị, ahụrụ m ka otu akpa si n’azụ ọgba tum tum dapụ. Enweghị m ike ịkwụsị onye ọgba tum tum ahụ, ya mere atụtụlitere m akpa ahụ wee hụ na ego jupụtara n’ime ya. N’iji ihe e ji amata mmadụ nke dị n’ime akpa ahụ eme ihe, achọtara m onye nwe ya ma weghachiri ya akpa ahụ.”
Ịlụso Ịda Mbà n’Obi Ọgụ
Otu nwoke bi n’Ebe Ugwu Africa kwuru, sị: “Ịda ogbenye [yiri] mmadụ ịtọkịrị n’ime olulu miri emi, na-enwe ike ịhụ ìhè na ndị na-agafere onwe ha, ma ghara inwe ike iti mkpu maka enyemaka ma ọ bụ rịọ maka ubube iji si n’olulu ahụ rịpụta.” Ka a sịkwa ihe mere na ịda ogbenye na-ewetakarị mmetụta nke ịda mbà n’obi na nkụda mmụọ! Ọbụna ndị ohu Jehova pụrụ ịhụ akụ̀ na ụba nke ndị ọzọ ma malite iche na ibi ndụ n’ikwesị ntụkwasị obi bụ ihe na-abaghị uru. (Tụlee Abụ Ọma 73:2-13.) Olee otú a pụrụ isi merie mmetụta dị otú ahụ?
Peter, bụ́ onye Ọdịda Anyanwụ Africa, lara ezumike nká mgbe ọ nọsịrị n’ọrụ gọọmenti ruo afọ 19. Ugbu a ọ dabeere n’ụzọ bụ isi ná ntakịrị ego a na-akwụ ndị lara ezumike nká. “Mgbe m nwere oge ndị na-akụda aka,” ka Peter na-ekwu, “m na-echetara onwe m ihe m gụrụ n’ime Bible na ná mbipụta ndị nke Watch Tower Society. Usoro ihe ochie a agawala ịgabiga, anyị na-echerekwa usoro ihe ka mma.
“Ọzọkwa, m na-eche banyere 1 Pita 5:9, nke na-asị: ‘Na-eguzogidenụ [Setan], n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu, ebe unu matara na a na-emezu otu ahụhụ ahụ n’ahụ ndị bụ òtù ụmụnna unu ndị nọ n’ụwa.’ Ya mere ọ bụghị nanị m na-enwe ihe isi ike. Ihe ncheta ndị a na-enyere m aka iwepụ echiche ndị na-akụda aka na ndị na-eweta ịda mbà n’obi.”
“E wezụga nke ahụ,” ka Peter na-agbakwụnye, “Jisọs rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ bụ ezie na o meghị ka onye ọ bụla baa ọgaranya n’ụzọ ihe onwunwe. N’ihi gịnị ka m ga-eji atụ anya ka o mee m ọgaranya?”
Ike nke Ekpere
Ịbịaru Jehova Chineke nso n’ekpere bụ ụzọ ọzọ isi lụsoo echiche na-ezighị ezi ọgụ. Mgbe Mary ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova na 1960, ezinụlọ ya gbahapụrụ ya. N’alụbeghị di ma nọrọkwa n’afọ ndụ nke 50 na ụma ugbu a, ahụ esighị ya ike, o nwekwara nnọọ ntakịrị ihe n’ụzọ ihe onwunwe. Ka o sina dị, ọ na-anụ ọkụ n’obi n’ozi ndị Kraịst.
Mary na-asị: “Mgbe m nwere nkụda obi, m na-agakwuru Jehova n’ekpere. M maara na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ inyere m aka karịa ka ọ pụrụ inyere m. Amụtawo m na mgbe ị tụkwasịrị Jehova obi, ọ na-enyere gị aka. M na-echeta mgbe nile okwu ndị a nke Eze Devid,ndị a na-achọta n’Abụ Ọma 37:25: ‘Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye, ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.’
“Ana m enwetakwa agbamume site n’ahụmahụ dị iche iche nke ụmụnna ime mmụọ ndị nwoke na ndị nwanyị ndị meworo okenye karịa m bụ́ ndị a kọrọ n’Ụlọ Nche. Jehova Chineke nyeere ha aka, ya mere, m maara na ọ ga-anọgide na-enyekwara m aka. Ọ na-agọzi ntakịrị ọrụ m bụ́ ire ụtara akpụ, m na-agbalịkwa inweta ihe ndị na-akpa m kwa ụbọchị. Oge ụfọdụ mgbe m na-enweghị ego, m wee na-eche ihe m ga-eme, Jehova ga-ezite onye ga-enye m onyinye ma sị: ‘Nwanna nwanyị, biko were ihe a.’ Jehova emechubeghị m ihu ma ọlị.”
Uru Ịmụ Bible Bara
Ndịàmà Jehova na-eji ịmụ Okwu Chineke, bụ́ Bible akpọrọ ihe, agụpụghịkwa ndị ogbenye nọ n’etiti ha. John dị iri afọ isii na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile (onye nkwusa alaeze oge nile) na ohu na-eje ozi n’ọgbakọ. O bi n’ụlọ elu dị okpukpu abụọ nke yiri ka ọ na-ada ada, bụ́ nke ezinụlọ 13 na-ekerịta. Ọnụ ụlọ ya bụ otu akụkụ nke paseji dị n’okpukpu nke mbụ, nke e ji ibe osisi kụchata. N’ime ya e nwere oche abụọ meworo ochie na otu table nke ihe ndị e ji amụ Bible tụkọrọ n’elu ya. Ọ na-ehi ụra n’ute ahịhịa.
John na-akpatabu ihe dị ka otu dollar n’otu ụbọchị site n’ire bred, ma mgbe a machibidoro mbubata nke ọka wheat, o nwekwaghị ụzọ a o si akpata ihe o ji ebi ndụ. Ọ na-asị: “N’oge ụfọdụ, ihe na-esibigara m ike ókè, ma m nọgidere na-asụ ụzọ. Ọ bụ Jehova na-akwagide m. M na-arụ ọrụ ọ bụla m pụrụ ịchọta, adịghịkwa m adabere n’ebe onye ọ bụla nọ maka ịkwado ma ọ bụ inye m nri, ọ bụ ezie na ụmụnna m n’ọgbakọ na-enyere m aka nke ukwuu. Ha na-enyere m aka ịchọta ọrụ, mgbe ụfọdụkwa nye m onyinye ego.
“M na-ewepụta oge iji gụọ Bible na mbipụta ndị nke Watch Tower Society. M na-amụ ihe n’isi ụtụtụ mgbe ụlọ dị jụụ ma na-agụ akwụkwọ ma e mesịa n’abalị mgbe ọ bụla anyị nwere ọkụ eletrik. M maara na aghaghị m ịnọgide na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye m.”
Ịzụlite Ụmụaka Maka Ndụ
Daniel bụ onye nwunye ya nwụrụ nke nwere ụmụ isii. Na 1985, a chụrụ ya n’ọrụ ọ rụworo afọ 25, ma ọ chọtara ọrụ dị ka onye na-elekọta ụlọ ahịa. “Ndụ na-esiri ezinụlọ m ike n’ụzọ ego,” ka ọ na-ekwu. “Ugbu a anyị pụrụ iri nri nanị otu ugboro n’ụbọchị. Otu mgbe, anyị erighị nri ruo ụbọchị atọ. Nanị ihe anyị nwere ike ime bụ ịṅụ mmiri iji nọgide ndụ.”
Daniel na-eje ozi dị ka okenye n’ọgbakọ. “Ọ dịbeghị mgbe m hapụrụ ịga nzukọ ndị Kraịst, m na-arụkwa ọrụ ọchịchị Chineke mgbe nile,” ka ọ na-ekwu. “Mgbe ọ bụla e nwere ọrụ a ga-arụ gburugburu Ụlọ Nzukọ Alaeze, m na-ejide n’aka na m nọ ya. Mgbe ọnọdụ siri ike, m na-echetara onwe m okwu Pita gwara Jisọs, nke e dekọrọ na Jọn 6:68: ‘Onyenwe anyị, Ònye ka anyị ga-ejekwuru?’ Ọ bụrụ na mụ akwụsị ijere Jehova ozi, olee ebe m ga-aga? Okwu Pọl ndị dị ná Ndị Rom 8:35-39 na-emesikwa m obi ike n’ihi na ha na-egosi na ọ dịghị ihe ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya nke Chineke na Kraịst. Nke a bụ àgwà m na-akụnye n’ime ụmụ m. M na-agwa ha mgbe mgbe na anyị agaghị ahapụ Jehova ma ọlị.” Ịnụ ọkụ n’obi Daniel, gụnyere inwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya enwewo mmetụta dị mma n’ahụ ụmụ ya.
Mmụọ nke Inye Ihe
Mmadụ pụrụ iche na ndị ogbenye ọnụ ntụ anọghị n’ọnọdụ ịtụnye ụtụ n’ụzọ ego iji kwalite ọdịmma Alaeze. Ma ọ dịghị otú ahụ. (Tụlee Luk 21:1-4.) Ụfọdụ Ndịàmà nọ na Ghana ndị ọrụ ha bụ́ isi bụ ịkọ ugbo maka inweta ihe ha ga-eri na-amawapụta akụkụ ala ha maka iji kwalite ọdịmma nke Alaeze Chineke. Mgbe e rere ihe akụkụ ahụ nke ala ha mawapụtara mepụtara, a na-eji ego ahụ eme ihe kpọmkwem maka ọdịmma Alaeze, nke gụnyere ịtụnye ụtụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ.
Joan, onye bi n’Ebe Etiti Africa, bụ ọsụ ụzọ. Iji lekọta di ya akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ na mmadụ anọ ọzọ dabeere n’ebe ọ nọ, ọ na-ere bred. Mgbe ọgbakọ ọ nọ chọrọ bench maka Ụlọ Nzukọ Alaeze, ezinụlọ Joan kpebiri inye ego nile ha nwere n’ụlọ. Nke a mere ka ha gbara aka. Otú ọ dị, n’echi ya mmadụ kwụrụ ha ụgwọ teworo aka, na-enye ha ego ha na-enwekwaghị olileanya inweta!
Joan na-enwe ihu ọchị, ọ dịghịkwa enye onwe ya nsogbu n’ụzọ na-enweghị isi banyere ego. “M na-akọwara Jehova ọnọdụ m n’ekpere, mgbe ahụkwa m gaa ozi ubi. Anyị maara na e nwere ntakịrị olileanya maka oge ndị ka mma n’usoro ihe a. Ma, anyị maara na Jehova ga-enye anyị ihe na-akpa anyị.”
Ịdị Uchu
A na-eji ịhụnanya ha hụrụ ibe ha amata Ndịàmà Jehova. (Jọn 13:35) Ndị nwere ego na-enyere ndị Kraịst ibe ha nọ ná mkpa aka. Nke a na-abịakarị dị ka onyinye, mgbe ụfọdụkwa dị ka enyemaka n’ịchọta ọrụ.
Mark, onye bi na Congo, na-arịa ekpenta. Ọ tabisịwo mkpịsị ụkwụ na mkpịsị aka ya. Ya mere, ọ na-eji mkpọ aga ije. Mgbe Mark kpebiri ijere Jehova ozi, ọ malitere ime mgbanwe ná ndụ ya. Kama ịrịọ arịrịọ maka nri dị ka ọ na-emebu, ọ malitere ịkọ nri nke aka ya. Ọ kpụkwara brik ụrọ, bụ́ ndị ọ na-ere.
N’agbanyeghị nkwarụ ya, Mark nọgidere na-arụsi ọrụ ike. N’ikpeazụ, ọ zụtara otu ibe ala ma wuo ụlọ na-efughị oké ego na ya. Taa, Mark na-eje ozi dị ka okenye ọgbakọ, a na-akwanyekwara ya ùgwù n’obodo o bi. Ugbu a ọ na-enyere ndị ọzọ nọ ná mkpa aka.
N’ezie, n’ọtụtụ ebe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-apụghị ikwe omume ịchọta ọrụ. Otu onye Kraịst bụ́ okenye nke na-eje ozi n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society n’Ebe Etiti Africa dere, sị: “Ọtụtụ ụmụnna nọ n’ebe a enweghị ọrụ. Ụfọdụ na-agbalị imepụtara onwe ha ọrụ, ma nke a siri ike. Ọtụtụ echewo na ebe ha ga-ata ahụhụ n’agbanyeghị ihe ha mere, na ha ga-achụ ihe onwunwe ha n’àjà dị ka ndị ozi ọsụ ụzọ. N’ime nke a, ọtụtụ achọpụtawo na ha bụ ndị a gọziri n’ụba karịa ma ọ bụrụ na ha nwere ọrụ a na-akwụ ntakịrị ụgwọ na ya.”
Jehova Na-akwagide Ndị Ya
Jisọs Kraịst kwuru banyere onwe ya, sị: “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ha na-edina, anụ ufe nke eluigwe nwekwara ebe ha na-arahụ ụra; ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ịtọgbọ isi Ya.” (Luk 9:58) N’ụzọ yiri nke ahụ, Pọl onyeozi dere, sị: “Wee ruo oge hour dị ugbu a agụụ na-agụ anyị, akpịrị na-akpọkwa anyị nkụ, anyị na-agbakwa ọtọ, a na-etikwa anyị aka, anyị enweghịkwa ebe obibi.”—1 Ndị Kọrint 4:11.
Ma Jisọs ma Pọl họọrọ ibi ndụ nke inwe ntakịrị akụ̀ na ụba ka ha wee nwee ike ịchụso ije ozi ha n’ụzọ zuru ezu karị. Ọtụtụ ndị Kraịst oge a dara ogbenye n’ihi na ha enweghị nhọrọ ọzọ. Otú o sina dị, ha na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha, na-ejikwa ịnụ ọkụ n’obi na-achọ ijere Chineke ozi. Ha maara na Jehova hụrụ ha n’anya nke ukwuu ka ha na-ahụ ịbụ eziokwu nke okwu Jisọs, bụ́: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe [onwunwe] ndị a nile.” (Matiu 6:25-33) Ọzọkwa, ndị ohu Chineke ndị a dara ogbenye nwere ihe àmà na “ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya.”—Ilu 10:22.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E ji aha ndị ọzọ mee ihe n’isiokwu a.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Olee Ndị Bụ “Ndị Na-eme Okwu Ahụ”?
DỊ KA otu njụta echiche e mere na 1994 na-egosi, 96 pasent nke ndị America “kwere na Chineke ma ọ bụ mmụọ nọzuru ebe nile.” E nwekwara “nkezi ọnụ ọgụgụ chọọchị ka ukwuu maka otu onye n’ime United States karịa n’ime mba ọ bụla ọzọ n’Ụwa,” ka U.S.News & World Report kwuru. N’agbanyeghị ọdịdị ime nsọ nsọ ndị dị otú ahụ, onye aka ochie n’ịjụta echiche bụ́ George Gallup, Jr., na-ekwu, sị: “Eziokwu na-enweghị mgbagha bụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị America amaghị ihe ha kwere ma ọ bụ ihe mere ha ji kwere ya.”
Ihe ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosikwa na e nwere oghere dị ukwuu n’agbata nkwenkwe okpukpe nke ọtụtụ ndị na omume ha. Dị ka ihe atụ, “ndị ọkà ná mmekọrịta ọha na eze na-ekwu na ụfọdụ n’ime ebe ndị a kasị eme mpụ ná mba ahụ na-abụkwa ebe ndị nkwenkwe na ememe okpukpe kasị sie ike,” ka onye edemede bụ́ Jeffery Sheler na-ekwu.
Nke a ekwesịghị ịbụ ihe ijuanya. N’ihi gịnị? N’ihi na laa azụ na narị afọ mbụ, onye ozi bụ Pọl dọrọ ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị ka ha kpachara anya maka ndị “na-ekwupụta na ha matara Chineke; ma ọrụ nile ha ka ha ji gọnahụ Ya.” (Taịtọs 1:16) Ọzọkwa, Pọl gwara nwa okorobịa ahụ bụ Timoti na “mgbe ikpeazụ” ga-abụ nke ndị ‘na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke ma gọọ ike ya’ ga-aka akara.—2 Timoti 3:1, 5.
Otú ọ dị, ezi ndị Kraịst na-eme ihe nile ha pụrụ ime iji gbasoo iwu Jisọs Kraịst ‘ịga mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ N’ụzọ dị otú a ha na-aghọ ‘ndị na-eme okwu ahụ, ọ bụghị ndị na-anụ nanị.’—Jemes 1:22.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị mmadụ gburugburu ụwa ji ọmụmụ Bible kpọrọ ihe