Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 8/1 p. 4-7
  • Ụbọchị Ndị Ka Mma Na-abịa n’Ihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụbọchị Ndị Ka Mma Na-abịa n’Ihu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Buru Amụma Ụkọ Nri
  • Jehova Lekọtara Ndị Ohu Ya n’Oge Gara Aga
  • Chineke Na-akwado Ndị Ohu Ya Taa
  • Ụbọchị Ndị Ka Mma Na-abịa n’Ihu
  • Ịda Ogbenye Ma Baa Ọgaranya Olee Otú Ọ Pụrụ Isi Mee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ị̀ Tatụla Achịcha ahụ Na-enye Ndụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Ụkọ Nri Dị Taa?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ezi Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Ugbu A na Mgbe Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 8/1 p. 4-7

Ụbọchị Ndị Ka Mma Na-abịa n’Ihu

“ANYỊ na-eri nri n’ụtụtụ, kwụọ agụụ n’ehihie, rie nri n’abalị,” ka otu nwanyị na-asị.

“Nke m kadị njọ,” ka enyi ya zaghachiri. “M na-akwụ agụụ n’ụtụtụ, kwụọ agụụ n’ehihie, rie nri n’abalị.”

N’ụfọdụ akụkụ nke Ọdịda Anyanwụ Africa, mkparịta ụka dị otú ahụ achọghị nkọwa. Kama iri ugboro nri atọ n’ụbọchị, onye na-eri nke ụtụtụ, kwụọ agụụ n’ehihie ma rie nke abalị pụrụ nanị iri ugboro nri abụọ kwa ụbọchị—otu ugboro n’ụtụtụ na otu ugboro n’uhuruchi. Nwa okorobịa nke na-akwụ agụụ n’ụtụtụ, kwụọ agụụ n’ehihie, ma rie nri abalị na-akọwa ọnọdụ ya, sị: “M na-eri ihe otu ugboro n’ụbọchị. M na-akwaju friji m mmiri. M na-eri ụtara garị n’abalị tupu mụ alakpuo ụra. Otú ahụ ka m siworo na-anagide ọnọdụ m.”

Nke ahụ bụ ọnọdụ ọjọọ nke ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke ndị mmadụ taa nọ na ya. Ọnụ ahịa na-arị elu, ikike nzụta ihe nke ego na-adalatakwa.

E Buru Amụma Ụkọ Nri

N’usoro ọhụụ e nyere Jọn onyeozi, Chineke buru amụma ọnọdụ ndị siri ike nke ọtụtụ ndị na-eche ihu taa. Otu n’ime ha ga-abụ ụkọ nri. Jọn na-akọ: “M wee hụ, ma lee, ịnyịnya ojii; onye na-anọkwasị ya nwekwara ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’aka ya.” (Mkpughe 6:5) Ịnyịnya nke a na onye na-anya ya bụ́ mgbaàmà ihe ọjọọ na-ese onyinyo ụnwụ nri—nri ga-adị oké ụkọ nke na a ga-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-eke ya.

Ọzọ, Jọn onyeozi na-asị: “M wee nụ . . . olu . . . ka ọ na-asị, Otu ọ̀tụ̀tụ̀ nta nke ọka bụ otu shilling, ọ̀tụ̀tụ̀ nta atọ nke barley bụ otu shilling.” N’oge Jọn, otu ọ̀tụ̀tụ̀ nke ọka bụ nri ụbọchị nke onye soja, otu shilling bụkwa ego a na-akwụ maka ọrụ ụbọchị. N’ihi ya, nsụgharị nke Richard Weymouth dere amaokwu ahụ otú a: “Ụgwọ ọrụ otu ụbọchị dum maka otu ogbe achịcha, ụgwọ ọrụ otu ụbọchị maka achịcha barley atọ.”—Mkpughe 6:6.

Gịnị bụ ụgwọ ọrụ otu ụbọchị taa? Akwụkwọ nta bụ́ The State of World Population, 1994 na-asị: “Ihe dị ka 1.1 ijeri mmadụ, ihe dị ka 30 pasent nke ọnụ ọgụgụ ndị bi ná mba ndị na-emepe emepe n’ụwa, na-eji ihe dị ka $1 na-ebi ndụ kwa ụbọchị.” N’ihi ya, nye ndị ogbenye nke ụwa, ụgwọ ọrụ otu ụbọchị n’ụzọ nkịtị na-azụta ihe dị ka otu ogbe achịcha.

Otú ọ dị, nke a abụghị ihe ijuanya nye ndị bụ ogbenye ọnụ ntụ. “Bredị!” ka otu nwoke tiri ná mkpu. “Ònye na-ata bredị? N’oge ugbu a bredị bụ nri ndị ọgaranya!”

N’ụzọ mgbagwoju anya, e nweghị ụkọ nri. Dị ka ihe e si n’aka òtù UN nweta si kwuo, n’ime afọ iri gara aga, ọ̀tụ̀tụ̀ mmepụta nri nke ụwa ji 24 pasent rịa elu, bụ́ nke karịrị uto nke ọnụ ọgụgụ mmadụ n’ụwa. Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile nwetara mmụba nke nri a. Dị ka ihe atụ, n’Africa, ọ̀tụ̀tụ̀ mmepụta nri ji pasent 5 dalata, ebe ọnụ ọgụgụ mmadụ ji 34 pasent rịa elu. Ya mere n’agbanyeghị ịba ụba nri nke e nwere nnọọ gburugburu ụwa, ụkọ nri na-anọgide n’ọtụtụ mba.

Ụkọ nri pụtara ọnụ ahịa dị elu karị. Enweghị ọrụ, ụgwọ ọrụ dị ala, nakwa ọnụ ahịa ịrị elu na-eme ka o sikwuo ike inweta ego ịzụrụ ihe dị adị. Akwụkwọ bụ́ Human Development Report 1994 na-asị: “Ndị mmadụ na-anọ agụụ ọ bụghị n’ihi na nri adịghị—kama n’ihi na aka ha apụghị iru ya.”

N’ụzọ na-arị elu, e nwere ndakpọ olileanya, nkụda mmụọ, na obi nkoropụ. “Ndị mmadụ na-eche na taa dị njọ, ma echi ga-aka njọ,” ka Glory, onye bi n’Ọdịda Anyanwụ Africa kwuru. Nwanyị ọzọ sịrị: “Ndị mmadụ na-eche na ha na-eru nso n’ọdachi. Ha na-eche na ụbọchị ga-abịa mgbe ọ na-adịghị ihe ga-afọdụ n’ahịa.”

Jehova Lekọtara Ndị Ohu Ya n’Oge Gara Aga

Ndị ohu Chineke maara na Jehova na-akwụghachi ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ site n’inye ha ihe ndị na-akpa ha nakwa site n’inye ha ume ịnagide ọnọdụ ihe isi ike. Obi ike dị otú ahụ n’ike Chineke nwere inye nlekọta bụ, n’ezie, akụkụ dị mkpa nke okwukwe ha. Pọl onyeozi dere, sị: “Onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị, na Ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.

Jehova anọworị na-elekọta ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe nile. N’oge ụkọ mmiri ozuzo afọ atọ na ọkara, Jehova nyere Elaịja onye amụma nri. Na mbụ, Chineke nyere ugoloọma iwu ka ọ na-ewetara Elaịja achịcha na anụ. (1 Ndị Eze 17:2-6) Mgbe e mesịrị, n’ụzọ ọrụ ebube, Jehova mere ka ntụ ọka na mmanụ nke otu nwanyị di ya nwụrụ nke na-enye Elaịja nri ghara ịgwụ agwụ. (1 Ndị Eze 17:8-16) N’oge otu ụnwụ nri ahụ, n’agbanyeghị mkpagbu okpukpe siri ike nke ajọ Eze Nwanyị Jezebel na-akpagbu ha, Jehova hụkwara na e nyere ndị amụma ya achịcha na mmiri.—1 Ndị Eze 18:13.

Ka oge na-aga, mgbe eze Babilọn gbara Jerusalem dapụrụ n’ezi ofufe gburugburu, ndị mmadụ aghaghị ‘iri achịcha n’ọ̀tụ̀tụ̀ na n’ime nchegbu.’ (Ezikiel 4:16) Ọnọdụ ahụ ghọrọ ihe siri oké ike nke na ụfọdụ ụmụ nwanyị riri anụ ahụ nke ụmụ ha. (Abụ Ákwá 2:20) Ma, ọ bụ ezie na Jeremaịa onye amụma nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi nkwusa ya, Jehova hụrụ na a “na-enye [Jeremaịa] otu ogbe achịcha kwa ụbọchị site n’èzí ndị osi ite, ruo mgbe achịcha nile nke dị n’obodo gwụsịrị.”—Jeremaịa 37:21.

Jehova ò chefuru Jeremaịa mgbe achịcha na-adịghịkwa? O doro anya na o meghị otú ahụ, n’ihi na mgbe ndị Babilọn meriri obodo ahụ, e nyere Jeremaịa “òkè ihe oriri na onyinye, zilaga ya.”—Jeremaịa 40:5, 6; leekwa Abụ Ọma 37:25.

Chineke Na-akwado Ndị Ohu Ya Taa

Dị nnọọ ka Jehova kwagidere ndị ohu ya n’ọgbọ ndị gara aga, otú ahụ ka ọ na-eme taa, na-elekọta ha ma n’ụzọ ihe onwunwe ma n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, tụlee ahụmahụ nke Lamitunde, onye bi n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Ọ na-akọ, sị: “M nweburu ebe butụrụ ibu a na-azụ ọkụkọ. Otu ụbọchị, ndị oji égbè eje ohi bịara n’ebe ahụ zukọrọ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ụmụ ọkụkọ ahụ, ígwè generator maka e wee ọkụ, na ego anyị nwere. Nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, ọkụkọ ole na ole fọdụrụnụ nwụrụ n’ihi ọrịa. Nke ahụ bibiri ọrụ ịkpa ọkụkọ m. Ruo afọ abụọ m gbalịrị ịchọta ọrụ n’enweghị ihe ịga nke ọma. Ihe siri ike n’ezie, ma Jehova kwagidere anyị.

“Ihe nyeere m aka ịnagide oge ihe ịkpọ nkụ ndị ahụ bụ mụ ịmata na Jehova na-ekwe ka ihe mee anyị iji nụchaa anyị. Mụ na nwunye m nọgidere na-enwe usoro ọmụmụ Bible ezinụlọ anyị, nke a nyekwaara anyị aka n’ezie. Ekpere bụkwa isi iyi dị ukwuu nke ume. Mgbe ụfọdụ ọ naghị adị m ka m kpee ekpere, ma mgbe m kpere ekpere, obi na-adị m mma karị.

“N’oge ahụ siri ike, m mụtara uru nke ịtụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ. M na-echebu echiche nke ukwuu banyere Abụ Ọma 23, nke na-ekwu banyere Jehova dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị. Akụkụ akwụkwọ nsọ ọzọ nke gbara m ume bụ Ndị Filipaị 4:6, 7, nke na-ezo aka ‘n’udo nke Chineke nke kachasị uche nile.’ Akụkụ akwụkwọ nsọ ọzọ nke nyere m ike bụ 1 Pita 5:6, 7, nke na-asị: ‘Ya mere wedanụ onwe unu n’okpuru aka dị ike nke Chineke, ka O wee welie unu elu n’oge nke Ya; na-atụkwasịnụ Ya nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ Ya n’obi.’ Amaokwu ndị a nile nyeere m aka n’oge ihe isi ike ndị ahụ. Mgbe ị na-atụgharị uche, ị na-enwe ike iji ihe ọzọ dochie ihe ndị dị n’uche gị bụ́ ndị na-akpata ịda mbà n’obi.

“Ugbu a enwetawo m ọrụ ọzọ, ma n’ikwu eziokwu, ọ bụghị na ihe adịla mfe. Dị nnọọ ka Bible buru amụma ya na 2 Timoti 3:1-5, anyị na-ebi na ‘mgbe ikpeazụ,’ nke ‘oge dị oké egwu’ kara akara. Anyị apụghị ịgbanwe ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Ya mere adịghị m atụ anya na ndụ ga-adị mfe. Ma, m na-eche na mmụọ Jehova na-enyere m aka ịnagide.”

N’agbanyeghị oge dị oké egwu anyị na-ebi n’ime ya, ndị na-atụkwasị Jehova na Ọkpara ya bụ́ Eze, bụ́ Kraịst Jisọs obi, agaghị enwe mmechuihu. (Ndị Rom 10:11) Jisọs n’onwe ya na-emesi anyị obi ike, sị: “N’ihi nke a ka M ji sị unu, Unu echegbula onwe unu nye ndụ unu, ihe unu ga-eri, ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ; echegbukwala onwe unu nye ahụ unu, ihe unu ga-eyi. Ọ́ bụghị ndụ karịrị ihe e ji azụ ya, ọ́ bụghịkwa ahụ karịrị uwe oyiyi ya? Leenụ anụ ufe nke eluigwe, na ha adịghị agha mkpụrụ, ha adịghị ewekwa ihe ubi, ha adịghị ekpokọtakwa ihe baa n’ọba; ma Nna unu nke eluigwe na-azụ ha. Ùnu onwe unu abụghị ihe oké ọnụ ahịa karịa ha? Ma ònye n’etiti unu pụrụ ịtụkwasị otu cubit n’ogologo ya site n’ichegbu onwe ya? Gịnị mere unu na-echegbukwa onwe unu nye uwe oyiyi?”—Matiu 6:25-28.

Ndị ahụ n’ezie bụ ajụjụ ndị na-enyocha obi n’oge ndị a dị oké egwu. Ma Jisọs gara n’ihu n’okwu ndị a na-akasi obi: “Rịbanụ urodi nke ubi ama, otú ha na-eto eto; ha adọgbughị onwe ha n’ọrụ, ha atụghịkwa ogho: ma asị m unu, na ọbụna Solomọn n’ebube ya nile, e gbokwasịghị ya ákwà dị ka otu n’ime ndị a. Ma ọ bụrụ na Chineke eyikwasị ahịhịa nke ubi uwe otú a, nke dị taa, echi a tụba ya n’ite ọkụ, Ọ́ gaghị eyikwasị karị unu uwe nke ukwuu, unu ndị okwukwe nta? Ya mere, unu echegbula onwe unu, sị, Gịnị ka anyị ga-eri? ma ọ bụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ? ma ọ bụ, Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị? N’ihi na ihe ndị a nile ka ndị mba ọzọ na-achọ; n’ihi na Nna unu nke eluigwe na-amata na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—Matiu 6:28-33.

Ụbọchị Ndị Ka Mma Na-abịa n’Ihu

E nwere ihe àmà nile na-egosi na n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, ọnọdụ akụ̀ na ụba na ọha mmadụ nke na-adakpọsị adakpọsị ga-anọgide na-aka njọ. Ma, ndị Chineke ghọtara na ọnọdụ ndị a ga-adị nanị nwa oge. Ịchịisi dị ebube nke Eze Solomọn mere ihe atụ ịchịisi ezi omume nke Eze ka Solomọn ukwuu nke ga-achị elu ụwa nile. (Matiu 12:42) Eze ahụ bụ Kraịst Jisọs, “Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenu kachasị ndị nwenụ nile.”—Mkpughe 19:16.

Abụ Ọma 72, nke nwere mmezu mbụ ya n’ihe banyere Eze Solomọn, na-akọwa ịchịisi magburu onwe ya nke Jisọs Kraịst. Tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị dị ebube o buru amụma ha banyere ọdịnihu ụwa n’okpuru Kraịst dị ka Eze.

Ọnọdụ Udo n’Ụwa Nile: “Onye ezi omume ga-ama akwụkwọ n’ụbọchị nile ya dị ka osisi ndụ; ọtụtụ udo ga-adịkwa ruo mgbe ọnwa agaghị adị. Ya nweekwa ike n’ahụ mmadụ site n’otu oké osimiri ruo oké osimiri ọzọ, sitekwa n’Osimiri ruo nsọtụ nile nke ụwa.”—Abụ Ọma 72:7, 8.

Nchegbu Maka Ndị E Wedara n’Ala: “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere, ọ bụkwa mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha; ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.”—Abụ Ọma 72:12-14.

Ịba Ụba nke Ihe Oriri: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile; mkpụrụ ya ga na-eme mkpatụ dị ka Lebanọn.”—Abụ Ọma 72:16.

Nsọpụrụ Jehova Ga-ejupụta Ụwa: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke, bụ, bụ́ Chineke nke Israel, onye nanị Ya na-arụ oké ọrụ dị iche iche: ihe a gọziri agọzi ka aha nsọpụrụ Ya bụkwa ruo mgbe ebighị ebi; ka ụwa nile jupụtakwa ná nsọpụrụ Ya.”—Abụ Ọma 72:18, 19.

Ya mere e nwere n’ezie ụbọchị ndị ka mma na-abịa n’ihu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya