Ezi Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Ugbu A na Mgbe Ebighị Ebi
OBI abụọ ọ bụla adịghị ya na Jehova Chineke pụrụ inye ndị ya ịnọ ná ntụkwasị obi. Ọ bụ “Onye Nke pụrụ ime ihe nile.” (Abụ Ọma 68:14) Aha ya pụrụ iche pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” Nke a na-eme ka a mata ya dị ka nanị Onye nwere ike n’eluigwe na ala imeri ihe mgbochi ọ bụla iji mezuo nkwa ya na uche ya. Chineke n’onwe ya na-ekwu, sị: “Otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.”—Aịsaịa 55:11.
Chineke na-enye ndị na-atụkwasị ya obi nchebe. Okwu ya na-eme ka e jide nke a n’aka. “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ,” ka Eze Solomọn kwuru n’okpuru ike mmụọ nsọ Chineke. “N’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọ n’elu.” O kwukwara, sị: “Onye na-atụkwasị Jehova obi, a ga-eme ka ọ nọ n’elu.”—Ilu 18:10; 29:25.
Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Maka Ndị Ohu Chineke
Jehova anọwo mgbe nile na-enye ndị nile na-adabere n’ebe ọ nọ nchebe. Dị ka ihe atụ, Jeremaịa onye amụma nwetara nchebe Chineke. Mgbe ndị agha Babilọn gbara Jerusalem ahụ si n’ezi ofufe dapụ gburugburu, ndị mmadụ aghaghị ‘iri achịcha n’ọ̀tụ̀tụ̀ na n’ime nchegbu.’ (Ezikiel 4:16) Ọnọdụ ahụ ghọrọ nke dị oké njọ nke na ụmụ nwanyị ụfọdụ siri ụmụ ha n’ite rie. (Abụ Ákwá 2:20; 4:10) Ọ bụ ezie na e ji Jeremaịa eji n’oge ahụ n’ihi nkwusa atụghị ụjọ ya, Jehova hụrụ na a “na-enye ya otu ógbè achịcha kwa ụbọchị site n’èzí ndị osi ite, ruo mgbe achịcha nile nke dị n’obodo gwụsịrị.”—Jeremaịa 37:21.
Mgbe ndị Babilọn meriri Jerusalem, e gbughị Jeremaịa ma ọ bụ kpụrụ ya gaa Babilọn dị ka onye mkpọrọ. Kama nke ahụ, “onye isi ndị ogbu [nke Babilọn] wee nye ya òkè ihe oriri na onyinye, zilaga ya.”—Jeremaịa 40:5.
Ọtụtụ narị afọ n’ihu Jisọs Kraịst mesiri ndị ohu Chineke obi ike, sị: “Unu echegbula onwe unu, sị, Gịnị ka anyị ga-eri? ma ọ bụ, Gịnị ka anyị ga-aṅụ? ma ọ bụ, Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị? N’ihi na ihe ndị a nile ka ndị mba ọzọ na-achọ; n’ihi na Nna unu nke eluigwe na-amata na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—Matiu 6:31-33.
Nke a ọ̀ pụtara na ndị ohu Jehova ga-enweta nchebe Chineke pụọ n’ọdachi nile nke oge a? Ee e, ọ bụghị ihe ọ pụtara. A gụpụghị ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ná mmerụ ahụ. Ezi ndị Kraịst na-arịa ọrịa, na-enwe mkpagbu, na-aghọ ndị e mesoro mpụ, na-anwụ n’ihe mberede, na-atakwa ahụhụ n’ụzọ ndị ọzọ.
Ọ bụ ezie na Jehova amalitebeghị inye ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ezu pụọ ná mmerụ ahụ, akụkọ dị iche iche na-egosi na ọ na-eji ike ya enye ndị ohu ya ihe ndị na-akpa ha ma na-echebe ha. A na-echebekwa ndị Kraịst pụọ n’ọtụtụ nsogbu n’ihi na ha na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha. (Ilu 22:3) Ọzọkwa, ha na-enweta ịnọ ná ntụkwasị obi nke mkpakọrịta zuru ụwa ọnụ nke ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmụọ na-ahụ n’anya, bụ́ ndị na-enyerịtara ibe ha aka n’oge mkpa. (Jọn 13:34, 35; Ndị Rom 8:28) Dị ka ihe atụ, ná nzaghachi nye ọnọdụ ọjọọ nke ụmụnna ha si Rwanda nke agha tisasịrị, Ndịàmà Jehova nọ na Europe nyere onyinye ma zigara ha 65 tọn ihe ndị a na-eyi eyi na ọgwụ, ihe oriri na ihe ndị ọzọ ruru $1,600,000 n’ọnụ ahịa n’egbughị oge.—Tụlee Ọrụ 11:28, 29.
Ọ bụ ezie na Jehova na-ekwe ka ule dakwasị ezi ndị Kraịst, obi siri ha ike na ọ ga-enye ha ume, enyemaka, na amamihe iji tachie obi. Ka ọ na-edegara ndị kwere ikwe ibe ya akwụkwọ, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ dịghị ọnwụnwa [ule] bịakwasịworo unu ma ọ bụghị nke na-abịara ndị mmadụ. Ma Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu [lee unu ule] gabiga ihe unu pụrụ idi, ma n’oge ọnwụnwa [ule] ahụ ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka unu wee nwee ike idi ya.”—1 Ndị Kọrint 10:13; The Emphatic Diaglott.
Ihe Chineke Na-emere Ndị Ya
Taa, ọtụtụ nde mmadụ na-enwe obi ụtọ ime uche Chineke. A dịghị amanye ha ijere Chineke ozi; ha na-eme otú ahụ n’ihi na ha maara, hụkwa ya n’anya. N’aka nke ọzọ, n’ihi na Jehova hụrụ ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe n’anya, o zubere ịgbanwe ụwa ịghọ paradaịs bụ́ ebe ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-enwe udo, ahụ ike, na nchebe ruo mgbe ebighị ebi.—Luk 23:43.
Chineke ga-eme nke a site n’otu ọchịchị eluigwe, na-enwe Eze ọ họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst, dị ka Onye Ọchịchị ya. (Daniel 7:13, 14) Bible na-ezo aka n’ebe ọchịchị a dị dị ka “alaeze Chineke” nakwa dị ka “alaeze eluigwe.” (1 Ndị Kọrint 15:50; Matiu 13:44) Alaeze Chineke ga-anọchi gọọmenti nile nke ụmụ mmadụ. Kama inwe ọtụtụ gọọmenti n’elu ala, a ga-enwe nanị otu gọọmenti. Ọ ga-achị ụwa nile n’ezi omume.—Abụ Ọma 72:7, 8; Daniel 2:44.
Jehova na-akpọ mmadụ nile òkù ibi n’okpuru Alaeze ahụ. Otu ụzọ o si na-eme nke a bụ site ná nkesa sara mbara nke Bible, bụ́ akwụkwọ na-akọwa ihe Alaeze ahụ ga-emere agbụrụ mmadụ nile. Bible bụ akwụkwọ a kasị ekesa n’ụwa, ọ dịkwa ugbu a, n’akụkụ ma ọ bụ n’ozuzu ya, n’ihe karịrị 2,000 asụsụ.
Jehova Chineke ji ịhụnanya na-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe Bible na-akụzi banyere Alaeze ahụ. Ọ na-eme otú ahụ site n’izi ndị mmadụ ihe na izipụ ha ịkọwara ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ. Ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova ise na-akpọsa ozi ọma Alaeze Chineke ahụ ugbu a n’ihe karịrị 230 ala.
Ezi Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ọ̀ Bụ Maka Mmadụ Nile?
Mmadụ nile hà ga-anabata ọkpụkpọ òkù ahụ ịghọ ndị Alaeze Chineke ga-achị site n’ikwekọ n’ụkpụrụ ezi omume ya nile? Ee e, n’ihi na ọtụtụ ndị enweghị mmasị n’ime uche Chineke. Ha na-ajụ mgbalị ndị a na-eme inyere ha aka imezi ndụ ha. N’ezie, ha na-egosipụta onwe ha ịbụ ndị yiri ndị ahụ Jisọs kwuru maka ha, sị: “Obi ndị nke a mara abụba, ntị ha kpọchikwara, ha kpuchikwara anya ha; ka ha ghara iwere anya ha hụ ụzọ ma eleghị anya, gharakwa iwere ntị ha nụ ihe, gharakwa iwere obi ha ghọta, gharakwa ichigharị, ka M [Chineke] gharakwa ime ka ahụ dị ha ike.”—Matiu 13:15.
Olee nnọọ otú a pụrụ isi nwee ezi ịnọ ná ntụkwasị obi n’elu ala n’etiti ndị na-ajụ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụzọ ezi omume nile nke Chineke? A pụghị inwe ya. Ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke na-etinye ịnọ ná ntụkwasị obi nke ndị chọrọ ijere Jehova ozi n’ihe ize ndụ.
Chineke adịghị amanye ndị mmadụ ịgbanwe, ma ọ gaghịkwa anagide ajọ omume ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ezie na Jehova ji ndidi nọgide na-ezipụ Ndịàmà ya izi ndị mmadụ banyere ụzọ na nzube ya nile, ọ gaghị anọgide na-eme otú ahụ ruo ogologo oge. Jisọs Kraịst buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.
Gịnị ka “ọgwụgwụ ihe nile” ahụ ga-apụtara ndị na-ajụ ụkpụrụ nile nke Chineke? Ọ ga-apụta ịma ha ikpe na ibibi ha. Bible na-ekwu banyere iweta ‘ịbọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs: bụ́ mmadụ ndị ga-ahụ ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, bụ́ mbibi ebighị ebi.’—2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9.
N’ikpeazụ —Ezi Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Ruo Mgbe Ebighị Ebi!
Mgbe e bibisịrị ndị na-ajụ ụzọ udo nile nke Jehova, Alaeze Chineke ga-ewebata ọgbọ dị ebube nke ịnọ ná ntụkwasị obi maka abamuru nke ndị ezi omume nọ n’elu ala. (Abụ Ọma 37:10, 11) Lee ka ụwa ọhụrụ ahụ ga-esi dị iche na nke anyị bi n’ime ya taa!—2 Pita 3:13.
Ụnwụ nri na agụụ agaghị adịkwa ọzọ. Onye ọ bụla ga-enwe ihe bara ụba iri. Bible na-asị na ‘ndị nile dị iche iche ga-enwe oké oriri nke ihe mara abụba.’ (Aịsaịa 25:6) A gaghị enwe ụkọ ihe oriri, n’ihi na “ọtụtụ ọka [ga-adị] n’ala n’elu ugwu nile.”—Abụ Ọma 72:16.
Ndị mmadụ agaghị ebikwa ná mkpọkọrọ ụlọ na n’ógbè ndị jupụtara ná nkịkara ụlọ. N’okpuru Alaeze Chineke, mmadụ nile ga-enwe ebe obibi ndị mara mma, ha ga-erikwa nri ndị ha kọtara n’ala ha. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha.”—Aịsaịa 65:21.
Kama enweghị ọrụ gbasazuru ebe nile, a ga-enwe ezigbo ọrụ, ndị mmadụ ga-ahụkwa ihe ọma ndị si na ha apụta. Okwu Chineke na-asị: “Ndị M họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu. Ha agaghị adọgbu onwe ha n’ọrụ n’efu.”—Aịsaịa 65:22, 23.
N’okpuru ịchịisi Alaeze, ndị mmadụ agaghị arịa ọrịa ma nwụọ n’ihi ọrịa. Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike, sị: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.
N’ime Paradaịs elu ala nke ga-ewere ọnọdụ n’ezie n’oge na-adịghị anya, a ga-ewepụ ịta ahụhụ na ahụ mgbu, iru újú na ọnwụ. Ee, ọbụna ọnwụ! Ndị mmadụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime Paradaịs! Bible na-agwa anyị na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
N’okpuru ịchịisi Jisọs Kraịst, bụ́ “Onyeisi Udo” ahụ, ndụ n’elu ala ga-abụ nke dị nchebe n’ikpeazụ. N’ezie, ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ụwa nile ga-adị n’okpuru ọchịchị ezi omume, nke ịhụnanya nke otu ọchịchị—Alaeze Chineke.—Aịsaịa 9:6, 7; Mkpughe 7:9, 17.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
“Ịnọ ná ntụkwasị obi nke ụmụ mmadụ na-egosi okwukwe banyere echi, . . . [okwukwe n’ime] nguzosi ike nke ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke akụ̀ na ụba.”—Otu nwanyị bi n’Esia
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
“Ihe kasị eme ka i nwee mmetụta nke anọghị ná ntụkwasị obi bụ ime ihe ike na ime isi ike.”—Otu nwoke bi na Ndịda America
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
“Enweghị m mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi n’oge . . . mwakpo ahụ. Ọ bụrụ na otu mba na-alụ agha, olee otú ndị mmadụ ga-esi nwee mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi?”—Otu nwa akwụkwọ praịmarị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]
“M ga-enwe mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi mgbe m maara na m pụrụ ịga ije n’okporo ámá n’abalị n’abụghị onye e dinara n’ike.”—Otu nwatakịrị nwanyị na-eje akwụkwọ n’Africa