Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • tp isi 1 p. 4-9
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Dị Nso!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Dị Nso!
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ile Anya Gabiga “Udo na Ntụkwasị” nke Mmadụ Guzobere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Echiche Bible Banyere Udo na Ntụkwasị Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Iyi Egwu Nuklia E Wepụ Ya Kpam Kpam!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ụdị Ịnọ Ná Ntụkwasị Obi Dị Aṅaa Ka Ị Chọsiri Ike Inwe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
tp isi 1 p. 4-9

Isi 1

Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Dị Nso!

1. Ọnọdụ ndị dị aṅaa na-eme ka ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi bụrụ ihe a na-achọsi ike?

N’EZIE, dị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ, ị chọrọ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ike imempụ, ime ihe ike, agha na egwu mgbukpọ nke nuklia agwụla ụmụ mmadụ n’ebe nile. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị enweghị ọrụ dị mma, ebe obibi dị mma, ma ọ bụ nri ga-ezuru ha. Lee ụdị ọṅụ ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na a pụrụ imeri nsogbu ndị dị otú ahụ, ụwa aghọọkwa ebe obibi mara mma, nke e chebere nke ọma nye ndị bi na ya!

2, 3. (a) Ọ bụrụ na ezi udo na ntụkwasị obi dị nso n’ezie, ajụjụ ndị dị aṅaa ka e kwesịrị ịjụ? (b) Olee otú ihe òtù United Nations mere si yie ka o kwekọrọ n’ọchịchọ e nwere maka udo na ntụkwasị obi?

2 N’ụzọ dị ịtụnanya, e nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na nnapụta ahụ a chọrọ dị nso, na udo na ịnọ ná ntụkwasị obi gburugburu ụwa na-abịaru mmezu ya nso! Ma ònye ga-eweta nke a? Mba nile nke ụwa hà ga-ewezuga esemokwu ha nile iji mezuo nke a?

3 Otu amụma Bible na-adọrọ mmasị kwuru na oge ga-abịa mgbe ndị ndú ụwa ga-akpọsa “Udo na ntụkwasị obi” n’ezie!a N’ezie, mgbe òtù United Nations kpọsara 1986 dị ka “Afọ Udo nke Mba Nile” ọ rịọrọ ka ndị òtù dị iche iche n’ebe nile tinye mgbalị pụrụ iche site n’afọ ahụ gaa n’ihu ịkwalite ihe mgbaru ọsọ nke “udo, nchebe nke mba nile na ijikọ aka ọnụ na-eme ihe.”1

4. Ọ bụrụ na ndokwa ọ bụla maka udo na ntụkwasị obi ga-abara gị uru, olee nsogbu ndị ọ na-aghaghị ịgwọta?

4 Ma nke a ọ̀ ga-abụ ezi “udo na ntụkwasị obi”? Ọ̀ ga-erute n’ógbè ebe i bi na n’ime ụlọ obibi gị ma gbooro gị mkpa ndị metụtara gị onwe gị? Ọ̀ ga-agwọta nsogbu ndị na-arịwanye elu nke imempụ na ọgwụ ọjọọ iri mmadụ ahụ, ọnụ ahịa ihe oriri, oké ụtụ isi, mgbasa nke mmetọ mbara, na nretọ na-aga n’ihu nke nkekọ ezinụlọ dị iche iche? Ruo n’ókè otu n’ime ọnọdụ ndị a nọgidere na-adị, ha na-eyi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke gị onwe gị egwu.

5, 6. N’ịdabere n’ahụmahụ ndị i nwere ná ndụ, ì kwere na ụmụ mmadụ gaje ịgwọta nsogbu ndị ahụ?

5 N’eziokwu, ụmụ mmadụ na-enwe olileanya na ha nwere ike imeri ihe isi ike ndị a. Ha na-asị na ọ bụrụ na ha enwere onwe ha pụọ n’oké ibu arọ nke ego a na-emefu n’agha, na ha pụrụ ichigharị akụ na ụba, ọkà nchọpụta nile na ikike ụmụ mmadụ ndị ahụ nile ihu iji merie nsogbu nile ndị ahụ.

6 Ì kwere nke ahụ n’ezie? È nwere ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ iji gosi na ụmụ mmadụ pụrụ nnọọ iweta ihe ngwọta ndị na-adịgide adịgide? Gịnị ka akụkọ ihe mere eme na-egosi? N’eziokwu, gịnị ka ahụmahụ nke gị onwe gị ná ndụ na-agwa gị?

7, 8. (a) Olee ebe ọzọ anyị pụrụ ilegara anya maka ngwọta? (b) Ruo ókè hà aṅaa ka Bible bụ akwụkwọ a ma ama?

7 ‘Ma ọ bụrụ na ụmụ mmadụ enweghị ihe ngwọta ha, gịnị fọdụrụ?’ ka ị pụrụ ịjụ. Leenụ, e nwere ihe àmà a na-apụghị ịgọnarị agọnarị na ụwa na ihe ndị dị ndụ n’elu ya nwere onyeọkà nwere ọgụgụ isi dokwara ha. (Ndị Hibru 3:4) Ọ̀ pụrụ ikwe mee na Onye hụrụ maka ndokwa ndị a ga-abata n’okwu a? Ọ̀ ga-etinye aka n’ihe metụtara ụmụ mmadụ? Nanị Bible nwere azịza nye ajụjụ ndị a.

8 Ya mere, n’ihi otú ihe si kwụrụ, ò kwesịghị ka ị̀ tụlee ihe Bible kwuru banyere okwu a? Ọ pụrụ ịbụ na ị maara na ọ bụ akwụkwọ a kasị sụgharịa ma kesaakwa n’elu ụwa nile. E kesawo ọtụtụ ijeri, n’ozuzu ya ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ n’ihe karịrị 1,800 asụsụ.2 Ma ị̀ matara na akwụkwọ mgbe ochie a nwere azịza nye ihe ndị na-emetụtakarịsị anyị na narị afọ nke iri abụọ a?

9, 10. (a) Gịnị ka Bible kwuru banyere ọdịnihu, na banyere ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ? (b) Gịnị bụ Alaeze Chineke, oleekwa mgbe ọ ga-anara ọchịchị nile dị n’oge a ike?

9 Ọtụtụ maara na Bible buru amụma ‘ọgwụgwụ ụwa.’ Ma ole na ole matara ihe o kwuru maka mgbe ọ ga-abịa, ma ọ bụ ihe ndụ n’elu ala ga-adị ka ya ma ọ gasịa. (Matiu 24:21, 22; 2 Pita 3:11-13) Ha pụrụ ọbụna ịdị na-ekpe ekpere Nna Anyị Bi n’Eluigwe, ebe ha na-arịọ ‘ka alaeze Chineke bịa.’ (Matiu 6:9, 10) Ma ole na ole ghọtara na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị n’ezie nke ga-anọchi usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile dị ugbu a. Dị ka Daniel onye amụma si kwuo, sị: “Ma n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke agaghị emebi emebi ruo mgbe ebighi ebi. . . . Ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighi ebi.”—Daniel 2:44.

10 Ọ dị mma ịmata na amụma Bible maka “udo na ntụkwasị obi” nke e hotara na mbụ gụnyere ihe ndị a: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:3) Ya mere o doro anya na udo na ntụkwasị obi ọ bụla ndị ndú ụwa na-akpọsa ga-abụ maka oge dị oké mkpirikpi. N’ihi na amụma dị iche iche na-egosi na ngwa ngwa nke a gasịrị, a ga-etipịa ọchịchị nile nke mmadụ pụọ n’ịdị adị, a ga-ejikwa otu ọchịchị ga-achị ụwa nile—bụ́ Alaeze Chineke—dochie ha.

11, 12. Olee ọdịiche ụfọdụ dị n’etiti ihe Bible kwuru na Alaeze Chineke ga-eme na ihe ndị mmadụ na-agbali ime?

11 Tụkwasị na nke a, Bible na-ekpughe ọtụtụ ọdịiche dị n’etiti udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke Alaeze Chineke ga-eweta na ihe ndị ndú ụwa na-ekwe nkwa ya. Taa ụmụ mmadụ na-ekwu ka ha belata ngwa agha site ná nkwekọrịta dị iche iche. Bible n’aka nke ọzọ, na-ekwu na mgbe na-adịghị anya Chineke ga-eweta ngwa agha nile ná njedebe ha, wepụsịakwa ihe nile bụ isi na-akpata agha. (Abụ Ọma 46:9; Aịsaịa 2:2-4) Ịnọ ná ntụkwasị obi nke Chineke na-ekwe nkwa ya abụghịkwa nanị site n’agha n’etiti mba dị iche iche. Ọ bụ site ná ndị iro nile nke ụdị ọ bụla, ka a ghara inwe onye ga-anọ n’egwu mgbe ọ bụla ọzọ—ehihie ma ọ bụ n’abalị. (Maịka 4:3, 4) Ọzọ, ụmụ mmadụ na-achọ ibelata imempụ, ma nzube Chineke e mere ka ọ pụta ìhè bụ iropu ọbụna omume na ọnọdụ ndị na-eduga n’imempụ.—Abụ Ọma 37:8-11; Ndị Galetia 5:19-21.

12 Mba dị iche iche na-anya isi n’ọganihu ha nweworo n’ime nchọpụta ọgwụ na usoro nlekọta e meziwanyere maka ndị ọrịa na ndị kara nká. Ma Bible na-akọwa otú ọchịchị Chineke ga-esi weta ahụ ike zuru ezu na nke na-adịgide adịgide, ọbụna na-emeri ịka nka na ọnwụ! (Mkpughe 21:3, 4) Tinyere nke a, n’okpuru Alaeze Chineke ọrụ onye ọ bụla ga-enwe ezi nzube, na-eweta ezi afọ ojuju. N’ihi na olee otú ị pụrụ isi nwee obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọrụ gị na-agbakasị gị ahụ ma ọ bụ ghara ịdị na-enye gị ezi ọṅụ nke inwe ihe a rụpụtara?—Aịsaịa 65:21-23; Ndị Rom 8:19-21.

13. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ọ ga-abara anyị uru inyocha?

13 Olee nke i kwere na-enye ụdị udo na ntụkwasị obi ga-emezi akụkụ ọ bụla nke ndụ gị—nkwa nile nke ụmụ mmadụ ka ọ̀ bụ nkwa nile nke Chineke, ndị ọchịchị Alaeze ya ga-eweta ná mmezu ha? Site n’ịgbaso ihe ụwa n’ozuzu ya nwere inye, ị̀ chọtawo ihe ị chọrọ ná ndụ n’ezie? Gịnị ma ọ bụrụ na i kwere ka e were ihe ndị pụrụ ịdị na-ewu ewu ugbu a bufuo gị, ma chọpụta n’ikpeazụ na e ji nkwa nduhie dị iche iche rafuo gị, na-ahapụ gị n’enweghị ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi? N’aka nke ọzọ, ị̀ pụrụ inwe obi ike na nkwa nile nke Bible kwesịrị ka e kwere ha, na ha ga-eme eme, bụrụkwa eziokwu? N’ezie, azịza nye ajụjụ ndị dị otú a chọrọ ezi ntụgharị uche.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3.

[Foto dị na peeji nke 4]

[Foto dị na peeji nke 9]

Ọ dịghị onye ga-anọkwa n’egwu mgbe ọ bụla ọzọ—n’ehihie ma ọ bụ n’abalị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya