Iyi Egwu Nuklia E Wepụ Ya Kpam Kpam!
IBI ndụ n’egwu na-akụnwụ ahụ abụghị ihe Chineke chọrọ maka ihe a kpọrọ mmadụ. Dị ka “Chineke dị ngọzi,” ọ chọrọ ka ha nwee udo ma biri ná ntụkwasị obi—ikwu ya ná mkpirikpi, ka ha dị ngọzi. (1 Timoti 1:11) N’ụwa nke jupụtara n’iyi egwu nuklia, nke a bụ ihe na-apụghị ime eme ma ọlị.
“Udo na Ntụkwasị Obi”—Nke Adịgboroja
O kwesịrị ido anya na iyi egwu nuklia ahụ agafebeghị ma ọlị. Ma, n’agbanyeghị ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọnọdụ akụ̀ na ụba, na usoro ọha na eze, mba dị iche iche yiri n’ozuzu ha ka ha na-atụ anya ihe ka mma. Mgbalị na-adịgide adịgide iji wepụ ihe ize ndụ ahụ apụtawo ìhè eri Afọ Udo nke Mba Nile nke òtù UN na 1986.
Akwụkwọ bụ́ The Bulletin of the Atomic Scientists n’ime iri afọ nke ikpeazụ ahịghachiwo klọkụ ụbọchị ọdachi ya azụ—usoro ya iji gosi ohere e nwere maka agha nuklia—site na minit 3 tupu etiti abalị gaa minit 17 tupu etiti abalị. Na 1989 ụlọ ọrụ Stockholm International Peace Research Institute rịbara ama na “olileanya maka ndozi esemokwu n’ụzọ udo nwere ihe ndabere ka mma karịa n’afọ ọ bụla ọzọ eri ngwụsị nke Agha Ụwa nke Abụọ.”
N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, e mewo ka òtù United Nations siwanye ike iji hụ maka ebe ndị e nwere nsogbu. Ihe ịga nke ọma ya, ọ bụ ezie na ọ bụghị na ha nile, ezuwo ezu iji tinye ihe ná mmụọ zuru ebe nile nke ịtụ anya ihe ọma. Ọdịnihu yiri ka ọ ga-ewetakwu ọganihu ndị ọzọ. Mkpu nke “udo na ntụkwasị obi” yiri ka ọ ga-adawanye ụda ma siwanye ike. Ha pụrụ ọbụna iyikwu ihe bụ ezie.
Ma lezie anya! “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị,” ka Bible na-adọ aka ná ntị ya, “mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime; ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.” Otú a, mkpu nke “udo na ntụkwasị obi” ga-abụ ihe mgbaama nke oge Chineke maka “imebi ndị ahụ [bụ́ ndị sitere ná mmetọ, nke nuklia na nke ihe ndị ọzọ] na-emebi ụwa.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:3, 4; Mkpughe 11:18.
Rịba ama na Bible adịghị ekwu na mba nile ga-enweta “udo na ntụkwasị obi.” O doro anya na ha ga na-ekwu banyere ya n’ụzọ pụrụ iche, na-ekwupụta atụmanya ihe ọma na obi ike nke a na-enwetụbeghị ihe yiri ya na mbụ. Ohere ndị e nwere maka inweta udo na ntụkwasị obi ga-eyi ihe dị nso karịa mgbe ọ bụla bu ụzọ. N’agbanyeghị iyi egwu nuklia nke nọgidere na-aga n’ihu, a ga-arafu mba dị iche iche gaa n’echiche ụgha nke ịnọ ná ntụkwasị obi.
Otú ọ dị, a gaghị eduhie ezi ndị Kraịst. Site n’ezi mmasị ha ga-ele anya gabiga udo na ntụkwasị obi nke mmadụ gaa n’ihe ka mma!
Udo na Ntụkwasị Obi—Nke Ezigbo Ya
Dị ka Abụ Ọma 4:8 na-ekwu, a ga-achọta ezi udo na ntụkwasị obi nanị n’ime ndokwa Jehova Chineke: “N’udo ka m ga-eji otu mgbe ahụ dinaa ala, rahụọ ụra: n’ihi na Gị onwe gị, Jehova, nanị Gị, na-eme ka m biri ná ntụkwasị obi.” Mkpu ọ bụla nke “udo na ntụkwasị obi” nke e kwupụtara n’abụghị n’ihe metụtara ndokwa Alaeze Jehova pụrụ ịbụ nanị nke adịgboroja. Ọ pụghị ịrụzu ihe ọ bụla bara uru na-adịgide adịgide.
Alaeze Chineke n’okpuru Kraịst agaghị eweta nanị ihe ngwọta ndị na-ezughị ezu. Gọọmenti Chineke ga-eme ihe karịrị iwetu Ebe e si nweta foto Dị na peejiọnụ ọgụgụ nke ngwá agha nuklia; ọ ga-ebibi ha na ihe agha ndị ọzọ nile kpam kpam. Abụ Ọma 46:9 na-ekwe nkwa, sị: “[Ọ] na-eme ka agha kwụsị ruo nsọtụ ụwa; Ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; Ọ na-esure ụgbọ ala nile n’ọkụ.”
N’otu aka ahụ, iyi egwu nuklia nile nke arụghị ọrụ nke ọma nke ụlọ ọrụ nuklia ma ọ bụ ihe mkpofu ndị na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu na-akpata agaghị adịkwa. Ma ọ bụghị otú ahụ, okwu ndị a agaghị abụ eziokwu: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.” Chineke apụghị ikwu okwu ụgha. Anyị enweghị ihe ọ bụla mere anyị ga-eji rụọ okwu ya ụka.—Maịka 4:4; Taịtọs 1:2.
Ọ̀ ga-amasị gị inwe olileanya nke ibi n’ime ụwa ebe e wepụworo nnọọ ihe iyi egwu nuklia kpam kpam? Ị pụrụ inwe ya, n’ihi na Okwu Chineke na-esetịpụ n’ụzọ doro anya ihe ndị a chọrọ. Site n’ịmụta banyere ha na ibi ndụ kwekọrọ na ha, otu ụbọchị ị pụrụ inwe ọṅụ nke iji ahụ efe kwuo, sị: “Iyi egwu nuklia—o mesịwo gafere!”
[Foto dị na peeji nke 7]
Udo ga-achị dị ka eze n’ime ụwa ọhụrụ Chineke n’enweghị iyi egwu ọ bụla nke nuklia
[Ebe e si nweta foto]
M. Thonig/H. Armstrong Roberts
[Ebe e si nweta foto Dị na peeji 6]
Foto U.S. National Archives