Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 8/15 p. 8-11
  • Otú Bible Si Rute Anyị Aka—Akụkụ nke Mbụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Bible Si Rute Anyị Aka—Akụkụ nke Mbụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndepụtaghachi na Nsụgharị nke Bible Oge Mbụ
  • Ndị Kraịst Mbụ Bipụtara Akwụkwọ
  • Bible Latin na Slavonic
  • Bible Hibru Alanarị
  • Nsụgharị Bible Ezute Mmegide
  • Gịnị Mere E Ji Nwee Baịbụl Dị Iche Iche?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ndekọ Oge
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Jerome—Onye Na-akpata Esemokwu nke Butere Ụzọ ná Nsụgharị Bible
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “Septuagint”—Ọ Bara Uru n’Oge Ochie Nakwa n’Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 8/15 p. 8-11

Otú Bible Si Rute Anyị Aka—Akụkụ nke Mbụ

Akụkụ nke 2 na nke 3 ga-apụtagasị ná mbipụta nke September 15 na October 15.

N’IME otu obere ụlọ ọrụ, onye na-ebi akwụkwọ na ụmụ ọrụ ya ji ígwè obibi akwụkwọ ha nwere ọbọ osisi arụ ọrụ n’usoro n’usoro, jiri nlezianya na-atụkwasị ibe akwụkwọ a na-edeghị ihe n’elu mkpụrụ ihe odide ndị ahụ. Ka ha na-ewelite ha, ha na-enyocha nke ọma ihe odide ahụ e biri ebi. N’eriri ndị e liwere site n’ahụ ájá ruo n’ahụ ájá, ha na-ekowe peji ndị ahụ ka ha kọọ.

Na mberede, a kụrụ aka na-ada oké ụda n’ibo ụzọ. N’ịbụ onye kụjara, onye ahụ na-ebi akwụkwọ akpọpee ụzọ, ìgwè ndị agha bu ngwá agha amabata. Ha amalite ịchọgharị ụdị akwụkwọ a kasị machibido iwu—Bible n’asụsụ ndị nkịtị!

Ha abịawo n’azụ oge gabiga ókè. N’ịbụ ndị a dọrọ aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ahụ, onye nsụgharị ahụ na otu onye na-enyere ya aka agbagaworị n’ụlọ ọrụ ahụ, kpojuo ùkwù peji ndị ahụ aka, ha na-agbapụkwa ugbu a ná mgbago Osimiri Rhine. Ma ọ dịghị ihe ọzọ ha anapụtala ụfọdụ n’ime ọrụ ha.

N’ọnọdụ a onye nsụgharị a bụ William Tyndale, na-agbalị imepụta “Agba Ọhụrụ” Bekee ya a machibidoro iwu na Cologne, Germany, na 1525. Ahụmahụ ya mesịrị bụrụ nke na-abụtụghị ọpụrụiche. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 1,900 eri e dechara Bible, ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom etinyewo ihe dum n’ihe ize ndụ iji sụgharịa ma kesaa Okwu Chineke. Anyị ka na-erite uru taa site n’ọrụ ha. Gịnị ka ha mere? Olee otú Bible ndị anyị ji n’aka ugbu a siri rute anyị aka?

Ndepụtaghachi na Nsụgharị nke Bible Oge Mbụ

Ezi ndị na-ejere Chineke ozi ejiwo Okwu ya kpọrọ oké ihe mgbe nile. Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-ekwenye, sị: “Dị ka ndị nna nna ha bụ́ ndị Juu, ndị Kraịst oge mbụ ji ịgụ Akwụkwọ Ndị Dị Nsọ kpọrọ ihe. N’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs (Mt 4.4; 5.18; Lk 24.44; Jn 5.39), Ndị Ozi ahụ maara A[gba] O[chie] nke ọma bụ́ nke pụtara ọgụgụ na ọmụmụ ihe e ji nlezianya nwee ruo ogologo oge, gbaakwa ndị na-eso ụzọ ha ume ime nke a (Rom 15.4; 2 Tm 3.15-17).”

Iji mezuo nke ahụ, a ghaghị ime ndepụtaghachi nke Bible. Tupu oge ndị Kraịst, ndị rụrụ ihe dị ukwuu n’ime ọrụ a bụ ndị ọkachamara bụ́ ‘ndị odeakwụkwọ bụ́ ọkà,’ ndị ụjọ nke idehie ihe na-atụ. (Ezra 7:6, 11, 12) N’ịgbalị ka a ghara idehie ihe, ha setịpụrụ ụkpụrụ dị elu maka ndị nile ga-emesịa bụrụ ndị na-edepụtaghachi Bible.

Otú ọ dị, na narị afọ nke anọ T.O.A., otu ihe ịma aka bilitere. Aleksanda Onye Ukwu chọrọ ka a kụziere mmadụ nile nọ n’ụwa ọdịbendị ndị Gris. Mmeri ya kwadoro Grik ọha na-asụ, ma ọ bụ Koine, dị ka asụsụ bụ isi n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ dum. N’ihi ya, ọtụtụ ndị Juu tolitere n’amụtatụghị ịgụ Hibru, n’ihi ya kwa, ha enweghị ike ịgụ Akwụkwọ Nsọ. Ya mere, n’ihe dị ka 280 T.O.A., ìgwè ndị ọkà mmụta Hibru zukọrọ na Alexandria, Ijipt, ịsụgharị Bible Hibru gaa na Koine ahụ a ma ama. A bịara mara nsụgharị ha dị ka Septuagint, bụ́ okwu Latin maka “Iri Asaa,” na-ezo aka n’ọnụ ọgụgụ ndị nsụgharị e kwenyere na aka ha dị na ya. E mesịrị ya n’ihe dị ka 150 T.O.A.

N’oge Jisọs, a ka ji Hibru eme ihe na Palestine. Ma ọ bụ Koine zuru ebe ahụ na n’ihe fọdụrụ n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ nke ụwa ndị Rom. N’ihi ya, ndị Kraịst so dee Bible ji ụdị Grik a ọtụtụ maara mee ihe iji ruo ọtụtụ ndị ná mba nile dị ka o kwere mee. Ọzọ, ha hotara Septuagint ahụ ọtụtụ ugboro ma jiri ọtụtụ n’ime okwu ya mee ihe.

Ebe ọ bụ na ndị Kraịst oge mbụ bụ ndị ozi ala ọzọ na-anụ ọkụ n’obi, ngwa ngwa ha ghọrọ ndị dị irè n’iji Septuagint ahụ anwapụta na Jisọs bụ Mesaịa ahụ a nọworo eri ogologo oge na-echere. Nke a kwaliri ndị Juu ma kpalie ha imepụta ụfọdụ nsụgharị ndị ọhụrụ na Grik, bụ́ ndị e mere iji napụ ndị Kraịst arụmụka ha site n’idepụtaghachi akụkụ akwụkwọ nsọ nnwapụta ndị kasị amasị ha. Dị ka ihe atụ, n’Aịsaịa 7:14 Septuagint ahụ ji otu okwu Grik pụtara “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke” mee ihe, bụ́ nke na-ezo aka n’ụzọ amụma n’ebe nne Mesaịa ahụ nọ. Nsụgharị ọhụrụ ndị ahụ ji okwu Grik dị iche mee ihe, bụ́ nke pụtara “nwa agbọghọ.” Ndị Kraịst ịnọgide na-eji Septuagint ahụ eme ihe mesịrị kwalie ndị Juu ịgbahapụ atụmatụ ha kpam kpam na iji kwalite nlọghachi na Hibru. N’ụzọ bụ isi, ihe omume a mesịrị ghọọ ihe ndabara ọma nye nsụgharị Bible ndị e mesịrị nwee n’ihi na o nyere aka ime ka asụsụ Hibru dịgide.

Ndị Kraịst Mbụ Bipụtara Akwụkwọ

Ndị Kraịst oge mbụ na-anụ ọkụ n’obi ji aka ha malite idepụta ọtụtụ Bible dị ka ha nwere ike, ha dum bụ́ ndị e ji aka depụtaghachi. Ọ bụkwa ha malitere iji codex eme ihe, bụ́ nke nwere peji dị ka akwụkwọ oge a, kama ịnọgide na-eji akwụkwọ mpịakọta. E wezụga na ọ ka mfe iji ya achọta akụkụ akwụkwọ nsọ ngwa ngwa, a pụrụ ide ihe ka ukwuu n’otu mpịakọta codex karịa ihe a pụrụ idekọ n’otu akwụkwọ mpịakọta—dị ka ihe atụ, Akwụkwọ Nsọ Grik ma ọ bụ ọbụna Bible dum.

E dezuru ndepụta a nakweere nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’ihe dị ka na 98 O.A. site n’akwụkwọ ndị onyeozi ikpeazụ fọrọ ndụ, bụ́ Jọn, dere. E nwere akụkụ nke ihe odide Oziọma Jọn, a kpọrọ Rylands Papyrus 457 (P52), nke dị laa azụ na 125 O.A. Laa azụ na 150 ruo 170 O.A., Tatian, nwa akwụkwọ Justin Martyr, mepụtara Diatessaron, bụ́ ihe ndekọ zuru ezu nke ndụ Jisọs nke e dekọrọ site n’otu Oziọma anọ ndị ahụ dị na Bible ndị anyị nwere ugbu a.a Nke a pụtara na o weere nanị Oziọma ndị ahụ dị ka ndị ziri ezi nakwa na a nọworị na-ekesa ha. N’ihe dị ka 170 O.A., e mepụtara ndepụta ndị kasị mee ochie nke akwụkwọ “Agba Ọhụrụ,” a kpọrọ Muratorian Fragment. O depụtara ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ nile nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

N’oge na-adịghị anya mgbasa nke nkwenkwe ndị Kraịst mere ka ọ dị mkpa ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nakwa Akwụkwọ Nsọ Hibru. E mesịrị mepụta ọtụtụ nsụgharị n’asụsụ ndị ahụ dị ka Armenian, Coptic, Georgian, na Syriac. Ọtụtụ ugboro a ghaghị imepuṭa mkpụrụ okwu dị iche iche kpọmkwem maka nzube ahụ. Dị ka ihe atụ, Ulfilas, bụ́ bishọp Chọọchị Roman nke narị afọ nke anọ, ka e kwuru na o chepụtara ihe odide Gothic iji sụgharịa Bible. Ma ọ gụnyeghị akwụkwọ Ndị Eze n’ihi na o chere na ha ga-akwado àgwà ịlụ agha nke ndị Goth. Otú ọ dị, ime nke a egbochighị ndị Goth “e mere ndị Kraịst” ịkwakọrọ ngwongwo ndị Rom na 410 O.A.!

Bible Latin na Slavonic

Ka ọ dị mgbe ahụ, Latin bịara welite isi, a bịakwara nwee ọtụtụ mbipụta Latin Ochie. Ma ha dịgasị iche iche n’ụzọ e siri dee ha na n’izi ezi. Ya mere na 382 O.A., Popu Damasus nyere odeakwụkwọ ya, bụ́ Jerome, ọrụ ịkwadebe Bible Latin nke nwere nkwado ndị isi.

Jerome malitere site n’idegharị nsụgharị Latin nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Otú ọ dị, maka Akwụkwọ Nsọ Hibru, o siri ọnwụ ịsụgharị ya site na Hibru mbụ. N’ihi ya, na 386 O.A., ọ gara Betlehem ịmụ Hibru na ịchọ enyemaka nke onye rabaị. N’ihi nke a, ọ kpalitere esemokwu buru ibu na chọọchị. Ụfọdụ ndị, gụnyere Augustine ahụ ya na Jerome dịrị ndụ n’otu oge, kwenyere na Septuagint ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, ha bokwara Jerome ebubo “ịgakwuru ndị Juu.” N’ịga n’ihu, Jerome dezuru akwụkwọ ya n’ihe dị ka 400 O.A. Site n’ịgaru nso n’ebe e si nweta asụsụ na ihe odide ndị mbụ na site n’ide ha n’asụsụ a na-asụ n’ụbọchị ya, Jerome ji otu puku afọ butere usoro nsụgharị ọgbara ọhụrụ ụzọ. A bịara mara akwụkwọ ya dị ka Vulgate, ma ọ bụ Nsụgharị Nkịtị, ọ bakwaara ndị mmadụ uru ruo ọtụtụ narị afọ.

Na Krisendọm ebe ọwụwa anyanwụ, ọtụtụ ndị ka pụrụ ịgụ Septuagint ahụ na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ma, asụsụ na olu asụsụ so n’igwe asụsụ Slavonic, ma ọ bụ Slavic, ghọrọ nke onye ọ bụla ji eme ihe n’akụkụ ọwụwa anyanwụ Europe. Na 863 O.A., ụmụnne abụọ na-asụ Grik, bụ́ Cyril na Methodius, gara Moravia, nke dị ugbu a na Czech Republic. Ha malitere ịsụgharị Bible gaa na Slavonic Ochie. Iji mee otú ahụ, ha chepụtara mkpụrụ akwụkwọ Glagolitic, bụ́ nke mkpụrụ akwụkwọ Cyrillic, site n’aha bụ́ Cyril, mesịrị nọchie anya ya. Ọ bụ n’ebe a ka ihe odide oge a nke Russian, Ukrainian, Serbian, na Bulgarian sitere. Bible Slavonic baara ndị ógbè ahụ uru ruo ọtụtụ ọgbọ. Otú ọ dị, ka oge na-aga, ka asụsụ dị iche iche na-agbanwe, ọ malitere ịbụ ihe ndị nkịtị na-apụghị ịghọta.

Bible Hibru Alanarị

N’ime oge a, malite n’ihe dị ka narị afọ nke isii ruo nke iri O.A., ìgwè ndị Juu a maara dị ka ndị Masorete mepụtara usoro idepụtaghachi ihe n’otu n’otu iji chekwaa ihe odide Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ha ruru n’ókè nke ịgụ ahịrị na ọbụna mkpụrụ akwụkwọ ọ bụla ọnụ, na-arịba ama ihe ndị dịgasị iche n’etiti ihe odide dị iche iche, ha nile ná mgbalị iji chekwaa ihe odide a pụrụ ịtụkwasị obi. Mgbalị ha abụghị na nkịtị. Iji nye otu ihe atụ, iji ihe odide Masorete tụnyere Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, bụ́ nke e dere n’agbata 250 T.O.A. na 50 O.A., egosighị mgbanwe ọ bụla n’ụzọ nkwenkwe n’ime ihe karịrị afọ 1,000.b

Na Europe, Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya na Oge Ụwa Nọ n’Ìsì bụ n’ozuzu ya otu ihe ahụ. Ịgụ na ịmụ ihe nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala n’etiti ọha mmadụ. Ka e mesịrị, ọbụna ndị ụkọchukwu, n’ụzọ ka ukwuu, enwekwaghị ike ịgụ Latin chọọchị, ọtụtụ mgbe ha apụghị ọbụna ịgụ asụsụ nke ha. Nke a bụkwa oge na Europe mgbe a chụgara ndị Juu n’ógbè dị iche iche. Ruo ókè ụfọdụ n’ihi nkewapụ nke a, e chekwara nkà mmụta Hibru e ji dee Bible. Otú ọ dị, n’ihi ajọ mbunobi na abụghị ndị a tụkwasịrị obi, ọ na-esikarị ike inweta ihe ọmụma ndị Juu n’ebe na-abụghị n’ógbè ha. N’ebe ọdịda anyanwụ Europe, ihe ọmụma Grik nọkwa na-adalata. Nsọpụrụ Chọọchị Ebe Ọdịda Anyanwụ nwere maka Latin Vulgate nke Jerome mekwuru ka ọnọdụ ahụ dịwanye njọ. E weere ya n’ọha dị ka nanị nsụgharị e nyere ikike ya, ọ bụ ezie na ka ọ na-erule ná ngwụsị nke oge ndị Masorete, Latin nọ na-aghọ asụsụ nwụrụ anwụ. N’ihi ya, ka ọchịchọ ịmara Bible ji nwayọọ nwayọọ na-amalite ipulite, a tọrọ ntọala maka oké esemokwu.

Nsụgharị Bible Ezute Mmegide

Na 1079, Popu Gregory nke Asaa nyere nke mbụ n’ime ọtụtụ iwu chọọchị nke mgbe ụwa na-emepechabeghị anya ndị na-amachibido mbipụta na mgbe ụfọdụ ọbụna inwe nsụgharị nke asụsụ ala mmadụ. Ọ kagburu ikike e nyere ido Mas na Slavonic n’ihi na ọ ga-achọ ịsụgharị akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ. N’ụzọ dị nnọọ iche ná nguzo ndị Kraịst oge mbụ, o dere, sị: “Ọ masịrị Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile ka akwụkwọ nsọ bụrụ ihe nzuzo n’ebe ụfọdụ.” Ebe ọ bụ na nke a bụ nguzo nke chọọchị, a nọgidere na-ewere ndị na-akwalite ọgụgụ Bible dị ka ndị dị ize ndụ.

N’agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ ahụ, idepụtaghachi na ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ ọha na-asụ gara n’ihu. Nsụgharị ndị dị n’ọtụtụ asụsụ gbasara na nzuzo na Europe. E ji aka deghachi ndị a nile, ebe ọ bụ na a gajeghị imepụta ígwè obibi akwụkwọ a na-edogharị mkpụrụ akwụkwọ ya edogharị na Europe ruo etiti afọ ndị 1400. Ma ebe ọ bụ na akwụkwọ ndị ahụ dị oké ọnụ ma dị ole na ole n’ọnụ ọgụgụ, nwa amaala nkịtị pụrụ iwere onwe ya dị ka onye obi ụtọ inwe nanị otu akụkụ nke otu akwụkwọ Bible ma ọ bụ nanị peji ole na ole. Ụfọdụ buuru akụkụ buru ibu n’isi, ọbụna Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst dum!

Otú ọ dị, ka oge na-aga, e nwere mkpali nke òtù ndị zuru ebe nile maka mgbanwe nke chọọchị. Ihe kpaliri ndị a bụ n’otu akụkụ nghọta e mere ka ọ dịghachi ọhụrụ nke ịdị mkpa nke Okwu Chineke ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Olee otú òtù ndị a na mmalite nke ibi akwụkwọ ga-esi metụta Bible? Gịnịkwa mere William Tyndale na nsụgharị ya, nke e kwuru banyere ya ná mmalite? Anyị ga-agbaso akụkọ a na-adọrọ mmasị ruo n’oge anyị ná mbipụta ndị dị n’ihu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, bụ ihe atụ oge a nke nkwekọ nke Oziọma anọ ndị ahụ.

b Lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 315, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Chaatị dị na peeji nke 8, 9]

Akara Ụbọchị Ndị Bụ Isi na

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

E dezuo Akwụkwọ Nsọ Hibru c. 443 T.O.A.

Aleksanda Onye Ukwu (d. 323 T.O.A.)

A malite Septuagint c. 280 T.O.A.

Ihe ka ọtụtụ n’Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ c. 100 T.O.A. ruo 68 O.A.

E bibie Jerusalem 70 O.A.

E dezuo Akwụkwọ Nsọ Grik 98 O.A.

Rylands Papyrus nke Jọn (b. 125 O.A.)

Latin Vulgate nke Jerome   c. 400 O.A.  

400 T.O.A.

300 T.O.A.

200 T.O.A.

100 T.O.A.

100 O.A.

200 O.A.

300 O.A.

400 O.A.

TUPU OGE ANYỊ (T.O.A.)

OGE ANYỊ (O.A.)

NDEPỤTA NKE BIBLE

A Kwadebe Ihe Odide Masorete

Cyril na Moravia 863 O.A.

Iwu megide Bible n’asụsụ ala dị iche iche 1079 O.A.

500 O.A.

600 O.A.

700 O.A.

800 O.A.

900 O.A.

1000 O.A.

1100 O.A.

1200 O.A.

1300 O.A.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndị Kraịst oge mbụ bụ ndị malitere iji “codex” eme ihe

[Foto dị na peeji nke 10]

Jerome gara Betlehem ịmụ Hibru

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya