Otú Bible Si Rute Anyị Aka—Akụkụ nke Atọ
BURMA, 1824—Ndị ozi eze ka nyochasịrị ebe obibi ndị ozi ala ọzọ bụ́ Adoniram na Ann Judson, na-achịrị ihe ọ bụla ha chere bara uru. Ma ha ahụghị akụ̀ kasị oké ọnụ ahịa—ihe odide Bible a sụgharịrị asụgharị nke Ann zokpuworo n’ala ụlọ. Onye sụgharịrị ya, bụ́ Adoniram, tọgbọ n’agbụ n’ụlọ nga anwụnta jupụtara, ebe e boro ya ebubo ịbụ onye nledo. Ugbu a udè na-achọ imebi ihe odide ahụ. Olee otú a pụrụ isi zọpụta ya? Ann dụchiri ya n’ime ohiri isi siri ike ma zigara ya di ya n’ụlọ mkpọrọ. E chekwara ohiri isi ahụ, ihe dị n’ime ya ghọkwara akụkụ nke Bible Burmese mbụ.
Bible enwewo ọtụtụ ahụmahụ na-akpali akpali dị otú ahụ eri akụkọ ihe mere eme. Ná mbipụta ndị bu ụzọ, anyị tụlere nsụgharị na nkesa nke Bible malite mgbe e dezuru ya ruo ná mmalite afọ ndị 1600. Gịnị bụworo ọnọdụ Bible malite n’oge ahụ ruo ugbu a? Ọ̀ dị mgbe ọ bụla aka mmadụ nile ga-eru ya? Òkè dị aṅaa ka Watch Tower Society kewooro?
Ndị Ozi Ala Ọzọ na Òtù Bible
N’ọtụtụ ala, e ji oké ịrị elu n’ọgụgụ Bible mara afọ ndị 1600 na 1700. Bible nwere mmetụta miri emi n’England karịsịa n’oge ahụ. N’ezie, akụkọ na ozizi Bible jupụtara n’echiche nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile ná mba ahụ, site n’onye eze ruo na nwa okoro ji ọgụ na-akọ ugbo. Ma mmetụta Bible gakwuru n’ihu. England bụ mgbe ahụ ike ọchịchị ndị ọcha na nke ji ọrụ ụgbọ mmiri na-achụta ego, ụfọdụ ndị England na-ejikwa Bible mgbe ha na-eme njem. Nke a tọrọ ntọala maka ọrụ sara mbara nke Bible.
Ka afọ ndị 1700 na-abịa ná njedebe, Bible kpaliri ụfọdụ ndị n’England ichebara mkpa ime mmụọ nke ụmụ amaala ndị nọ n’ala ndị dịpụrụ adịpụ nke Alaeze Ukwu Britain echiche. Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile nwere nchegbu a. Ọtụtụ ndị chọọchị kwere n’akara aka, n’ihi ya kwa, ha weere ya na ọ bụ uche Chineke na a gaghị azọpụta ụfọdụ ndị. Mgbe onye gaje ịbụ onye ozi ala ọzọ bụ́ William Carey kwuru okwu na-emetụ n’ahụ iji nweta nkwado maka ịga ozi ala ọzọ n’India, otu onye ji ịba mba kwuo sị: “Enyi, nọdụ ala; mgbe Chineke chọrọ ịtọghata ndị ọgọ mmụọ, Ọ ga-eme ya n’enweghị enyemaka gị!” Ka o sina dị, Carey ji ụgbọ mmiri gaa India na 1793. N’ụzọ na-eju anya, o mesịrị sụgharịa Bible dum ma ọ bụ ụfọdụ akụkụ ya gaa n’asụsụ 35 nke India.
Ndị ozi ala ọzọ ahụ matara na ngwá ọrụ ha bụ isi bụ Bible dị n’asụsụ ndị ala ahụ. Ma, ònye ga-eweta Bible? Ọ dị mma ịmara na otu nwa agbọghọ dị afọ 16 nke sitere Wales, bụ́ Mary Jones, n’amaghị ama, kpalitere ihe omume ga-eme ka Bible gbasaa gburugburu ụwa. Na 1800, Mary gba ụkwụ ọtọ gaa kilomita 40 ịzụta otu Bible Welsh site n’aka otu onye ụkọchukwu. O jiriwo afọ isii kpakọba ego ya, mgbe Mary matakwara na e rewo Bible ahụ nile, o bere ákwá n’ihi obi ịda mbà. N’ịbụ onye o metụrụ n’ahụ nke ukwuu, onye ụkọchukwu ahụ nyere Mary otu n’ime Bible nke ya.
Mgbe e mesịrị, onye ụkọchukwu ahụ chere echiche banyere ọtụtụ ndị ọzọ Bible dị mkpa, ya na ndị enyi ya kwurịtakwara nsogbu ahụ na London. Ihe ọ rụpụtara bụ nguzobe nke Òtù Bible nke Britain na Ofesi, na 1804. Ebumnobi ya dị mfe: Inye ndị mmadụ Bible ndị ha ga-azụli n’asụsụ nke ha, nke e biri “n’etinyeghị okwu nkọwa.” Site n’ịghara itinye okwu nkọwa n’etiti ya, ndị guzobere Òtù ahụ tụrụ anya izere esemokwu metụtara nkwenkwe. Ma, ọtụtụ ugboro, Òtù Bible ahụ ga-ekewa n’ihe metụtara Apọkrịfa, baptism ime mmiri, na nkwenkwe Atọ n’Ime Otu.
Ịnụ ọkụ n’obi mbụ gbasara ngwa ngwa, ka ọ na-erulekwa 1813 e guzobewo òtù ọzọ na Germany, Netherlands, Denmark, na Russia. Ka oge na-aga, e nwekwuru òtù Bible dị iche iche ná mba ndị ọzọ. Mgbe òtù Bible ndị mbụ kwupụtara nzube ha, ha chere na ihe ka ọtụtụ n’ụwa ji nanị asụsụ ole na ole bụ isi na-eme ihe. Ọ dịghị mgbe ha chetụrụ n’echiche na e nwere ọtụtụ puku! Nanị ndị nsụgharị ole na ole maara Hibru na Grik iji mee nsụgharị gaa kpọmkwem n’asụsụ ndị obodo. N’ihi ya, mgbe Òtù Bible nke Britain na Ofesi hụrụ maka nsụgharị ụfọdụ, ndị nsụgharị ahụ na-adaberekarị nsụgharị ha na King James Version nke asụsụ Bekee.
Ule Dị Iche Iche nke Otu Onye Nsụgharị
Akụkụ dị ukwuu nke Bible nwere akụkọ na ihe atụ ndị na-adabere n’ahụmahụ a na-enwe kwa ụbọchị. Nke a na-eme ka ọ dị mfe nsụgharị karịa ka ọ gaara adị ma a sị na e ji okwu ụmị edemede nke nkà ihe ọmụma dee ya. Otú ọ dị, dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, mgbalị mbụ ndị ozi ala ọzọ ahụ mere rụpụtara mgbe ụfọdụ nsụgharị dị mgbagwoju anya ma ọ bụ ndị na-atọ ọchị. Dị ka ihe atụ, otu onye nsụgharị nyere ndị mmadụ n’otu akụkụ India echiche na Chineke bụ onye na-acha anụnụ anụnụ. Okwu e jiri mee ihe maka “nke eluigwe” n’okwu ahụ bụ “Nna nke eluigwe” pụtara “inwe ụcha nke igwe”—eluigwe nkịtị!
Banyere ihe mgbochi nke onye nsụgharị, Adoniran Judson dere na 1819, sị: ‘Mgbe anyị na-amụ asụsụ ndị bi n’akụkụ nke ọzọ nke ụwa, ndị usoro okwu ha dị ọhụrụ n’ihi ya, na ndị mkpụrụ okwu na okwu ha nile na-eyitụghị asụsụ ndị anyị zutetụworo mbụ; mgbe anyị na-enweghị akwụkwọ ọkọwa okwu ma ọ bụ ndị ntụgharị ọ bụla, anyị aghaghịkwa ịmụtatụ asụsụ ahụ tupu anyị enwee ike inwetara onwe anyị enyemaka nke nwa amaala ga-akụzi ya—nke ahụ bụ nnọọ ọrụ!’ Ọrụ ndị nsụgharị dị ka Judson mụbakwara n’ụzọ dị ukwuu ókè a pụrụ inweta Bible.—Lee chaatị dị na peji nke 12.
Ann Judson nyeere di ya aka n’ọrụ siri ike nke ime nsụgharị. Ma ezinụlọ Judson chere ihe karịrị nanị ule ọgụgụ isi ihu. Mgbe ndị ọrụ eze kpụgara Adoniram n’ụlọ nga, Ann dị ime. N’atụghị egwu, ruo ọnwa 21 o degaara ndị isi ahụ na-enweghị omume enyi akwụkwọ n’ịrịọ arịrịọ n’ihi di ya. Ahụmahụ ọjọọ ahụ na nrịanrịa kpara ya aka ọjọọ. N’oge na-adịghị anya mgbe a tọhapụsịrị Adoniram, Ann ya nwere obi ike na nwa agbọghọ nta ha nwụrụ n’ihi ahụ ọkụ. Obi gbawara Adoniram. Ma, o legaara Chineke anya maka ume ma gaa n’ihu n’ime nsụgharị, na-asụgharịcha Bible Burmese na 1835. Ka ọ dịgodị, ihe ndị ọzọ dị aghụghọ nke na-ama Bible aka nọ na-ebilite.
Esemokwu Agbaa Bible Gburugburu
N’afọ ndị 1800 e nwere oké esemokwu nke ọha na eze na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, bụ́ nke Bible kpatara mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na site ná nkwado nke eze ukwu na Chọọchị Ọtọdọks, nke Russia, a malitere Òtù Bible Russia, ka oge na-aga e kposara ha ma machibido Òtù ahụ. (Ndị na-emegide Òtù ahụ esuworị ọtụtụ puku Bible ọkụ n’ihe dị ka otu afọ bu ụzọ.) Ndị ụkọchukwu Ọtọdọks jizi ịnụ ọkụ n’obi chọọ ịkwụsị ihe ndị Kraịst oge mbụ jiworo ikpo ọkụ dị ukwuu malite—nkesa zuru ụwa ọnụ nke Bible. Ndị ndú Ọtọdọks na narị afọ nke 19 siri ọnwụ na Bible na-eyi ma ikike Chọọchị ma nke Ọchịchị egwu. N’ụzọ dị iche, ihe omume mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-apụtanụ bịara were Bible, ọ bụghị dị ka ihe na-eyi ndị ọchịchị egwu, kama nke ahụ, dị ka ngwá agha Chọọchị na Ọchịchị nwere maka ime ka ọha na eze na-erube isi. E sitere n’akụkụ abụọ ahụ wakpo Bible!
E jikwa “nkà ihe ọmụma” na-arị elu katọọ Bible n’afọ ndị sochiri. Na 1831, Charles Darwin malitere njem ụgbọ mmiri nke dugara ná nchepụta evolushọn ya. Na 1848, Marx na Engels wepụtara Communist Manifesto, na-egosipụta Iso Ụzọ Kraịst dị ka ngwá ọrụ nke mmegide. N’ime oge a kwa, ndị na-eme oké nkatọ nwere obi abụọ banyere ịbụ eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ na ịdị adị nke ndị a kọrọ akụkọ ha na Bible—ọbụna banyere Jisọs n’onwe ya! Ma ụfọdụ ndị na-eche echiche ghọtara ezighị ezi nke nchepụta ndị jụrụ Chineke na Bible, ha chọkwara iji ụzọ nkà mmụta chọpụta ikwesị ntụkwasị obi nke Bible. Otu n’ime ndị a bụ Konstantin von Tischendorf, bụ́ onye Germany nwere onyinye nkà mmụta asụsụ.
Nchọpụta Enye Aka Nwapụta Ihe Odide Bible
Tischendorf mere njem gabiga Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na-achọ ihe odide Bible oge ochie, na-enwe olileanya ịnwapụta ihe odide mbụ nke Bible n’ụzọ na-enweghị mgbagha. Na 1859, afọ ahụ Darwin bipụtara The Origin of Species, Tischendorf chọpụtara ihe bụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst kasị mee ochie a maara n’ebe obibi ndị mọnk dị na ndịda Ugwu Saịnaị. A maara ya dị ka Codex Sinaiticus, e dekwara ya n’ihe dị ka ma eleghị anya afọ 50 tupu Jerome edezuo Vulgate nke Latin. Ọ bụ ezie na a ka na-arụ ụka banyere ikwesị ekwesị nke mwepụ o wepụrụ codex n’ebe obibi ndị mọnk, Tischendorf bipụtara ya, wee si otú ahụ mee ka ndị ọkà mmụta nwee ike inweta ya.a
N’ihi na Sinaiticus so n’ime ihe odide asụsụ mbụ kasị mee ochie, ọ bụghị nanị na o kpughere na Akwụkwọ Nsọ Grik abụrụwo n’ụzọ bụ isi nke a na-agbanweghị agbanwe, kama o nyewokwara ndị ọkà mmụta aka ikpughe ndehie ihe ndị gbebataworo n’ihe odide ndị sochiri. Dị ka ihe atụ, nhota e hotara Jisọs na 1 Timoti 3:16 na Sinaiticus na-agụ, sị: “E mere ka ọ pụta ìhè n’anụ ahụ.” N’ọnọdụ “ọ,” ihe ka ọtụtụ n’ime ihe odide ndị a maara n’oge ahụ tinyere ndebiri maka “Chineke,” bụ́ nke e mere site n’ịgbanwetụ okwu Grik maka “ọ.” Otú ọ dị, e wepụtara Sinaiticus ọtụtụ afọ tupu ihe odide Grik ọ bụla nke na-agụ “Chineke.” Ya mere, o kpughere na e nwewo ngwagbu e mesịrị mee n’ihe odide ahụ, nke o doro anya na e tinyere iji kwadoo nkwenkwe Atọ n’Ime Otu.
Eri oge Tischendorf, a chọpụtawo ihe odide ndị ọzọ. Taa, ngụkọta nke ihe odide Akwụkwọ Nsọ Hibru a maara dị ihe dị ka 6,000, nke Akwụkwọ Nsọ Grik kwa, ihe karịrị 13,000. Ịmụ ihe ndị a n’ụzọ iji ihe tụnyere ibe ya emewo ka e nwee ihe odide asụsụ mbụ a pụrụ ịtụkwasị obi nke ọma. Dị ka ọkà mmụta bụ́ F. F. Bruce si kwuo ya: “Ọgụgụ ihe dịgasị iche iche . . . adịghị emetụta ajụjụ bara uru nke akụkọ ihe mere eme ma ọ bụ nke okwukwe na omume ndị Kraịst.” Ka nsụgharị Bible gaa n’asụsụ ndị ọzọ na-aga n’ihu, olee otú ihe ọmụma a ka ukwuu pụrụ isi nyere ndị mmadụ aka?
Watch Tower Society na Bible
Na 1881 otu ìgwè dị nta ma nwee obi eziokwu nke ndị nkụzi na ndị mmụta Bible guzobere ihe mesịrị bụrụ Watch Tower Bible and Tract Society. Na mbụ, ha kesara Bible ndị òtù Bible ndị ọzọ bipụtara, gụnyere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Tischendorf. Otú ọ dị, ka ọ na-erule 1890, ha abanyewo kpọmkwem n’ibipụta Bible, na-akwado nke mbụ n’ime ọtụtụ mbipụta Bible. Na 1926 Society malitere ibi Bible n’ígwè obibi akwụkwọ nke ya. Ma mkpa e nwere maka nsụgharị Bible ọgbara ọhụrụ na-apụtakwu ìhè. À pụrụ itinyekọ ihe ọmụma ndị e nwetara site ná nchọpụta na nkà mmụta nke narị afọ bu nke a ụzọ n’ime Bible a pụrụ ịghọta, nke aka pụkwara iru? N’iburu nke a n’obi, ndị ha na Society na-arụkọ ọrụ malitere iwepụta nsụgharị ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ na 1946.
Otu Nsụgharị, Ọtụtụ Asụsụ
E guzobere kọmitii nsụgharị nke ndị Kraịst e tere mmanụ nwere ahụmahụ mejupụtara iji wepụta New World Translation of the Holy Scriptures na Bekee. E bipụtara ya ná mpịakọta isii, ndị e wepụtara site na 1950 ruo 1960, na-amalite n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Kemgbe 1963 a sụgharịwo ya gaa n’asụsụ 27 ndị ọzọ, ọnụ ọgụgụ ka nke ahụ ka na-agakwa n’ihu. Ihe mgbaru ọsọ maka asụsụ ndị ọzọ abụrụwo otu ihe ahụ e nwere maka Bekee. Nke mbụ, nsụgharị ahụ kwesịrị izi ezi, na-adị nso n’echiche mbụ ahụ ruo n’ókè o kwere omume. A gaghị anwa ịgbagọ ihe ọ pụtara ikwekọ n’otu nghọta nkwenkwe. Nke abụọ, e kwesịrị ịnọgide na-enwe nkwekọ, na-eme ka nsụgharị ahụ kwekọọ n’otu okwu maka okwu ọ bụla bụ isi ruo n’ókè ezi uche nyere ohere ya. Ụzọ dị otú ahụ na-enyere ndị na-agụ ya aka ịhụ otú ndị dere Bible si jiri otu okwu kpọmkwem mee ihe. Nke atọ, nsụgharị ahụ kwesịrị ịbụ nke nkịtị ruo n’ókè o kwere omume n’ekpuchighị ihe ọ pụtara. Ịbụ nke nkịtị na-eme ka onye na-agụ ya nwee ike inweta ọdịdị nke asụsụ ndị mbụ na usoro dị iche iche nke njikọ echiche karị. Nke anọ kwa, o kwesịrị ịdịrị ndị nkịtị mfe ịgụ na ịghọta.
Ụdị nkịtị nke New World Translation Bekee na-eme ka ịsụgharị ya gaa n’asụsụ ndị ọzọ ka mfe. N’ihi nzube a ìgwè ndị nsụgharị Society e nwere ugbu a na-eji ngwá ọrụ ígwè kọmputa ọgbara ọhụrụ eme ka ọrụ ha gaa ngwa ngwa, na-emekwa ka o zie ezi karị. Usoro a na-enyere ndị nsụgharị aka ịchịkọta ihe ndepụta nke ihe okwu ndị bụ isi pụtara n’asụsụ obodo. Ọ na-enyekwara ha aka ịmụ otú ndị Bekee si sụgharịa okwu Hibru na Grik ọ bụla dị na Bible.
Ịsụgharị site na Bekee, kama ịsụgharị kpọmkwem site na Hibru na Grik, nwere abamuru ndị dị mkpa. E wezụga igbubilata oge nsụgharị, ọ na-eme ka e nwee nkwekọ nke okwu n’ụzọ ka ukwuu n’asụsụ nile. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ dị mfe karị ịsụgharị kpọmkwem site n’otu asụsụ oge a gaa n’ọzọ karịa ịsụgharị site n’otu asụsụ oge gboo gaa n’asụsụ dịgasị iche iche nke oge a. E kwuwerị, ndị nsụgharị pụrụ ijekwuru ụmụ afọ na-asụ asụsụ oge a ma ha agaghị ejekwuru ndị nke asụsụ a sụrụ ọtụtụ puku afọ gara aga.
Ozi Ọma Maka Mba Nile
A pụrụ ide ihe ka ukwuu banyere ndị ikom na ndị inyom nwere mkpebi siri ike bụ́ ndị nyeworo aka ime ka Bible bụrụ akwụkwọ pụrụ iru aka karịsịa n’ụwa. Eri ọtụtụ narị afọ, e biwo ma ọ dịkarịa ala ijeri anọ nke Bible na akụkụ dị iche iche nke Bible n’ihe karịrị asụsụ puku abụọ, nke ihe karịrị 90 pasent nke ndị bi n’ụwa na-asụ!
Bible buru amụma banyere mkpọsa zuru ụwa ọnụ nke Alaeze Chineke n’ụbọchị anyị. Iji rụzuo nke a, Jehova Chineke n’onwe ya enyewo aka n’ụzọ pụtara ìhè n’ime ka Bible bụrụ ihe fọrọ nke nta ka e nwee ya n’ụwa nile. (Matiu 13:47, 48; 24:14) Ndị nsụgharị na ndị mbipụta Bible na-adịghị atụ egwu nke oge gara aga tinyere ihe nile n’ihe ize ndụ iji nye anyị Okwu Chineke—nanị isi iyi nke ìhè ime mmụọ n’ime ụwa gbara ọchịchịrị n’ụzọ omume. Ka ihe nlereanya ha kwalie gị iji otu nkwenyesi ike ahụ gụọ Okwu ahụ, bie ndụ kwekọrọ na ya, ma kerịta ya. Ee, kwa ụbọchị, jiri Bible a pụrụ ịtụkwasị obi dị n’aka gị mee ihe n’ụzọ zuru ezu!—Aịsaịa 40:6-8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee “Ịzọpụta Codex Sinaiticus ahụ” n’Ụlọ Nche nke October 15, 1988.
[Diagram on peeji 12]
UTO E NWERE NÁ NSỤGHARỊ BIBLE
ỌNỤ ỌGỤGỤ ASỤSỤ E MERE ATỤMATỤ YA DỊ KA AFỌ SI DỊ
[Foto dị na peeji nke 12]
Ebe ndị e si nweta ha: Christianity Today, United Bible Society
Ndị Juu amalite ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Grik c. 280 T.O.A.
Jerome edepụtazuo Vulgate nke Latin c. 400 O.A.
Gutenberg edepụtazuo Bible mbụ c. 1455
E guzobe Òtù Bible nke Britain na Ofesi 1804
ỌNỤ ỌGỤGỤ ASỤSỤ
2,400
2,300
2,200
1996
2,123
1970
1,471
1,300
1,200
1,100
1950
1,049
900
800
700
600
1900
522
[Foto dị na peeji nke 8]
E kere Judson agbụ ma dọkpụpụ ya
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ Judson the Hero of Burma, nke Jesse Page dere
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 9]
Mountain High Maps® Copyright © 1995 Digital Wisdom, Inc.
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Tischendorf napụtara otu ihe odide bara uru n’ebe obibi ndị mọnk nke a na ndịda Ugwu Saịnaị
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
TO E NWERE NÁ NSỤGHARỊ BIBLE
ỌNỤ ỌGỤGỤ ASỤSỤ E MERE ATỤMATỤ YA DỊ KA AFỌ SI DỊ
Ebe ndị e si nweta ha: Christianity Today, United
Bible Society
Ndị Juu amalite ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru gaa na Grik c. 280 T.O.A.
Jerome edepụtazuo Vulgate nke Latin c. 400 O.A.
Gutenberg edepụtazuo Bible mbụ c. 1455
E guzobe Òtù Bible nke Britain na Ofesi 1804
1 • • • • • • • • • • • 12 • •
ỌNỤ ỌGỤGỤ ASỤSỤ
• • • • 35 • • • • • • 81 • •
2,400
2,300
2,200
1996
2,123
1970
1,471
1,300
1,200
1,100
1950
1,049
900
800
700
600
1900
522