Olee Ebe A Pụrụ Inweta Ezi Obi Ụtọ?
ỌTỤTỤ mmadụ na-eche na a pụrụ ịchọta obi ụtọ site n’inweta ihe onwunwe. Olee banyere gị? Ọ bụ ezie na ihe onwunwe pụrụ n’ezie iso kpata obi ụtọ anyị, ha adịghị eme ka e jide ya n’aka; ntụsara ahụ adịghịkwa ewulite okwukwe ma ọ bụ gboo mkpa ime mmụọ.
N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, ebe ọ bụ na alaeze nke eluigwe bụ nke ha.” (Matiu 5:3, NW) Jisọs kwukwara, sị: “Debekwanụ onwe unu ka unu ghara inwe anyaukwu ọ bụla: n’ihi na ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.”—Luk 12:15.
Ọtụtụ ndị na-achọ obi ụtọ site n’itinye aka ná mmekọahụ rụrụ arụ na “ọrụ nile nke anụ ahụ” ndị ọzọ. (Ndị Galetia 5:19-21) Otú ọ dị, ịdaba n’ihe ụtọ anụ ahụ adịghị eweta ezi obi ụtọ na-adịgide adịgide. N’ezie, ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa Alaeze Chineke.—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
Ndị ọzọ na-echigharịkwuru mmadụ ime n’ọchịchọ ha na-achọ obi ụtọ site n’ịgbalị iwulite ùgwù onwe onye nke ha. Akwụkwọ enyemaka onwe onye jupụtara ọtụtụ ọ́bá akwụkwọ na ebe ndị a na-ere akwụkwọ, ma ụdị mbipụta ndị ahụ ewetabereghị ndị mmadụ obi ụtọ na-adịgide adịgide. Mgbe ahụ, oleezi ebe anyị pụrụ ịchọta ezi obi ụtọ?
Iji nwee obi ụtọ n’ezie, anyị aghaghị ịghọta mkpa ime mmụọ anyị e ketara eketa. Jisọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” N’ezie, o nweghị uru ọ ga-abara anyị ịghọta mkpa a nanị ma mgbe ahụ ghara ime ihe ọ bụla banyere ya. Iji maa atụ: Gịnị ga-eme onye ọsọ ogologo jụrụ ime ihe maka ọchịchọ ahụ ya chọrọ mmiri mgbe ọ gbasịrị ọsọ ahụ? Ọ́ gaghị eche mmiri ịtakpọ n’ahụ na ihe ndị ọzọ dị oké njọ ihu n’oge na-adịghị anya? N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị aghara ime ihe banyere mkpa anyị maka ihe oriri ime mmụọ, anyị ga-emesịa kpọnwụọ n’ụzọ ime mmụọ. Nke a ga-eduje ná mfunahụ nke ọṅụ na obi ụtọ.
Jisọs ghọtara mkpa ime mmụọ ya n’ụzọ zuru ezu, na-amụ ma na-atụgharị uche n’Okwu Chineke mgbe nile. Ọ pụrụ iji ahụ iru ala chọta ma gụọ nkebi dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ, ọ kụzikwaara ndị ọzọ ime otú ahụ. (Luk 4:16-21; tụlee Ndị Efesọs 4:20, 21.) Jisọs jikwa ime uche Nna ya nke eluigwe tụnyere ihe oriri. Ime uche Chineke wetaara ya obi ụtọ dị ukwuu.—Jọn 4:34.
Ee, a pụghị inweta ezi obi ụtọ site n’inweta ihe onwunwe; inye anụ ahụ dara ada ihe ọ na-achọ adịghịkwa arụpụta obi ụtọ. Ezi obi ụtọ bụ ọnọdụ nke obi, nke dabeere n’ezi okwukwe na iso Jehova Chineke nwee mmekọrịta dị mma. Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọbụ abụ bụ́ Devid bụrụ abụ, sị: “Ndị [obi ụtọ, NW] ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.”—Abụ Ọma 144:15b.
[Foto dị na peeji nke 23]
Okwukwe na iso Chineke nwee mmekọrịta dị mma ga-ewetara gị ezi obi ụtọ