Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 5/15 p. 15-20
  • Ezi Obi Ụtọ n’Ijere Jehova Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Obi Ụtọ n’Ijere Jehova Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Dị Iche E Si Ele Obi Ụtọ Anya
  • Ihe Bụ Isi Maka Ezi Obi Ụtọ
  • Ihe Ndị Na-agbanwe Agbanwe Na-akpata Obi Ụtọ
  • Inwe Obi Ụtọ N’alụghị Di na Nwunye n’Oge Gara Aga
  • Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye ma Nwee Obi Ụtọ Taa
  • Abamuru nke Ọnọdụ Alụghị Di Ma ọ Bụ Nwunye
  • Na Gịnị Ka Ezi Obi Ụtọ Dabeere?
  • Alụmdi na Nwunye Ọ̀ Bụ Nanị Ụzọ Bụ Isi E Si Enweta Obi Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Otú E Si Enweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-efe “Chineke Bụ́ Onye Obi Ụtọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Olee Ebe A Pụrụ Inweta Ezi Obi Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 5/15 p. 15-20

Ezi Obi Ụtọ n’Ijere Jehova Ozi

“Onye ihe na-agara nke ọma [“onye obi ụtọ,” NW] ka onye ahụ bụ nke Chineke nke Jekọb bụ Onye na-enyere ya aka, nke olileanya ya dịkwasịrị Jehova, bụ́ Chineke ya.”—ABỤ ỌMA 146:5.

1, 2. Olee ihe e kwuworo banyere nkọwa nke obi ụtọ, gịnịkwa ka obi ụtọ pụtara nye ọtụtụ mmadụ taa?

GỊNỊ bụ obi ụtọ? Ndị na-akọwa okwu, ndị ọkà ihe ọmụma, na ndị ọkà mmụta ihe banyere okpukpe anọwo na-eme mgbalị ịkọwa ya ruo ọtụtụ narị afọ. Ma ha enyebeghị nkọwa nke onye ọ bụla nakweere. Akwụkwọ Encyclopædia Britannica kwetara na “‘Obi ụtọ’ bụ otu n’ime okwu ndị kasị sie ike ịkọwa.” N’ụzọ doro anya, obi ụtọ pụtara ihe dị iche iche nye ndị dị iche iche, na-adabere n’ụzọ ha si ele ndụ anya.

2 Nye ọtụtụ ndị obi ụtọ dabeere n’ezi ahụ ike, akụ na ụba, na ezi ndị enyi. Ma, ọ dị mmadụ ndị nwere ihe ndị ahụ ma ha enweghị obi ụtọ. Nye ndị ikom na ndị inyom raara onwe ha nye Jehova Chineke, Bible na-enye echiche nke obi ụtọ bụ́ nke dị nnọọ iche n’ụzọ ọha si ele ya anya.

Ụzọ Dị Iche E Si Ele Obi Ụtọ Anya

3, 4. (a) Ole ndị ka Jisọs kpọrọ ndị obi ụtọ? (b) Gịnị ka a pụrụ ịrịba ama metụta ihe ndị na-akpata obi ụtọ nke Jisọs kpọtụrụ uche na ha?

3 Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs Kraịst ekwụghị na obi ụtọ dabere n’ezi ahụ ike, akụ na ụba, na ihe yiri ya. Ọ kpọrọ ha ndị ezi obi ụtọ bụ́ “ndị bụ ogbenye n’ime mmụọ ha” na ndị “agụụ ezi omume na-agụ.” Ihe yiri ihe abụọ ndị ahụ dị mkpa a chọrọ maka ezi obi ụtọ bụ otu ụdị okwu ahụ Jisọs kwuru: “Ngọzi [(“obi ụtọ,” NW] na-adịrị ndị na-eru uju: n’ihi na ndị ahụ ka a ga-akasi obi.” (Matiu 5:3-6) N’ụzọ doro anya, Jisọs adịghị ekwu na ndị mmadụ ga-enwe obi ụtọ n’otu mgbe ahụ mgbe onye ha hụrụ n’anya nwụrụ. Kama, ọ na-ekwu banyere ndị na-eru uju n’ihi ọnọdụ mmehie ha na ihe ndị si na ya pụta.

4 Pọl onyeozi kwuru okwu banyere ihe e kere eke na-asụ ude n’okpuru mmehie ná ndabere nke olileanya nke na a “ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi.” (Ndị Rom 8:21, 22) A ga-akasi mmadụ ndị nakweere ihe Jehova nyere maka mgbaghara mmehie site n’àjà mgbapụta nke Kraịst na ndị ga-eme uche Chineke obi ma mee ka ha nwee obi ụtọ. (Ndị Rom 4:6-8) N’ozizi Elu Ugwu, Jisọs kpọkwara ha ndị obi ụtọ bụ́ “ndị dị nwayọ n’obi,” “ndị ebere,” “ndị dị ọcha n’obi,” na “ndị na-eme ka mmadụ na ibe ha dị n’udo.” O mere ka obi sie ha ike na ọbụnadị na a ga-akpagbu ha, ndị ahụ dị umeala n’obi agaghị atụfu obi ụtọ ha. (Matiu 5:5-11) Ọ bụ ihe obi ụtọ ịrịba ama na ihe ndị a na-akpata obi ụtọ e buliri elu na-edebe ndị ọgaranya na ndị ogbenye n’otu ọnọdụ.

Ihe Bụ Isi Maka Ezi Obi Ụtọ

5. Olee ihe bụ ihe ndabere nke obi ụtọ nke ndị ohu Chineke raara onwe ha nye ya?

5 Isi iyi nke ezi obi ụtọ abụghị ihe onwunwe. Eze Onye amamihe bụ́ Solomon kwuru, sị: “Ngọzi nke Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” (Ilu 10:22) Nye ihe e kere eke ndị nakweere ịbụ ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova, obi ụtọ na ngọzi nke Chineke nwere njikọ siri ike. Onye ahụ nke raara onwe ya nye nke nwere ma na-aghọta na ya nwere ngọzi Jehova nwere obi ụtọ n’ezie. N’ile ya anya n’ụzọ Bible, obi ụtọ gụnyere echiche nke afọ ojuju, na inwe ihe a rụzuru n’ozi Jehova.

6. Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị Chineke iji nwee obi ụtọ n’ezie?

6 Ezi obi ụtọ dabeere n’ezi mmekọrịta mmadụ na Jehova. Ọ dabere n’ịhụ Chineke n’anya na ikwesị ntụkwasị obi nye ya. Ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ya ji obi ha nile na-anakwere okwu ndị ahụ nke Pọl, bụ́: “N’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla n’etiti anyị nke dị ndụ n’ebe ya onwe ya nọ . . . Ọ bụ n’ebe Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nọ ka anyị na-adị ndụ . . . Anyị bụ ndị nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW].” (Ndị Rom 14:7, 8) Ya mere, a pụghị inweta ezi obi ụtọ ma ọ bụghị site n’irubere Jehova isi na iji ọṅụ doo onwe anyị n’okpuru uche ya. Jisọs kwuru, sị: “Ngọzi [“obi ụtọ,” NW] na-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke debekwa ya!”—Luk 11:28.

Ihe Ndị Na-agbanwe Agbanwe Na-akpata Obi Ụtọ

7, 8. (a) Olee otú a pụrụ isi doo ihe ndị na-akpata obi ụtọ n’usoro? (b) Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere alụmdi na nwunye na ịmụ ụmụ?

7 A pụrụ ịkpọ ihe ndị a e buru ụzọ kọwaa na-akpata obi ụtọ “ihe ndị bụ isi,” ma ọ bụ “ihe ndị na-adịgide adịgide,” n’ihi na ha bara uru nye ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ruo mgbe nile. Ọzọkwa, e nwere ihe ndị a pụrụ ikpọ ihe ndị na-agbanwe agbanwe, ihe ndị pụrụ ịrụpụta obi ụtọ n’otu oge ma n’oge ọzọ, ọ dịghị arụpụta. N’oge ndị nna ochie na oge ndị bu oge ndị Kraịst ụzọ, e lere alụmdi na nwunye na ịmụ nwa anya dị ka ihe ndị dị mkpa maka obi ụtọ. E gosiri nke a site n’okwu Rechel nọgidere na-agwa Jekọb, sị: “Nye m ụmụ, ma ọ bụrụ na i nyeghị m, onye nwụrụ anwụ ka m bụ.” (Jenesis 30:1) Omume nke a n’ebe ịmụ nwa nọ kwesịrị nzube Chineke maka oge ahụ.—Jenesis 13:14-16; 22:17.

8 E lere alụmdi na nwunye na ịmụ nwa anya dị ka ngọzi nke Chineke nyere n’etiti ndị ohu Jehova nke oge mbụ. Otú ọ dị, e jikọtara ndị a na ihe isi ike na ọnọdụ ndị ọzọ n’oge ihe mgbu n’akụkọ ihe mere eme ha. (Tụlee Abụ Ọma 127, 128 na Jeremaịa 6:12; 11:22; Abụ Akwa 2:19; 4:4, 5.) Ya mere, ọ pụtara ìhè na alụmdi na nwunye na ịmụ nwa abụghị ihe ndị na-adịgide adịgide na-akpata obi ụtọ.

Inwe Obi Ụtọ N’alụghị Di na Nwunye n’Oge Gara Aga

9. N’ihi gịnị ka ada Jefta jiri nata ịja mma kwa afọ?

9 Ọtụtụ ndị ohu Jehova achọtawo ezi obi ụtọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. N’ihi ịkwanyere nkwa nke nna ya ùgwù, ada Jefta ji ọchịchọ obi ya kwenye ịnọ n’alụghị di. Ruo oge ụfọdụ, ya na ụmụ agbọghọ ibe ya kwara ákwá banyere ọnọdụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ya. Ma lee ọṅu nke o nwere n’ije ozi oge nile n’ụlọ Jehova, ma eleghị anya, n’etiti ndị inyom “na-ezukọ n’usuu n’ọnụ ụzọ ụlọ ikwuu nzute”! (Ọpụpụ 38:8) N’ihi nke a, ọ na-anata ịja mma kwa afọ.—Ndị Ikpe 11:37-40.

10. Olee ihe Jehova chọrọ n’aka Jeremaịa, nke a ọ̀ pụtakwara na o biri ndụ nke enweghị obi ụtọ n’ihi ya?

10 N’ihi oge ndị dị ịtụnanya nke Jeremaịa na-ebi n’ime ha, Jehova nyere ya iwu ka ọ ghara ịlụ nwunye na ịmụ ụmụ. (Jeremaịa 16:1-4) Ma Jeremaịa sitere n’ahụmahụ wee mata ịbụ eziokwu nke Okwu Chineke: “Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ nke na-atụkwasị Jehova obi, onye Jehova bụ ihe ntụkwasị obi ya.” (Jeremaịa 17:7) N’oge nile nke ihe karịrị 40 afọ nke ije ozi ya dị ka onye amụma, Jeremaịa jeere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi n’alụghị nwunye. Ruo n’oke anyị maruru, ọ dịghị mgbe ọ lụrụ nwunye ma ọ bụ mụọ ụmụ. Ma, ònye ga-arụ ụka ọ bụla na Jeremaịa nwere obi ụtọ, dị ka ihe ahụ fọdụrụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị ‘rubara dị ka osimiri ruo ezi ihe Jehova’?—Jeremaịa 31:12.

11. Olee ihe atụ Akwụkwọ nsọ ụfọdụ nke ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi bụ ndị nwere obi ụtọ ọ bụ ezie na ha alụghị dị ma ọ bụ nwunye?

11 Ọtụtụ ndị ọzọ ejiriwo ọṅụ jeere Jehova ozi n’enweghị di ma ọ bụ nwunye ha lụrụ. Ha bụ ndị na-alụghị alụ ma ọlị, ndị di ha nwụrụ, ma ọ bụ ndị nwunye ha nwụrụ. N’etiti ha, e nwere onye amụma nwanyị bụ Ana; ma eleghị anya Dọkas, ma ọ bụ Tabita; Pọl onyeozi; na ihe nlereanya kasị ndị ọzọ nile—Jisọs Kraịst.

Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye ma Nwee Obi Ụtọ Taa

12. Gịnị ka ụfọdụ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye, ndị nwere obi ụtọ meworo ohere maka ya taa, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

12 Taa, e nwere ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova na-eji ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi n’enweghị di ma ọ bụ nwunye. Ụfọdụ n’ime ndị a egewo ntị n’ịkpọ òkù ahụ nke Jisọs: “Onye pụrụ ịnagide ya [onyinye nke alụghị di ma ọ bụ nwunye], ya nagide.” Ha emewo nke a “n’ihi ọdịmma nke alaeze eluigwe.” (Matiu 19:11, 12) Ya bụ, ha ejiwo nnwere onwe nke Chineke nyere ha mee ihe n’ụzọ dị mma site n’iwepụtakwu oge na ike iji kwalite ọdịmma nke Alaeze. Ọtụtụ n’ime ha na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ, ndị ozi ala ọzọ, ma ọ bụ ndị òtù ezinụlọ Betel n’isi ụlọ ọrụ nke ụwa nile nke Watch Tower Society ma ọ bụ n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ dị iche iche.

13. Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi na onye Kraịst pụrụ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ma nwee obi ụtọ?

13 Otu ezi nwanna nwanyị meworo agadi dere banyere akụkọ ndụ ya n’okpuru isiokwu nke na-akọ banyere onwe onye, bụ́ “Alụghị Di Ma Nwee Obi Ụtọ dị ka Onye Ọsụ Ụzọ.” (Ụlọ Nche, November 1, 1985, peji 23-26) Nwanna nwanyị ọzọ na-alụghị di, bụ́ onye nọworo ihe karịrị 50 afọ n’ije ozi na Betel kwuru, sị “Ndụ m na ọrụ m juru m nnọọ afọ n’ụzọ zuru ezu. Ana m arụsi ọrụ ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ n’ọrụ nke m hụrụ n’anya. Adịghị m akwa m makwaara ọ bụla. Otu mkpebi a ka m ga-eme ma o chee m ihu ọzọ.”—Ụlọ Nche, December 15, 1982, peji 15.

14, 15. (a) Dị ka Pọl onyeozi si kwuo, gịnị bụ ihe dị mkpa iji nọgide n’alụghị di ma ọ bụ nwunye? (b) N’ihi gịnị ka Pọl onyeozi ji kwuo na onye na-alụghị di ma ọ bụ nwunye ga-eme “nke ọma karị” ma nwee ‘obi ụtọ karị’?

14 Rịba okwu ahụ bụ “mkpebi” ama. Pọl dere, sị: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie n’obi ya, n’enweghị mkpa, kama nwee ike n’ebe ọchịchọ ya dị ma meekwa mkpebi nke a n’obi ya, idebe ọnọdụ amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ya, ọ ga-eme nke ọma. Ya mere onye nyefekwara ọnọdụ amaghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ya n’alụmdi na nwunye mere nke ọma ma onye na-enyefeghị ya n’alụmdi na nwunye ga-eme nke ọma karị.” (1 Ndị Kọrint 7:37, 38, NW) N’ihi gịnị ka ọ ga-eji mee “nke ọma karị”? Pọl kọwara, sị: “Ana m achọ ka unu bụrụ ndị na-adịghị echegbu onwe unu. Onye na-enweghị nwunye na-echegbu onwe ya n’ihe nke Onyenwe anyị, otú ọ pụrụ isi mee ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ. . . . Ọzọ, nwanyị na-enweghị di, na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, na-echegbu onwe ya banyere ihe nke Onyenwe anyị . . . Ma nke a ka m na-ekwu ka ọ baara unu uru onwe onye . . . ịkpali unu ime ihe kwesịrị ekwesị, na ka unu wee nọdụ n’ihu Onyenwe anyị ghara inwe uche mgbasasị.”—1 Ndị Kọrint 7:32-35, NW.

15 ‘I nọdụ n’ihu Onyenwe anyị ghara inwe uche mgbasasị’ ná nzube nke ‘ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ’ ọ̀ bụ nke na-eweta obi ụtọ? N’ụzọ doro anya Pọl chere otú ahụ. N’ikwu okwu banyere onye Kraịst nke di ya nwụrụ, o sịrị: “O nweere onwe ya ịlụ di ọ na-achọ; ma ọ bụ nanị n’ime Onyenwe anyị. Ma ngọzi [“obi ụtọ,” NW] dịkarịrị ya ma a sị na ọ nọgidere otú ọ dị, dị ka izu m sị dị: Ma ana m eche na mụ onwe m nwekwara mmụọ Chineke.”—1 Ndị Kọrint 7:39, 40.

Abamuru nke Ọnọdụ Alụghị Di Ma ọ Bụ Nwunye

16. Gịnị bụ abamuru ụfọdụ nke Ndịàmà Jehova n’alụghị di ma ọ bụ nwunye nwere?

16 Ma mmadụ ọ̀ nọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi mkpebi nke onwe onye ma ọ bụ n’ihi nrụgide nke ọnọdụ ụfọdụ, ọnọdụ alụghị di ma ọ bụ nwunye na-eweta ọtụtụ abamuru nke onwe onye. Ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-enwekarị oge maka ịmụ ihe na ịtụgharị uche. Ọ bụrụ na ha ejiri abamuru nke a mee ihe, ọnọdụ ime mmụọ ha na-adịwanye omimi. N’ihi enweghị di ma ọ bụ nwunye ha na ha ga na-ekerịta nsogbu ha, ọtụtụ na-amụta inwe ndabere dị ukwuu karị n’ebe Jehova nọ, na-achọkwa nduzi ya n’ihe nile. (Abụ Ọma 37:5) Nke a na-eweta mmekọrịta chiri anya karị n’etiti ha na Jehova.

17, 18. (a) Ohere ije ozi ndị dị iche iche dị aṅaa maka ịmụba ije ozi dịịrị ndị ohu Jehova bụ́ ndị n’alụghị di ma ọ bụ nwunye? (b) Oleekwa otu ụfọdụ ndị ohu Jehova na-alụghi di ma ọ bụ nwunye siri kọwaa obi ụtọ ha?

17 Ndị Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nwere ohere dị iche iche ịmụba ije ozi ha maka otuto Jehova. Ọzụzụ pụrụ iche a na-enye ugbu a n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi dịịrị nanị ụmụnna ndị nwoke na-alụbeghị nwunye ma ọ bụ ndị nwunye ha nwụrụ. Ụmụnna nwanyị ndị na-alụbeghị di na-enwerekwa onwe ha karị iru eru maka ihe ùgwù ije ozi dị iche iche. Nwanna nwanyị ahụ meworo agadi e kwuru banyere akụkọ ndụ ya n’oge na-adịbeghị anya wepụtara onwe ya ije ozi n’otu mba n’Africa n’oge mgbe, iji hota ihe o kwuru, ọ bụ “nwanyị dị peke peke nke karịrịla 50 afọ.” Ọ nọgidekwara n’ebe ahụ, ọbụna n’oge e nwere mmachibido iwu, mgbe a chụpụsịrị ndị ozi ala ọzọ nile. Ọ ka nọ na-eje ozi ebe ahụ dị ka onye ọsụ ụzọ, ọ bụ ezie na ugbu a ọ gafewo 80 afọ ndụ. Ọ̀ na-enwe obi ụtọ? N’akụkọ ndụ ya, o dere, sị: “Enwere m ike iji nnwere onwe m na ike njegharị nke ịnọ n’alụghị di nyere m mee ihe ịrụsi ọrụ ike n’ije ozi ahụ, nke a kwa ewetaworo m obi ụtọ dị ukwuu. . . . N’ime afọ ndị a mmekọrịta mụ na Jehova adịwo omimi. Dị ka nwanyị na-alụghị di nke nọ ná mba Africa, ahụwo m ya dị ka Onye Nchebe.”

18 Ọ bụkwa ihe dị ịrịba ama, bụ́ okwu otu nwanna nwoke nke jere ozi n’isi ụlọ ọrụ Watch Tower Society ruo ọtụtụ iri afọ. O nwere obi ụtọ, ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe ọ lụrụ nwunye, bụrụkwa ezie na o nwere olileanya nke ịga eluigwe n’enweghị olileanya ịlụ nwunye. O dere ka ọ gbara 79 afọ, sị: “Kwa ụbọchị m na-arịọ ezi Nna anyị nke eluigwe n’ekpere maka enyemaka na amamihe iji nọgide n’ọnọdụ ahụ ike ime mmụọ nakwa anụ ahụ, siekwa ike na ha ka m wee nwee ike ịnọgide na-eme uche ya. N’ime iri afọ anọ na itoolu ndị a gara aga n’ijere Jehova ozi, n’ezie enwetawo m obi ụtọ na ngọzi na ụzọ ndụ nke na-akwụghachi ụgwọ ọrụ. Sitekwa n’ebere Jehova na-erughịrị mmadụ, m na-elepụ anya n’ihu ịnọgide n’ozi nye nsọpụrụ na otuto ya na ngọzi nke ndị ya. . . . Ọṅụ nke Jehova na-enyere m aka ịnọgide na-agba mgba ọma nke okwukwe, na-elepụ anya n’ihu n’oge mgbe ndị iro nke Jehova na-agaghị adị, mgbe ụwa ga-ejupụtakwa n’otuto ya.”—Ọnụ Ọgụgụ 14:21; Nehemaịa 8:10; Ụlọ Nche, November 15, 1968, peji 699-702 (Bekee).

Na Gịnị Ka Ezi Obi Ụtọ Dabeere?

19. Na gịnị ka obi ụtọ anyị ga-anọgide na-adabere?

19 Mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke anyị na Jehova, nnwapụta ya, na ngọzi ya—ndị a bụ ihe ndị ga-ewetara anyị ezi obi ụtọ ruo mgbe nile ebighị ebi. N’ile nke a anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ebe ihe ndị na-eweta ezi obi ụtọ nọ, ọbụna ndị ohu Jehova na-alụghị di ma ọ bụ nwunye na-aghọta na alụmdi ma ọ bụ nwunye ha abụghị ihe ka mkpa ná ndụ ha. Ha na-aṅa ntị ndụmọdụ Pọl onyeozi nke kwuru, sị: “Ma nke a ka m na-ekwu, ụmụnna m, e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ, ka ndị nwere nwunye wee dị ka ha enweghị site n’ugbu a.” (1 Ndị Kọrint 7:29) Nke a apụtaghị ilelị nwunye ha anya. Ndị Kraịst tozuru òkè bụ di na-etinye ozi Jehova n’ihe mbụ, otú a kwa ka nwunye ha ndị na-asọpụrụ Chineke, ndị na-ahụ n’anya, na ndị na-enye nkwado na-eme, ọbụna ụfọdụ n’ime ha na-eje ozi oge nile dị ka ndị bụ di ha.—Ilu 31:10-12, 28; Matiu 6:33.

20. Omume dị aṅaa kwesịrị ekwesị ka ọtụtụ ndị Kraịst nwere n’ebe ihe ùgwù nke alụmdi na nwunye ha nọ?

20 Ụmụnna ndị ikom bụ́ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị na-eje ozi afọ afufo na Betel, ndị okenye ọgbakọ—n’ezie, ndị Kraịst nile bụ́ ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ndị na-etinye ọdịmma Alaeze n’ihe mbụ—‘adịghị ejibiga ụwa eme ihe’; ha na-arụ ọrụ iji kwekọọ n’ihe ùgwù nile nke alụmdi na nwunye ha n’ime ndụ nke nrara onwe ha nye n’ozi Jehova. (1 Ndị Kọrint 7:31) Ma, ha nwere obi ụtọ. N’ihi gịnị? N’ihi na echiche ka ukwu nke obi ụtọ ha abụghị alụmdi ha kama ozi ha na-ejere Jehova. Ma ọtụtụ ndị bụ di na ndị bụ nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi—ee, na ụmụ ha kwa—nwere obi ụtọ n’ihi na ọ dị otú a.

21, 22. (a) N’ihi ihe Jeremaịa 9:23, 24 kwuru, gịnị kwesịrị ime ka anyị jupụta n’obi ụtọ? (b) Ihe ndị dị aṅaa na-eweta obi ụtọ ka a kpọtụrụ uche n’Ilu 3:13-18?

21 Onye amụma bụ Jeremaịa dere, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, ka onye nke maara ihe ghara inya isi n’amamihe ya, ka dike ghara ịnya isi n’ịdị ike ya, ka ọgaranya ghara ịnya isi n’akụ ya: kama, onye na-anya isi, ya nyaa isi na nke a, na o nwere uche n’ebe m nọ, wee mara m, na mụ onwe m bụ Jehova Nke na-eme ebere na ikpe ziri ezi na ezi omume n’ụwa: n’ihi na ihe ndị a atọwo m ụtọ; ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”—Jeremaịa 9:23, 24.

22 Ma ànyị bụ ndị na-alụghị di na nwunye ma ọ bụ na anyị lụrụ, isi iyi anyị kasị ukwuu nke obi ụtọ kwesịrị ịbụ ihe ọmụma anyị banyere Jehova na nkweta anyị nwere banyere ngọzi ya anyị na-enweta n’ihi na anyị na-eme uche ya. Anyị nwekwara obi ụtọ inwe nghọta nke ihe mejupụtara ezi ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe ndị bara uru, ihe ndị na-atọ Jehova ụtọ. Eze Solomon nke lụrụ ọtụtụ ndị inyom eleghị alụmdi na nwunye anya dị ka nanị ụzọ e si enweta obi ụtọ. O sịrị: “Onye ihe na-agara nke ọma [“onye obi ụtọ,” NW] ka mmadụ nke chọtaworo amamihe bụ, ya na mmadụ nke na-enwepụta nghọta. N’ihi na ọzụzụ ahịa dị mma karị ọzụzụ ahịa ọla ọcha, uru ya dị mma karịa ọla edo ọma. Ihe dị oké ọnụ ahịa ka ọ bụ karị ruby: ihe nile kwa nke na-atọ gị ụtọ, ha agaghị aha ka ya. Ụbọchị ndụ dị ogologo dị n’aka nri ya; n’aka ekpe ya ka akụ na nsọpụrụ dị. Ụzọ ya nile bụ ụzọ nke ịdị ụtọ, okporo ụzọ ya nile bụkwa udo. Osisi na-enye ndụ ka ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka: ee, onye ọ bụla nke na-ejisi ya aka ike bụ onye ihe na-agara nke ọma.”—Ilu 3:13-18.

23, 24. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee obi ike na ndị ohu Jehova nile na-ekwesị ntụkwasị obi ga-enwe obi ụtọ n’ime usoro ihe ọhụrụ?

23 Ka ndị ahụ lụrụ di na nwunye n’ime anyị chọta ọṅụ n’ime uche Chineke. Ka ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi nhọrọ ma ọ bụ nrụgide nke ọnọdụ dị iche iche tachie obi n’ọnwụnwa ha nile ma chọtakwa obi ụtọ na afọ ojuju n’ijere Jehova ozi ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi. (Luk 18:29, 30; 2 Pita 3:11-13) N’usoro ihe ọhụrụ Chineke nke na-abịanụ, a ga-asaghe “akwụkwọ dị iche iche.” (Mkpughe 20:12) Ndị a ga-enwe iwu na ụkpụrụ ọhụrụ dị iche iche na-akpata obi ụtọ nke ụmụ mmadụ ndị na-erube isi.

24 N’eziokwu, anyị pụrụ ijide n’aka na “Chineke obi ụtọ” anyị nwere ọtụtụ ihe mara mma ọ kwadebeere anyị nke ga-arụpụta obi ụtọ zuru ezu nye anyị. (1 Timoti 1:11) Chineke ga-anọgide ‘na-emeghe aka ya, iwere ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’ (Abụ Ọma 145:16) Ka a sịnụ ihe mere e ji nwee ma ga-enwe mgbe nile obi ụtọ n’ijere Jehova ozi.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?

◻ Gịnị bụ ihe ndabere maka obi ụtọ nke ndị ohu Jehova raara onwe ha nye?

◻ N’oge Bible, ole ndị bụ ụfọdụ ndị ohu Jehova na-alụghị di ma ọ bụ nwunye, bụ́ ndị nwere obi ụtọ?

◻ N’ihi gịnị ka Pọl jiri jaa alụghị di ma ọ bụ nwunye mma, oleekwa otú ụfọdụ ndị Kraịst siworo chọpụta nke a ịbụ ndụ obi ụtọ?

◻ Na gịnị ka obi ụtọ anyị ga-adabere mgbe nile?

◻ N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee obi ike na ndị nile na-ekwesị ntụkwasị obi ga-enwe obi ụtọ n’usoro ihe ọhụrụ?

[Foto dị na peeji nke 16]

Ọtụtụ ụmụnna nwanyị ji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi dị ka ndị ozi oge nile

[Foto dị na peeji nke 18]

Ije ozi maka ọdịmma nke Jehova bụ ụzọ bụ isi e si enweta obi ụtọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya