Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs
Otú E Si Enweta Obi Ụtọ
Olee ihe na-eweta obi ụtọ?
▪ Okwu mbụ Jizọs kwuru n’ozizi ya a kacha mara amara bụ obi ụtọ. O kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Olee ihe o bu n’uche? Gịnị bụ mkpa ime mmụọ anyị?
Iji dịgide ndụ, ọ dị anyị mkpa iku ume, ịṅụ mmiri, na iri nri, dịkwa ka ọ dị ụmụ anụmanụ. Ma, iji nwee obi ụtọ, anyị nwere mkpa nke ụmụ anụmanụ na-enweghị—mkpa ịghọta nzube nke ndụ. Ọ bụ naanị Onye kere ndụ nwere ike igbo mkpa ahụ. N’ihi ya, Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” (Matiu 4:4) Ndị maara mkpa ime mmụọ ha na-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-abịaru Jehova, bụ́ “Chineke bụ́ onye obi ụtọ,” nso, ọ na-enyekwa ha ihe dị ha mkpa iji nwee obi ụtọ—olileanya.—1 Timoti 1:11.
Olee otú Jizọs si mee ka ndị mmadụ nwee olileanya?
▪ Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5) Jizọs mere ka ụmụ mmadụ nwee olileanya site n’ịgwọ ndị ọrịa na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ịdịghachi ndụ n’ụwa. O jikwa ozi olileanya bịa. Ọ kọwara, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ụmụ mmadụ ndị na-erubere Chineke isi ga-adị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. Ì nwere ike ichetụ n’echiche otú ọ ga-adị gị ibi n’etiti ndị dị nwayọọ n’obi, n’enweghị mgbe ị ga-aka nká? Ka a sịkwa ihe mere Okwu Chineke ji kwuo, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’olileanya ahụ.” (Ndị Rom 12:12) Jizọs kwukwara otú e nwere ike isi nweta obi ụtọ ugbu a.
Olee ụdị ndụ na-eweta obi ụtọ Jizọs kụziiri ndị mmadụ ibi?
▪ Jizọs nyere ndụmọdụ ndị bara uru banyere ihe ndị dị ka otú mmadụ na ndị ọzọ nwere ike isi na-emekọrịta ihe, alụmdi na nwunye, ịdị umeala n’obi, na otú mmadụ kwesịrị isi na-ele ihe onwunwe anya. (Matiu 5:21-32; 6:1-5, 19-34) Ịgbaso ndụmọdụ Jizọs ga-enyere gị aka inwe obi ụtọ.
Imesapụ aka na-eweta obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru, sị: “Mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị nwere nkwarụ, ndị ngwọrọ, ndị ìsì; ị ga-enwekwa obi ụtọ, n’ihi na ha enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ gị ụgwọ.” (Luk 14:13, 14) Ndị na-enweta obi ụtọ abụghị ndị na-achọ ya maka onwe ha, kama ọ bụ ndị na-achọ ya maka ndị ọzọ.
Olee ihe kacha eweta obi ụtọ?
▪ Imere ndị ọzọ ihe nwere ike ime ka i nwee obi ụtọ, ma imere Chineke ihe ga-aka eme gị obi ụtọ. Obi ụtọ ị ga-enweta ga-akarịdị nke nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya ma jiri ha na-eme ọnụ na-enwe. Ihe mere otu mgbe ka Jizọs na-akụziri ìgwè mmadụ ihe mere ka nke a doo anya. “Otu nwaanyị n’ime ìgwè mmadụ ahụ ji oké olu sị ya: ‘Obi ụtọ na-adịrị afọ buru gị na ara ị ṅụrụ!’ Ma ọ sịrị: ‘Ee e, kama nke ahụ, Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!’”—Luk 11:27, 28.
Jizọs n’onwe ya nwetara obi ụtọ na afọ ojuju n’ime uche Nna ya nke eluigwe. Uche Chineke bụ ka ndị mmadụ nụ banyere olileanya nke ndụ ebighị ebi. Otu mgbe, mgbe Jizọs kọwachaara otu onye nwere mmasị olileanya a, Jizọs kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m.” (Jọn 4:13, 14, 34) I nwekwara ike inweta obi ụtọ na-adị n’ime ihe masịrị Chineke site n’ịkọrọ ndị ọzọ eziokwu ndị dị na Baịbụl.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ isi 1 nke akwụkwọ a, Gịnị n’Ezie ka Bible Na-akụzi? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 16]
Anyị na-enweta ezi obi ụtọ site n’igbo mkpa anyị nwere ịghọta nzube nke ndụ