Ihe Mere Ọrụ Ebube Nanị Adịghị Ewulite Okwukwe
A HỤ n’anya e kwere. Nke ahụ bụ echiche ọtụtụ ndị mmadụ. Ụfọdụ na-asị na ha ga-ekwere na Chineke ma ọ bụrụ na ọ ga-ekpughe onwe ya n’ụzọ ụfọdụ nke ọrụ ebube. Ikekwe ọ dị otú ahụ, ma ụdị nkwenkwe ahụ ọ̀ na-eduje n’ezigbo okwukwe?
Tụlee ndị Israel bụ́ Kora, Detan, na Abaịram. Bible na-egosi na ha ji anya ha hụ ọrụ ebube ndị a na-akpali egwu ndị sitere n’aka Chineke: ihe otiti iri n’ahụ Ijipt, nlanarị nke mba Israel gabiga n’Osimiri Uhie, na mkpochapụ nke Fero Ijipt na usuu ndị agha ya. (Ọpụpụ 7:19–11:10; 12:29-32; Abụ Ọma 136:15) Kora, Detan, na Abaịram nụkwara ka Jehova sitere n’eluigwe kwuo okwu n’Ugwu Saịnaị. (Deuterọnọmi 4:11, 12) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị anya mgbe ọrụ ebube ndị a weresịrị ọnọdụ, ndị ikom atọ a kpaliri nnupụisi megide Jehova na ndị ohu ya a họpụtara ahọpụta.—Ọnụ Ọgụgụ 16:1-35; Abụ Ọma 106:16-18.
Ihe dị ka afọ 40 n’ihu, otu onye amụma aha ya bụ Belam hụkwara otu ọrụ ebube. Ọbụna ntinye aka nke mmụọ ozi egbochighị ya n’ịdụnyere ndị iro Chineke, bụ́ ndị Moab úkwù. N’agbanyeghị ọrụ ebube ahụ, Belam gara n’ihu wee were nguzo megide Jehova Chineke na ndị Ya. (Ọnụ Ọgụgụ 22:1-35; 2 Pita 2:15, 16) Otú ọ dị, enweghị okwukwe nke Belam adịtụghị ihe ọ bụ ma e were ya tụnyere nke Judas Iskarịọt. N’agbanyeghị ịbụ onye ya na Jisọs kpachiri anya na onye ji anya ya hụ ọtụtụ ọrụ ebube ndị pụrụ iche, Judas raara Kraịst nye maka mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.—Matiu 26:14-16, 47-50; 27:3-5.
Ndị ndú okpukpe ndị Juu makwaara banyere ọtụtụ ọrụ ebube nke Jisọs. Mgbe ọ kpọlitesịrị Lazarọs n’ọnwụ, ọbụna na ha kwetara, sị: “Nwoke a na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama.” Ma ịhụ Lazarọs dị ndụ ugbu a ò mere ka obi ha dị nro ma mee ka ha nwee okwukwe? Ee e, ma ọlị. Kama nke ahụ, ha kpara nkata igbu ma Jisọs ma Lazarọs!—Jọn 11:47-53; 12:10.
Ọbụna aka Chineke tinyere n’onwe ya emepụtalighị okwukwe n’ime ndị ikom ọjọọ ahụ. Mgbe Jisọs nọ n’ógbè ụlọ nsọ ahụ n’otu oge, o kpere ekpere n’olu dara ụda, sị: “Nna, nye aha Gị otuto.” Jehova ji olu sitere n’eluigwe zaghachi, sị: “Enyere m ya otuto, M ga-enyekwa Ya otuto ọzọ.” Ma, ihe omume ọrụ ebube a emepụtaghị okwukwe n’obi nke ndị nọ n’ebe ahụ. Bible na-asị: “Ọ bụ ezie na O mererịị ọtụtụ ihe ịrịba ama dị otú a n’ihu ha, ma ha ekweghị na Ya.”—Jọn 12:28-30, 37; tụlee Ndị Efesọs 3:17.
Ihe Mere na Ọrụ Ebube Ewuliteghị Okwukwe
Olee otú enweghị okwukwe dị otú ahụ pụrụ isi dịrị n’agbanyeghị ọrụ ebube dị iche iche? Ọjụjụ ndị ndú okpukpe ndị Juu jụrụ Jisọs yiri ihe dị mgbagwoju anya karịsịa mgbe ị tụlere na kpọmkwem n’oge ọ malitere ozi ya, ndị Juu n’ozuzu ha “nọ na-ele anya” “Kraịst ahụ,” ma ọ bụ Mesaịa ahụ. (Luk 3:15) Otú ọ dị, ebe nsogbu dị bụ n’ihe ndị ha nọ na-ele anya ha. Onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ W. E. Vine hotara otu onye ọkà mmụta Bible a ma nke ọma dị ka onye na-asị na echiche nke Mesaịa onye ga-enye ha “mmeri ndụ elu ala” na “ụba ihe onwunwe” na-agba ndị Juu ara. N’ihi ya, ha adịghị njikere maka Jisọs nke Nazaret dị umeala n’obi, onye na-adịghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, bụ́ onye pụtara n’etiti ha dị ka ezi Mesaịa ahụ na 29 O.A. Ndị ndú okpukpe ahụ tụkwara egwu na nkụzi Jisọs ga-akpaghasị ọnọdụ dịnụ ma tinye ọkwá ha dị elu n’ihe ize ndụ. (Jọn 11:48) Echiche ndị ha bu ụzọ nwee na ịchọ ọdịmma onwe ha mere ka ha ghara ịmata ihe ọrụ ebube nke Jisọs pụtara.
Ndị ndú okpukpe ndị Juu na ndị ọzọ jụrụ nnwapụta sitere n’ụzọ ọrụ ebube na ụmụazụ Jisọs nwetara ihu ọma Chineke. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị ozi ya gwọrọ otu nwoke dara ngwụrọ site n’ọmụmụ, ndị òtù nke ụlọikpe ukwu ndị Juu iwe na-ewe jụrụ, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme mmadụ ndị a? n’ihi na ọ pụtara ìhè nye ndị nile bi na Jerusalem, na ọ bụ ezie na e mewo ihe ịrịba ama a maara nke ọma site n’aka ha; anyị apụghịkwa ịgọ ya. Ma ka o wee ghara ịgbasa karị n’etiti ndị Juu, ka anyị baara ha mba, ka ha ghara ịgwa mmadụ ọ bụla okwu n’aha nke a site n’ugbu a.” (Ọrụ 3:1-8; 4:13-17) N’ụzọ doro anya, ọrụ ebube a magburu onwe ya ewuliteghị ma ọ bụ mepụta okwukwe n’obi ndị ikom ahụ.
Oké ọchịchọ, nganga, na anyaukwu bụ ihe ndị kpaliworo ọtụtụ ndị imechi ụzọ nke obi ha. Nke a yiri ka ọ bụ ihe mere n’ọnọdụ Kora, Detan, na Abaịram, ndị a kpọrọ aha ná mmalite. Ekworo, egwu, na ọtụtụ àgwà ọjọọ ndị ọzọ egbochiwo ndị ọzọ. A na-echetakwara anyị banyere ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ndị n’otu oge nwere ihe ùgwù nke ile ihu Chineke n’onwe ya anya. (Matiu 18:10) Ha enweghị obi abụọ banyere ịdị adị nke Chineke. N’ezie, “ndị mmụọ ọjọọ kwekwara, wee kụja.” (Jemes 2:19) N’agbanyeghị nke ahụ, ha enweghị okwukwe n’ebe Chineke nọ.
Ihe Ezi Okwukwe Pụtara
Okwukwe karịrị nkwenkwe nkịtị. Ọ karịkwara mmeghachi omume nwa oge n’ụzọ mmetụta uche nye ọrụ ebube. Ndị Hibru 11:1 na-asị: “Okwukwe bụ ndabere nke ihe a na-ele anya, bụrụkwa nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya.” Onye nwere okwukwe kwenyere n’obi ya na ihe ọ bụla Jehova Chineke kwere ná nkwa ga-emezurịrị. Ọzọkwa, nnwapụta a na-apụghị ịgọpụ agọpụ nke ihe dị adị a na-adịghị ahụ anya dị ike nke ukwuu nke na a na-asị na okwukwe n’onwe ya na ihe àmà ahụ bụ otu ihe. Ee, okwukwe dabeere n’ihe àmà. N’oge ndị gakwara aga, ọrụ ebube keere òkè ná nzụlite nke okwukwe ma ọ bụ n’iwulite ya. Ihe àmà ndị Jisọs mere jere ozi ime ka ndị ọzọ kwere na ọ bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. (Matiu 8:16, 17; Ndị Hibru 2:2-4) N’otu aka ahụ, onyinye dị otú ahụ nke mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ Chineke, dị ka iji ọrụ ebube agwọ ọrịa na ịsụ asụsụ dị iche iche gosiri na ndị Juu enwekwaghị ihu ọma Jehova kama na nnwapụta ya dị ugbu a n’ahụ ọgbakọ ndị Kraịst, nke Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, guzobere.—1 Ndị Kọrint 12:7-11.
Ihe so n’onyinye ọrụ ebube nke mmụọ nsọ bụ ikike ibu amụma. Mgbe ndị na-ekweghị ekwe hụrụ ọrụ ebube a, a kwaliri ụfọdụ ife Jehova ofufe, na-ekwupụta, sị: “Ọ bụ ezie na Chineke nọ n’etiti unu.” (1 Ndị Kọrint 14:22-25) Otú ọ dị, Jehova Chineke ebughị n’obi na ọrụ ebube ga-abụ akụkụ ga-adịgide adịgide nke ofufe ndị Kraịst. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụrụ na ibu amụma dị, a ga-eme ka ha ghara ịdị irè; ọ bụrụkwa na asụsụ dị iche iche dị, ha ga-agwụ.” (1 Ndị Kọrint 13:8) Dị ka ihe àmà na-egosi, onyinye ndị a kwụsịrị n’ọnwụ nke ndị ozi na ndị nataworo ụdị onyinye ndị ahụ n’aka ha.
À ga-ahapụ ndị mmadụ n’enweghị ihe ndabere maka okwukwe? Ee e, n’ihi na Pọl sịrị: “[Chineke] ahapụghị Onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe Ọ na-eme ezi ihe, na-enyekwa unu mmiri ozuzo na oge mkpụrụ site n’eluigwe, na-emeju obi unu n’ihe ọzụzụ na ọṅụ.” (Ọrụ 14:17) N’ezie, nye ndị obi ha ziri ezi dị njikere imeghe uche na obi ha nye ihe àmà ndị gbara anyị gburugburu, ‘ihe Jehova Chineke anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke, bụ́ ike ebighị ebi Ya na ụdị Chineke Ya; ka ha [ndị na-agọnarị Chineke] ghara inwe ngọpụ.’—Ndị Rom 1:20.
A chọrọ ihe karịrị ikwere n’ịdị adị nke Chineke. Pọl gbara ume, sị: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa Ya ezi ụtọ nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) A pụrụ ime nke a site n’iji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ site n’enyemaka nke mbipụta ndị Kraịst, dị ka magazin a. Okwukwe nke dabeere n’ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke, bụ́ Bible, abụghị ihe na-esighị ike ma ọ bụ na-emighị emi. Ndị ghọtaworo uche Chineke ma na-eme ya n’okwukwe na-ejere Chineke ozi dị nsọ.—Ndị Rom 12:1.
Ikwere Ọ Bụ Ezie na A Hụghị n’Anya
O siiri Tọmas onyeozi ike ikwere ná mbilite n’ọnwụ Jisọs. “Ọ bụrụ na ahụghị m n’aka Ya abụọ apa ntú, tinyekwa mkpịsị aka m n’apa ntú ahụ, tinyekwa aka m n’akụkụ Ya, m gaghị ekwe ma ọlị,” ka Tọmas kwupụtara. Mgbe Jisọs mesịrị nwoghara anụ ahụ nke gosipụtara ọnyá nke mkpọgbu ya, Tọmas zaghachiri nke ọma n’ọrụ ebube a. Otú ọ dị, Jisọs sịrị: “Ngọzi na-adịrị ndị aka-ahụghị, ma ha kwere.”—Jọn 20:25-29.
Taa, ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova “sitere n’okwukwe na-ejegharị, ọ bụghị n’ọhụhụ ụzọ.” (2 Ndị Kọrint 5:7) Ọ bụ ezie na ha ahụghị ọrụ ebube ndị ahụ e dekọrọ na Bible, ha kwenyesiri ike na ndị a mere. Ndịàmà na-egosipụta okwukwe na Chineke na Okwu ya. Site n’enyemaka mmụọ ya, ha nwere ike ịghọta ozizi Bible na isiokwu ya bụ isi—iwepụ ọbụbụeze Jehova Chineke n’ụta site n’Alaeze eluigwe ya. (Matiu 6:9, 10; 2 Timoti 3:16, 17) N’inwe abamuru dị ukwuu nye onwe ha, ezigbo ndị Kraịst a na-etinye ndụmọdụ amamihe nke Bible n’ọrụ ná ndụ ha. (Abụ Ọma 119:105; Aịsaịa 48:17, 18) Ha na-anakwere nnwapụta a na-agaghị agbagha agbagha na amụma Bible na-aka oge anyị akara dị ka “mgbe ikpeazụ,” ha nwekwara okwukwe na ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa dị nnọọ nso. (2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:3-14; 2 Pita 3:13) Nye ha ọ bụ ihe ọṅụ isoro ndị ọzọ kerịta ihe ọmụma Chineke. (Ilu 2:1-5) Ha maara na ọ bụ nanị site n’ịmụ Akwụkwọ Nsọ ka ndị na-achọ Chineke pụrụ n’ezie ịchọta ya.—Ọrụ 17:26, 27.
Ì chetara Albert, onye a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu nke a ụzọ? Ụbọchị ole na ole mgbe a na-azaghị ekpere ya maka otu ọrụ ebube, otu n’ime Ndịàmà Jehova letara ya, bụ́ otu agadi nwanyị hapụụrụ ya ụfọdụ akwụkwọ dabeere na Bible. Mgbe nke ahụ gasịrị Albert nakweere ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Ka ọ matara ozi Bible nke ọma karị, ndakpọ olileanya ya ghọrọ ihe mkpali. Ọ malitere ịghọta na ya emesịwo chọta Chineke.
Akwụkwọ Nsọ na-agba ume, sị: “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta Ya, kpọkuonụ Ya mgbe Ọ nọ nso.” (Aịsaịa 55:6) Ị pụrụ ime nke a, ọ bụghị site n’ichere otu ọrụ ebube oge a site n’aka Chineke, kama site n’inweta ezi ihe ọmụma nke Okwu ya. Nke a bụ ihe a chọrọ, n’ihi na nanị ọrụ ebube adịghị ewulite okwukwe.
[Foto dị na peeji nke 5]
Ọbụna mbilite n’ọnwụ nke Lazarọs n’ụzọ ọrụ ebube akwalighị ndị iro Jisọs igosipụta okwukwe
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Okwukwe aghaghị ịdabere n’ezi ihe ọmụma nke Bible