Ozi Ọsụ Ụzọ—Ọ̀ Dịịrị Gị?
1 “Apụghị m iche n’echiche ime ihe ọ bụla ọzọ. Enwetụghị m ike icheli n’echiche ihe ọ bụla nke ga-eweta otu ụdị ọṅụ ahụ.” Ònye kwuru nke a? Ọ bụ otu n’ime ọtụtụ narị puku Ndịàmà Jehova ndị meworo ozi oge nile ọrụ na-enye ha ọṅụ ná ndụ. Ì jiriwo ekpere tụlee ma ozi ọsụ ụzọ ọ̀ dịịrị gị? Ebe anyị rarawooro onwe anyị kpam kpam nye Jehova, anyị kwesịrị n’ezie ịtụle ma anyị pụrụ ikerekwu òkè zuru ezu n’ịgbasa ozi ọma Alaeze ahụ. Iji mezuo nke ahụ, biko tụlee ajụjụ ụfọdụ nke ọtụtụ ndị na-ajụ banyere ozi ọsụ ụzọ.
AJỤJỤ NKE 1: “Ụfọdụ na-ekwu na ịsụ ụzọ adịghịrị mmadụ nile. Olee otú m ga-esi mara ma ọ̀ dịịrị m?”
2 Azịza ya dabeere n’ọnọdụ gị na ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ ndị i nwere. E nwere ọtụtụ ndị ahụ ike ha ma ọ bụ ọnọdụ ha ugbu a ná ndụ na-enyeghị ohere itinye hour 90 kwa ọnwa n’ozi. Were dị ka ihe atụ ọtụtụ ụmụnna nwanyị na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwunye na nne bụ́ ndị Kraịst. Ha na-ekere òkè n’ozi ọtụtụ mgbe ruo n’ókè ọnọdụ ha nyere ha ohere. Dị ka ohere si dapụta, ha na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka otu ọnwa ma ọ bụ karị kwa afọ, na-enweta ọṅụ ndị na-abịa site n’ịmụba òkè ha na-ekere n’ozi. (Gal. 6:9) Ọ bụ ezie na ọnọdụ ha nwere ike ghara ikwe ha jee ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile ugbu a, ha na-akwalite mmụọ ịsụ ụzọ ma bụrụ ngọzi nye ọgbakọ dị ka ndị nkwusa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi.
3 N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị ndị na-enwekebeghị ibu ọrụ emewo ohere maka ozi ọsụ ụzọ site n’ịgbanwe ihe ndị ha butere ụzọ. Olee banyere gị? Ị̀ bụ onye ntorobịa nke gụsịworo akwụkwọ? Ị̀ bụ nwunye nke di ya nwere ike inyezu ezinụlọ ya ihe ndị dị ya mkpa? Ì nwere di ma ọ bụ nwunye ma ghara inwe ụmụaka na-adabere n’ebe ị nọ? Ị̀ lawo ezumike nká n’ọrụ ego gị? Ịsụ ụzọ ma ọ bụ asụghị ụzọ bụ mkpebi onye ọ bụla na-aghaghị imere onwe ya. Ajụjụ bụ, Ị̀ pụrụ ime ohere ná ndụ gị maka ịsụ ụzọ?
4 Setan na-eji usoro ihe ya nke ụwa emejupụta ndụ anyị n’ihe ndọpụ uche dị iche iche na iji ụzọ ndụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị rikpuo anyị. Ọ bụrụ na anyị ekpebisie ike ịnọgide n’abụghị akụkụ nke ụwa, Jehova ga-enyere anyị aka ibute ọdịmma Alaeze ụzọ na iru na inweta ihe ùgwù nile nke ije ozi ọchịchị Chineke ndị anyị pụrụ inweta. Ọ bụrụ na ị pụrụ ime mgbanwe n’ọnọdụ gị iji jee ozi dị ka onye ọsụ ụzọ, gịnị mere na ị gaghị eme otú ahụ?
AJỤJỤ NKE 2: “Olee otú m pụrụ isi jide n’aka na m ga-enwe ego iji kwadoo onwe m n’ozi oge nile?”
5 Ọ bụ eziokwu na n’ọtụtụ ala hour ole a chọrọ n’ọrụ ego kwa izu iji nweta ihe ndị a na-ewere dị ka ihe ndị dị mkpa ná ndụ amụbawo n’afọ ndị gafeworonụ. Ka o sina dị, ọtụtụ ndị asụwo ụzọ ruo ọtụtụ iri afọ, Jehova anọgidewokwa na-akwado ha. Iji nwee ihe ịga nke ọma dị ka onye ọsụ ụzọ, a chọrọ okwukwe na mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. (Mat. 17:20) Anyị nwere mmesi obi ike ahụ dị n’Abụ Ọma 34:10 na “ndị na-achọ Jehova, ọ dịghị ezi ihe ọ bụla ga-akọ ha.” Onye ọ bụla na-abanye n’ozi ọsụ ụzọ kwesịrị iji obi ike zuru ezu na Jehova ga-enye ya ihe ndị dị mkpa wee banye. Ọ na-emere nnọọ ndị ọsụ ụzọ na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’ebe nile nke ahụ! (Abụ Ọma 37:25) N’ezie, n’ikwekọ n’ụkpụrụ ndị dị ná 2 Ndị Tesalọnaịka 3:8, 10, na 1 Timoti 5:8, ndị ọsụ ụzọ adịghị atụ anya ka ndị ọzọ na-akwado ha n’ụzọ ego.
6 Onye ọ bụla nke na-eche echiche ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ kwesịrị ime dị ka Jisọs kwuru: ‘Ibu ụzọ nọdụ ala gụọ ego ọ ga-ewe.’ (Luk 14:28) Ime nke a na-egosi ezi amamihe. Soro ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’ịsụ ụzọ ruo ọtụtụ afọ kwurịta okwu. Jụọ ha otú Jehova siworo kwadoo ha. Onye nlekọta sekit unu bụ onye ọsụ ụzọ nwere ahụmahụ, bụ́ onye ga-enwe obi ụtọ ịtụ aro banyere ụzọ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ozi oge nile.
7 Mmadụ nwere ike ọ gaghị ahụ n’ụzọ zuru ezu ịbụ eziokwu nke nkwa Jisọs dị na Matiu 6:33 ma ọlị ruo mgbe o tinyere onwe ya n’aka Jehova. Otu onye ọsụ ụzọ na-ekwesị ntụkwasị obi kọrọ, sị: “Mgbe mụ na onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ bịarutere n’ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ dị ka ndị ọsụ ụzọ, anyị nwere nanị akwụkwọ nri ole na ole, otu ngwugwu bọta, ego adịghịkwa. Anyị richara nri anyasị wee sị, ‘Ugbu a anyị enweghị ihe ọ bụla maka echi.’ Anyị kpere ekpere banyere ya, wee lakpuo ụra. N’isi ụtụtụ echi ya otu Onyeàmà nọ n’ógbè ahụ kpọtụụrụ anyị, wee kọwaa onwe ya, na-asị, ‘M kpere ekpere na Jehova ga-ezite ndị ọsụ ụzọ. Ugbu a apụrụ m isoro unu ihe ka ọtụtụ n’ụbọchị, ma ebe m bi n’ime ime obodo, m ga-eso unu rie nri ehihie, ya mere m bu nri nke a bịa maka anyị nile.’ Ọ bụ anụ ehi na akwụkwọ nri dị ukwuu.” Ka a sịkwa ihe mere Jisọs ji mesie anyị obi ike na anyị pụrụ ịkwụsị ‘ichegbu onwe anyị nye ndụ anyị’! O kwukwasịziri: “Ònye n’etiti unu pụrụ ịtụkwasị otu cubit n’ogologo ya site n’ichegbu onwe ya?”—Mat. 6:25, 27.
8 Ụwa nke gbara anyị gburugburu na-aghọwanye nke na-ahụ ihe onwunwe n’anya. A na-arụgide anyị n’ụzọ na-arịwanye elu ikwekọ na ya. Otú ọ dị, iji obi umeala na-enwe ekele maka ozi oge nile na-eme ka afọ ju anyị n’inwe ihe onwunwe dị nta. (1 Tim. 6:8) Ndị ọsụ ụzọ ndị na-eme ka ndụ ha dị mfe ma dị n’usoro na-enwe oge ka ukwuu maka ozi ma na-enwe ọṅụ na ume ime mmụọ ka ukwuu site n’ịkụziri ndị ọzọ eziokwu ahụ. Ọ bụ ezie na ha adịghị agbalị ibi ndụ ịnapụ onwe onye ihe ụtọ nile, ụzọ ziri ezi ha si ele ọnọdụ akụ̀ na ụba ha anya emewo ka ha nwee ike inweta ngọzi dị iche iche nke ịsụ ụzọ.
9 Ọ bụrụ na ị ghọta nke ọma na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ nakwa na oge na-agwụnahụ ụwa ọjọọ a, a ga-akwali gị n’ụzọ ime mmụọ ịchụ àjà ndị dị mkpa iji kwusaa ozi ọma ahụ n’ohere ọ bụla dapụtaranụ. Site n’ilerughachi anya n’ọnọdụ akụ̀ na ụba gị na itinye okwu ahụ n’aka Jehova, ị pụrụ ịchọpụta na ị pụrụ ijere ya ozi oge nile. A sịgodị na ị ghaghị ịhapụ ihe onwunwe ụfọdụ ị chọrọ iji sụọ ụzọ, ị ga-enweta ngọzi bara ụba nke Jehova.—Abụ Ọma 145:16.
AJỤJỤ NKE 3: “Dị ka onye nọ n’afọ iri na ụma, gịnị mere m ga-eji tụlee ozi ọsụ ụzọ dị ka ọrụ m pụrụ ịhọrọ?”
10 Mgbe afọ ndị ikpeazụ gị n’ụlọ akwụkwọ na-agwụsị, dị nnọọ ka o kwesịrị ịdị ị na-eche banyere ọdịnihu. Ị chọrọ ka ọ bụrụ nke e ji n’aka, nke obi ụtọ, na nke na-enye afọ ojuju. Ndị ndụmọdụ n’ụlọ akwụkwọ pụrụ ịgbalị iche gị ihu n’ọrụ na-enye ego nke chọrọ ọtụtụ afọ nke agụmakwụkwọ mahadum. Akọ na uche ndị Kraịst gị a zụrụ nke ọma agwa gị na i kwesịrị ijikere ijere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu dị ka o kwere mee. (Ekli. 12:1) Ị pụkwara iche echiche banyere imesịa lụọ di ma ọ bụ nwunye na inwe ezinụlọ. Gịnị ka ị ga-eme?
11 Mkpebi ndị ị na-eme n’oge a ná ndụ gị pụrụ ịkpụzi ọdịnihu gị dum. Ọ bụrụ na ị bụrụlarị Onyeàmà Jehova raara onwe ya nye, e mere baptism, i jiriwo obi gị dum nyefee Jehova onwe gị. (Hib. 10:7) N’ohere mbụ i nwere, gbalịa ịsụ ụzọ inyeaka otu ọnwa ma ọ bụ karị. Nke a ga-eme ka i nwetatụ ọṅụ na ibu ọrụ ndị ha na ịsụ ụzọ oge nile na-agakọ, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na echiche gị banyere ihe i kwesịrị iji ndụ gị mee ga-edo anya karị. Mgbe ahụ, kama iji nnọọ ọrụ ego oge nile mejuo ohere gị mgbe ị gụsịrị akwụkwọ, gịnị ma ị malite ọsụ ụzọ oge nile? Ụfọdụ ndị bụ́ ndị cheere ruo mgbe oge gatụkwuru ná ndụ tupu ha amalite ozi ọsụ ụzọ na-akwa ụta na ha amaliteghị ngwa ngwa karị.
12 Dị ka onye na-eto eto, jiri ohere ndị i nwere nke ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye mee ihe, nwetakwa abamuru ndị ọ na-enye n’ọrụ ime nkwusa oge nile. Ọ bụrụ ọchịchọ gị ịlụ di ma ọ bụ nwunye otu ụbọchị, ọ dịghị ntọala ka mma a pụrụ ịtọ maka alụmdi na nwunye nke karịrị ibu ụzọ jee ozi n’ọrụ ọsụ ụzọ oge nile. Ka ị na-eto ná ntozu okè na n’ime mmụọ, ị pụrụ ịhọrọ iji ịsụ ụzọ mere ọrụ, gị na onye òtù ọlụlụ nwere echiche dị otú ahụ. Ụfọdụ di na nwunye ndị sụkọworo ụzọ ọnụ abanyewo n’ọrụ sekit ma ọ bụ n’ozi ala ọzọ. Ụzọ ndụ nke na-eju afọ n’ezie!
13 N’agbanyeghị ogologo oge ị sụruru ụzọ, ị ga-emeworị ka mmụta gị zuo ezuo ma nweta ọzụzụ bara oké uru nke ọ na-adịghị ọrụ ọ bụla ọzọ n’elu ala pụrụ inye gị ya. Ịsụ ụzọ na-akụzi njide onwe onye, nhazi onwe onye, ụzọ isi na-emeso ndị mmadụ, ndabere n’ebe Jehova nọ, na ụzọ isi zụlite ndidi na obiọma—àgwà ndị ga-akwadebe gị iwere ibu ọrụ ndị ka ukwuu.
14 Ọ dịtụbeghị mgbe ndụ bụ nke a na-ejighị n’aka nye ihe a kpọrọ mmadụ karịa ka ọ dị ugbu a. Nanị ihe ole na ole na-adịgide adịgide n’ezie ma e wezụga ihe ndị Jehova kwere ná nkwa. Ebe ọdịnihu gị tọgbọrọ gị n’ihu, olee oge ka mma a pụrụ iji chesie echiche ike banyere ihe ị ga-eji ndụ gị mee n’afọ ndị na-abịanụ karịa ugbu a? Jiri nlezianya tụlee ihe ùgwù nke ịsụ ụzọ. Ọ dịghị mgbe ị ga-akwa ụta na ị họọrọ ozi ọsụ ụzọ dị ka ọrụ gị.
AJỤJỤ NKE 4: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe nrụgide mgbe nile ịrụzu hour a chọrọ? Gịnị ma ọ bụrụ na mụ arụtazughị hour m?”
15 Mgbe ị na-edejupụta akwụkwọ maka ịsụ ụzọ oge nile, ị ghaghị ịza ajụjụ bụ́: “Ị̀ haziwo ihe omume gị nke na ị pụrụ ịtụ anya n’ụzọ ezi uche dị na ya ịrụtazu hour 1,000 ahụ a chọrọ kwa afọ?” Iji rụtazuo ya, ọ dị gị mkpa inweta ná nkezi ihe dị ka hour atọ kwa ụbọchị n’ozi. N’ụzọ doro anya, nke a na-achọ ime ezi ndokwa na ọzụzụ onwe onye. Ihe ka ukwuu ná ndị ọsụ ụzọ na-enwe usoro ime ihe dị irè, nke na-ekwe omume n’ime ọnwa ole na ole.
16 Otú ọ dị, Eklisiastis 9:11 na-ekwu n’eziokwu sị, ‘Mgbe na ihe ndapụta na-adabara anyị nile.’ Oké ọrịa ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ a na-atụghị anya ha pụrụ ime ka onye ọsụ ụzọ ghara ịrụzu hour ya. Ọ bụrụ na nsogbu ahụ anọteghị aka ma mee ná mmalite nke afọ ije ozi, usoro ihe omume a tụkwasịrị ihe na ya agwụla ihe pụrụ ịdị mkpa iji rụta oge fọrọ afọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na nsogbu siri ike ebilite mgbe ọ fọrọ nanị ọnwa ole na ole n’afọ ije ozi, onye ọsụ ụzọ ahụ apụghịkwa ịrụzu?
17 Ọ bụrụ na ị rịatụrụ ọrịa ruo ọnwa ole na ole ma ọ bụ n’ihi ihe ọzọ siri ike ị na-apụghị ime ihe ọ bụla banyere ya ị pụghị ịrụtazu hour a chọrọ, ị pụrụ ijekwuru otu onye so na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ma kọwaara ya nsogbu ahụ. Ọ bụrụ na ndị okenye a echee na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ikwe ka ị nọgide n’ozi ọsụ ụzọ n’echegbughị onwe gị banyere ịrụta oge fọrọ afọ, ha pụrụ ikpebi nke ahụ. Odeakwụkwọ ga-edenye ihe na kaadị Ihe Ndekọ Ọgbakọ Maka Onye Nkwusa igosi na a chọghị ka ị rụta oge ahụ fọrọ afọ. Nke a abụghị oge ezumike, kama nke ahụ, ọ bụ nchebara echiche pụrụ iche n’ihi ọnọdụ gị.—Lee ihe ntinye nke Ozi Alaeze Anyị nke September 1986, paragraf nke 18.
18 Ndị ọsụ ụzọ nweworo ahụmahụ na-arụfe hour a chọrọ ná mmalite afọ ije ozi. Ozi ọsụ ụzọ ha na-ebute ụzọ, ya mere mgbe ụfọdụ ha na-ahụ na ọ dị mkpa ibelata ihe omume ndị na-adịghị mkpa. Ọ bụrụ na onye ọsụ ụzọ arụzughị hour ya n’ihi enweghị ezi ndokwa ma ọ bụ enweghị ọzụzụ onwe onye n’ịgbaso ya, o kwesịrị iwere ya na ọ bụ ibu ọrụ ya ịrụta oge fọrọ afọ ma ghara ịtụ anya nchebara echiche pụrụ iche.
19 E nwere mgbe ọnọdụ onye ọsụ ụzọ na-agbanwe n’ụzọ a na-apụghị izere ezere. Ọ pụrụ ịchọpụta na ya apụghị ịrụzu hour a chọrọ ruo ogologo oge n’ihi nsogbu ahụ ike na-aga n’ihu, ibu ọrụ ezinụlọ buwanyere ibu, na ihe ndị ọzọ. N’ọnọdụ a, ihe amamihe dị na ya ime ga-abụ ịlaghachi n’ịbụ onye nkwusa ma na-ekere òkè mgbe ọ bụla o kwere mee n’ozi ọsụ ụzọ inyeaka. E nweghị ndokwa ọ bụla dị oge nile nke na-enye mmadụ ohere ịnọgide dị ka onye ọsụ ụzọ ma ọ bụrụ na ọnọdụ ya enyekwaghị ya ohere ịrụzu hour a chọrọ.
20 Anyị na-enwe olileanya na ndokwa nke inye ndị ruru eru nchebara echiche pụrụ iche ga-agba ọnụ ọgụgụ ka ukwuu ume idebanye aha n’ozi ọsụ ụzọ n’echegbughị onwe ha n’ụzọ na-adịghị mkpa. O kwesịkwara ịgba ndị nọ anọ n’ozi oge nile ume ịnọgide na-asụ ụzọ. Anyị chọrọ ka ndị ọsụ ụzọ nwee ihe ịga nke ọma n’ozi oge nile ha.
AJỤJỤ NKE 5: “Achọrọ m ịrụpụta ihe ma nwee obi ụtọ n’ime ya. Ozi ọsụ ụzọ ọ̀ ga-enye m afọ ojuju?”
21 Ezi obi ụtọ na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’inwe mmekọrịta chiri anya, nke mmadụ na Jehova na nkwenyesi ike na anyị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere ya ozi. Jisọs tachiri obi n’elu osisi ịta ahụhụ “n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya.” (Hib. 12:2) Obi ụtọ ya bịara site n’ime uche Chineke. (Abụ Ọma 40:8) N’usoro ihe dị ugbu a, anyị pụrụ inweta ezi obi ụtọ ma ọ bụrụ na e jikọtara ihe ka ukwuu n’ihe omume anyị ná ndụ na ofufe anyị na-efe Jehova. Nchụso ime mmụọ na-enye anyị echiche nke inwe nzube n’ihi na anyị maara n’ime ime obi anyị na anyị na-eme ihe ziri ezi. Obi ụtọ na-abịa site n’inye ihe, anyị makwaara na ọ dịghị ụzọ ka mma anyị pụrụ isi nye onwe anyị karịa ịkụziri ndị ọzọ ụzọ isi nweta ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.—Ọrụ 20:35.
22 Onye ọsụ ụzọ ahụ e hotara ihe o kwuru na paragraf mmalite si otú a kọwaa ya: “À pụrụ inwe ọṅụ dị ukwuu karịa ịhụ onye ị na-amụrụ ihe ka ọ na-aghọ onye siri ike na-enye Jehova otuto? Ọ na-akpali akpali ma na-ewusi okwukwe ike ịhụ otú Okwu Chineke si akpa ike n’ịkwali ndị mmadụ ime mgbanwe ná ndụ ha iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ.” (Lee Ụlọ Nche nke October 15, 1997, peji nke 18-23.) Ya mere, gịnị na-enye gị obi ụtọ? Ọ bụrụ na i jiri ihe omume ndị na-adịgide adịgide, ndị bara uru kpọrọ ihe, kama ịbụ obi ụtọ na-adịru nwa oge nke ụwa na-enye, ịsụ ụzọ ga-enye gị echiche magburu onwe ya nke ịrụpụta ihe nke ga-eme ka i nwee obi ụtọ n’ezie.
AJỤJỤ NKE 6: “Ọ bụrụ na a chọghị ya iji dịrị ndụ ebighị ebi, ọ̀ bụghị okwu aka m ma m sụrụ ụzọ ma mụ asụghị?”
23 N’eziokwu, mkpebi ịsụ ụzọ aghaghị ịbụ nke gị. Nanị Jehova pụrụ ikpebi ihe bụ ọnọdụ gị ná ndụ. (Rom 14:4) Ọ na-atụ anya n’ụzọ ziri ezi ka i jiri obi gị, mkpụrụ obi gị, uche gị, na ume gị dum jeere ya ozi. (Mak 12:30; Gal. 6:4, 5) Ọ hụrụ onye ji obi ụtọ na-enye ihe n’anya, onye ji ọṅụ na-ejere ya ozi, ọ bụghị ná ntamu ma ọ bụ ná mmanye. (2 Kọr. 9:7; Kọl. 3:23) Ihe mere i ji na-eje ozi oge nile aghaghị ịbụ n’ihi na ị hụrụ Jehova na ndị mmadụ nọ n’ókèala gị n’anya. (Mat. 9:36-38; Mak 12:30, 31) Ọ bụru na ọ dị gị otú a, mgbe ahụ ozi ọsụ ụzọ kwesịrị ka i chebara ya nnọọ echiche.
24 Anyị na-enwe olileanya na ihe a kọwapụtara n’ebe a ga-enyere gị aka ịtụle ohere ndị i nwere ịsụ ụzọ. Ị̀ pụrụ ime mgbanwe n’ọnọdụ gị iji sụọ ụzọ oge nile? E biri n’okpuru ebe a kalenda a kpọrọ “Usoro Ozi Ọsụ Ụzọ M Kwa Izu.” Lee ma ị ga-enwe ike idejupụtara onwe gị usoro dị irè nke ga-enye gị ohere itinye nkezi nke ihe dị ka hour 23 kwa izu n’ozi. Mgbe ahụ, nwee okwukwe na ntụkwasị obi zuru ezu na Jehova. Site n’enyemaka ya ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma! O kwewo nkwa, sị: ‘M ga-awụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.’—Mal. 3:10.
25 Ya mere anyị na-ajụ sị, “Ozi ọsụ ụzọ—ọ̀ dịịrị gị?” Ọ bụrụ na ị pụrụ ịza “Ee,” yie oge iji malite ịsụ ụzọ oge nile n’isi nso, jidekwa n’aka na Jehova ga-eji ndụ na-enye ọṅụ gọzie gị!
[Foto dị na peeji nke 6]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Usoro Ozi Ọsụ Ụzọ M Kwa Izu
MONDAY: Ụtụtụ ozi ubi
TUESDAY: Ụtụtụ ozi ubi
WEDNESDAY: Ụtụtụ ozi ubi
THURSDAY: Ụtụtụ ozi ubi
FRIDAY: Ụtụtụ ozi ubi
SATURDAY: Ụtụtụ ozi ubi
SUNDAY: Ụtụtụ ozi ubi
MONDAY: Ehihie ozi ubi
TUESDAY: Ehihie ozi ubi
WEDNESDAY: Ehihie ozi ubi
THURSDAY: Ehihie ozi ubi
FRIDAY: Ehihie ozi ubi
SATURDAY: Ehihie ozi ubi
SUNDAY: Ehihie ozi ubi
MONDAY: Uhuruchi ozi ubi
TUESDAY: Uhuruchi ozi ubi
WEDNESDAY: Uhuruchi ozi ubi
THURSDAY: Uhuruchi ozi ubi
FRIDAY: Uhuruchi ozi ubi
SATURDAY: Uhuruchi ozi ubi
SUNDAY: Uhuruchi ozi ubi
Jiri pensịl detuo ndokwa gị maka ụbọchị ọ bụla n’ime izu.
Mee ndokwa maka ngụkọta nke ihe dị ka hour 23 kwa izu n’ozi ubi.
Ngụkọta hour e dokwara kwa izu ___________________