“Ị Ga-eme nke Ọma ma Ị Bụrụ Ọsụ Ụzọ Oge Niile!”
1. Olee otú otu nwanna nwaanyị si were ozi oge niile?
1 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Kati B. Pam, onye rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile n’ókèala niile nke mba Chile, nke dị na Kọntinent Ebe Ndịda Amerịka, kwuru, sị: “O nweghị ọrụ ọzọ gaara eme m obi ụtọ ma ọ bụ mee ka m nwee ọtụtụ ngọzi n’ozi Chineke.” O nwere ike, onye ghọtara uru ozi oge niile na-abara mmadụ agwatụla gị sị: “Ị ga-eme nke ọma ma ị bụrụ ọsụ ụzọ oge niile!”
2. Kọwaa ihe mere mmadụ ji enweta ezigbo obi ụtọ ma onye ahụ mewe ihe ndị gbasara ofufe Chineke.
2 Ọrụ Na-enye Obi Ụtọ: Jizọs, Onye Nlereanya anyị, nwetara ezigbo obi ụtọ n’ihi ime uche Nna ya. (Jọn 4:34) N’ihi ya, Jizọs kwuru eziokwu mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na mmadụ na-enweta ezigbo obi ụtọ ma onye ahụ na-eme ihe ndị gbasara ofufe Jehova. Obi na-adị anyị ụtọ ma anyị na-arụ ọrụ ndị na-eme Jehova obi ụtọ. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na anyị ana-ewepụtakwu oge, ume, na ihe ndị anyị nwere, iji na-enyere ndị ọzọ aka, anyị ga na-enwekwu obi ụtọ.—Ọrụ 20:31, 35.
3. Olee ọṅụ anyị nwere ike inweta ma anyị banye ọrụ ọsụ ụzọ oge niile?
3 Ka anyị na-ewepụtakwu oge aga ozi ọma, otú ahụkwa ka anyị ga na-enwekwu ọṅụ a na-enweta ma a malite iduziri mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Ọ bụrụgodị na o yiri ka ọtụtụ ndị nọ n’ókèala anyị anaghị enwe mmasị n’ozi ọma, anyị malite ọrụ ọsụ ụzọ oge niile, anyị nwere ike ịchọpụta na a ka nwere ọtụtụ ndị ga-ege anyị ntị. Ndị ọsụ ụzọ oge niile, ndị rụrụla ọrụ ọsụ ụzọ ruo otu afọ, na-aga Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ. Ọtụtụ ihe ha mụtara n’ụlọ akwụkwọ ahụ na-abara ha uru n’ozi ọma. (2 Tim. 2:15) Ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike n’ozi anyị, anyị nwere ike ịkụ mkpụrụ nke eziokwu nke ga-emecha puo.—Ekli. 11:6.
4. Gịnị ka ndị na-eto eto gụchawarala ụlọ akwụkwọ sekọndrị kwesịrị ichebara echiche?
4 Ndị Na-eto Eto: Ọ bụrụ na ị gụchawala ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ì chetụla ihe ị ga-eme ma ị gụchaa? Ihe ị na-ejikarị oge gị eme ugbu a bụ ihe gbasara agụmakwụkwọ gị. Gịnị ka ị ga-eji oge ndị ahụ mee ma ị gụchaa akwụkwọ? Kama iji oge gị niile na-arụ ọrụ ego, í cheghị na ọ ga-adị mma ma i chebara ịbanye n’ọrụ ọsụ ụzọ echiche ma rịọ Chineke ka o nyere gị aka? Ị ga-amụta ọtụtụ ihe ga-abara gị uru ná ndụ gị niile. Dị ka ihe atụ, ị ga-amụta izi ụdị mmadụ ọ bụla ozi ọma, imeri nsogbu ndị ị na-enwe, ijide onwe gị, na ịkụzi ihe nke ọma.
5. Olee otú ndị nne na nna nakwa ọgbakọ nwere ike isi gbaa ndị na-eto eto ume ịbanye ọrụ ọsụ ụzọ?
5 Ndị nne na nna, ùnu na-enyere ụmụ unu aka ka uche ha dịrị n’ịbanye n’ozi oge niile? Okwu ọnụ unu na otú unu si jiri ozi ọma kpọrọ ihe nwere ike inyere ha aka ibu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ. (Mat. 6:33) Otu nwa okorobịa aha ya bụ Ree, onye banyere ọrụ ọsụ ụzọ oge niile mgbe ọ gụchawarala ụlọ akwụkwọ sekọndrị, kwuru ihe nyeere ya aka. Ọ sịrị: “Mama m na-ekwukarị na ọrụ ọsụ ụzọ oge niile bụ ọrụ kacha enye mmadụ obi ụtọ ná ndụ.” Mmadụ niile nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịna-akwado ndị ọsụ ụzọ ma na-ekwu okwu ọma banyere ọrụ ọsụ ụzọ oge niile. Nke a ga-eme ka ọrụ a gụwa ndị ọzọ agụụ ịrụ. Nwa okorobịa ọzọ aha ya bụ Hose, onye bi na Spen, sịrị: “Ndị ọgbakọ anyị weere ọrụ ọsụ ụzọ ka ọrụ kacha mma ndị na-eto eto kwesịrị ịrụ. Ihe ha na-ekwu banyere ọrụ ọsụ ụzọ, otú obi si adị ha ụtọ n’ọrụ a, nakwa aka ha na-enyere ndị ọsụ ụzọ, mere ka ọ dịrị m mfe ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ oge niile.”
6. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na obi anyị adịghị n’ọrụ ọsụ ụzọ ugbu a?
6 Otú Ị Ga-esi Emeri Ihe Ndị Na-egbochi Gị: Ọ́ bụrụkwanụ na ị na-asị, ‘Obi m adịghị n’ọrụ ọsụ ụzọ’? Ọ bụrụ ihe a ka obi gị na-agwa gị ma e kwute okwu ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, gwa ya Jehova n’ekpere. Gwa ya sị, ‘Amaghị m ma m̀ ga-arụli ọrụ ọsụ ụzọ oge niile, ma achọrọ m ime ihe ga-atọ gị ụtọ.’ (Ọma 62:8; Ilu 23:26) Gụọ Okwu ya bụ́ Baịbụl, gụọkwa ihe nzukọ ya bipụtara gbasara ọrụ ọsụ ụzọ oge niile, iji mara ihe ị ga-eme. Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ oge niile bu ụzọ rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka iji mara otú ọrụ ọsụ ụzọ na-adị, ọṅụ ha nwetakwara mgbe ahụ kpaliri ha ịbanye n’ozi oge niile.—Ọma 34:8.
7. Olee ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ụjọ anyị bụ ma ànyị ga-arụzulikwa awa iri asaa a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ oge niile kwa ọnwa?
7 Ọ́ bụrụkwanụ na ụjọ gị bụ ma ị̀ ga-arụzụlikwa awa iri asaa a chọrọ kwa ọnwa? Í cheghị na ọ ga-adị mma ma ị kọtatụrụ ya ndị ọsụ ụzọ oge niile ọnọdụ gị na ha bụ otu, ka ha tụọrọ gị aro ihe ị ga-eme? (Ilu 15:22) Depụta otú dị iche iche ị ga-esi hazie oge gị ka i nwee ike na-arụzu awa iri asaa. I nwere ike ịchọpụta na isi n’ihe ndị ị na-eme na-adịchaghị mkpa wepụta oge maka ozi ọma dịịrị gị mfe karịa ka i cheburu.—Efe. 5:15, 16.
8. Gịnị mere o ji dị mkpa ka mmadụ nọtụ, ya elebagharịa anya n’ihe ndị ọ na-eme?
8 Lebaghachi Anya n’Ihe Ndị Ị Na-eme: Ihe na-agbanwekarị ná ndụ mmadụ. Ọ dị mma ka mmadụ nọtụ, ya atụlee ihe ndị ọ na-eme ná ndụ iji mara ma ọ̀ ga-ekwe ya ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, ò ruwela mgbe ị ga-ala ezumike nká? Otu nwanna aha ya bụ Randi, onye lara ezumike nká n’oge, sịrị: “Ịla ezumike nká n’oge mere ka mụ na nwunye m nwee ohere ịbanye ọrụ ọsụ ụzọ oge niile, o meekwala ka anyị nwee ohere ije ozi ebe mkpa ka ukwuu. Enwetakwala m ọtụtụ ngọzi n’ihi mkpebi a m mere, ma ngọzi kachanụ m nwetara bụ akọnuche dị ọcha.”
9. Gịnị ka ndị di na nwunye kwesịrị ichebara echiche?
9 Ụfọdụ ndị dị na nwunye achọpụtala na ọ dịghị mkpa ka ha abụọ jiri oge ha niile na-arụ ọrụ ego. Ọ bụ eziokwu na nke a nwere ike ime ka ha ghara inwecha ego otú ha nweburu, ha na-achọpụta na ha na-enwekwu obi ụtọ ma ha mee otú ahụ. Otu nwanna aha ya bụ Jọn, onye nwunye ya kwụsịrị ọrụ o ji oge ya niile arụ ka o nwee ike nwekwuo oge maka ozi ọma, sịrị: “O nweghị ihe na-enye m obi ụtọ karịa ịma na nwunye m nọ n’ozi Jehova oge m nọ n’ọrụ.”
10. Olee ihe ndị na-akpali Ndị Kraịst ịbanye ọrụ ọsụ ụzọ oge niile?
10 Ọ Na-egosi na Mmadụ Nwere Ịhụnanya na Okwukwe: Jehova emeela ka ikwusa ozi ọma bụrụ ọrụ kacha mkpa onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịrụ. A ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya, ọ bụkwa naanị ndị na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta. (Rom 10:13) Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, ma nwee obi ụtọ maka ihe ọma ndị o meere anyị, ọ ga-akpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Ọkpara ya nyere anyị iwu ka anyị kwusaa. (Mat. 28:19, 20; 1 Jọn 5:3) Ọ bụrụkwa na anyị kwenyesiri ike na anyị bi n’oge ikpeazụ n’eziokwu, anyị ga-eme ike anyị niile n’ozi ọma ugbu a oge ka dị, kama iji ụwa na-eme ihe n’uju.—1 Kọr. 7:29-31.
11. Ọ bụrụ na mmadụ agwa gị na ị ga-eme nke ọma ma ị bụrụ onye ọsụ ụzọ oge niile, olee otú i kwesịrị isi were ihe ahụ o kwuru?
11 Ihe mere e ji arụ ọrụ ọsụ ụzọ oge niile abụghị naanị ka mmadụ na-enye awa buru ibu, kama ọ bụ otu ụzọ anyị si egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ agwa gị na ị ga-eme nke ọma ma ị bụrụ onye ọsụ ụzọ oge niile, were ya na onye ahụ na-aja gị mma. Chebara ịbanye n’ọrụ a echiche ma rịọ Chineke ka o nyere gị aka isonye ná ndị na-arụ ọrụ a na-enye obi ụtọ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
Ndị nne na nna, ùnu na-enyere ụmụ unu aka ka uche ha dịrị n’ịbanye n’ozi oge niile?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Jehova emeela ka ikwusa ozi ọma bụrụ ọrụ kacha mkpa onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịrụ.