Ugbu A Bụ Oge Ime Nkwusa!
1. N’ihi gịnị ka ugbu a ji bụrụ oge ime nkwusa?
1 “Na-atụnụ Chineke egwu, na-enyekwa ya otuto.” Site ná nduzi nke ndị mmụọ ozi, a na-ekwusa ozi a ná “mba na ebo na asụsụ na ndị ọ bụla.” N’ihi gịnị? “N’ihi na oge awa nke ikpe sitere n’aka [Chineke] abịawo.” Taa, anyị bi ‘n’oge awa nke ikpe’ ahụ, bụ́ nke ga-abịa ná njedebe mgbe a ga-ebibi usoro ihe dị ugbu a. Ọ dị oké mkpa ka ndị mmadụ ‘na-efe Onye ahụ nke mere eluigwe na ụwa na oké osimiri na isi mmiri dị iche iche.’ Ọ dịghị ọrụ ọ bụla a na-arụ taa nke dị mkpa ma ọ bụ chọọ ka e mee ihe ngwa ngwa banyere ya ka ọrụ ikwusa “ozi ọma ebighị ebi.” Ee, ugbu a bụ oge ime nkwusa!— Mkpu. 14:6, 7.
2. Olee otú ndị ohu Jehova si na-egosi na ha ghọtara na oge a bụ oge chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa banyere ya?
2 N’ime afọ iri gara aga, ndị ohu Jehova ejiriwo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri awa 12 kwusaa ozi ọma Alaeze ahụ ma mee ndị na-eso ụzọ. Ọtụtụ ndị emewo mgbanwe ụfọdụ ná ndụ ha iji kerekwuo òkè n’owuwe ihe ubi ime mmụọ ahụ. (Mat. 9:37, 38) Dị ka ihe atụ, n’afọ gara aga, ihe dị ka ndị nkwusa 850,000 jere ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ kwa ọnwa. Nye ndị ọsụ ụzọ oge nile, nke a pụtara itinye awa 70 kwa ọnwa n’ọrụ nkwusa. Nye ndị ọsụ ụzọ inyeaka, ihe a chọrọ bụ awa 50.
3. Olee mgbanwe ndị ọ na-adịkarị mkpa ka ndị nkwusa mee iji nwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ?
3 Ihe Ndị A Chọrọ Iji Nwee Ike Ịrụ Ọrụ Ọsụ Ụzọ: Ndị ọsụ ụzọ na-agbalị ime ka ndụ ha dị mfe n’ihi na ha ghọtara na “oge fọdụrụnụ dị ntakịrị.” (1 Kọr. 7:29, 31) Ha na-achọ ụzọ isi belata ego ha na-emefu ka ha wee nwee ike iwetulatakwu ihe n’oge ha ji arụ ọrụ ego. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ akwagala n’ụlọ katụ dị nta. Ndị ọzọ ewepụla ihe onwunwe ha ndị na-adịghị mkpa. (Mat. 6:19-21) Mgbe mgbe, ha aghaghịkwa iwetulata aka n’ịchụso ihe nke onwe ha. Ha na-eme ihe ndị a nile iji hụ na ha tinyekwuru oge dị ukwuu n’ije ozi ọma. (Efe. 5:15, 16) Site n’ịnọgide na-agbasi mbọ ike, inwe mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà, na ịdabere na Jehova site n’ekpere, ọtụtụ ndị nkwusa enwewo ike ịhazi ihe n’ụzọ dị mma iji hụ na ha rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ.
4. Olee ihe ndị kwesịrị ekwesị ị pụrụ ime iji ruo ihe mgbaru ọsọ nke ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ?
4 Ị̀ pụrụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ? Gịnị ma ị jụọ ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’ọrụ ọsụ ụzọ otú ha si mee ya? Soro ha rụkọọ n’ozi ubi, ma hụ ọṅụ ha na-enwe. Tụlee isiokwu ndị pụtaworo n’akwụkwọ anyị bụ́ ndị e kwuru banyere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ na ha. Setịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ iru eru bụ́ ndị ga-enyere gị aka ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. Ọ bụrụ na e nwere ihe ndị na-egbochi gị ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ ugbu a, kpegara Jehova ekpere banyere ha, ma rịọ ya ka o nyere gị aka iwepụ ha.—Ilu 16:3.
5. Olee otú ọrụ ọsụ ụzọ si enyere anyị aka inwekwu nkà n’ozi ọma?
5 Ngọzi na Ọṅụ Ndị Ọ Na-eweta: Ọrụ ọsụ ụzọ na-eme ka anyị nwekwuo nkà n’iji Okwu Chineke eme ihe, bụ́kwa nke na-enyekwu anyị ọṅụ. Otu nwanna nwanyị na-eto eto bụ́ onye ọsụ ụzọ kwuru, sị, “Inwe ike ijizi eziokwu nke Okwu Chineke ejizi bụ nnọọ ngọzi. Mgbe ị na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ, ị na-eji Bible eme ihe mgbe nile. Ọ na-abụ m na-eje ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ugbu a, mụ ana-echeta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ga-ekwesị onye ọ bụla m na-ezi ozi ọma.”—2 Tim. 2:15.
6. Olee ọzụzụ ọrụ ọsụ ụzọ na-enye mmadụ?
6 Ọrụ ọsụ ụzọ na-akụzikwara anyị ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị mkpa ná ndụ. Ọ pụrụ inyere ndị na-eto eto aka ịmụta otú e si eji oge eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya, otú e si eji ego eme ihe n’ụzọ dị mma, na otú ha na ndị ọzọ pụrụ isi na-adị ná mma. Ọtụtụ ndị na-amụta ijikwu ihe ime mmụọ akpọrọ ihe n’ihi na ha na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ. (Efe. 4:13) Tụkwasị na nke ahụ, ndị ọsụ ụzọ na-enwekarị ihe ùgwù nke ịhụ aka Jehova n’ahụ́ ha.—Ọrụ 11:21; Fil. 4:11-13.
7. Olee otú ọrụ ọsụ ụzọ si enyere anyị aka ịbịaru Jehova nso?
7 Ikekwe, ngọzi kachasịnụ a na-enweta n’ọrụ ọsụ ụzọ bụ na ọ na-enyere anyị aka ịbịaru Jehova nso. Nke a pụrụ ịbụrụ anyị ihe agbamume n’oge mkpagbu. Otu nwanna nwanyị nke tachiri obi n’otu oge ọ nọ n’oké ihe isi ike, kwuru, sị: “Mmekọrịta chiri anya mụ na Jehova nwere, bụ́ nke m zụlitere site n’ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, nyeere m aka n’oge nile ahụ ihe siiri m ike.” O kwukwara, sị: “Obi dị m nnọọ ụtọ na ejiriwo m oge m toruru ogo mmadụ jeere Jehova ozi oge nile. O nyeworo m aka iwepụta onwe m maka ọrụ ndị m na-echetụghịdị n’echiche na m pụrụ iwepụta onwe m.” (Ọrụ 20:35) N’otu aka ahụ, ka anyị nwetakwa ngọzi dị ukwuu ka anyị na-eme ike anyị nile n’ọrụ nkwusa a dị oké mkpa.—Ilu 10:22.