Ị̀ Pụrụ Ịbanye ‘n’Ọnụ Ụzọ Buru Ibu nke Na-eduga n’Ịrụ Ọrụ’?
1. Olee “ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ” nke ghere oghe nye anyị?
1 Mgbe “ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ” megheere Pọl onyeozi, o ji ịnụ ọkụ n’obi jiri ohere ahụ kwusaa ozi ọma Alaeze n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ndị na-emegide ya. (1 Kọr. 16:9) Taa, ihe dị ka narị puku ndị nkwusa Alaeze isii na iri puku anọ na abụọ gburugburu ụwa abanyela n’ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ site n’ịghọ ndị ọsụ ụzọ oge nile.
2. Gịnị mere o ji dị mma ka anyị na-atụle ọnọdụ anyị site n’oge ruo n’oge?
2 Ọnọdụ Na-agbanwe Agbanwe: Ọ bụ eziokwu na ọnọdụ anyị nọ na ya ugbu a nwere ike ime ka anyị ghara ịdị na-agaru ozi ọma otú anyị gaara achọ ịgaru, anyị kwesịrị ịghọta na ọnọdụ na-agbanwe agbanwe. N’ihi ya, ọ dị mma ka anyị na-atụle ọnọdụ anyị site n’oge ruo n’oge ma ghara ichere ruo mgbe ihe nile dịchaara anyị mma. (Ekli. 11:4) Ị̀ bụ nwa okoro ma ọ bụ nwa agbọghọ nke gụchawarala akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị? Ị̀ bụ nne ma ọ bụ nna nke ụmụ ya ga-amalite akwụkwọ n’oge na-adịghị anya? Ò ruwela oge ị ga-ala ezumike nká n’ọrụ ego ị na-arụ? Mgbanwe ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka i nwetakwuo oge iji malite ọrụ ọsụ ụzọ oge nile. Otu nwanna nwanyị nke ọrịa jibu aka ọjọọ kpebiri ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ mgbe ọ dị afọ 89. N’ihi gịnị? Ebe ọ bụ na ọ gabeghị ụlọ ọgwụ ọzọ ruo ihe karịrị otu afọ, obi ya gwara ya na ahụ́ ya ga-ekwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ.
3. Olee mgbanwe ụfọdụ ndị merela iji nwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile?
3 Na nke Pọl, o bubu n’obi ịga leta ụmụnna ya nọ na Kọrint. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ gbanwere atụmatụ ya n’ihi ozi ọma ahụ. Ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile taa mere ọtụtụ mgbanwe iji nwee ike ịrụ ya. Ụfọdụ emeela ka ndụ ha dị mfe ruo n’ókè nke na ha na-arụ ọrụ ego nanị ihe dị ka ụbọchị atọ n’izu iji na-egbo mkpa ego ha. Ihe ùgwù ije ozi ha na-eme ha obi ụtọ. (1 Tim. 6:6-8) Ụfọdụ ndị di na nwunye emeela mgbanwe ndị mere ka ọ bụrụ nanị onye nke nwoke ga na-arụ ọrụ ego. Nke a emeekwala ka onye nke nwanyị nwee ohere ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ.
4. Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ọ na-eme anyị obi abụọ ma ànyị ga na-arụtazulikwa awa ole a chọrọ?
4 Adịla ngwa ikwu na ị gaghị arụli ọrụ ọsụ ụzọ n’ihi na ị na-atụ ụjọ na ị gaghị na-enwetazu awa ole a chọrọ. Nanị ihe a chọrọ n’aka gị kwa ụbọchị bụ ihe karịtụrụ awa abụọ. Ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ ma ị̀ ga-arụlikwa ya, gbalịa ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka ruo otu ọnwa ma ọ bụ abụọ, ma nwee ihe mgbaru ọsọ nke inweta awa 70. Nke a ga-eme ka i nwee ike ịchọpụta ụdị ọṅụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile na-enye. (Ọma 34:8) Soro ndị na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile ugbu a kparịta ya. Ọ pụrụ ịbụ na ha meriri ihe ịma aka ndị yiri nke gị tupu ha enwee ike ịrụ ya. (Ilu 15:22) Rịọ Jehova ka ọ gọzie mgbalị ị na-eme ijechiwekwu ozi ubi anya.—1 Jọn 5:14.
5. Gịnị mere ọrụ ọsụ ụzọ oge nile ji bụrụ ọrụ kwesịrị ekwesị?
5 Nchụso Kwesịrị Ekwesị: Ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile na-eweta ọtụtụ ngọzi. Ọ na-eme ka i nwee obi ụtọ ka ukwuu, bụ́ nke a na-enweta site n’inye ihe mgbe nile. (Ọrụ 20:35) Ọrụ ọsụ ụzọ ga-eme i jiziwekwuo Okwu Chineke, bụ́ okwu nke eziokwu, ejizi. (2 Tim. 2:15) Ọ ga-eme ka i nwekwuo ohere ịhụ aka Jehova n’ahụ́ gị. (Ọrụ 11:21; Fil. 4:11-13) Ọrụ ọsụ ụzọ ga-enyekwara gị aka inwe àgwà ndị na-amasị Chineke, dị ka ntachi obi, ọ ga-emekwa ka i nwee ike ịbịarukwu Jehova nso. (Jems 4:8) Ị̀ pụrụ ịbanye n’ọnụ ụzọ a buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ ma ghọọ onye ọsụ ụzọ oge nile?