Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/11 p. 3
  • Ị̀ Bụbu Onye Ọsụ Ụzọ Oge Niile?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Bụbu Onye Ọsụ Ụzọ Oge Niile?
  • Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Pụrụ Ịbanye ‘n’Ọnụ Ụzọ Buru Ibu nke Na-eduga n’Ịrụ Ọrụ’?
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enye ma Na-anara Ngọzi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Ị Ga-eme nke Ọma ma Ị Bụrụ Ọsụ Ụzọ Oge Niile!”
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Ozi Ọsụ Ụzọ—Ọ̀ Dịịrị Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2011
km 3/11 p. 3

Ị̀ Bụbu Onye Ọsụ Ụzọ Oge Niile?

1. Olee ihe ùgwù ọtụtụ ụmụnna anyị nwerela, ma olee ihe ụfọdụ n’ime ha merela?

1 Kemgbe ọtụtụ afọ, ọtụtụ puku ụmụnna anyị enweela ihe ùgwù ịbụ ndị ozi oge niile, ndị ‘na-akụzi ihe ma na-ezisa ozi ọma.’ (Ọrụ 5:42) Ma ụfọdụ n’ime ha akwụsịla n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ. Ọ bụrụ na e nweela mgbe ị bụ onye ọsụ ụzọ oge niile, ì chebarala ihe ndị ị na-eme ugbu a echiche ka ị mara ma ị̀ ka nwere ike ibidoghachi ozi oge niile?

2. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka ndị bụ́bu ọsụ ụzọ oge niile lee ma ihe ndị ha na-arụ ugbu a ọ̀ ga-ekwe ha bidoghachi ịsụ ụzọ oge niile?

2 Ọnọdụ Na-agbanwe Agbanwe: O nwere ike, nsogbu mere i ji kwụsị ozi oge niile adịghịzi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe mere i ji kwụsị ozi oge niile bụ n’ihi na ị naghị arụzu awa iri itoolu a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ oge niile n’oge ahụ, ì nwere ike ịmaliteghachi ugbu a awa a chọziri ha n’aka bụ awa iri asaa? Ọ bụrụ na ihe mere i ji kwụsị bụ ọrụ gị ma ọ bụkwanụ ibu ezinụlọ, ì nwere ike ile ma ihe ndị ahụ hà ebelatala ka i nwee ike maliteghachi? Otu nwanna nwaanyị onye kwụsịrị ịsụ ụzọ oge niile n’ihi ọrịa maliteghachiri ya mgbe ọ dị iri afọ asatọ na itoolu. Ebe ọ bụ na ọ gafeela otu afọ ọ na-agabeghị ụlọ ọgwụ, o chere na ahụ́ ya ga-ekwe ya ịmaliteghachi ozi oge niile!

3. Olee otú ndị niile nọ n’ezinụlọ ga-esi nyere otu onye n’ezinụlọ ha aka ka ọ bụrụ ọsụ ụzọ?

3 O nwere ike gịnwa abụtụbeghị onye ọsụ ụzọ oge niile, ma e nwere otu onye n’ezinụlọ unu bụ́bu ya ma mechaa kwụsị n’ihi na ọ na-elekọta otu onye ezinụlọ unu, o nwere ike bụrụ nne ma ọ bụ nna merela agadi. (1 Tim. 5:4, 8) Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, gịnwa ma ọ bụ ndị ọzọ n’ezinụlọ unu, ùnu nwere ike inyere onye ahụ bụ́bu ọsụ ụzọ aka ka o bidoghachi ịsụ ụzọ? Í cheghị na ọ ga-adị mma ma unu niile n’ezinụlọ unu kwurịta ya? (Ilu 15:22) Ọ bụrụ na mmadụ niile n’ezinụlọ enyere otu onye aka ịghọ onye ọsụ ụzọ oge niile, obi ga-adị ndị niile nọ n’ezinụlọ ahụ ụtọ.

4. Ọ bụrụ na ị gaghị enweli ike ịmaliteghachi ọrụ ịsụ ụzọ ugbu a, gịnị ka ị ga-eme?

4 Ọ bụrụgodị na ihe ndị ị na-eme ugbu a agaghị ekwe gị bidoghachi ịsụ ụzọ, ekwela ka nke ahụ kụda gị mmụọ. Obi dị Jehova ụtọ na ọ na-agụ gị agụụ ịsụ ụzọ oge niile. (2 Kọr. 8:12) Ị gaa ozi ọma, jiri ihe ndị ị mụtara mgbe ị bụ ọsụ ụzọ oge niile na-ezi ozi ọma. Na-agwa Jehova n’ekpere na ị chọrọ ibidoghachi ọrụ ịsụ ụzọ oge niile, ị nọtụkwa gị eleba anya n’ihe ndị ị na-eme ka ị mara mgbe ị ga-enwe ike ibido. (1 Jọn 5:14) Ikekwe, ka oge na-aga, Jehova ga-emeghere gị “ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ” ka i nwee ike ịmaliteghachi ọrụ ịsụ ụzọ oge niile ma nwee obi ụtọ na-adị na ya!—1 Kọr. 16:9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya