Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 1/15 p. 21-23
  • Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enye ma Na-anara Ngọzi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enye ma Na-anara Ngọzi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Ụfọdụ Ndị Ji Asụ Ụzọ
  • Ndị Ọzọ Pụrụ Inye Aka
  • Ịrapagidesi Ike ná Mkpebi Gị
  • Ọtụtụ Ọṅụ na Ngọzi
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ozi Ọsụ Ụzọ—Ọ̀ Dịịrị Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • “Ị Ga-eme nke Ọma ma Ị Bụrụ Ọsụ Ụzọ Oge Niile!”
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Ịsụ Ụzọ Na-eme Ka Anyị na Chineke Dịkwuo ná Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 1/15 p. 21-23

Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enye ma Na-anara Ngọzi

“ỊSỤ ụzọ bara uru nke ukwuu karịa ọrụ ego nke a na-enwe ihe ịga nke ọma na ya. Ọ dịghị ihe na-eju afọ karịa inyere ndị mmadụ aka ịmata Jehova na eziokwu ya.” Otú a ka otu nwanyị bụ́ onye Kraịst kwuru, bụ́ onye họọrọ ịsụ ụzọ​—⁠ime nkwusa Alaeze oge nile⁠—​dị ka aka ọrụ ya. Aka ọrụ ndị ọzọ pụrụ inye obi ụtọ dị otú ahụ dị ole?

Ịsụ ụzọ bụ ihe mgbaru ọsọ dị elu na ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa. Olee otú mmadụ pụrụ isi họrọ ịdị ndụ dị otú ahụ? Gịnị ka a chọrọ iji nọgide n’ịsụ ụzọ ruo otú o kwesịrị iji nweta ngọzi ndị ọ na-eweta?

Ihe abụọ dị mkpa. Nke mbụ, ọnọdụ ndị ziri ezi. Ọtụtụ ndị bi n’ọnọdụ ndị doro anya na ha na-eme ka ịsụ ụzọ bụrụ ihe na-ekweghị omume. Nke abụọ, iru eru ime mmụọ na àgwà nke kwesịrị ekwesị. N’ezie, ma ọnọdụ ndị dị ugbu a hà kwere ka mmadụ sụọ ụzọ ma ọ bụ na ha ekweghị, mmadụ nile pụrụ ịrụ ọrụ iwulite àgwà ndị Kraịst tozuru okè.

Ihe Mere Ụfọdụ Ndị Ji Asụ Ụzọ

Gịnị bụ iru eru ndị a chọrọ maka ịsụ ụzọ n’ụzọ na-aga nke ọma? Ọ dị mma, nkà nke izisa ozi ọma dị mkpa. Ọ dị ndị ọsụ ụzọ mkpa ịmara otú e si eche ozi ọma ahụ n’ihu ndị ha na-amaghị, mee nletaghachi n’ebe ndị nwere mmasị nọ, ma duzie ọmụmụ Bible ebe obibi. Enweghị nkà ndị a pụrụ ịkụda onye ọsụ ụzọ aka. Otú o sina dị, ihe ndị ọzọ dịkwa mkpa.

Dị ka ihe atụ, ihe nile gbasara ofufe anyị metụtara mmekọrịta anyị na Jehova na nzukọ ya. Nke a gụnyere ịsụ ụzọ. Otu onye ọsụ ụzọ na-eto eto aha ya bụ Rado kọwara, sị: “Nye onye na-eto eto, ọ dịghị ihe ọ bụla dị mma karịa icheta Jehova na ijegharị n’ụzọ nke eziokwu.” Ee, ịsụ ụzọ bụ ụzọ dị mma maka ndị ntorobịa igosipụta ịhụnanya ha maka Jehova na ịnọ ya nso.​—⁠Eklisiastis 12:1.

Ihe ọmụma na nghọta dịkwa mkpa nke ukwuu. (Ndị Filipaị 1:​9-⁠11) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ndị a bụ mmanụ nke na-eme ka injin nke ime mmụọ anyị na-arụ ọrụ. Ọmụmụ ihe onwe onye nke chiri anya dị mkpa iji zere ịbụ onye ike gwụrụ n’ụzọ ime mmụọ, na-atụfu ịnụ ọkụ n’obi na nkwenyesi ike anyị. N’ezie, ihe ọmụma anyị na-enweta kwesịrị imetụta ọ bụghị nanị ọgụgụ isi kamakwa obi. (Ilu 2:2) Ya mere, tụkwasị n’ọmụmụ ihe onwe onye, anyị nwere mkpa maka ekpere na ntụgharị uche ka ihe ọmụma anyị nwetara nwee mmetụta n’obi anyị. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ọnọdụ anyị nyere ohere, anyị ga-achọ ịsụ ụzọ.​—⁠Tụlee Ezra 7:10.

Iwere ozi ọsụ ụzọ chọkwara mmụọ nke iji onwe onye achụ àjà. Otu nwa okoro a na-akpọ Ron mezuru atụmatụ ya nile maka ịsụ ụzọ. Ọ nọ nnọọ na-echere ọnọdụ ndị kwesịrị ekwesị ka o wee malite. Kpọmkwem ihe ọ chọrọ bụ ọrụ nke ga-ekwe ya ịsụ ụzọ ma n’otu mgbe ahụ nwee ụfọdụ n’ihe ndị na-eme ka ndụ dị ụtọ. Mgbe ọ gwatara otu nwanna nwanyị tozuru okè nke a, azịza nwanna ahụ kụjara ya. Ọ sịrị: “Jehova na-agọzi ihe ndị mmadụ mere, ọ bụghị nkwa.” Nwa okoro ahụ nwetara ọrụ nke a na-akwụ ụgwọ dị ala nke nyere ya ohere ịsụ ụzọ. Itinye Matiu 6:​25-⁠34 n’ọrụ ga-enyere mmadụ aka iji ego na-ehighị nne ọ na-akpata na-agbalị.

Ịdị njikere iji umeala n’obi gbasoo aro ndị dị mma pụkwara inye aka n’anyị ịbanye ozi ọsụ ụzọ. Ná mmalite ndụ ya dị ka onye Kraịst, Hanna zụlitere ọchịchọ nke ịsụ ụzọ. Ma ọ sụghị ụzọ mgbe ọ na-azụlite ezinụlọ, e mesịakwa o tinyere aka n’aka ọrụ nke ịchụ nta ego. N’ige ntị n’ezi ndụmọdụ sitere n’aka ndị okenye na-eleru anya ala, ọ hapụrụ ọrụ ego ya nke na-akpali mmasị ma were ozi ọsụ ụzọ. Hanna na-enwe ọṅụ dị ukwuu ugbu a n’ịkpọbata ndị ọzọ ịrara onwe ha nye na inyere ndị na-adịghị ejekwa ozi aka.

Inwe ekele maka ihe eziokwu meworo ná ndụ mmadụ pụkwara ịbụ ihe na-akpali ịsụ ụzọ. Tụlee ọnọdụ nke otu nwanyị nwere ịda mbà n’obi dị ukwuu, onye alụmdi na nwunye ya na-adakpọ. Ọnọdụ nke a gbanwere n’ụzọ dị ịrịba ama mgbe ọ mụtara eziokwu nke Okwu Chineke ma tinye ya n’ọrụ. N’inwe ọṅụ n’ihi ihe eziokwu ahụ mewooro ya, o kpebiri na ụzọ kasị mma ọ ga-esi gosi ekele ga-abụ ịsụ ụzọ ma nyere ndị ọzọ aka. Nke a ka o mere, ọ na-enwekwa ngọzi nke ọtụtụ ọmụmụ Bible na ndụ ezinụlọ nke obi ụtọ ugbu a.

Ndị Ọzọ Pụrụ Inye Aka

Ndị ọsụ ụzọ na-emekarị ka e nwee ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ. Rado, onye e hotara na mbụ, dị afọ isii mgbe ndị mụrụ ya sooro ndị ọsụ ụzọ abụọ mụọ Bible. Mgbe ọ ka bụkwa nwata nke ukwuu, ọ na-eso ndị nkwusa oge nile ndị a n’ozi ubi mgbe nile. Rado n’onwe ya ghọrọ onye ọsụ ụzọ mgbe ọ dị afọ 17. Nwa okorobịa ọzọ bụ́ Arno, bụ onye a zụlitere n’ezinụlọ ndị Kraịst ma ọ ghọrọ onye dara mbà n’ime mmụọ. Mgbe e mesịrị, ọ malitere iwulighachi ike ime mmụọ ya, ọ na-ekwuzikwa ugbu a, sị: “Enwetara m agbamume dị ukwuu n’aka ndị ọsụ ụzọ. M sonyeere ha karịsịa n’oge ezumike ụlọ akwụkwọ, mgbe ụfọdụkwa nye akụkọ ozi ubi ruru 60 hour n’ọnwa. Mgbe nke ahụ gasịrị, ịgbago n’ozi ọsụ ụzọ oge nile [nke na-achọ 90 hour n’ọnwa] abụkwaghị oké ihe.” Ịtụgharị uche na ndụmọdụ ahụ dị ná 1 Ndị Kọrint 7:​29-⁠31 nke ịghara iji ụwa eme ihe gabiga ókè enyeworo ndị dị otú a na-eto eto aka n’ezie.

Mmụọ nke ịsụ ụzọ pụrụ ịgbanye mkpọrọgwụ n’ụzọ dị mfe karị n’ụlọ ebe ọdịmma ime mmụọ nwere ọnọdụ mbụ, ebe ndị mụrụ ụmụ na-agbakwa ụmụ ha ume ịbanye ozi oge nile. Philo, onye tolitere n’ụdị ụlọ dị otú ahụ, sịrị: “Ọtụtụ ndị dụrụ m ọdụ ka m gaa n’ihu n’agụmakwụkwọ m, ka m kwadebe maka ọdịnihu nke ịrụ ọrụ ego. Ma ndị mụrụ m nyeere m aka ime mkpebi amamihe dị na ya karị. Ha gwara m na ọ bụrụ na m chọrọ n’ezie ime atụmatụ maka ọdịnihu, ihe mbụ m ga-eme kwesịrị ịbụ ịzụlite mmekọrịta n’ebe Jehova nọ.”

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Thamar sịkwara na ozi ọsụ ụzọ ya bụ n’ihi ihe nlereanya na mgbalị nke ndị mụrụ ya. Ọ sịrị: “Apụghị m ikwu n’ezie mgbe m zụlitere ndụ nke ile ihe anya n’ụzọ ime mmụọ, ma amaara m na a mụnyeghị ime otú ahụ n’ime m. Àgwà ndị mụrụ m nke ikere òkè n’ozi ubi mgbe nile na ije nzukọ, nakwa ịhụnanya dị omimi ha nwere maka eziokwu ahụ, nyeere m aka nke ukwuu ịzụlite àgwà nke ile ihe anya n’ụzọ ime mmụọ.”

Ịrapagidesi Ike ná Mkpebi Gị

Mgbe mmadụ banyesịrị n’ozi ọsụ ụzọ, ịnọgidesi ike na ya na-enyere onye ahụ aka inwetazu uru nke mkpebi amamihe ahụ. A pụrụ inye ọtụtụ ndụmọdụ ndị a pụrụ itinye n’ọrụ iji mee nke ahụ. Dị ka ihe atụ, ndị ọsụ ụzọ ga-eme nke ọma ịmụta otú e si ahazi oge ha iji mee ka ọ baa uru ruo otú o kwere mee. Ma, ihe kasị mkpa nọgidere na-abụ mmekọrịta mmadụ na Jehova na nzukọ Ya.

Ihe ya na nke a yiri bụ inwe àgwà nke ikpe ekpere. “Mgbe m batara n’eziokwu, achọsiri m ike ịsụ ụzọ,” ka Cor kwuru. Otú ọ dị, nna ya sịrị na ọ ga-ebu ụzọ gụchaa akwụkwọ ya na Mahadum Ọrụ Ugbo. Mgbe nke ahụ gasịrị, Cor malitere ịsụ ụzọ. Ka oge na-aga ọ lụrụ nwanyị, nwunye ya sonyekwara ya n’ọrụ ọsụ ụzọ. Mgbe ọ tụtara ime, ọnọdụ nke pụrụ ime ka ọ hapụ ọrụ ọsụ ụzọ chere Cor ihu. “Ekpegaara m Jehova ekpere ọtụtụ mgbe ma chee n’ihu ya ọchịchọ nke obi m ịnọgide na-asụ ụzọ,” ka Cor kwuru. N’ikpeazụ Cor nwetara ụdị ọrụ nke kwere ya ka ọ na-asụ ụzọ ọ bụ ezie na ọ na-azụ ezinụlọ.

Inwe afọ ojuju n’ihe dị mkpa e ji azụ anụ ahụ bụ ihe ọzọ na-enyere mmadụ aka mgbe mgbe ịnọgide n’ozi ọsụ ụzọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka ọchịchọ obi unu ghara ịdị n’ịhụnanya ego; ka afọ ju unu n’ihe unu nwere ugbu a: n’ihi na Ya onwe ya ekwuwo, sị, M gaghị aha gị aka ma ọlị, M gaghị ahapụkwa gị ma ọlị.” (Ndị Hibru 13:5) Inwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a nyeere Harry na Irene aka ịnọgide na-asụ ụzọ. Irene, bụ́ onye kpuru ìsì, abụwo onye ọsụ ụzọ kemgbe afọ asatọ. “Ọ dịtụbeghị mgbe anyị lere ọnọdụ akụ na ụba anyị anya dị ka nsogbu,” ka ọ sịrị. “Nanị na anyị leziri anya ka anyị ghara ibokwasị onwe anyị ibu arọ ndị na-adịghị mkpa n’ụzọ ego. Anyị na-eme mgbakọ ihe ọ ga-ewe mgbe nile. Ndụ anyị abụrụwo nke dị mfe mgbe nile, ọ bụ ezie na ọ bụkwa nke na-enye obi ụtọ, o jupụtawokwa ná ngọzi dị iche iche.”

Ọtụtụ Ọṅụ na Ngọzi

N’ileghachi anya azụ n’afọ itoolu nke ịsụ ụzọ, Thamar na-asị: “Ị na-abịa Jehova nso nke ukwuu, dị ka a ga-asị na o sekpụ gị n’aka n’ezie.” (Abụ Ọma 73:23) A na-echetakwa ọnwụnwa ụfọdụ. “Ezughị okè m tinyere nke ndị ọzọ na-enye m nsogbu mgbe nile,” ka Thamar kwukwara. “Tụkwasịkwa, m ga-ele ụmụnna ndị nwoke na nwanyị ndị họọrọ ụzọ ndụ nke ka na-akwụghachi ụgwọ n’ụzọ ihe onwunwe anya, nhọrọ ha eyiekwa ihe na-adọrọ mmasị mgbe m nọ n’èzí na-ejegharị ná mmiri ozuzo na oyi. Ma n’ala ala obi m, m naghị achọ ịgbanwere ọnọdụ ha ma ọlị. Olee ihe ọzọ ma e wezụga ịsụ ụzọ nke pụrụ iweta ọṅụ dị ukwuu, afọ ojuju ime mmụọ dị ukwuu, na ngọzi ndị dị ukwuu?” Ị̀ ga-ewere ọṅụ na ngọzi yiri ndị a n’ihe dị oké ọnụ ahịa?

N’ihi na ndị ọsụ ụzọ na-etinye oge dị ukwuu n’ozi ndị Kraịst, ha nọ n’ọnọdụ nke inyere ọtụtụ ndị aka inweta ihe ọmụma nke eziokwu Bible. Harry na Irene, ndị a kpọtụrụ aha na mbụ, na-asị: “E nwere ọtụtụ ihe ùgwù a ga-enweta ná nzukọ Jehova, ma inyere onye nwere mmasị ọhụrụ aka inwe ọganihu ruo n’ókè nke ịghọ onye na-ejere Jehova ozi kachasị ha nile.”

Onye ọsụ ụzọ ọzọ kwuru okwu otú o kwesịrị mgbe ọ sịrị: “Okwu ndị ahụ dị n’Ilu 10:22 abụrụwo eziokwu n’ọnọdụ m: ‘Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.’ E mezuwo akụkụ akwụkwọ nsọ nke a nye m ọtụtụ ugbo n’afọ ndị ahụ m jewooro Jehova ozi.”

Ndị mụrụ ụmụ, ùnu na-akụbanye ọchịchọ nke ịsụ ụzọ n’ime ụmụ unu? Ndị ọsụ ụzọ, ùnu na-agbalịsi ike ịkpali ọchịchọ nke a n’ime ndị ọzọ? Ndị okenye, ùnu na-akwado ndị ọsụ ụzọ n’ọgbakọ unu ma na-enye aka iwulite mmụọ nke ịsụ ụzọ n’ime ndị ọzọ? Ka ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị Jehova bụrụ ndị a kpaliri iru eru maka ngọzi bara ụba ndị dị otú a ka ha na-ekere òkè n’ozi ịsụ ụzọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya