Ònye Ga-anwa Anwa Ripịa Ụlọ Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ?
1 “Ndị na-eripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ . . . ga-enwe ezi ọmụma ikpe gabigara ókè karịa ndị ọzọ.” (Mak 12:40) Gịnị mere Jisọs ji kwuo okwu a? Ọ bụ ezie na ọ nọ na-ekwu banyere àgwà ịdị mpako na nke rụrụ arụ nke ndị odeakwụkwọ n’oge ya, ma o doro anya na nhota o hotara ndị inyom di ha nwụrụ n’ọnọdụ a na-emesi ike otú ịnapụ ndị dị otú ahụ ihe ndị ruuru ha siruru n’ike. Ọ pụrụ iweta ikpe ọmụma site n’aka Jehova.—Aịsa. 1:23.
2 Ma gịnị ka ‘iripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ’ pụtara? Tụlee ọnọdụ ndị a. Otu akwụkwọ kọrọ na mgbe di otu nwanyị nwụnahụrụ ya, ụmụnne di ya kere ụlọ nwoke ahụ nwụrụ anwụ n’etiti onwe ha ma bo nwanyị ahụ di ya nwụrụ ebubo na ọ bụ ya gburu di ya. Ha gbakasịrị ya ajụjụ ahụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ hour atọ. Ka e mesịrị, ha gwara ya ka ọ ṅụọ mmiri e ji saa ozu ahụ. Ha nwara ịmanye ya ịlụ otu nwanne di ya. Mgbe ọ jụrụ, ha chụpụrụ ya n’ezinụlọ ahụ ma hapụ ya ka ọ kpawa ọnụ ya na ụmụ ya atọ na-enwekwaghị nna. N’ọnọdụ ọzọ, otu nwanyị di ya nwụrụ kwuru na ya hụsiri anya ọbụna n’aka ụfọdụ ndị okenye ọgbakọ mgbe ha jichiri ihe nketa di ya n’ihi ihe ngọpụ na-erijughị afọ bụ́ na ha chọrọ ilekọta otú ọ ga-esi jiri ihe onwunwe a mee ihe. Ka a sịkwa ihe mere otu nwanyị di ya nwụrụ ji kwuo na ‘ịbụ onye di ya nwụrụ yiri ibi ná mba a na-enweghị onye na-asụ asụsụ gị, mba nke na-ewere gị dị ka onye a na-asọ asọ.’
3 Mgbe di ha nwụrụ, a maara na ndị inyom di ha nwụrụ na-enwe mwute, nkụda mmụọ, obi erughị ala, owu ọmụma, na mgbe ụfọdụ mgbagwoju anya. Onye ọ bụla ịtụkwasị ná nsogbu ndị a mkpasasị uche nke ịnapụ ha ihe e ji ebi ndụ yiri ikenyesi ụdọ ike n’olu nke onye na-enweghị ume. Ọ na-egbu mmụọ. Anyaukwu, iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, amaghị nke a na-akọ, na ịtụ ọdịnala egwu bụ ole na ole n’ime ihe ndị na-eme ka ndị mmadụ na-emegbu ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei. Otú ọ dị, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ngọpụ ndị ahụ na-eme ka onye ikpe mara nwere onwe ya pụọ n’iwe Chineke. (Ọpụ. 22:22, 23) Ọ bụ nke a mere ndị Kraịst nile na-aghaghị iji nọrọ na nche ka ha ghara imegbu ma ọ bụ irigbu ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei.
4 Ọ dị mwute ikwu na ndị Kraịst ụfọdụ bụ́ di, ruo mgbe ha nwụrụ, so na-akpata ahụhụ ndị nwunye ha nọ ndụ na-ata site n’izochi akụ̀ na ụba ha ma ọ bụ igbochi ndị nwunye ha ịmata ebe ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀ ha, ịnshọransị, na ihe onwunwe ha ndị ọzọ dị. Ọzọkwa, ha adịghị ede akwụkwọ ike ékpé na-akọwa otú e kwesịrị isi kee ala na ụlọ ha, ikekwe n’achọghị ka nwunye (na ụmụ) ha keta ihe ọ bụla mgbe ha nwụrụ. Otú a, n’amaghị ama, ha na-etinye ndị nwunye (na ụmụ) ha n’ịta ahụhụ na-adịghị mkpa. Nke a na-egosi na ndị dị otú ahụ ahụghị nwunye ha n’anya n’ezie dị ka ahụ ha.—Efe. 5:28, 29.
5 Otú ọ dị, n’ụzọ kwesịrị ịja mma, ndị ọzọ na-ede akwụkwọ ike ékpé doro anya nke na-egosi ndokwa ndị ha chọrọ ka e mee maka ndị òtù ezinụlọ nke ha kpọmkwem ma ha nwụọ. Ahụmahụ egosiwo na nke a bụ ndokwa ịhụnanya na nke amamihe dị na ya. Ọ na-egbochi mmegbu pụrụ ịpụta. N’ezie, ọ bụ ‘amamihe a gụrụ n’onye ezi omume site n’ọrụ ya nile.’—Mat. 11:19; 2 Kọr. 12:14; 1 Tim. 5:8.
6 Otu n’ime ihe ndị kpatara Jehova ji maa ndị “ikpe Sọdọm” ikpe bụ n’ihi mmegbu nke ndị inyom di ha nwụrụ. (Aịsa. 1:10, 17) N’ikpeazụ ọ jụrụ ịṅa ntị n’arịrịọ ha. Imeso ndị inyom di ha nwụrụ ma ọ bụ ụmụaka na-enweghị nna mmeso ọjọọ pụrụ iduje n’ịtụfu ihe ùgwù ije ozi ndị pụrụ iche n’ọgbakọ. Amamikpe ahụ pụrụ ọbụna isi ike karị nye ndị mmeso ọjọọ ha mesoro ndị inyom di ha nwụrụ na/ma ọ bụ ụmụ mgbei gụnyere mpụnara ihe ma ọ bụ anyaukwu. A pụrụ ịchụpụ ndị dị otú ahụ n’ụzọ ziri ezi n’ọgbakọ ndị Kraịst ọ gwụla ma ha chegharịrị ma chigharịa n’eziokwu. N’ihi ya ndị okenye kwesịrị ịmụrụ anya “ikpe ọnụ” ndị inyom di ha nwụrụ na ichebe ha pụọ n’aka ndị yiri anụ ọhịa wolf ma ọ bụ anụ ndị na-eri ibe ha.—Aịsa. 1:17; Mak 12:40; 1 Kọr. 5:10, 11; 6:10; 1 Tim. 3:8.
7 Ka anyị nile dị njikere ma nwee ọchịchọ “ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha,” wee si otú a na-efe Jehova, bụ́ Chineke anyị nke na-eche banyere anyị, ofufe ọ na-anakwere.—Jes. 1:27.