Jiri Oge Gị Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya
1 Ọchịchọ anyị nwere ime ka obi na-adị Jehova ụtọ na-akpali anyị ime ka ndụ anyị dịkwasị n’ihe ime mmụọ. Okwu ya na-enye anyị ntụziaka ka anyị ‘nọgide buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ’ nakwa ka anyị ‘na-ejide ihe ndị ka mkpa n’aka.’ (Mat. 6:33; Fil. 1:10) Olee otú anyị pụrụ isi na-azụpụta oge maka ihe ndị metụtara Alaeze ma na-edebe ihe ndị na-adịchaghị mkpa n’ọnọdụ ha?—Efe. 5:15-17.
2 Na-ebute Ihe Ndị Metụtara Alaeze Ụzọ: Na-ahazi oge gị ahazi ka i wee ghara imefu ya n’ihe ndị na-adịghị mkpa. Ụfọdụ na-amalite ọnwa ọ bụla site n’ịka oge ụfọdụ akara na kalenda ha dị ka oge ha ga-eji jee ozi ubi. Ha na-akpachapụzi anya ịhụ na ha ejighị oge ndị ahụ mee ihe ndị ọzọ. A pụrụ ime otu ihe ahụ iji zụpụta oge maka ịga nzukọ ọgbakọ, inwe ọmụmụ ihe onwe onye, na ịga mgbakọ. Ọtụtụ ndị nwere ndokwa nke ịgụ Bible ozugbo ha tetara ụra n’ụtụtụ ma ọ bụ tupu ha alakpuo ụra n’abalị. Wepụta oge doro anya maka nke ọ bụla n’ime ihe ndị a dị mkpa, ekwekwala ka ihe ndị ọzọ weghara oge ndị ahụ.—Ekli. 3:1; 1 Kọr. 14:40.
3 Wetulata Aka n’Otú I Si Eji Ụwa Eme Ihe: Ná mba ụfọdụ, egwuregwu, ihe ntụrụndụ, na ihe ndị ọzọ e ji atụ ndụ mmanụ dị aghara aghara. Ọtụtụ ndị na-eji oge karịrị akarị ekiri telivishọn ma ọ bụ na-achọ ihe na kọmputa. Otú ọ dị, iji oge dị ukwuu atụrụ ndụ ma na-azụkarị ihe ndị ọhụrụ a na-emepụta n’ụwa a ga-emerịrị ka ihe ghara ịgaziri gị otú i si chee ya. (1 Jọn 2:15-17) N’ihi ya, Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ka anyị ghara iji ụwa mee ihe n’újú. (1 Kọr. 7:31) Site n’ịṅa ntị na ndụmọdụ ahụ amamihe dị na ya, ị pụrụ igosi Jehova na ị na-edebe ofufe ya n’ọnọdụ mbụ ná ndụ gị.—Mat. 6:19-21.
4 Oge fọdụụrụ usoro ihe a agwụwala. Ndị na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ụzọ ga-enwe obi ụtọ, ha ga-enwetakwa ihu ọma Chineke. (Ilu 8:32-35; Jems 1:25) N’ihi ya, ka anyị jiri ihe a bara uru, bụ́ oge anyị, na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya.