Debe Ntụrụndụ n’Ọnọdụ Ya Kwesịrị Ekwesị
1 N’oge ndị a siri ike, ọ dị anyị nile mkpa ịdị na-enwetụ ezumike site n’oge ruo n’oge. Ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ntụrụndụ kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, itinyebiga oge ókè ná ntụrụndụ na isoro ndị ọzọ na-akpakọrịta pụrụ ime ka mmadụ na-etinye oge na-adịwanye nta ná nchụso nke ihe ime mmụọ. Anyị aghaghị idebe ntụrụndụ n’ọnọdụ ya kwesịrị ekwesị. (Mat. 5:3) Olee otú nke a ga-esi kwe omume? Site n’ịgbaso ndụmọdụ ahụ dị ná Ndị Efesọs 5:15-17.
2 Setịpụ Ebe Ị Ga-ejeru: Pọl dere na ndị Kraịst kwesịrị ‘ilezi anya’ otú ha si na-ebi ndụ n’ụzọ amamihe dị na ya. Imeru ihe n’ókè na njide onwe onye dịcha mkpa iji mee ka oge ntụrụndụ bụrụ nanị ruo n’ókè dị mkpa n’ezie. Ọ dị mma ichesi echiche ike n’ụzọ anyị si eji oge ndị anyị na-ejighị ọrụ n’aka eme ihe. Ntụrụndụ kwesịrị ịrụpụta ihe bara uru kama ime ka anyị chee na anyị emebisịwo oge anyị ma ọ bụ mee ka ike gwụ anyị nke ukwuu. Ọ bụrụ na anyị na-enwetụ obi amamikpe mgbe anyị mesịrị otu ihe omume, nke a ga-egosi na ọ dị anyị mkpa ime mgbanwe n’otú anyị si eji oge eme ihe.
3 Nwee Ezi Uche: Pọl nyere ndụmọdụ n’ịdị “na-azụchapụta oge” maka ihe ndị ka mkpa ná ndụ, ghara ịbụ “ndị na-enweghị uche.” Ndị Kraịst raara onwe ha nye agaghị ekwe ka ndụ ha hiwe isi ná ntụrụndụ. Ọ bụ ezie na ezumike na ntụsara ahụ pụrụ ime ka anyị dịghachi ike n’ụzọ anụ ahụ, isi iyi nke ume ọrụ ime mmụọ bụ ike Chineke nọ n’ọrụ. (Aịsa. 40:29-31) Anyị na-enweta mmụọ ya n’ọrụ ọchịchị Chineke—ịmụ Bible, ịga nzukọ ọgbakọ, ikere òkè n’ozi ubi—ọ bụghị site ná ntụrụndụ.
4 Setịpụ Ihe Ndị Ka Mkpa: Pọl nyere ndị Kraịst ntụziaka ka ha nọgide ‘na-aghọta ihe bụ́ ihe Onyenwe anyị na-achọ.’ Jisọs kụziri na ihe ndị anyị na-eme kwesịrị ihiwe isi n’Alaeze Chineke dị ka ihe mbụ ná ndụ anyị. (Mat. 6:33) Ọ dị oké mkpa na anyị buru ụzọ mee ihe ndị ga-eme ka anyị na-ebi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị nye Jehova. Mgbe e mesịziri, a pụrụ idebe oge ntụrụndụ n’ọnọdụ ya kwesịrị ekwesị. Mgbe e mere nke ahụ, ọ ga-enwe mmetụta dị mma, anyị ga-anụkwa ụtọ ya karị.—Ekli. 5:12.