Igbe Ajụjụ
◼ Ruo ogologo oge hà aṅaa ka e kwesịrị iduziri mmadụ ọmụmụ Bible n’akwụkwọ Ihe Ọmụma?
Jehova na-agọzi nzukọ ya taa. Anyị na-ahụ ihe àmà nke a kwa afọ ka ọtụtụ puku ndị ọhụrụ na-ewere nguzo maka eziokwu ahụ. Akwụkwọ Ihe Ọmụma na-egosi onwe ya ịbụ ngwá ọrụ dị irè n’ịrụzu nke a. Mbipụta Ụlọ Nche nke January 15, 1996, rụtụrụ aka na a haziri akwụkwọ a iji nyere onye a na-amụrụ Bible aka inwe ọganihu ime mmụọ n’ụzọ dịtụ ngwa, ikekwe ruo na baptism n’ime ọnwa ole na ole.
N’ihi nke a, otu Ụlọ Nche ahụ, na peji nke 17, nyere ndụmọdụ, sị: “Mgbe mmadụ nwezusịrị ọmụmụ Bible ya n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, e meekwa ya baptism, o nwere ike ọ gaghị adị mkpa iduziri ya ọmụmụ ihe ọzọ n’akwụkwọ nke abụọ.”
Gịnị banyere onye a na-emeghị baptism mgbe ọ mụsịworo akwụkwọ Ihe Ọmụma? Ozi Alaeze Anyị nke June 1996, peji nke 6, paragraf nke 23, chetaara anyị isi ihe e kwupụtara n’Ụlọ Nche ahụ banyere esoghị otu onye mmụta ahụ mụọ akwụkwọ ndị ọzọ mgbe ọ mụsịworo akwụkwọ Ihe Ọmụma. Nke a ọ̀ pụtara na anyị enweghị mmasị n’inyere onye a na-amụrụ Bible aka gabiga n’ebe a? Ee e. Anyị chọrọ ka ndị mmadụ nweta ihe ọmụma bụ isi nke eziokwu ahụ. Ma, a na-atụ anya na n’ime oge dịtụ mkpirikpi, onye nkụzi dị irè ga-enwe ike inyere onye mmụta nwere obi eziokwu nke nwetụrụ ihe ọmụma aka inweta ihe ọmụma zuru ezu iji mee ezi mkpebi ijere Jehova ozi. Ọ pụrụ ịbụ na n’ihi ọnọdụ onwe onye ha, ụfọdụ ndị a na-amụrụ Bible ga-achọ ọbụna ịmụ ihe karịa otu ugboro n’izu.
N’eziokwu, ụfọdụ ndị mmụta ga-enwe ọganihu na-adịghị ngwa karị ndị ọzọ. Ma ọ bụrụ na mgbe a mụsịrị akwụkwọ Ihe Ọmụma, bụ́ nke pụrụ ịdịteworị anya karịa ka o kwesịrị, onye ahụ ekpebibeghị na ya chọrọ iso ọgbakọ na-akpakọrịta, onye nkwusa ahụ ga-eme nke ọma isoro otu n’ime ndị okenye nọ na Kọmitii Ije Ozi Ogbakọ kwurịta ọnọdụ ahụ. Ọ bụrụ na ọ gụnyere ọnọdụ a pụrụ ịgọpụrụ ma ọ bụ nke a na-adịghị ahụkebe, ọ pụrụ ịdị mkpa inyekwu enyemaka ụfọdụ. Nke a bụ n’ikwekọ n’ụkpụrụ ihe e kwuru na paragraf nke 11 na 12, na peji nke 17 n’Ụlọ Nche nke January 15, 1996.
Ekele maka ịnara ọbụna ihe ọmụma bụ isi nke eziokwu ahụ kwesịrị ịkwali onye mmụta ahụ ịga nzukọ ndị Kraịst. Nke a pụrụ iduga onye mmụta ahụ n’inye ihe àmà doro anya nke ọchịchọ ya ijere Jehova ozi. Ọ bụrụ na ekele n’ihe ime mmụọ dị otú ahụ apụtaghị ìhè mgbe e duzisịworo ọmụmụ ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ruo ogologo oge, ọ pụrụ ịdị mkpa ka a kwụsị ọmụmụ ihe ahụ.