Ihe Ọmụma nke Ezi Chineke ahụ Na-eduba ná Ndụ
1 “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ,” ka Jisọs kwuru n’ekpere o kpegaara Nna ya, “ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke.” (Jọn 17:3) Lee ụgwọ ọrụ mmesapụ aka nke ahụ bụ! Site n’iji akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi eme ihe, anyị pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịmụta ihe ọ dị mkpa ka ha mee iji dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Gịnị ka anyị pụrụ ikwu iji kpalie mmasị ha ma kwalie ha ịgụ akwụkwọ Ihe Ọmụma?
2 Ị pụrụ iji ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke na-egosipụta Bible dị ka isi iyi dị irè nke nduzi mee ihe, site n’ịsị:
◼ “Anyị so ndị agbata obi anyị na-akparịta ụka banyere ebe a ga-achọta isi iyi dị irè nke nduzi maka ịnagide nsogbu ndị dị ná ndụ. N’oge gara aga, ọtụtụ ndị mmadụ na-ebu ụzọ akpọtụrụ Bible. Ma ugbu a àgwà ndị mmadụ agbanwewo; ọtụtụ ndị nwere obi abụọ banyere Bible, na-ele ya anya nanị dị ka akwụkwọ ụmụ mmadụ dere. Gịnị bụ uche gị? [Nye ohere maka nzaghachi.] E nwere ezi ihe mere a pụrụ iji kwuo na Bible dị irè maka ụbọchị anyị. [Gụọ 2 Timoti 3:16, 17.] Ụkpụrụ dị iche iche nke Bible dị irè ugbu a dị nnọọ ka ha dị mgbe Chineke kpaliri odide nke Bible.” Sapeta peji nke 16 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, kwuokwa okwu ná mkpirikpi banyere nduzi dị irè dị n’Ozizi Elu Ugwu nke Jisọs. Gụọ nhota ahụ dị na paragraf nke 11 ma ọ bụ nke dị na paragraf nke 13. Nyefee akwụkwọ ahụ, meekwa ndokwa ịgaghachi iji zaa ajụjụ bụ́, Olee otú anyị onwe anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe ọmụma dị n’ime Bible?
3 Ebe ọ bụ na ekpere bụ isiokwu na-amasị ọtụtụ ndị, ị pụrụ ịchọ ikwurịta ya site n’ịjụ, sị:
◼ “N’ihi ihe ịma aka nile anyị na-aghaghị iche ihu ná ndụ a na-adị ugbu a, ì chere na ekpere pụrụ ịbụrụ anyị ezi ihe inyeaka? [Chere maka nzaghachi.] Ọtụtụ ndị na-eche na ha abịaruwo Chineke nso site n’ikpegara ya ekpere nakwa na ime otú ahụ enyewo ha ume dị n’ime, bụ́ kpọmkwem ihe Bible na-ekwe nkwa ya. [Sapee akwụkwọ Ihe Ọmụma na peji nke 156, gụọkwa Ndị Filipaị 4:6, 7.] Ọbụna otú ahụ, mmadụ pụrụ iche na a na-adịghị aza ekpere ya mgbe ụfọdụ. Isiakwụkwọ a na-atụle ‘Otú Ị Pụrụ Isi Bịaruo Chineke Nso.’ [Nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya.] Isiakwụkwọ a na-akọwakwa otú anyị pụrụ isi ṅaa Chineke ntị, ebe ọ bụ na iso ya enwe nkwurịta okwu adịghị aga nanị otu akụkụ. Anyị pụrụ ịtụle nke ahụ n’oge ọzọ m ga-abịa.”
4 Ị̀ ga-achọ ịnwale ụzọ ịga n’ihe kpọmkwem iji malite ọmụmụ ihe? Nke a bụ otu nke pụrụ ịgara gị nke ọma:
◼ “Anyị na-enye ndị mmadụ usoro ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Ọ̀ dịwo mgbe i nwere usoro ọmụmụ Bible na mbụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ka m gosi gị ihe enyemaka ọmụmụ ihe anyị ji eme ihe.” Gosi ya akwụkwọ Ihe Ọmụma, sapeta peji nke 3 ka onye nwe ụlọ wee hụ usoro ihe ndị dị n’ime ya, jụọkwa sị, “Ọ̀ dịwo mgbe ị jụrụ ihe Bible nwere ikwu banyere isiokwu ndị a?” Sapeta isiakwụkwọ nke e gosiri mmasị na ya karịsịa, gụọkwa isiokwu nta ndị o nwere. Kọwaa na ị ga-achọ igosi n’ụzọ dị mkpirikpi otú anyị si atụle ihe ọmụma a n’usoro ọmụmụ ihe anyị. Ma à malitere ọmụmụ ihe ma ọ bụ na a maliteghị, nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya.
5 Taa ọtụtụ ìgwè mmadụ na-anakwere ezi ihe ọmụma nke ezi Chineke ahụ. (Aịsa. 2:2-4) Ọ bụ ihe ùgwù anyị inyere ọtụtụ ndị aka dị ka o kwere omume ịmụta banyere Jehova wee bụrụkwa ndị e dubara ná ndụ.—1 Tim. 2:4.