Nyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ
1 Pọl onyeozi kọwara na ọ bụ ‘uche Chineke ka mmadụ nile bịaruo ná mmazu nke eziokwu ahụ.’ (1 Tim. 2:4) Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka inweta ihe ọmụma ahụ? Otu ụzọ bụ site n’ịgaghachi leta ndị a kpaliworo mmasị ha site n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Akwụkwọ a na-akọwa eziokwu Bible n’okwu ndị doro anya, dị mfe, ndị a họọrọ nke ọma. Site n’ịmụ ya, a pụrụ iduba ụdị mmadụ nile ná ndụ. Gịnị ka anyị pụrụ ikwu nke ga-agba ndị ọzọ ume isoro anyị na-amụ ya?
2 Nye ndị gosiri mmasị na Bible dị ka ihe nduzi dị irè, ị pụrụ ịgaghachi iji malite ọmụmụ ihe, ma eleghị anya na-asị:
◼ “Mgbe m bịara ebe a n’oge gara aga, anyị tụlere ihe mere anyị pụrụ iji tụkwasị Bible obi dị ka isi iyi dị irè nke nduzi. N’ihi na ọ bụ ihe sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, Bible bụkwa isi iyi e ji n’aka nke nkasi obi na olileanya, ọbụna dị ka otu n’ime ndị ozi Kraịst kwuru. [Gụọ Ndị Rom 15:4.] Ná ngwụsị nke mkparịta ụka ikpeazụ anyị, ewelitere m ajụjụ bụ́, Olee otú anyị onwe anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe ọmụma dị n’ime Bible?” Gụpụta paragraf nke 18 na peji nke 11 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Rụtụ aka na Ndịàmà Jehova na-eduzi ihe dị ka nde ọmụmụ Bible ise n’ụwa nile, na-enyere ndị mmadụ aka n’ebe nile inweta ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Mee otu ihe ngosi dị mkpirikpi banyere ụzọ e si eduzi ọmụmụ ihe, na-eji paragraf ise mbụ n’isi 1 eme ihe.
3 Ọ bụrụ na ekpere bụ isiokwu mbụ i sooro mmadụ kparịta, ị pụrụ ịnwale ụzọ nke a ná mgbalị ịmalite ọmụmụ ihe:
◼ “Echere m na ihe ọmụma anyị kparịtara banyere ekpere n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi masịrị gị. Ekwere m nkwa ịbịaghachi ma soro gị tụlee otú ndị na-ekpegara Chineke ekpere pụrụ isi, n’aka nke ha, ṅaa ya ntị. Rịba ama ihe e kwuru na peji nke 158. [Gụpụta paragraf nke 18.] N’ihi ya, site n’ịmụ Bible n’onwe anyị, anyị na-aṅa ihe Chineke nwere ịgwa anyị ntị. Ime nke a na-adọta anyị nso n’ebe ọ nọ karịa, na-enyekwara anyị aka ịnagide nsogbu ndị anyị na-enwe kwa ụbọchị, bụ́ ndị anyị na-ekpe ekpere banyere ha. Ọ ga-amasị m isoro gị mụọ Bible.” Ọ bụrụ na onye ahụ achọọ, malite n’isiakwụkwọ mbụ nke akwụkwọ Ihe Ọmụma ahụ.
4 Ọ bụrụ na i jiri ụzọ ịga n’ihe kpọmkwem wee malite ọmụmụ ihe n’ebe a natara akwụkwọ ahụ, ị pụrụ ikwu nke a iji sochie mkparịta ụka unu nweburu:
◼ “Emere m mgbalị pụrụ iche iji bịaghachi na nke gị n’ihi na m chọrọ ịgwakwu gị okwu banyere usoro ọmụmụ Bible n’efu anyị. Ahapụụrụ m gị otu n’ime akwụkwọ a, Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke bụ́ ihe enyemaka ọmụmụ ihe nke anyị ji eme ihe. Rịba ama otú o si agba anyị ume ịtụle Okwu Chineke. [Gụpụta paragraf nke 23 na peji nke 22.] Biko ọ bụrụ na ị ga-eweta akwụkwọ nke gị, eleghị anya anyị pụrụ ịga n’ihu n’ịmụ site n’ebe anyị kwụsịrị n’oge gara aga.” Ọ bụrụ na a maliteghị ọmụmụ ihe n’ọbịbịa nke mbụ, ị pụrụ ịsị: “Ikekwe nke a pụrụ ịbụrụ m oge mara mma iji gosi gị otú anyị si amụ Bible.” Mgbe unu tụlesịrị paragraf ole na ole, dokwaa otu oge kpọmkwem iji gaghachi maka ọmụmụ ihe ọzọ.
5 Iji akwụkwọ Ihe Ọmụma na-eme ihe n’ụzọ dị irè ga-eme ka anyị nwee ike ịgbasa ezi ihe ọmụma maka ngọzi nke ndị ọzọ. (Ilu 15:7) Ihe ọmụma dị otú ahụ ga-ewetara ndị obi ha ziri ezi obi ụtọ, ọ ga-abụkwa ihe mkpali dị ike nye ha ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ezi omume Jehova, na-eduba ná ndụ ebighị ebi n’ikpeazụ.