Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/96 p. 8
  • “Okwukwe Si n’Ọnụnụ Pụta”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Okwukwe Si n’Ọnụnụ Pụta”
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Nke A Bụ Ndụ Ebighị Ebi”
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ịgbasa Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ihe Ọmụma Sitere n’Aka Chineke Na-aza Ọtụtụ Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 4/96 p. 8

“Okwukwe Si n’Ọnụnụ Pụta”

1 Mgbe anyị chọtara onye nwere “ọnọdụ uche ziri ezi maka ndụ ebighị ebi,” ọ dị mkpa iwusi okwukwe onye ahụ ike n’ihe ọ nụworo. (Ọrụ 13:48, NW; Rom 10:17) Iji mezuo nke ahụ, anyị kwesịrị isochi ụtụ Ụlọ Nche na ntinye magazin nile site n’iweta mbipụta ndị kasị ọhụrụ na ịkparịtakwu ụka. Otú ọ dị, buru n’uche ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Nke a bụ aro ụfọdụ pụrụ inye aka:

2 Mgbe ị na-eme nletaghachi n’ebe ị tụlere isiokwu bụ́ “Nye Eze nke Mgbe Ebighị Ebi Otuto!,” ị pụrụ ịmalite n’ụzọ dị otú a:

◼ “Mgbe ikpeazụ anyị kwurịtara okwu, anyị tụlere ụfọdụ n’ime ihe àmà na-enweghị mgbagha ndị na-anwapụta na e nwere otu Chineke pụrụ ime ihe nile. Otú ọ dị, nanị ịmara banyere ịdị adị ya ezughị. Ọ dị anyị mkpa ịmata aha ya. Olee aha ị na-akpọ Chineke? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọtụtụ nde mmadụ na-akpọ ya nanị ‘Onyenwe anyị’ ma ọ bụ ‘Chineke,’ bụ́ utu aha ndị na-adịghịrị onye ọ bụla kpọmkwem. Tụkwasịkwa, ọ chọrọ ka anyị jiri aha ya mara ya. [Gụọ Abụ Ọma 83:18.] Bible na-agwa anyị ihe dị ukwuu karị banyere Jehova Chineke, dị ka a kọwara n’akwụkwọ a.” Gosi ihe osise dị na peji nke 29 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma ma gụpụta okwu nkọwa ya. Mgbe ị tụlere paragraf atọ mbụ dị n’isi nke 3, ị ga-amaliteworị ọmụmụ ihe!

3 Maka ndị gị na ha tụlere isiokwu bụ́ “Ihe Mere Okpukpe Ụwa Ga-eji Abịa ná Njedebe,” ị pụrụ ịchọ isochi mmasị ahụ site n’ịsị:

◼ “Mgbe ị gụsịrị isiokwu ahụ, eziokwu bụ na anyị apụghị ile okpukpe nile anya n’otu ụzọ pụrụ imetụwo gị n’obi. Ma ezi okpukpe ma okpukpe ụgha dịcha. Nke a na-ewelite ajụjụ ahụ ezi uche dị na ya, Ofufe ole ndị ka Chineke na-anakwere? Jisọs nyere azịza ya, a kọwapụtakwara ya n’akwụkwọ a.” Sapeta isi nke 5 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, ma gụpụta paragraf nke 4, gụnyere Jọn 4:23, 24. Mgbe ahụ jụọ sị, “Ị̀ ga-ekwe ịnakwere ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu?” Ọ bụrụ na azịza bụ ee, sapeta isi 1 ma malite ọmụmụ ihe.

4 Ọ bụrụ na e gosiri mmasị na “Teta!” May 8, mgbe ị gaghachiri ị pụrụ ịnwa ụzọ nke a iji malite ọmụmụ ihe n’akwụkwọ “Ihe Ọmụma”:

◼ “Ị pụrụ icheta na anyị kparịtara ụka banyere olileanya anyị maka imesịa hụ ụwa agha na-adịghị ya. O siri ike iche n’echiche ihe nke ahụ ga-adị ka ya. Nke a bụ nchepụta otu onye na-ese ihe osise banyere ya. [Gosi ihe osise dị na peji nke 188 na 189 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.] Ọ́ gaghị abụ ihe obi ụtọ inwe ike ibi na gburugburu ebe obibi ndị a? [Sapeta peji nke 4 na 5, gosi ihe osise, gụpụtakwa igbe.] Isiokwu akwụkwọ a yiri okwu Jisọs ndị a na-ahụ na Jọn 17:3. [Gụọ.] Ọ bụrụ na ị ga-ekwe, m ga-achọ igosi gị ụzọ a pụrụ isi jiri akwụkwọ na Bible gị chọta ihe ọmụma ahụ na-azọpụta ndụ.” Ọ bụrụ na onye ahụ nwe ụlọ kwere, malite ọmụmụ ihe n’isiakwụkwọ mbụ.

5 Ọ bụrụ na i jekwuru onye ji ọrụ n’aka mgbe ị gara na mbụ, ị pụrụ ikwu nke a mgbe ị gaghachiri:

◼ “M letara gị n’oge na-adịbeghị anya ma hapụrụ gị ụfọdụ magazin Ụlọ Nche na Teta! Magazin ndị a na-ewulite nkwanye ùgwù maka Bible na nduzi ụkpụrụ omume ya. N’ihi na m chere na ọ dị mkpa ka onye ọ bụla ghọta Okwu Chineke, m bịaghachiri iji gosi gị ihe ga-enyere gị aka ime nke ahụ.” Gosi akwụkwọ Ihe Ọmụma, zookwa aka n’ihe ndị dị n’ime ya dị na peji nke 3. Jụọ ya isiakwụkwọ yiri ka ọ kasị na-adọrọ mmasị, sapeta ya, ma malite ọmụmụ ihe.

6 Ọṅụ anyị ga-adị ukwuu ma anyị nwee ike ‘imeghere ndị ọzọ ọnụ ụzọ okwukwe’ nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.—Ọrụ 14:27; Jọn 17:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya