Ihe Ọmụma Sitere n’Aka Chineke Na-aza Ọtụtụ Ajụjụ
1 Tupu i nweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ikekwe i nwere ọtụtụ ajụjụ banyere ndụ ndị ị na-enweghị ike ịza. Lee ka i si nwee obi ụtọ inweta azịza ndị dabeere na Bible nye ajụjụ ndị ahụ! Ugbu a i nwere ike inyere ndị ọzọ aka ịchọta otu azịza ndị ahụ. (Tụlee 2 Timoti 2:2.) Ị pụrụ isoro ha kerịta ihe ọmụma Chineke nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Ma olee otú ị pụrụ isi nyere mmadụ aka ịghọta uru nke ihe ọmụma a? Cheedị echiche banyere ajụjụ ndị eziokwu ahụ zawooro gị. Gịnị ka ndị na-achọ eziokwu chọrọ ịmara? Iche echiche n’ụzọ dị otú a pụrụ inyere gị aka inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Aro ndị na-esonụ pụrụ inyere gị aka mgbe ị na-akwadebe maka ịgba àmà na June.
2 Ebe ọtụtụ ndị mmadụ na-eche ihe mere e ji nwee oké nhụjuanya n’ụwa, ụzọ njekwuru a pụrụ inweta nzaghachi dị mma:
◼ “Mgbe ọdachi mere ma ọ bụ mgbe ime mpụ na ihe ike na-amụba, ndị mmadụ na-ajụkarị ihe mere ajọ ihe ndị dị otú ahụ ji na-eme. Gịnị ga-abụ azịza gị?” Nye ohere maka nzaghachi onye ahụ, jaakwa ya mma. Mgbe ahụ sapeta isi nke 8 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, dọrọkwa uche ya gaa n’ihe e kwuru na paragraf nke 2. Kọwaa na akwụkwọ a na-enye nkọwa nke Bible banyere ihe mere ihe ọjọọ ji na-eme, ma sị: “Ọ ga-amasị m ịhapụrụ gị akwụkwọ a n’ụtụ ₦55.”
3 Mgbe ị na-alaghachi n’ebe i tinyere akwụkwọ “Ihe Ọmụma,” ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Enwere m mmasị ná nkwubi okwu i ruru na ya banyere ihe mere e ji nwee oké nhụjuanya dị n’ụwa. Ì kwere n’azịza Bible dị ka e depụtara n’akwụkwọ ahụ?” Nye ohere maka nzaghachi. Gụpụta paragraf nke 17 na peji nke 77 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, kwuokwa ka ị gụpụta Ndị Rom 9:14 site na Bible onye nwe ụlọ. Mgbe ahụ kwuo, sị: “Ozi ọma dị ya bụ na Chineke adịghị akpatara anyị ihe mgbu na nhụjuanya n’ụzọ na-ezighị ezi. O kwewo nkwa inye anyị ndụ ebighị ebi n’udo na obi ụtọ. A kpọrọ isi nke mbụ n’akwụkwọ a ‘Ị Pụrụ Inwe Ọdịnihu Obi Ụtọ!’ Aga m achọ ịkọwa otú nke ahụ pụrụ isi bụrụ eziokwu nye gị na ndị ị hụrụ n’anya.” Sapeta isi nke 1, ma gosi ụzọ anyị si amụ ihe. Tụlee ihe dị ukwuu n’isiakwụkwọ ahụ dị ka o kwesịrị ekwesị n’okpuru ọnọdụ dịnụ.
4 Ị pụrụ ịhọrọ iji okwu mmeghe nke dị na peji nke 5 n’akwụkwọ nta bụ́ “Nkwurịta Okwu Bible” mee ihe, n’okpuru isiokwu bụ́ “Ịka Nká/Ọnwụ”:
◼ “Ọ̀ dịwo mgbe ị jụrụ, sị, ‘Ọnwụ ọ̀ bụ njedebe ihe nile? Ka è nwere ihe ọzọ mgbe a nwụsịrị?’ [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-aza ajụjụ ọ bụla anyị pụrụ inwe banyere ọnwụ. [Gụọ Eklisiastis 9:5, 10.] Ọ na-egosikwa na e nwere ezi olileanya maka ndị nwere okwukwe. [Sapeta paragraf nke 13 na peji nke 84 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma; gụpụta ma kọwaa okwu Jisọs ndị a na-ahụ na Jọn 11:25.] E ji isiakwụkwọ a dum zaa ajụjụ ahụ bụ́, Gịnị na-eme ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ? Nke a pụrụ ịbụ nke gị n’ụtụ ₦55.”
5 Mgbe ị na-eme nletaghachi, ị pụrụ ịmaliteghachi mmekọrịta ndị i nweburu, mgbe ahụkwa sị:
◼ “N’oge gara aga anyị kwurịtara banyere ihe na-eme mgbe mmadụ nwụrụ. Ọtụtụ ndị kwetara na ndụ ọ bụla a ga-adị mgbe a nwụsịrị ga-abụ n’eluigwe ma ọ bụ na hel. Ma ì chetụwo echiche banyere ikwe omume nke ndị nwụrụ anwụ ịdị ndụ ọzọ kpọmkwem n’elu ala ebe a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Dị ka Bible si kwuo, ndị a kpọlitere n’ọnwụ ga-eso ná ndị dị umeala n’obi ndị na-enweta ala. [Gụọ Abụ Ọma 37:11, 29, mgbe ahụ tụlee paragraf nke 20 na peji nke 88 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.] Olileanya ahụ enyewo ọtụtụ nde mmadụ ndị na-ebibu n’ụjọ ọnwụ nkasi obi. Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịghọta okwu ahụ nke ọma karị. M̀ pụrụ igosi gị ụzọ ọ ga-esi nyere gị aka?”
6 Ọ bụrụ na i nwere mmasị karị n’ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ bụ́ nke dị mfe, ị pụrụ ịnwale nke a:
◼ “Aga m achọ igosi gị ihe osise dị n’akwụkwọ a, bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ̀ bụ na nke a abụghị ihe osise mara mma?” Mepee akwụkwọ ahụ ka onye nwe ụlọ nwee ike ịhụ peji nke 4-5. Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụpụta okwu ndị dị na peji nke 5. Mechie site n’ikwu, sị: “Ị pụrụ inweta akwụkwọ a ịgụ n’onwe gị n’ụtụ ₦55.” Chọpụta oge ga-aka mma ịlaghachi iji sochie mmasị ọ bụla e gosiri.
7 Anyị nwere ihe ọmụma sitere n’aka Chineke nke na-aza ajụjụ ndị dị mkpa ná ndụ. Kwadoo nke ọma, Jehova ga-agọzikwa mgbalị gị isoro ndị na-achọ eziokwu kerịta ihe ọmụma a na-enye ndụ.