Ịgbasa Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
1 Jehova bụ “Onye na-ezi mmadụ ihe ọmụma.” (Abụ Ọma 94:10) O ji anyị na-agbasa ihe ọmụma na-azọpụta ndụ banyere onwe ya nye ndị na-amaghị ụzọ e si ejere ya ozi n’ụzọ ọ na-anara. Akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi bụ ngwá ọrụ ọma e ji ezi ihe nke ndị nwere obi eziokwu pụrụ isite na ya nweta ezi nghọta banyere Chineke site n’Okwu ya e dere ede, bụ́ Bible. (1 Tim. 2:3, 4) Nkọwa doro anya ma dị n’usoro nke akwụkwọ Ihe Ọmụma nyere eziokwu ahụ ga-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe Jehova na-achọ izi ha. N’ọnwa a, anyị chọrọ isoro ndị mmadụ nwee mkparịta ụka ndị ga-eme ka ha chọọ ịgụ akwụkwọ ahụ. Ndị a bụ aro ụfọdụ. Kama ịnwa iburu ndị a n’isi, gbalịa ikwupụta echiche ndị bụ isi n’okwu nke aka gị na n’ụzọ e si enwe mkparịta ụka.
2 Ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ enwewo onye ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ ha, ị pụrụ iwebata olileanya mbilite n’ọnwụ n’ime mkparịta ụka site n’ibu ụzọ kwuo ihe dị ka nke a:
◼ “Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị enwewo onye anyị hụrụ n’anya nwụnahụrụ anyị. Ị̀ jụwo ma ị ga-ahụ onye dị otú ahụ ọzọ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọnwụ abụghị akụkụ nke nzube mbụ nke Chineke maka mmadụ. Jisọs nyere ihe àmà na a pụrụ ịnapụta ndị anyị hụrụ n’anya site n’ọnwụ. [Gụọ Jọn 11:11, 25, 44.] Ọ bụ ezie na nke a weere ọnọdụ ọtụtụ narị afọ gara aga, ọ na-egosi ihe Chineke kweworo nkwa imere anyị. [Sapeta ihe osise dị na peji nke 85 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma gụọ okwu nkọwa ya. Mgbe ahụ gosi ihe osise dị na peji nke 86 ma kwuo okwu na ya.] Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịgụkwu banyere olileanya a na-akasi obi nke mbilite n’ọnwụ, ọ ga-amasị m ịhapụrụ gị akwụkwọ a n’ụtụ ₦80.”
3 Mgbe mkparịta ụka mbụ banyere olileanya mbilite n’ọnwụ gasịrị, ị pụrụ isoro otu onye ahụ malite mkparịta ụka ọzọ n’ụzọ dị otú a:
◼ “Ị pụrụ icheta na m sịrị na ọnwụ abụghị akụkụ nke nzube mbụ nke Chineke maka mmadụ. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu, gịnị mere anyị ji aka nká, na-anwụkwa anwụ? Mbekwu ụfọdụ na-adị ndụ gafee 100 afọ, e nwekwara osisi ndị dịworo ndụ ruo ọtụtụ puku afọ. Gịnị mere ụmụ mmadụ ji adị ndụ nanị 70 ma ọ bụ 80 afọ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Anyị na-anwụ n’ihi na di na nwunye mbụ ahụ nupụụrụ Chineke isi.” Gụọ Ndị Rom 5:12. Sapeta peji nke 53 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma gụpụta isiokwu isiakwụkwọ ahụ. Tụlee paragraf atọ mbụ, na-egosipụta azịza nye ajụjụ ndị e biri ebi. Yie oge ịbịaghachi ma e mesịa iji tụlee ụfọ isiakwụkwọ ahụ. Gbaa onye ahụ ume ịgụtọpụ ya tupu mgbe ahụ.
4 Ọ bụrụ na ị na-agwa onye yiri ka o ji okpukpe kpọrọ ihe okwu, ị pụrụ ịsị:
◼ “E nwere nnọọ ọtụtụ narị okpukpe dị iche iche taa. Ha na-akụzi ụdị nkwenkwe dị iche iche na-emegiderịta onwe ha. Ụfọdụ na-ekwu na okpukpe nile dị mma, na ihe anyị kweere adịghịkwa ihe o mere. Gịnị bụ uche gị? [Nye ohere maka nzaghachi.] Jisọs kụziri ezi okpukpe ahụ ma gosi na Chineke adịghị anara ụdị ofufe ndị ọzọ. [Gụọ Matiu 7:21-23.] Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, anyị aghaghị ife ya ofufe n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya.” Sapeta isi nke 5 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma, gụpụta isiokwu ya, rụtụkwa aka n’ụfọdụ isiokwu nta ya. Kọwaa na ihe ọmụma a ga-enyere mmadụ aka ịmụta otú e si eme ihe na-atọ Chineke ụtọ. Nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ a na-enyefe ya.
5 Ndị mmadụ nwere mgbagwoju anya n’ihi na e nwere ọtụtụ okpukpe pụrụ ịghọta azịza nye ajụjụ a ná nletaghachi gị:
◼ “Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ okpukpe dị iche iche taa, olee otú anyị pụrụ isi mata nke bụ ezie? Gịnị ka ị ga-atụ anya ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Jisọs gwara anyị otú e si amata ezi ndị na-eso ụzọ ya.” Gụọ Jọn 13:35. Tụlee paragraf nke 18 na 19 n’isi nke 5 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma. Gosipụta na site n’iji ntụziaka Akwụkwọ Nsọ ndị a na usoro ime ihe nke iwezụga ihe na-adịghị mkpa, mmadụ pụrụ ịghọta ezi okpukpe ahụ. Kọọ otú Ndịàmà Jehova si bụrụ ndị a ma ama n’ụwa nile maka ezi ịhụnanya na ụkpụrụ omume dị elu ha. Kọwaa otú iji akwụkwọ Ihe Ọmụma na-amụ Bible ga-esi mee ka a mata n’ụzọ doro anya ụdị ofufe nke Chineke na-anwapụta.
6 Ọ bụrụ na i zute nne ma ọ bụ nna, ụzọ nke a pụrụ ịdị irè:
◼ “Kwa ụbọchị, anyị na-anụ akụkọ banyere àgwà nnupụisi nke ndị ntorobịa yiri ka ha enweghị ụkpụrụ omume ọma ma ọlị. Ụfọdụ ndị toruworo ogo mmadụ chọrọ ịta usoro ụlọ akwụkwọ ụta maka akụzighịrị ụmụaka ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. Ònye ka i chere na o kwesịrị inye ọzụzụ nke a? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ṅaa ntị n’ihe Bible na-ekwu n’ajụjụ a. [Gụọ Ndị Efesọs 6:4.] Nke ahụ na-agwa anyị na ịkụnye ụkpụrụ omume ọma n’ime ụmụaka bụ ibu ọrụ dịịrị nne na nna.” Sapeta peji nke 145 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, gụpụta paragraf nke 16, kọwaakwa ihe osise ndị dị na peji nke 147. Kọwaa na a haziri akwụkwọ ahụ ka ezinụlọ dum wee jiri ya mụọ ihe. N’iji paragraf nke 17 na 18 dị na peji nke 146 mee ihe, kwuo na ị ga-egosi otú anyị si eduziri ezinụlọ dị iche iche ọmụmụ ihe dị otú ahụ.
7 Ọ bụrụ na gị na nne ma ọ bụ nna na-enwe nchegbu malitere ọmụmụ ihe n’ọbịbịa mbụ gị, ị pụrụ ịga n’ihu na ya ná nletaghachi site n’ịsị:
◼ “Ụwa taa na-edebe ọtụtụ ọnwụnwa n’ihu ndị na-eto eto anyị. Nke a na-eme ka o siere ha ike nke ukwuu ịghọ ndị na-atụ egwu Chineke mgbe ha na-etolite. Eleghị anya ị pụrụ icheta na ná mkparịta ụka ikpeazụ anyị, anyị chọpụtara ụkpụrụ abụọ. Dị ka ndị nne na nna na-asọpụrụ Chineke, ọ dị anyị mkpa isetịpụrụ ụmụ anyị ezi ihe nlereanya, anyị kwesịkwara inye ngosipụta na-adịgide adịgide nke ịhụnanya anyị maka ha. E nwere ihe ọzọ Bible na-ekwu na ụmụaka chọrọ n’ebe ndị mụrụ ha nọ.” Gụọ Ilu 1:8. Sapeta peji nke 148 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ, na-atụlezu paragraf nke 19-23. Tụọ aro ka ị bịaghachi ọzọ iji soro ezinụlọ ahụ dum mụọ ihe, na-amalite n’isi 1.