Chekwaa Ya
Ụzọ Ndị A Tụrụ Aro Ha Isi Nyefee Akwụkwọ n’Ozi Ubi
Jiri aro ndị na-esonụ mee ihe dị ka ihe ga-enyere gị aka ịkwadebe ụzọ ndị ị ga-esi nyefee akwụkwọ ndị a ga-eji jee ozi n’ọnwa nke ọ bụla.
Bịaruo Jehova Nso
“Ọ ga-amasị ọtụtụ ndị kweere na Chineke ịbịaru ya nso. Ị̀ maara na Chineke na-akpọ anyị òkù ịbịaru ya nso? [Gụọ Jems 4:8.] E mere akwụkwọ a otú ọ ga-esi nyere ndị mmadụ aka iji Bible nke ha bịaruo Chineke nso.” Gụọ paragraf 1 na peeji nke 16.
“Ikpe na-ezighị ezi juru ebe nile taa. Ọ dị nnọọ otú ahụ e si kọwaa ya n’ebe a. [Gụọ Eklisiastis 8:9b.] Ọtụtụ ndị na-eche ma Chineke ọ̀ chọkwadịrị ịma. [Gụọ ahịrịokwu abụọ mbụ dị na paragraf nke 4 na peeji nke 119.] Isiakwụkwọ a na-akọwa ihe mere Chineke jiworo kwere ka ikpe na-ezighị ezi dịrị ruo oge ụfọdụ.”
Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
“Ebee ka i chere anyị pụrụ isi nweta enyemaka iji nagide nrụgide nke ndụ? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ Ndị Rom 15:4.] Rịba ama na Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ na-enye anyị ntụziaka, nkasi obi, na olileanya, bụ́ ndị pụrụ ime ka anyị gbasie ike idi ihe isi ike. Akwụkwọ a na-atụ aro ndị na-enye aka banyere ụzọ anyị pụrụ isi rite uru kasịnụ n’ịgụ Bible.” Mee ka isi ihe anọ ndị e depụtara na peeji nke 30 pụta ìhè.
“Malite mgbe ahụ Jizọs nọ n’ụwa, ọtụtụ mmadụ anọwo na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. Ì chetụla echiche ihe ọbịbịa Alaeze ahụ ga-abụrụ ihe a kpọrọ mmadụ? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ gụọ Daniel 2:44.] Akwụkwọ a kọwara ihe Alaeze Chineke bụ, ihe ọ ga-arụ, na otú anyị pụrụ isi rite uru n’ọchịchị ezi omume ya.” Kọwaa ihe osise dị na peeji nke 92-93.
Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
“Ì chere na Chineke bu n’uche ka anyị na-enwe ụdị nsogbu ndị anyị na-enwe taa? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ Matiu 6:10.] Ì chetụla echiche banyere ihe Alaeze Chineke bụ n’ezie?” Sapeta ihe ọmụmụ nke 6, ma gụpụta ajụjụ ndị a jụrụ ná mmalite ya. Malite ịmụrụ ya ihe ọmụmụ ahụ ma ọ bụ mee ndokwa ka unu mụọ ya n’oge ọzọ ị ga-abịa.
“N’agbanyeghị ọganihu ndị e nwere n’ụwa taa, ọrịa na ọnwụ anọgidewo na-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụsi anya ma na-eru újú. Ị̀ maara ihe Jizọs ga-emere ndị ọrịa, ndị agadi, na ọbụna ndị nwụrụ anwụ?” Chere ka ọ zaa. Ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ịma azịza ya, sapeta ihe ọmụmụ nke 5, ma gụpụta ajụjụ ndị a jụrụ maka paragraf nke 5-6. Soro ya mụọ paragraf ndị ahụ, ma ọ bụ mee ndokwa ka unu mụọ ya n’oge ọzọ ị ga-abịa.
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
“A sị gị bịa biri n’ebe mara mma otú a, ị̀ ga-ekwe? [Gosi ya ihe osise dị na peeji nke 4-5, ma chere ka ọ zaa.] Rịba ama ihe Okwu Chineke kwuru na ọ bụ ya bụ mkpịsị ugodi maka ibi ụdị ndụ a ruo mgbe ebighị ebi. [Gụọ Jọn 17:3.] Akwụkwọ a ga-enyere gị aka inweta ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.” Mee ndokwa ka unu mụọ paragraf ise mbụ nke isi 1 n’oge ọzọ ị ga-abịa.
Sapeta ihe osise dị na peeji nke 188-189, jụọ onye nwe ụlọ ajụjụ a jụrụ banyere ihe osise ahụ, nke bụ́: “Ì nwere olileanya ibi n’ime Paradaịs, mgbe ihe ọmụma Chineke ga-ejupụta ụwa? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ Aịsaịa 11:9.] Akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịma ihe Bible na-ekwu banyere Paradaịs na otú anyị pụrụ isi biri na ya.” Mee ndokwa ka unu mụọ paragraf nke 11-16 nke isi 1 n’oge ọzọ ị ga-abịa.
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
“Ikekwe ị nụla banyere [kwuo otu ihe a kọrọ n’akụkọ ụwa]. Mgbe ndị mmadụ nwụchuru ọnwụ, ọtụtụ ndị na-adị eche otú a ga-esi kasie ndị ezinụlọ ha obi. Gịnị ka i chere?” Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, sapeta peeji nke 299, ma gosi ya ihe osise mbilite n’ọnwụ e sere ebe ahụ. Gaa n’ihu site n’ikwu, sị: “Ọ na-atụ ọtụtụ ndị n’anya ịmata na a ga-akpọlite ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume n’ọnwụ n’ime Paradaịs n’elu ala. [Gụọ Ọrụ 24:15 dị ka e si hota ya na paragraf nke 9 na peeji nke 297, mgbe ahụ, kọwaa ya otú e si kọwaa ya na paragraf nke 10.] Akwụkwọ a na-ekwu banyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-akpali mmasị Chineke zubere ime n’ọdịnihu.”
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
“Ì chere na ụwa ga-aka mma ma ndị mmadụ na-eme ihe e kwuru ebe a? [Gụọ Matiu 7:12a. Mgbe ahụ, chere ka ọ zaa.] Akwụkwọ a nwere ọtụtụ ihe mmụta sitere n’aka onye ozizi kasị ukwuu nke dịworo ndụ.” Kọwaa ihe osise ndị dị n’isi nke 17 na ihe ndị e dere iji kọwaa ha.
“Ihe ka ọtụtụ ná ndị nne na nna taa na-agbalị ịkụnye ụkpụrụ omume ọma n’obi ụmụ ha. Ì chere na nke a dị mkpa? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ Ilu 22:6.] Rịba ama na a gbara ndị nne na nna ume ịmalite ịzụ ụmụ ha mgbe ụmụ ha ka dị obere. E dere akwụkwọ a otú ọ ga-esi nyere ha aka ime nke ahụ.” Kọwaa ihe osise ndị dị n’isi nke 15 ma ọ bụ nke 18 na ihe ndị e dere iji kọwaa ha.
“Ajụjụ ụmụaka na-ajụ na-atụkarị ndị nne na nna n’anya. Ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị a pụrụ isi ike ọzịza, ọ́ bụghị ya? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ Ndị Efesọs 6:4.] Akwụkwọ a pụrụ inyere ndị nne na nna aka ịza ụmụ ha ajụjụ taa.” Kọwaa ihe osise ole na ole ndị dị n’isi nke 11 na nke 12 ma ọ bụ n’isi nke 34 ruo 36 na ihe ndị e dere iji kọwaa ha.
Nọrọ na Nche!
“Ọtụtụ ndị na-enwe nchegbu banyere ajọ nsogbu na ihe ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ bụ́ ndị juru ebe nile taa. [Kwuo otu nke ndị nọ n’ógbè unu maara.] Ị̀ maara na ihe ndị a so n’ihe àmà zuru ụwa ọnụ na-egosi na oge eruwela ka Chineke malite ịchị ụwa? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ya, dị ka Matiu 24:3, 7, 8; Luk 21:7, 10, 11; ma ọ bụ 2 Timoti 3:1-5.] Broshuọ a na-akọwa ihe mere o ji dị ngwa ugbu a karịsịa ka anyị nọrọ na nche banyere ihe ihe ndị a na-emenụ pụtara.”
“Ọtụtụ ndị taa na-enwe nchegbu n’ihi ihe omume ndị na-awụ akpata n’oyi n’ahụ́ ma ọ bụ n’ihi oké ihe ndị funahụrụ ha. Ụfọdụ na-eche ihe mere na Chineke adịghị eme ihe iji gbochie ihe ndị dị otú ahụ. Bible na-emesi anyị obi ike na Chineke ga-eme ihe n’isi nso iji mee ka ihe a kpọrọ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ. [Gụọ Mkpughe 14:6, 7.] Rịba ama ihe ikpe Chineke ga-apụtara ihe a kpọrọ mmadụ. [Gụọ 2 Pita 3:10, 13.] Broshuọ a na-enyekwu ihe ọmụma banyere okwu a dị mkpa.”
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
“N’oge Krismas a, ọtụtụ ndị na-eche banyere Jizọs. Otú ọ dị, n’ihi ọtụtụ ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa nile, ụfọdụ pụrụ ịdị na-eche ma Jizọs ọ̀ chọkwadịrị ịma banyere anyị. Gịnị ka i chere?” Chere ka ọ zaa. Sapeta isi nke 24, ma kọwaa n’ụzọ dị mkpirikpi ihe mere Jizọs ji bịa n’ụwa. Mgbe ahụ, gụọ Jọn 15:13, ma mee ka ezi ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe ndị ọzọ nọ pụta ìhè.
“Mgbe mmadụ kpọtụrụ Jizọs Kraịst aha, ọtụtụ ndị na-ele ya anya dị ka nwa ọhụrụ ma ọ bụ dị ka nwoke na-ahụsi anya nke nọ n’ọnụ ọnwụ. Ihe ha maara banyere Jizọs bụ nanị ọmụmụ ya na ọnwụ ya. Ha adịkarịghị elekwasị anya n’ọmarịcha ihe ndị o kwuru ma mee n’oge ndụ ya. Ihe ọ rụrụ metụtara onye ọ bụla biworo ndụ n’ụwa a. Ọ bụ ya mere o ji dị oké mkpa ka anyị mụta ihe nile anyị pụrụ ịmụta banyere ihe ndị dị ebube o meere anyị.” Gụọ Jọn 17:3. Sapeta peeji nke mbụ nke okwu mmeghe, ma gụọ paragraf nke anọ ya.