Inyefe Akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
◼ “Ì chere na ụwa ga-aka mma ma ọ bụrụ na ndị mmadụ ejiri okwu a na-eme ihe? [Gụọ Matiu 7:12a. Mgbe ahụ nye ohere maka nzaghachi.] Akwụkwọ a nwere ọtụtụ ihe mmụta ndị sitere n’aka onye ozizi kasị ukwuu nke dịworo ndụ.” Kwuo okwu banyere foto ndị dị n’isiakwụkwọ nke 17 nakwa ihe ndị e dere iji kọwaa foto ndị ahụ.
◼ “Ihe ka ọtụtụ ná ndị nne na nna taa na-agbalị ịkụziri ụmụ ha àgwà na ụkpụrụ ndị dị mma. Ì chere na nke a dị mkpa? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Ilu 22:6.] Rịba ama na a na-agba ndị nne na nna ume ịmalite ịzụlite ụmụ ha n’oge ha dị obere. E bipụtara akwụkwọ a iji nyere ha aka ime otú ahụ.” Kwuo okwu banyere foto ndị dị n’isiakwụkwọ nke 15, nke 18, ma ọ bụ nke 32 nakwa ihe ndị e dere iji kọwaa foto ndị ahụ.
◼ “Ajụjụ ndị ụmụaka na-ajụ na-atụkarị ndị nne na nna n’anya. Ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị ahụ pụrụ isi ike ọzịza, ọ́ bụghị ya? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ 2 Timoti 3:14, 15.] Nne Timoti na nne ochie ya kụziiri ya ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu malite n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ. Akwụkwọ a pụrụ inyere ndị nne na nna aka ime otu ihe ahụ n’ebe ụmụ ha nọ taa.” Kwuo okwu banyere foto ole na ole dị n’isiakwụkwọ nke 11 na nke 12 ma ọ bụ ndị dị n’isiakwụkwọ nke 34 ruo 36 nakwa ihe ndị e dere iji kọwaa foto ndị ahụ.