(1) Jụọ Ajụjụ, (2) Gụọ Akụkụ Akwụkwọ Nsọ, (3) Gosi Isiakwụkwọ Kọwara Ya
Otu ụzọ dị mfe isi nyefee akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? bụ (1) ịjụ ajụjụ iji mata uche onye nwe ụlọ, (2) ịgụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị, na (3) igosi onye nwe ụlọ isiakwụkwọ dị n’akwụkwọ ahụ nke zara ajụjụ ahụ ị jụrụ ma gụọ ajụjụ mmalite ndị dị n’okpuru isiokwu ahụ. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ egosi na ya nwere mmasị, i nwere ike iji paragraf ndị mbụ dị n’isiakwụkwọ ahụ gosi ya otú e si eji akwụkwọ ahụ amụ Bible. I nwere ike isi otú a malite ọmụmụ Bible n’oge mbụ ị gara na nke onye nwe ụlọ ma ọ bụkwanụ mgbe ị na-eme nletaghachi.
◼ “Ì chere na ọ ga-ekwe ụmụ mmadụ nkịtị omume ịbịa mara Onye Okike anyị pụrụ ime ihe nile, dị ka e si kwuo ya na Bible ebe a?” Gụọ Ọrụ 17:26, 27, ma chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị egosi ya isi nke 1.
◼ “N’ihi ọtụtụ nsogbu na-eche anyị ihu taa, ì chere na ọ ga-ekwe anyị omume inweta nkasi obi na olileanya a kọwara ebe a?” Gụọ Ndị Rom 15:4, ma chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị egosi ya isi nke 2.
◼ “Ọ bụrụ na ị ga-emeli ya, ị̀ ga-eme ka e nwee ụdị mgbanwe a a kọwara ebe a? Gụọ Mkpughe 21:4, ma chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị egosi ya isi nke 3.
◼ “Ì chere na ọ dị mgbe ụmụ anyị ga-enwe ike ịnọ n’ọnọdụ ọma a a kọwara n’abụ a a bụrụ n’oge ochie?” Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11, ma chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị egosi ya isi nke 3.
◼ “Ì chere na e nwere ụbọchị ihe ndị a e dere ebe a ga-emezu?” Gụọ Aịsaịa 33:24, ma chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị egosi ya isi nke 3.
◼ “Ò nwetụla mgbe i chere echiche ma ndị nwụrụ anwụ hà ma ihe ndị dị ndụ na-eme?” Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Eklisiastis 9:5, ma gosi ya isi nke 6.
◼ “Ì chere na ọ ga-ekwe omume na otu ụbọchị, anyị ga-emecha hụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ, dị ka Jizọs kwuru n’amaokwu ndị a?” Gụọ Jọn 5:28, 29, ma chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị egosi ya isi nke 7.
◼ “A sị gị kwuo, olee ihe i chere a ga-eme ka uche Chineke wee mewe n’ụwa dị ka ọ na-eme n’eluigwe, dị ka e si kwuo ya n’ekpere a a ma ama?” Gụọ Matiu 6:9, 10, ma chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị egosi ya isi nke 8.
◼ “Ọ̀ dị gị ka anyị bi n’oge a a kọwara n’amụma a?” Gụọ 2 Timoti 3:1-4, ma chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị egosi ya isi nke 9.
◼ “Ọ na-agbagwoju ọtụtụ mmadụ anya ihe mere nsogbu ụmụ mmadụ ji na-akawanye njọ. Ò nwetụla mgbe i chere na o nwere ike ịbụ ihe a kpatara ya?” Gụọ Mkpughe 12:9, ma chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị egosi ya isi nke 10.
◼ “Ọ̀ dịtụla mgbe ị chọrọ ịma azịza nke ajụjụ dị ka nke a?” Gụọ Job 21:7, ma chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị egosi ya isi nke 11.
◼ “Ì chere na ọ bụrụ na ndị mmadụ agbasoo ndụmọdụ a dị na Bible na obi ụtọ ga-adị n’ezinụlọ ha?” Gụọ Ndị Efesọs 5:33, ma chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị egosi ya isi nke 14.
A pụrụ ịgụrụ ọmụmụ Bible mgbe e duzirila ya ugboro abụọ malite na nke mbụ e ji gosi otú e si amụ ihe, nakwa ma ọ bụrụ na o yie ka ọmụmụ ihe ahụ ọ̀ ga-aga n’ihu.