Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/06 p. 4-5
  • Ụzọ Isi Nyefee Akwụkwọ Bible Na-akụzi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Nyefee Akwụkwọ Bible Na-akụzi
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agha/Udo
  • Amagedọn
  • Bible
  • Ekpere
  • Ezinụlọ
  • Jehova Chineke
  • Jizọs Kraịst
  • Ndụ Ebighị Ebi
  • Okpukpe
  • Ọdachi/Nhụjuanya
  • Ọnwụ/Mbilite n’Ọnwụ
  • Ụlọ Obibi
  • Ụzọ Ndị A Tụrụ Aro Ha Isi Nyefee Akwụkwọ n’Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Ihe Ọmụma Sitere n’Aka Chineke Na-aza Ọtụtụ Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • (1) Jụọ Ajụjụ, (2) Gụọ Akụkụ Akwụkwọ Nsọ, (3) Gosi Isiakwụkwọ Kọwara Ya
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Jiri Nghọta Kwusaa
    Ozi Alaeze Anyi—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 3/06 p. 4-5

Ụzọ Isi Nyefee Akwụkwọ Bible Na-akụzi

N’ihe ntinye a, a tụrụ aro dị iche iche banyere ụzọ a pụrụ isi nyefee akwụkwọ Bible Na-akụzi. Ka aro ndị ahụ wee dị nnọọ irè, kwuo ha n’okwu nke gị, mee ka okwu gị kwekọọ ná mkpa nke ndị nọ n’ókèala unu, marakwa ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ ahụ nke ọma, bụ́ ndị ị ga-adabere na ha wee nyefee ya. I nwekwara ike iji ụzọ ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu mee ihe.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke January 2005, p. 8.

Agha/Udo

◼ “Mmadụ nile chọsiri udo ike. Ọ̀ dị gị ka olileanya nke inwe udo n’ụwa ọ̀ bụ nrọ nkịtị? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Abụ Ọma 46:8, 9.] Akwụkwọ a kwuru otú Chineke ga-esi mezuo nzube ya ma weta udo ga-ezu ụwa ọnụ.” Gosi ya ihe osise dị na peeji nke 35, ma tụlee paragraf nke 17-21 nke dị na peeji nke 34.

Amagedọn

◼ “Mgbe ndị mmadụ nụrụ okwu ahụ bụ́ ‘Amagedọn,’ ihe na-agbata ọtụtụ n’uche bụ mbibi a ga-ebibi ihe nile. Ọ̀ ga-eju gị anya ịmara na Amagedọn bụ nnọọ ihe e kwesịrị ịtụsi anya ya ike? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Mkpughe 16:14, 16.] Rịba ama ihe e kwuru ebe a banyere ihe ndụ ga-adị ka ya ma Amagedọn gasịa.” Sapeta peeji nke 82-84, ma gụọ paragraf nke 21.

Bible

◼ “Ndị mmadụ na-akpọkarị Bible Okwu Chineke. Ì chetụla otú o si daba adaba na a na-akpọ akwụkwọ mmadụ dere, Okwu Chineke? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ 2 Pita 1:21 nakwa paragraf nke 5 nke dị na peeji nke 19-20.] Akwụkwọ a na-ekwu otú Bible si zaa ajụjụ ndị a.” Gosi ya ajụjụ ndị ahụ dị na peeji nke 6.

◼ “N’oge anyị a, ndị mmadụ nwegasịrị ọtụtụ ebe ha si enweta ihe ọmụma karịa ka ha nweburu. Ma, ebee ka i chere anyị nwere ike ịchọta ezi ndụmọdụ ga-enyere anyị aka inwe obi ụtọ na ihe ịga nke ọma ná ndụ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ 2 Timoti 3:16, 17 nakwa paragraf nke 12 nke dị na peeji nke 23.] Akwụkwọ a na-akọwa otú anyị pụrụ isi bie ndụ n’ụzọ na-atọ Chineke ụtọ, nakwa n’ụzọ ga-abara anyị uru.” Gosi ya chaatị na ihe osise dị na peeji nke 122-123.

Ekpere

◼ “Ì chetụla banyere otú Chineke si aza ekpere? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ 1 Jọn 5:14, 15 nakwa paragraf nke 16-18 nke dị na peeji nke 170-172.] Isiokwu a kọwakwara ihe mere anyị kwesịrị iji na-ekpegara Chineke ekpere nakwa ihe anyị ga-emerịrị ka o wee nụ ekpere anyị.”

Ezinụlọ

◼ “Anyị nile nwere mmasị inwe ezinụlọ obi ụtọ dị na ya. Ọ́ bụghị eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] Bible kwuru ihe onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ pụrụ ime ka obi ụtọ wee dị n’ime ezinụlọ—iṅomi Chineke n’igosi ịhụnanya.” Gụọ Ndị Efesọs 5:1, 2 nakwa paragraf nke 4 nke dị na peeji nke 135.

Jehova Chineke

◼ “Ọtụtụ ndị kweere na Chineke ga-achọ ịbịarukwu ya nso. Ị̀ ma na Bible na-agba anyị ume ịbịaru Chineke nso? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Jems 4:8a nakwa paragraf nke 20 nke dị na peeji nke 16.] E bipụtara akwụkwọ a iji nyere ndị mmadụ aka iji Bible nke ha mụtakwuo banyere Chineke.” Gosi ya ajụjụ mmalite ndị ndị na peeji nke 8.

◼ “Ọtụtụ mmadụ na-ekpe ekpere ka e doo aha Chineke nsọ ma ọ bụ ka aha Chineke dị nsọ. Ì chetụla banyere ihe aha ahụ bụ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Abụ Ọma 83:18 nakwa paragraf nke 2-3 nke peeji nke 195.] Akwụkwọ a kọwara ihe Bible na-akụzi n’ezie banyere Jehova Chineke na ihe bụ́ nzube ya maka ụmụ mmadụ.”

Jizọs Kraịst

◼ “Ndị mmadụ gburugburu ụwa anụla banyere Jizọs Kraịst. Ụfọdụ na-asị na ọ bụ mmadụ nkịtị. Ndị ọzọ na-efe ya ofufe dị ka Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile. Ì chere na ihe anyị kweere banyere Jizọs Kraịst dị ihe o mere?” Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Jọn 17:3 nakwa paragraf nke 3 nke dị na peeji nke 37-38. Gosi ya ajụjụ ndị dị n’okpuru isiokwu nke isiakwụkwọ ahụ.

Ndụ Ebighị Ebi

◼ “Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ chọrọ ogologo ndụ na ahụ́ isi ike. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, ị̀ ga-achọ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Mkpughe 21:3, 4 nakwa paragraf nke 17 nke dị na peeji nke 53-54.] Akwụkwọ a kwuru otú anyị pụrụ isi nweta ndụ ebighị ebi nakwa ihe ndụ ga-adị ka ya mgbe nkwa ahụ mezuru.”

Okpukpe

◼ “Ọtụtụ ndị amalitela ile okpukpe ndị dị n’ụwa anya dị ka otu n’ime ebe nsogbu ụmụ mmadụ si kama ịbụ otu n’ime ihe ndị na-eme ka nsogbu ha kwụsị. Ì chere na okpukpe na-edu ndị mmadụ aga n’ezigbo ụzọ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Matiu 7:13, 14 nakwa paragraf nke 5 nke dị na peeji nke 145-146.] Isiokwu a tụlere ihe isii e ji ama ụdị ofufe Chineke na-anakwere.” Gosi ya ihe ndị ahụ e depụtara na peeji nke 147.

Ọdachi/Nhụjuanya

◼ “Mgbe e nwere ọdachi, ọtụtụ ndị na-enwe obi abụọ ma Chineke ọ̀ na-eche banyere ụmụ mmadụ n’ezie, ma na-ahụ ahụhụ ha na-ata. Ò nwetụla mgbe i chere otú ahụ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ 1 Pita 5:7 nakwa paragraf nke 11 nke dị na peeji nke 11.] Akwụkwọ a na-akọwa otú Chineke ga-esi mee ka ụmụ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ.” Gosi ya ajụjụ mmalite ndị dị na peeji nke 106.

Ọnwụ/Mbilite n’Ọnwụ

◼ “Ọtụtụ mmadụ na-eche banyere ihe na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ. Ì chere na ọ ga-ekwe anyị omume ịmata? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Eklisiastis 9:5 nakwa paragraf nke 5-6 nke dị na peeji nke 58-59.] Akwụkwọ a na-akọwakwa ihe mbilite n’ọnwụ, nke Bible kwere nkwa ya, ga-apụtara ndị nwụrụ anwụ.” Gosi ya ihe osise dị na peeji nke 75.

◼ “Ọ bụrụ na onye anyị hụrụ n’anya anwụọ, ọ ga na-agụ anyị agụụ ịhụ ya anya ọzọ. Ọ́ bụghị eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] Nkwa Bible kwere banyere mbilite n’ọnwụ akasiela ọtụtụ mmadụ obi. [Gụọ Jọn 5:28, 29 nakwa paragraf nke 16-17 nke dị na peeji nke 71-72.] Isiakwụkwọ a zakwara ajụjụ ndị a.” Gosi ya ajụjụ mmalite ndị dị na peeji nke 66.

Ụlọ Obibi

◼ “N’ọtụtụ ebe, inweta ezigbo ụlọ aka ndị mmadụ ga-eru na-esiwanye ike. Ì chere na oge ga-abịa mgbe onye ọ bụla ga-enwe ezigbo ụlọ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Aịsaịa 65:21, 22 nakwa paragraf nke 20 nke dị na peeji nke 34.] Akwụkwọ a na-akọwa otú Chineke ga-esi mezuo nkwa a o kwere.

[Igbe dị na peeji nke 5]

Ụzọ Ndị A Ga-esi Gwa Ndị Mmadụ Banyere Ndokwa Inye Onyinye

“Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inye obere onyinye maka ọrụ a anyị na-arụ n’ụwa nile, obi ga-adị m ụtọ ịnara ya.”

“Ọ bụ ezie na anyị na-enyefe akwụkwọ anyị na-ekwughị ego ole a ga-akwụ, anyị na-anabata ntakịrị onyinye maka ọrụ a anyị na-arụ n’ụwa nile.”

“O nwere ike ịdị na-eju gị anya otú anyị si enweta ego anyị ji arụ ọrụ a. Anyị na-enweta ya n’ihi na ndị mmadụ na-eji obi ha enye onyinye iji kwado ọrụ a anyị na-arụ n’ụwa nile. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inye obere onyinye taa, obi ga-adị m ụtọ ịnara ya.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya