Nwalee Ụzọ Ndị Dị Mfe Isi Na-enyefe Akwụkwọ
Ezi mmasị anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ ga-akpali anyị ịgbalị ịghọta ihe bụ́ mkpa ha ma gosi ha otú Alaeze ahụ ga-esi wepụ nsogbu ndị ha na-enwe kpamkpam. (Fil. 2:4) Ụzọ dị mfe ọtụtụ ndị nkwusa chọpụtara na ọ na-adị irè isi enyefe akwụkwọ bụ ịgwa onye nwe ụlọ ka ọ kọwaa ihe osise paradaịs ndị dị n’akwụkwọ anyị, dị ka ndị nke e depụtara na kọlụm aka nri nke peeji a. Ị pụrụ ime ya site n’iji otu n’ime okwu mmeghe ndị a mee ihe:
◼ “Ì chere na ọ dị mgbe anyị ga-ahụ ụmụ mmadụ ka ha nọ n’ụdị ọnọdụ e sere ebe a?”
◼ “Ọ ga-amasị anyị nile ka ụmụ anyị nwee ike ịnọ n’ụdị ụwa e sere ebe a. Gịnị ka i chere ọ ga-ewe iji mee ka ụwa dị otú a?”
◼ “Ihe a bụ ihe osise nke otú ụwa ga-adị mgbe e mewere uche Chineke n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe. Ị̀ chọpụtara ọdịiche ọ bụla n’etiti ihe osise a na ndụ a na-ebi taa?”
◼ “Ọ̀ ga-amasị gị ibi n’ụdị ọnọdụ e sere ebe a? [Chere ka ọ zaa.] Ì chere na a ga-enwe ụdị ọnọdụ a n’oge ndụ anyị?”
Gee ntị nke ọma n’ihe onye ahụ ga-aza ma jiri obiọma chọpụta ihe dị ya n’obi site n’ịjụ ya otu ajụjụ ma ọ bụ abụọ ọzọ. Ọ bụrụ na ụfọdụ zara na ha agaghị enwe mmasị ibi n’ụdị ọnọdụ e sere ebe ahụ ma ọ bụ na ha ekweghị na ihe dị otú ahụ ga-ekwe omume, ekwubila ozugbo na ha enweghị mmasị. Jiri akọ jụọ ha ihe mere ha ji nwee echiche dị otú ahụ. Azịza ha pụrụ igosi na ha na-enwe nchegbu dị ukwuu banyere ihe ndị yiri nsogbu a na-apụghị idozi edozi bụ́ ndị na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu.—Ezik. 9:4.
Mgbe ị chọpụtara ihe na-enye onye nwe ụlọ nsogbu n’obi, mee ka okwu gị kwekọọ na ya. Mee ka ozi Alaeze ahụ nke kasị metụta ihe ndị na-akpa ya pụta ìhè. Gụọrọ ya otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ abụọ bụ́ ndị kwuru banyere ihe ahụ na-enye ya nsogbu n’obi. (Lee aro ndị a tụrụ na kọlụm aka nri.) Kwe ka o jiri anya ya hụ ihe Okwu Chineke na-ekwu. Ọ bụrụ na o gosiri mmasị, nyefee ya akwụkwọ ahụ ma mee ndokwa ịbịaghachi na nke ya. Ị gaghachi, malite n’ebe unu kwụsịrị n’oge ikpeazụ ị gara.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Ihe Atụ nke Ihe Osise Paradaịs
Akwụkwọ Onye Ozizi: peeji nke 251-254
Akwụkwọ Ihe Ọmụma: peeji nke 4-5, 188-189
Broshuọ Na-achọ: peeji nke 11, 13
Akwụkwọ Fee Chineke Ofufe: peeji nke 92-93
Akwụkwọ Ezi Udo: peeji nke 98
[[Igbe dị na peeji nke 5]
Ihe Ndị Na-emetụta Ndị Mmadụ
Agha, iyi ọha egwu
Imebi ụwa
Imegbu ụmụ anụmanụ
Ịda mbà n’obi
Ịda ogbenye, mmegbu
Ịkpọasị, ahaghị nhata
Mpụ, ime ihe ike
Ndakpọ omume ọma
Nrụrụ aka, ikpe na-ezighị ezi
Nsogbu ụlọ na nke akụ̀ na ụba
Ọchịchị na-adịghị arụ ọrụ nke ọma
Ọnwụ, iru újú
Ọrịa, nkwarụ
Ụkọ nri, erighị nri na-edozi ahụ́