Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa January: Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke I, Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ, Mpịakọta nke II, ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla dị peeji 192 nke e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ ma ọ bụ ndị na-agbanwe ụcha ha ma ọ bụ nke ọ bụla e bipụtara tupu 1990. February: A ga-enyefe Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, a pụrụ inyefe Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, Ị pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ime Paradaịs n’Elu Ala, na Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
◼ Malite na February, n’agafeghịkwa March 6, okwu ihu ọha ọhụrụ maka ndị nlekọta sekit ga-abụ “Jiri Amamihe Na-eme Ihe n’Ụwa nke Na-enweghị Uche.”
◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa ndị kwesịrị ekwesị maka ime Ememe Ncheta nke afọ a na Thursday, March 24, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na okwu pụrụ ịmalite mgbe anyanwụ na-adabeghị, mbugharị nke ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Mee nchọpụta iji mara mgbe anyanwụ ji ada n’ógbè unu. Ọ ga-adị mma ka ọgbakọ ọ bụla mee Ememe Ncheta nke ya. Otú ọ dị, nke a nwere ike ọ gaghị ekwe omume mgbe nile. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ikekwe otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ebe ọzọ ha ga-eji mee ihe n’uhuruchi ahụ. N’ebe o kwere mee, anyị na-atụ aro ka a nọọ, ọ dịkarịa ala, minit 40 mgbe otu ọgbakọ mesịrị Ememe Ncheta nke ha tupu ọgbakọ ọzọ ga-eji otu ụlọ nzukọ ahụ mee ihe amalite Ememe Ncheta nke ha. Nke a ga-eme ka mmadụ nile nwee ike irite uru zuru ezu n’ememe ahụ. E kwesịkwara ichebara ụgbọala na ebe a ga-adọba ha echiche, gụnyere ibusa na iburu ndị mmadụ. Òtù ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-akasị mma n’ógbè ha.
◼ N’ihi otú Ememe Ncheta si bụrụ ihe dị mkpa, òtù ndị okenye kwesịrị ịhọrọ otu n’ime ndị okenye ka ruo eru ka ọ bụrụ ọkà okwu, kama ịdị na-eke ya eke ma ọ bụ ikwe ka otu nwanna na-ekwu ya kwa afọ. Ọ bụrụ na e nwere okenye so ná ndị e tere mmanụ bụ́ onye nwere ike ikwu okwu ahụ, e kwesịrị ịhọrọ ya ka o kwuo ya.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta 2005 na Sunday, April 10. A ga-ewepụta isiokwu ya ma e mesịa. Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit, mgbakọ sekit, ma ọ bụ mgbakọ pụrụ iche ná ngwụsị izu ahụ, ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu ya tupu Sunday, April 10, 2005.
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:
Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst—Efịk
Watch Tower Publications Index—2003—Bekee