Igbe Ajụjụ
◼ Olee ụzọ kasị mma isi na-enye onyinye maka ụmụnna anyị ndị nọ ná mkpa ná mba ndị ọzọ?
Mgbe ụfọdụ, anyị na-anụ banyere ụmụnna anyị ndị nọ ná mba ọzọ bụ́ ndị nọ ná mkpa ihe onwunwe n’ihi mkpagbu, ọdachi, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ tara akpụ. O metụla ụfọdụ ụmụnna n’obi iziga ego n’alaka ụlọ ọrụ ndị dị ná mba ndị a, na-ekwu ka e were ego ahụ nyere otu nwanna ma ọ bụ otu ọgbakọ aka, ma ọ bụkwanụ ka e jiri ya mee ihe n’otu ihe owuwu.—2 Kọr. 8:1-4.
Ọ bụ ezie na mmetụta ịhụnanya dị otú ahụ e gosiri n’ebe ndị kwere ekwe ibe anyị nọ bụ ihe e kwesịrị ịja mma, mgbe mgbe, a na-enwe mkpa ndị chọrọ ka e lebara ha anya ngwa ngwa karịa ndị nke onye ahụ nyere onyinye bu n’obi nye onyinye ya. Mgbe ụfọdụ, tupu e nweta onyinye ahụ, e gboolarị mkpa ahụ e bu n’obi nye ya. N’ezie, anyị pụrụ inwe obi ike na mgbe ọ bụla mmadụ zigara onyinye n’alaka ụlọ ọrụ dị n’obodo ya maka ọrụ zuru ụwa ọnụ, Ụtụ Ego Maka Iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ bụ ọrụ enyemaka n’oge e nwere ọdachi, na a ga-eji ego ndị ahụ e nyere n’onyinye mee ihe onye nyere ha kwuru ka e jiri ha mee.
E nyewo ụmụnna ndị nọ n’alaka ụlọ ọrụ nile ọzụzụ nke ọma banyere otú ha ga-esi na-agbata ọsọ enyemaka ngwa ngwa. N’ọnọdụ ọ bụla, alaka ụlọ ọrụ na-akọrọ Òtù Na-achị Isi banyere ya. Ọ bụrụ na a chọkwuru enyemaka, Òtù Na-achị Isi pụrụ ịgwa alaka ụlọ ọrụ ndị nọ nso ka ha nye aka ma ọ bụkwanụ ha esi n’isi ụlọ ọrụ zite ego.—2 Kọr. 8:14, 15.
Ya mere, mmadụ kwesịrị izigara alaka ụlọ ọrụ dị ná mba ya onyinye nile ọ na-enye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ, maka iwu ihe owuwu ná mba ndị ọzọ, ma ọ bụ maka ọrụ enyemaka n’oge e nwere ọdachi. Ọ pụrụ isi n’aka ọgbakọ ziga ya ma ọ bụ ya ejiri aka ya ziga ya n’alaka ụlọ ọrụ ahụ. N’ụzọ dị otú a, “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” site ná ndokwa Òtù Na-achị Isi mere, na-egbo mkpa nke òtù ụmụnna zụrụ ụwa ọnụ n’ụzọ a haziri ahazi.—Mat. 24:45-47; 1 Kọr. 14:33, 40.