Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Nye Aka?
1 Ndịàmà Jehova na-ajụkarị ajụjụ ahụ bụ́ “Olee otú anyị pụrụ isi nye aka?” mgbe ọ bụla ha nụrụ na e nwere ọdachi n’ebe ụfọdụ n’ụwa. Dị ka ihe ndekọ dị n’Ọrụ 11:27-30 gosiri, Ndị Kraịst nọ na narị afọ mbụ zigaara ụmụnna ha bi na Judia ihe enyemaka n’ihi ụkọ nri e nwere n’ebe ahụ.
2 N’oge a, iwu ndị na-achịkwa nzukọ anyị akwadowo ka e jiri ego na-eme ihe iji nyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka, jiri ya na-agbatara ndị ọdachi ndị meere onwe ha ma ọ bụ ọdachi ndị mmadụ kpatara dakwasịrị ọsọ enyemaka, jirikwa ya na-eme ihe n’oge ndị ọzọ e nwere mkpa.
3 Dị ka ihe atụ, n’afọ gara aga, ọtụtụ ụmụnna nyere onyinye ego iji nyere ndị ọdachi ahụ mere n’ebe Ndịda Eshia metụtara aka, nke ihe kpatara ya bụ oké ala ọma jijiji nke mere n’oké osimiri ma kpalie nnukwu ebili mmiri bụ́ nke sọọrọ banye n’ebe ndị mmadụ bijuru. Anyị nwere ekele dị ukwuu maka onyinye a e ji ezi obi nye iji kwadoo ọsọ enyemaka nzukọ anyị na-agbatara ndị nwere ọdachi. Otú ọ dị, mgbe ọ bụla e nyere onyinye ma kwuo na ọ bụ kpọmkwem maka otu ọdachi merenụ ka e ji maka ya nye ya, ọ bụ iwu ná mba ụfọdụ na, ruo oge ụfọdụ e kwuru, a ga-ejirịrị onyinye ahụ gboo mkpa ahụ onye nyere ya ji maka ya nye ya, ma è gbowo mkpa ahụ ma e gbobeghị ya.
4 N’ihi ya, a na-atụ aro ka mgbe ọ bụla mmadụ na-enye onyinye iji gbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka, ya kwuo na onyinye ahụ bụ maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. A na-eji onyinye a agbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka, na-ejikwa ya egbo mkpa ime mmụọ nke òtù ụmụnna Ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụ na n’ihi ihe ụfọdụ, mmadụ achọọ inye onyinye dị iche na nke a na-enye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ, a ga-anabata ya ma jiri ya mee ihe n’ebe e nwere mkpa maka enyemaka. Otú ọ dị, ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na onye nyere ya ekwughị kpọmkwem ebe ọ chọrọ ka e jiri ya mee ihe na otú a ga-esi jiri ya mee ihe.
5 Ọ bụrụ na anyị ana-enye onyinye anyị maka ọrụ zuru ụwa ọnụ, ọ ga-eme ka e nwekwuo ego a ga-eji na-arụ ọrụ nile metụtara ozi Alaeze anyị kama idebe ya ruo nanị mgbe a ga-enwe mkpa maka ịgbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka. Nke a kwekọrọ n’ihe e dere ná Ndị Efesọs 4:16, bụ́ nke na-ekwu ka anyị na-arụkọ ọrụ ọnụ iji nye ihe ndị a chọrọ “ka ahụ́ na-eto eto maka iwuli onwe ya elu n’ịhụnanya.”