OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Onyinye A Na-ewetara Jehova”
Olee otú anyị ga-esi ‘ewetara Jehova onyinye taa?’ (1 Ihe 29:5, 9, 14) E depụtara ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi nye onyinye iji kwado ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ ma n’obodo unu ma n’ụwa niile n’okpuru ebe a.
A NA-EJI ONYINYE NDỊ ANYỊ SI N’ỊNTANET NYE MA Ọ BỤ NDỊ ANYỊ TINYERE N’IGBE ONYINYE AKWADO:
ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ
ịrụ alaka ụlọ ọrụ na ọfis ndị nsụgharị dị iche iche, nakwa ịkwado ọrụ na-aga na ha
ịhụ maka ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova
ilekọta ndị nọ n’ozi oge niile pụrụ iche
inye aka n’oge ọdachi ma ọ bụ mgbe ihe gbata gbata mere
ibi akwụkwọ, imepụta video, nakwa itinye ihe n’Ịntanet
MMEFU ỌGBAKỌ
mmefu a na-eme n’ọgbakọ dị ka ịkwụ ụgwọ ọkụ, mmiri na ịzụta ihe ndị ọzọ dị mkpa nakwa ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze
mkpebi ọ bụla ọgbakọ mere maka ịna-ezigara alaka ụlọ ọrụ ego maka:
ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ n’ụwa niile
ịkwado Ndokwa Enyemaka Zuru Ụwa Ọnụ
ọrụ ndị ọzọ a na-arụ n’ụwa niile
MGBAKỌ UKWU NA MGBAKỌ SEKIT
A na-etinye ego ndị e nyere n’onyinye ná mgbakọ ukwu n’ọrụ zuru ụwa ọnụ. A na-esizi na ya akwụ ụgwọ mmefu ndị gbasara mgbakọ ukwu, mgbakọ pụrụ iche na mgbakọ mba niile.
A na-eji ego e nwetara ná mgbakọ sekit akwụ ụgwọ ihe ndị e mefuru iji nwee mgbakọ ahụ nakwa maka ihe ndị ọzọ metụtara sekit. Sekit nwere ike ikpebi itinye ego ọ bụla mafọrọ mgbe ha mechara mmefu ha n’ọrụ zụrụ ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova.