Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/99 p. 4
  • Ka Anyị Kpọọ Okwu Aha!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ka Anyị Kpọọ Okwu Aha!
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú E Si Akwadebe Ihe A Ga-ekwu Mgbe A Chọrọ Inyefe Magazin
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Na-akpa Àgwà Ọma n’Ozi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ò Nweela Onye I Duziiri Ọmụmụ Baịbụl n’Oge Mbụ Ị Gara na nke Ya?
    Ozi Alaeze Anyi—2010
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 7/99 p. 4

Ka Anyị Kpọọ Okwu Aha!

1 Ụfọdụ ndị taa adịghị enwe ndidi. Ha chọrọ ịma ndị anyị bụ na ihe mere anyị ji bịa. Mgbe ha chọpụtara na ihe mere anyị ji bịa bụ inwe nkwurịta okwu banyere Bible, ha pụrụ ịjụ ige ntị. Ọgụgụ Bible na mkparịta ụka banyere ihe ime mmụọ abụghị ihe dị mkpa ná ndụ ọtụtụ ndị. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndị nwe ụlọ dị otú ahụ kwere na ha kwesịrị iwepụta minit ole na ole iji soro anyị kwurịta isiokwu sitere na Bible?

2 Ihe Kasị Adị Irè: Ihe dị mkpa bụ igosi onye nwe ụlọ na Bible na-enye ngwọta ndị bara uru maka nsogbu ndị metụtara ya ma mee otú ahụ n’okwu ole na ole ruo n’ókè o kwere mee. Iche ihe n’ihu mmadụ ndị kasị adị irè na-enwe ajụjụ doro anya a kwadebere iji mee ka onye nwe ụlọ chee echiche, bụ́ nke a na-eji akụkụ akwụkwọ nsọ nke na-aza ajụjụ ahụ esochi. Ọ pụrụ ịtọ gị ụtọ ịnwale aro ndị a na-esonụ. A kwadebere ha iji nyere anyị aka ịkpọ okwu aha ngwa ngwa ma n’otu mgbe ahụ kpalie mmasị onye nwe ụlọ.

3 N’ókèala ebe ndị mmadụ na-ekwukarị na ha enweghị mmasị, jụọ metụtara ha onwe ha:

◼ “Ka anyị na-abịaru narị afọ iri ọzọ nso, ì nwere olileanya ka ì nwere obi abụọ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible buru amụma banyere ihe ndị na-akpata nchegbu na-eme taa nakwa ihe ndị ga-esi na ha pụta.” Gụọ 2 Timoti 3:1, 2, 5 na Ilu 2:21, 22.

◼ “E nwere nchegbu dị ukwuu ná mba a banyere nlekọta ahụ ike. Ị̀ maara na Chineke na-ekwe nkwa na ya ga-agwọ nsogbu ahụ ike nile ruo mgbe ebighị ebi?” Gụọ Mkpughe 21:3, 4.

◼ “Olee otú i chere ógbè anyị ga-esi rite uru ma ọ bụrụ na mmadụ nile bi ebe a na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ?” Gụọ Matiu 22:37-39.

4 Ebe ọrụ e nyere anyị bụ izisa ozi ọma Alaeze ahụ, mgbe ọ bụla o kwere mee anyị kwesịrị ịkpọtụ uche n’ihe Alaeze ahụ ga-emezu. Ị pụrụ ikwu, sị:

◼ “Ị̀ maara na akwụkwọ kasị ochie n’ụwa, bụ́ Bible, buru amụma na a ga-enwe otu ọchịchị ga-achị ụwa dum?” Gụọ Daniel 2:44.

◼ “Gịnị ka i chere ọnọdụ ga-adị ka ya ma ọ bụrụ na Jisọs Kraịst achịwa ụwa?” Gụọ Abụ Ọma 72:7, 8.

5 N’ókèala ebe ndị mmadụ ji okpukpe kpọrọ ihe, ị pụrụ ịnwale otu n’ime okwu mmalite ndị a:

◼ “A na-akpa ókè megide ọtụtụ ndị n’ihi na ha bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, n’ihi okpukpe ha, agbụrụ ha, ma ọ bụ ụcha akpụkpọ ahụ ha. Olee otú i chere Chineke si ele ajọ mbunobi dị otú ahụ anya?” Gụọ Ọrụ 10:34, 35.

◼ “Anyị maara na Jisọs Kraịst rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube n’oge ya. Ọ bụrụ na ị pụrụ ịgwa ya ka ọ rụọ otu ọrụ ebube ọzọ, gịnị ka ọ ga-abụ?” Gụọ Abụ Ọma 72:12-14, 16.

6 Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ adịghị njikere imeghe ụzọ ya, ị pụrụ ịmalite mkparịta ụka site n’ikwu, sị:

◼ “Ịnụ banyere nsogbu agwụla ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa ike. Ha chọrọ ịnụ banyere ngwọta. Obi abụọ adịghị ya na ọ dịkwa gị otú ahụ. Ma olee ebe anyị pụrụ ịchọta ezi ngwọta nye nsogbu anyị?” Nye ohere maka nzaghachi. Gụọ 2 Timoti 3:16, 17.

7 Gịnị Ma Ị Nwalee Ya? Ọtụtụ mgbe nanị ihe dị mkpa iji kpalie mmasị onye nwe ụlọ bụ ajụjụ dị mfe, dịkwa nkenke. Otu nwanyị nke na-adịbughị enwe mmasị nabatara ụmụnna nwanyị abụọ n’ụlọ ya mgbe otu n’ime ha jụsịrị ajụjụ bụ́: “Ị̀ maara Alaeze ahụ ị na-ekpe ekpere maka ya n’Ekpere Onyenwe Anyị?” Ajụjụ ahụ kpaliri mmasị nwanyị ahụ, ọ nakwerekwara ọmụmụ Bible. Ugbu a ọ bụ ohu Jehova raara onwe ya nye!

8 Mgbe ị na-agwa onye nwe ụlọ okwu, ka okwu ndị ị na-ekwu bụrụ ihe si gị n’obi. Si n’ala ala obi gị kwuo okwu. Ndị mmadụ yiri ka ha ga-ege ntị mgbe ha ji n’aka na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ n’ezie.—Ọrụ 2:46, 47.

9 Ọrụ ikwusa ozi ọma bụ ihe ịma aka taa. Ụfọdụ ndị nwe ụlọ na-enyo ndị ha na-amabughị enyo. Ndị ọzọ nwere ọtụtụ ihe ha na-eme ná ndụ, nweekwa ntakịrị oge fọdụrụ iji mee ihe ọzọ. Ma, anyị pụrụ ijide n’aka na a ka nwere ọtụtụ ndị kwesịrị ekwesị a ga-achọta. (Mat. 10:11) Mgbalị anyị ịchọta ha yiri ka ọ ga-aga nke ọma karị ma ọ bụrụ na anyị mee ka ụzọ anyị si eche ihe n’ihu mmadụ dị nkenke ma kpọọ okwu aha!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya