Iji Àgwà Ziri Ezi Na-eche Ozi Ọma ahụ n’Ihu Mmadụ
1 Anyị nile na-enwe mmasị inweta ọṅụ na afọ ojuju n’ihe anyị na-eme, karịsịa n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Gịnị na-ewetara anyị afọ ojuju dị otú ahụ? Ọ na-amalite site na anyị inwe echiche uche ziri ezi ka anyị na-eji ọrụ n’aka n’ọrụ ahụ bara uru nke inyere ndị ọzọ aka. (Ilu 11:25) Àgwà anyị n’iche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ kwesịrị igosi na anyị kwere ihe anyị na-ekwu n’ezie. Ọ bụrụ na anyị ekwuo okwu site n’obi anyị, mgbe ahụ obi eziokwu anyị na nkweta onwe onye anyị ga-apụta ìhè. (Luk 6:45) Site n’ịmụgharị ụzọ anyị si eche ihe n’ihu mmadụ, anyị ga-enwe obi ike karị mgbe anyị na-agwa ndị nọ n’ókèala anyị okwu. Nke a ga-aba uru karịsịa n’ọnwa September mgbe anyị ga-eme mkpọsa pụrụ iche site n’inyefe akwụkwọ bụ́ Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya? n’ụtụ dị ala bụ́ ₦50. A gaghị agụnye akwụkwọ Ezi Udo n’asụsụ Bekee ná ndị a ga-enyefe n’ọnụ ego dị ala nke a. Ọ na-anọgide n’ụtụ ahụ a na-enyefe ya bụ́ ₦80. Ị pụrụ ịhụ aro ndị na-esonụ dị ka ihe na-enye aka n’iji àgwà ziri ezi na-eche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ.
2 Mgbe ị na-enyefe akwụkwọ “Ezi Udo,” ị pụrụ ikwu nke a n’ọbịbịa mbụ:
◼ “N’ịgwa ndị agbata obi anyị okwu, anyị achọpụtawo na ụfọdụ na-enwe obi ike n’ebe Chineke nọ. Ọ na-esiri ndị ọzọ ike ikwere na ya. Gịnị ka i chere? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba ama ihe Bible na-ekwu n’isiokwu a. [Gụọ Ndị Rom 1:20.] Anyị pụrụ ịhụ ihe àmà nke ‘ike ebighị ebi Chineke na ịbụ Chineke ya’ site n’ikiri ihe ndị o kere.” Gụpụta paragraf ikpeazụ na peji nke 56 nke akwụkwọ Ezi Udo, dọrọkwa uche gaa na paragraf nke 11 na peji nke 59, na-emesi ike eziokwu ahụ bụ na Chineke adabeghị mgbe ọ bụla ime ihe mgbe mmezu nke nzube ya chọrọ ka e mee ihe. Kọwaa nzọụkwụ o weere mgbe nne na nna anyị mbụ bụ́ mmadụ nupụụrụ ya isi wee si otú a na-eso Setan n’omume nnupụisi ya. Kwuo okwu na Jenesis 3:15 mgbe e ji ya tụnyere Mkpughe 12:9. Kwuo na ị ga-eme ka onye ahụ nweta akwụkwọ ahụ n’ụtụ dị ala bụ́ ₦50, kwekwa nkwa ịlọghachi maka ikwurịtakwu okwu.
3 Mgbe ị na-alaghachi ileta ndị gị na ha kwurịtara ihe mere anyị kwesịrị iji nwee obi ike na Chineke, ị pụrụ ịchọ ikwu nke a:
◼ “N’ọbịbịa m nke gara aga, anyị kwurịtara ihe àmà nke ịdị adị Chineke dị ka ihe okike ya dị ịtụnanya na ịmụrụ anya ya n’imezu nzube ya na-egosi. Ọ̀ na-esiri gị ike ikweta na Onye kere eluigwe na ala ga-ewetakwara ihe a kpọrọ mmadụ ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ị ga-echeta na n’ọbịbịa m nke ikpeazụ, ezoro m aka n’akwụkwọ Jenesis 3:15, nke mesiri nkwa Chineke ike banyere otu mkpụrụ nke ga-ebibi Setan onye iro anyị bụ isi ka ihe a kpọrọ mmadụ wee nwee ike ịnụ ụtọ ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ya mere, ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịrịba ama na Onye Okike ahụ ekpebiworị ọdịnihu.” Gụọ Aịsaịa 46:9, 10. Na-adabere ná mmasị onye ahụ, jiri ihe ọmụma dị na peji nke 63 mee ihe, gụpụtakwa paragraf nke 18, nke na-akọwa òkè Jisọs na-ekere ná mmezu nke nzube Jehova maka obi ụtọ ebighị ebi nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. Kwuo ka e nwee ọmụmụ Bible, ọ bụrụkwa na a nabata ya, malite ọmụmụ ihe ahụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.
4 Ị pụrụ ịhụ ụzọ iche ihe n’ihu nke a dị ka ihe na-enye aka mgbe ị na-enyefe akwụkwọ “Ezi Udo”:
◼ “N’ịgwa ndị agbata obi anyị okwu, achọpụtawo m na ihe ka ọtụtụ na-achọsi ógbè na-adịghị ize ndụ na ụwa nke dị n’udo ike. Gịnị bụ echiche gị banyere ihe mere ụmụ mmadụ jiworo daa n’inweta ọnọdụ ndị dị otú ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ụfọdụ ndị ndú ụwa pụrụ inwe obi eziokwu, na-emekwa ihe ọma ụfọdụ, ma rịba ama ihe Bible ji amamihe na-adụ ọdụ ya.” Gụọ Abụ Ọma 146:3, 4; mgbe ahụ jụọ, sị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla pụrụ imeju mkpa mmadụ?” Gụọ amaokwu nke 5 na 6. Gosi akwụkwọ Ezi Udo ahụ, ma sapeta n’isi nke 2 nke isiokwu ya bụ́ “Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Iweta Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Na-adịgide Adịgide?” Dọrọ uche gaa n’abamuru dị iche iche nke ịchịisi Chineke. Nyefee akwụkwọ ahụ n’ụtụ ahụ dị ala bụ́ ₦50.
5 Ọ bụrụ na unu kwurịtara ịchịisi Chineke na mbụ, ị pụrụ ịnwale aro a ná nletaghachi:
◼ “Mgbe m bịara ebe a n’ụbọchị ole na ole gara aga, anyị kwurịtara ọdịda mmadụ daworo n’iweta ezi udo n’elu ụwa. Ị pụrụ icheta na anyị chọpụtara ihe Bible na-ekwu kpatara ọdịda dị otú ahụ. [Gụghachi Abụ Ọma 146:3.] Ị̀ rịbara ama ihe mere Chineke ji na-adụ anyị ọdụ ịghara itinye olileanya anyị n’ebe ụmụ mmadụ nọ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ma eleghị anya i kwetara na olileanya maka ihe ngwọta na-adịgide adịgide aghaghị ịbịa site n’aka Chineke. A kọwara ihe mere anyị pụrụ iji nwee obi ike nke a n’Abụ Ọma 146:10. [Gụọ.] Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị Alaeze Chineke ga-achị, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?” Sapeta peji nke 20 nke akwụkwọ Ezi Udo, gụpụta paragraf nke 28-30, meekwa ka Jọn 17:3 pụta ìhè. Kwuo ka i gosi otú ọtụtụ nde mmadụ siworo nweta ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi site n’ọmụmụ Bible. Ọ bụrụ na e nye gị ohere, gosi akwụkwọ Ihe Ọmụma ma malite ọmụmụ ihe ahụ.
6 Mgbe ị na-arụ site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa ma ọ bụ n’ahịa, ị pụrụ iji akwụkwọ “Ezi Udo” mee ihe n’ụzọ iche ihe n’ihu nke a dị mkpirikpi:
◼ “Taa anyị na-ejere ndị na-achụ nta ego nọ n’ógbè a ozi pụrụ iche. Anyị nile na-enwe nchegbu banyere ịrị elu nke mpụ na ime ihe ike n’ógbè anyị. Ì chere na ọ dị onye nwere ezi ihe ngwọta nye nsogbu ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Chineke nwere ihe ngwọta.” Sapeta isi nke 9 na peji nke 94 nke akwụkwọ Ezi Udo; gụpụta ma kwuo okwu n’Aịsaịa 45:18 na paragraf nke 4, nyefeekwa akwụkwọ ahụ n’ụtụ ahụ dị ala bụ́ ₦50.
7 Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke onye na-achụ nta ego nke i nyefere akwụkwọ “Ezi Udo,” ị pụrụ ikwu nke a:
◼ “N’ọbịbịa ikpeazụ m, ekwuru m na ọ bụ nanị Chineke bụ onye nwere ihe ngwọta na-adịgide adịgide n’ezie nye mpụ na ime ihe ike. Dị ka nkwa ya si dị, anyị pụrụ ịtụkwasị obi na a ga-enwe ụwa nke dị n’udo. Rịba ama nhọrọ e setịpụrụ n’ihu onye ọ bụla n’ime anyị.” Gụpụta paragraf nke 11 na peji nke 97 nke akwụkwọ Ezi Udo, gụnyere Aịsaịa 25:6. Kwuo okwu n’ihe osise dị na peji nke 98. Kwuo ka e nwee ọmụmụ Bible n’efu, nke a ga na-eduzi n’ebe achụmnta ego ha ma ọ bụ n’ebe obibi ha.
8 Akwụkwọ ndị ọzọ a pụrụ inyefe n’oge mkpọsa a pụrụ iche bụ́ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma, Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Ị pụrụ inwe ike ichepụta ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị mfe mgbe ị na-enyefe akwụkwọ ndị a. Dị ka “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ,” anyị nwere ihe mere anyị ga-eji nwee echiche ziri ezi mgbe anyị na-eche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ. (1 Kọr. 3:9) Anyị ijigide àgwà a ga-arụpụta ngọzi bara ụba nke Jehova.