Isi 9
Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Gburugburu Ụwa—Olileanya Kwesịrị Ndabere
1, 2. Ọnọdụ dịgasị aṅaa ndị e buru amụma ha n’ime Bible ga-eme ka ụwa nke a bụrụ ebe dị ụtọ ibi ndụ?
ALA nke a pụrụ ịbụ ebe mara mma, nke na-agụkwa agụụ ibi ma ọ bụrụ n’ezie na udo na ọnọdụ ịnọ ná ntụkwasị obi ejupụta ebe nile. Ọ bụ ezie na ugbu a, ọ dịghị otú ahụ ma ọlị, Bible na-ebu amụma na ụwa ka ga-aghọ ebe obibi mara mma ebe ezinụlọ nke mmadụ ga-ama ụtọ ndụ ruo n’ùjú ya.
2 Olee nnọọ ihe Bible na-ekwe nkwa ya? Ànyị ga-esi aṅaa jide n’aka na nke a ga-emezu?
Ihe Ndabere Siri Ike maka Inwe Obi Ike
3, 4. (a) Gịnị ka anyị na-amụta site ná ndabere e ji n’aka nke iwu ndị bụ isi na-achịkwa eluigwe na ụwa? (b) Ònye guzobere iwu ndị ahụ, n’ihi ya na gịnị ọzọ ka anyị nwere ihe ziri ezi anyị ga-eji tụkwasị ya obi?
3 Ntọala iwu ụfọdụ na-achịkwa elu na ala. Anyị na-ewere ọtụtụ n’ime ha n’ihe nkịtị. Anwụ ọwụwa, anwụ ọdịda, ọnwa otiti, na oge dị iche iche na-abịa na-alakwa n’ụzọ na-akwado ndụ nke ụmụ mmadụ nọgidere na-adị. Ụmụ mmadụ na-ebipụta kalenda, na-emekwa atụmatụ ihe omume maka ọtụtụ afọ ndị na-abịa n’ihu. Ha matara na njegharị nke anyanwụ, ọnwa na mbara ala dị iche iche kwesịrị ndabere. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a?
4 Onye nke mere iwu ndị ahụ nile kwesịrị ndabere kpam kpam. Anyị pụrụ ịdabere n’ihe ọ na-ekwu na ihe ọ na-eme. Ọ bụ n’aha ya, dị ka Onye Okike nke eluigwe na ụwa, ka Bible na-ekwe nkwa usoro ihe ọhụrụ ezi omume. (Aịsaịa 45:18, 19) N’usoro ihe omume nke ndụ anyị kwa ụbọchị, anyị na-adaberekarị n’ókè ụfọdụ ná ndị ọzọ—ndị na-ebute ihe oriri n’ahịa, ndị na-ebuga ozi, na ndị enyi anyị. Ya mere, ọ̀ bụ na ezi uche adịghị ya ịtụkwasị obi nke ukwuu karị na Chineke na ná nkwa ya nile ndị na-aghaghị imezu?—Aịsaịa 55:10, 11.
5. Olee otú enweghị mkpali nke ọchịchọ onwe onye ọ bụla n’ihe Chineke kwere ná nkwa si enye anyị okwukwe?
5 Ọ bụ ezie na ọtụtụ mgbe nkwa nke ndị mmadụ ekwesịghị ndabere, nkwa nile nke Chineke kwesịrị ndabere kpam kpam, ọ bụkwa maka ọdịmma anyị, ọ bụghị nke onwe ya. Ọ bụ ezie na Chineke achọghị ihe ọ bụla n’aka anyị, ọ na-enwe obi ụtọ ná ndị ahụ tinyere okwukwe n’ebe ọ nọ n’ihi na ha hụrụ ya na ụzọ ezi omume ya n’anya.—Abụ Ọma 50:10-12, 14.
6. Ụdị okwukwe dị aṅaa ka Bible na-enyere anyị aka ịzụlite?
6 Ọzọkwa, Bible na-akpali ike iche echiche anyị. Ọ naghị achọ okwukwe kpuru ìsì ma ọ bụ nke ikwere ihe n’ajụghị ajụjụ. N’ezie, ọ kọwara ezi okwukwe dị ka “ndabere nke ihe a na-ele anya, bụrụkwa nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya.” (Ndị Hibru 11:1) N’ime Bible, Chineke nyere anyị ezi ihe mgbado ụkwụ maka okwukwe. Izi ezi nke ihe ndabere ahụ na-apụta ìhè karị mgbe anyị na-eto n’ihe ọmụma nke Okwu Chineke na-ahụtakwa eziokwu ya ka ọ na-arụ ọrụ ná ndụ anyị na ná mmezu nke amụma ya nile—Abụ Ọma 34:8-10.
7. Ka anyị na-enyocha nkwa nile nke Bible maka ngọzi nke ọdịnihu, gịnị ka anyị na-ekwesịghị ile anya na ikwere na ha ga-achọ n’aka anyị?
7 Nkwa nile nke Bible maka ngọzi nke ọdịnihu karịrị nke ukwuu ihe ụmụ mmadụ pụrụ inye. Ma, nkwa ndị ahụ adịghị achọ n’aka anyị ikwere n’ihe ndị megidere ahụmahụ nile nke mmadụ. Ha adịghịkwa emegide ọchịchọ nkịtị nke ụmụ mmadụ. Tụlee ụfọdụ ngọzi ukwu ndị a ma hụta otú nke a si bụrụ eziokwu.
Ụwa Ịghọ Ebe Obibi dị ka Ubi A Gbara Ogige
8, 9. (a) Echiche dị aṅaa ka o kwesịrị ka anyị nwee banyere okwu ahụ bụ “paradaịs”? (b) Ọ̀ dịwo mgbe ụdị ihe ahụ dịrị n’ụwa? (ch) Gịnị na-egosi na ọ bụ nzube Chineke ka ala nile ghọọ Paradaịs?
8 Okwu ahụ bụ “paradaịs” sitere n’okwu ndị yiri ya ndị e jiri mee ihe n’oge ochie (Hibru, par·desʹ; Peasia, pai·ridaeʹza; Grik, pa·raʹdei·sos), okwu ndị e jiri kọwaa ihe ndị dịworo adị n’ezie n’elu ụwa. Okwu ndị a nile nwere ntọala echiche nke ebe ntụrụndụ mara mma ma ọ bụ ubi a gbara ogige yiri ebe ntụrụndụ. Dị ka ọ dị n’oge ochie, otú ahụkwa taa, e nwere ọtụtụ ebe dị otú ahụ, ụfọdụ n’ime ha bụ ogige ndị buru ibu. Mmadụ nwekwara ọchịchọ ebumpụta ụwa maka ịma mma ha. Bible na-ekwe nkwa na ụbọchị na-abịa mgbe ụwa nile ga-abụ ụdị ubi a gbara ogige yiri ebe ntụrụndụ ma ọ bụ paradaịs dị otú ahụ!
9 Mgbe Chineke kere mmadụ abụọ mbụ o nyere ha dị ka ebe obibi ubi Iden a gbara ogige, aha nke pụtara “Paradaịs nke Obi Ụtọ.” Ma a gaghị enwe Paradaịs nanị n’otu ebe ahụ. Chineke gwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:28; 2:8, 9) Nke a ga-agụnye ịgbasapụ ókèala nile nke Paradaịs ruo nsọtụ nile nke ụwa, bụ́ nzube Chineke guzobere nke nnupụisi Adam na Iv na-akwụsịghị. Jisọs Kraịst n’onwe ya gosiri obi ike ná nzube ahụ mgbe o kwere otu nwoke nwụrụ n’akụkụ ya nkwa na ọ ga-enwe ohere ibi n’ime ụdị ụwa Paradaịs ahụ. (Luk 23:39-43) Nke a ọ̀ ga-esi aṅaa mee?
10. Gịnị bụ ihe ndị na-egbochi Paradaịs dị ka Mkpughe 11:18 si kwuo, bụ́ nke Chineke kwere nkwa iwepụ?
10 Ná “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịanụ Chineke ga-ewezuga ihe mgbochi nile nke Paradaịs elu ụwa ya nke na-abịanụ site ‘n’imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Chineke ga-esi otú a mee ihe ọchịchị ụmụ mmadụ na-enweghị ike ime ma ọlị. Ọ ga-ewezuga ndị nile ji maka ọdịmma onwe ha na-emetọ ụwa iji rite oké uru ahịa, ndị nile na-ebu agha mgbukpọsị ihe, na ndị nile na-adịghị eji ụwa eme ihe n’ụzọ dị mma n’ihi enweghị nsọpụrụ maka onyinye nile dị ukwuu nke Chineke nyeworo.
11. (a) Akụkọ ihe mere eme dị aṅaa na-egosi na iweghachi Paradaịs n’elu ụwa emegideghị ahụmahụ nke ụmụ mmadụ? (b) Ná nkwa ngọzi dị aṅaa ka nke a na-ewusi okwukwe anyị ike?
11 Ụwa nile mgbe ahụ ga-ejupụta n’ịma mma. A ga-enwe ịdị ọhụrụ na ịdị ọcha mgbe ahụ n’ikuku, mmiri na ala ya. Mweghachi nke a nke Paradaịs abụghị ihe a na-apụghị ikwere ekwere, ọ bụghịkwa nke megidere ahụmahụ ụmụ mmadụ. Ọtụtụ narị afọ gara aga, mgbe mba Israel si ná ndọta n’agha na Babilọn pụta, Jehova weghachiri ha n’ala nke aka ha, nke bụ ebe tọgbọrọ n’efu mgbe ahụ. Ma n’ihi ngọzi Chineke gọziri ha na ọrụ ha rụrụ, ala ahụ mgbe na-adịghị anya ghọrọ ebe mara mma nke ukwuu na ndị agbata obi ha pụrụ iti mkpu, sị: ‘Ọ dịwokwa ka ubi Iden a gbara ogige!’ Ọ ghọkwara ala na-emepụta nri, na-ewepụ iyi egwu nile nke agụụ na ụnwụ nri. (Ezikiel 36:29, 30, 35; Aịsaịa 35:1, 2; 55:13) Ihe Chineke mere mgbe ahụ bụ ihe atụ dị nta nke ihe ọ ga-emekwa n’ụwa nile iji mezuo nkwa ya nile. Mmadụ nile ndị a gụrụ ná ndị kwesịrị ekwesị ịdị ndụ mgbe ahụ ga-enweta ihe nile na-enye obi ụtọ ná ndụ nke Chineke ga-enye n’ime Paradaịs.—Abụ Ọma 67:6, 7; Aịsaịa 25:6.
Ngwụsị nke Ịda Ogbenye na Ibu Ohu nye Akụ na Ụba
12. Ọnọdụ akụ na ụba na ịrụ ọrụ dị aṅaa ka a na-aghaghị idozi ma ọ bụrụ na anyị ga-enwe ezi obi ụtọ ná ndụ?
12 Ịda ogbenye na ịbụ ohu nye usoro akụ na ụba obodo jupụtara n’ụwa nile. Apụghị inwe ezi ịnụ ụtọ nke Paradaịs ma ọ bụrụ na ọtụtu nde ndị mmadụ anọgide na-adọgbu onwe ha n’ọrụ maka nanị ihe ndị a ga-eri ma ọ bụ na-arụ otu ụdị ọrụ na-agwụ ike, nke na-eme mmadụ ka ọ ghọọ onye na-arụ ọrụ ma ndị ọzọ a na-eri eri.
13-15. (a) N’ole ebe ka anyị na-achọta ihe atụ akụkọ ihe mere eme nke na-egosi anyị ihe bụ uche Chineke maka mmadụ metụta nke a? (b) Ndokwa nke ahụ si aṅaa etinye ihe n’ịnọ ná nchebe na ịnụ ụtọ nke ndụ maka onye na ezinụlọ nile ọ bụla?
13 Uche Chineke maka mmadụ banyere nke a ka a na-ahụta n’ụzọ o si dozie okwu ndị dị otú ahụ n’Israel oge ochie. N’ebe ahụ, ezinụlọ ọ bụla nwetara ihe nketa ihe onwunwe nke ala. (Ndị Ikpe 2:6) Ọ bụ ezie na a pụrụ ire nke a ere, ndị mmadụ pụkwara n’otu n’otu irenye onwe ha n’ohu ma ọ bụrụ na ha ejide ụgwọ, Jehova mekwara ndokwa megide ịzọkọrọ ókèala dị ukwuu ma ọ bụ ịgbara ndị mmadụ n’ohu ruo ogologo oge. N’ụzọ dị aṅaa?
14 Site ná ndokwa akụ na ụba dị n’Iwu ahụ o nyere ndị ya. Afọ nke asaa nke ije ozi bụ ‘afọ inwere onwe’ mgbe onye Israel ọ bụla nọ n’ohu ga-enwere onwe ya. Ọzọkwa, iri afọ ise ọ bụla bụ afọ “Jubile” maka mba ahụ nile, afọ nke ‘ịkpọsa inwe onwe’ nye ndị nile bi na ya. (Deuterọnọmi 15:12; Levitikọs 25:10) Mgbe ahụ ihe nketa nke ihe onwunwe ọ bụla nke e reworo ga-alaghachiri onyenwe ya na mbụ. A na-atọhapụ ndị nile nọ n’ohu, ọbụna ma a sị na afọ asaa ezubeghị. Ọ bụ oge ịṅụrị ọṅụ n’ihi obi ụtọ ịdịghachi n’otu nke ezinụlọ nakwa mmalite ndụ ọhụrụ n’ihe banyere akụ na ụba. N’ụzọ dị otú a, ọ dịghị ala a pụrụ ire ere ruo mgbe ebighị ebi. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, orire ya ga-abụ nanị mgbazinye nke ga-enwe njedebe, ma ọ dịkarịa anya n’afọ nke Jubile.—Levitikọs 25:8-24.
15 Ihe a nile butere ọnọdụ akụ na ụba kwụrụ chịm nke mba ahụ nakwa ịnọ ná ntụkwasị obi na udo nke ezinụlọ ọ bụla. Mgbe e debere iwu ndị a, a na-echebe mba ahụ pụọ n’ịdaba n’ụdị ọnọdụ dị mwute anyị na-ahụ taa n’ọtụtụ ala ebe oké akụ na ụba na oké ịda ogbenye na-adịkọta ọnụ. Uru nke ndị mmadụ na-erite wusiri mba ahụ ike, n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla ụwa nke ya ka njọ wee bụrụ onye ọnọdụ akụ na ụba na-adịghị mma na-emekpa ahụ. Dị ka a kọrọ n’oge ọchịchị Eze Solomọn, “Juda na Israel wee biri ná ntụkwasị obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya.” (1 Ndị Eze 4:25) Taa ọtụtụ mmadụ apụghị itinyecha onyinye ha nile na amamihe ha n’ọrụ n’ihi na e jigidewo ha n’usoro akụ na ụba nke na-amanye ha ijere ọchịchọ nke mmadụ ole na ole ma ọ bụ ọbụna nke nanị otu onye ozi. N’okpuru iwu nile nke Chineke e nyeere onye na-arụsi ọrụ ike aka iji ihe o nwere ike ime mee ihe maka ọdịmma na obi ụtọ nke mmadụ nile. Nke a na-enye anyị ihe ngosi nke echiche mmadụ ịbụ onye e ji kpọrọ ihe na inwe ùgwù onwe onye nke ndị ga-enweta ndụ n’Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke ga-ama ụtọ ya.
16. Banyere ọnọdụ nile nke ibi ndụ na ọnọdụ akụ na ụba nke mmadụ, gịnị ka Alaeze Chineke ga-ewetara ndị nile ọ ga-achị?
16 Amụma nke Maịka 4:3, 4 ga-enwe mmezu dị ebube gburugburu ụwa. Mmadụ ndị hụrụ udo n’anya bụ́ ndị bi n’okpuru ọchịchị Chineke “ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji: n’ihi na ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha ekwuwo okwu.” Ọ dịghị n’ime ndị ahụ bi n’okpuru Alaeze Chineke nke ga-ebi ná mkpọmkpọ ebe ruru unyi ma ọ bụ ná nkịkara ụlọ ndị mmadụ jubigara ókè. Ha ga-enwe ala na ebe obibi bụ nke aka ha. (Aịsaịa 65:21, 22) Eze ahụ bụ Jisọs Kraịst kwere nkwa eri ogologo oge gara aga na ‘ndị dị nwayọọ n’obi ga-eketa ụwa,’ o nwekwara “ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa” ịhụ na nke a mere.—Matiu 5:5; 28:18.
Ahụ Ike na Ndụ Na-adịgide Adịgide
17-19. (a) Gịnị na-egosi na ezi ahụ ike na ogologo ndụ bụ ọchịchọ ebumpụta ụwa nke ụmụ mmadụ? (b) Eziokwu dịgasị aṅaa banyere ndụ mmadụ na banyere ihe ọkụkụ na-eme ka oge ndụ dị mkpirikpi nke mmadụ na-adị bụrụ ihe mgbagwoju anya? (ch) Gịnị banyere ụbụrụ mmadụ na-egosi na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na e mere mmadụ ibi ndụ ebighị ebi?
17 Otú ọ dị, e nweghị nke ọ bụla n’ime ọnọdụ ọma ndị a pụrụ ime ka ndụ dị nnọọ n’udo na ná nchebe ma ọ bụrụhaala na ọrịa, ịka nká, na ọnwụ anọgide n’ọdịnihu. Ọ̀ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ma ọ bụ ihe megidere ahụmahụ nke ụmụ mmadụ inwe olileanya maka nnapụta pụọ n’ihe mgbu ndị a? N’ezie, o megideghị ọdịdị mmadụ ịchọ nke a, n’ihi na ndị mmadụ etinyewo oge ndụ ha na ego buru ibu ịgbalị imezu ya.
18 Ya mere, olileanya nke ahụ ike na ndụ na-adịgide adịgide abụghị ihe ezi uche na-adịghị ya. N’ezie, ihe ezi uche na-adịghị ya bụ nke a: Mgbe mmadụ ruru nnọọ n’afọ ndụ ha malitere inweta ihe ọmụma, ahụmahụ, na ike ime ihe bara uru, ha na-amalite ịka nká na n’ikpeazụ ha anwụọ. Ma, e nwere osisi ndị na-adị ndụ ruo ọtụtụ puku afọ! N’ihi gịnị ka mmadụ, onye e kere n’oyiyi Chineke, ji adị ndụ nanị otu ụzọ nke oge ndụ nke ụfọdụ ihe ọkụkụ na-enweghị ọgụgụ isi na-adị? N’echiche ziri ezi, ọ̀ bụ na o kwesịghị ibi ogologo ndụ karị?
19 Nye ndị ọkà na-amụ ihe banyere ịka nká, ihe kpatara nke a ka bụ oké ihe omimi. Ihe ọzọkwa bụ ihe omimi bụ eziokwu ahụ bụ na e mere ụbụrụ mmadụ n’ụdị nke ịnabata oké ihe ọmụma na-agaghị agwụ agwụ. Dị ka otu onye na-ede ihe ọkà mmụta sayensi kwuru, ụbụrụ nwere ike “ruru nnọọ eru ịnagide ibu ọ bụla nke mmụta na ncheta ihe nke mmadụ pụrụ itinye na ya—tinyekwara otu okpukpu ijeri karịa nke ahụ.”55 Nke ahụ pụtara na ụbụrụ gị nwere ike ịnagide ọ bụghị nanị ibu ọ bụla ị pụrụ ibo ya n’oge ndụ nke 70 ma ọ bụ 80 afọ ndụ gị, kamakwa okpukpu puku nde ọzọ karịa nke ahụ! Ka a sịkwa ihe mere akpịrị ihe ọmụma ji na-akpọ mmadụ nkụ otú a, oké ọchịchọ nke ịmụta ime ihe na ịrụzu ihe. Ma, e gbochiri ya n’ihi ịdị mkpirikpi nke ndụ ya. Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya na ụbụrụ mmadụ nke nwere ike pụrụ iche dị otú a ga-adị ebe ahụ ma a ghara iji ihe karịrị otu akụkụ dị nta nke ike ya mee ihe? Ọ̀ bụ na ezi uche adịghị ya karị ikwubi, dị ka Bible kwubiri na Jehova mere mmadụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’elu ala ma nyekwa ya ụbụrụ dabara nnọọ maka nzube ahụ?
20. Olee ihe Bible na-ekwu bụ ihe Chineke kweworo nkwa imere ụmụ mmadụ banyere mmetụta nile nke mmehie, tinyere ọnwụ n’onwe ya?
20 Bible na-egosi na mmadụ nwere ohere ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi na mbụ ma ọ tụfuru ya site n’inupụ isi: “Dị ka mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Ma e nwekwara n’ime Bible nkwa Chineke na n’ime Paradaịs e weghachiri, “ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” (Mkpughe 21:3, 4; tụlee 7:16, 17.) O kwuru na ndụ ebighị ebi, n’enweghị mmetụta nile nke mmehie, bụ nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Ndị Rom 5:21; 6:23) Karịa nke ahụ, ọ na-ekwe nkwa na ohere nke ngọzi nke Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke ga-adịkwara ọtụtụ ijeri ndị nwụworo anwụ n’oge gara aga. N’ụzọ dị aṅaa? Site ná mbilite n’ọnwụ nke ga-eghebe ili nke ọha mmadụ oghe. Jisọs ji obi ike kwupụta, sị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile di n’ili ga-anụ olu ya, ha ga-apụtakwa.”—Jọn 5:28, 29.
21, 22. N’ihi gịnị ka echiche nke iweghachi mmadụ n’ọnọdụ ahụ ike zuru ezu na-ejighị bụrụ ihe hiri oké nne inwe olileanya maka ya?
21 Ọkà mmụta sayensi ọgwụ na ahụ ike nke oge a enwewo ike imepụta “ọgwụ ọrụ ebube dị iche iche” na ime ihe ịrịba ama n’ịwa ahụ nke gaara eyiworị ihe a na-apụghị ime eme ọbụna n’iri afọ ole na ole gara aga. Ànyị kwesịrị ịrụ ụka na Onye ahụ kere mmadụ pụrụ ime ihe dị ịtụnanya karị nke ahụ n’ịgwọ ọrịa? N’ezie Onye Okike ahụ nwere ike nke iweghachi ndị obi ha ziri ezi n’ọnọdụ ahụ ike zuru ezu, ọbụna imegharị usoro ịka nká. Ọ pụkwara ime nke a n’ejighị ọgwụ dị iche iche, usoro ịwa ahụ, ma ọ bụ akụkụ ahụ ndị mmadụ mere. Dị ka ihe obi ebere, Chineke enyewo ihe àmà na ngọzi ndị dị otú ahụ ehighị nne karị inwe olileanya maka ha.
22 Chineke nyere Ọkpara ya ike mgbe ọ nọ n’elu ala ịrụ oké ọrụ dị iche iche nke ịgwọ ọrịa. Ọrụ ndị a na-emesi anyị obi ike na e nweghị adịghị ike, nkwarụ ma ọ bụ nrịa nrịa ọ bụla karịrị ike Chineke ịgwọta. Mgbe otu nwoke nke anụ ahụ ya jupụtara n’ekpenta rịọrọ Jisọs ka ọ gwọọ ya, Jisọs n’ọmịiko metụrụ nwoke ahụ aka ma sịkwa: “Ka e mee ka ị dị ọcha.” Dịkwa ka ihe ndekọ ahụ si kwuo, “ngwa ngwa e wee mee ka ọ dị ọcha n’ekpenta ya.” (Matiu 8:2, 3) Jisọs mere ihe ndị dị otú a n’ebe ọtụtụ ìgwè ndịàmà na-ekiri ya, dị ka ọkọ akụkọ bụ Matiu si kọọ, sị: “Ọtụtụ ìgwè mmadụ wee bịakwute ya, chịrị ndị ngwụrọ, ndị ìsì, ndị ogbi, ndị ọlụsị, na ọtụtụ ndị ọrịa dị iche iche, tinyere onwe ha, ha wee tọgbọ ha n’ala n’ụkwụ ya; o wee mee ka ahụ ha dị ike: ya mere na o juru ìgwè mmadụ ahụ anya . . . ha wee too Chineke nke Israel.” (Matiu 15:30, 31) Gụọ n’onwe gị ihe ndekọ dị na Jọn 9:1-21 iji hụta izi ezi na eziokwu nke ihe mere eme n’ihe ndekọ akụkọ nke ụdị ọgwụgwọ ọrịa ahụ. Ịbụ eziokwu nke ihe ndị a mere eme bụ nke ọtụtụ ndịàmà gbara akaebe ya, ndị gụnyere onye dọkịta bụ Luk, onye na-agwọ ọrịa.—Mak 7:32-37; Luk 5:12-14, 17-25; 6:6-11; Ndị Kọlọsi 4:14.
23, 24. N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ikwere na a ga-eweghachi ndị nwụrụ anwụ ná ndụ n’okpuru Alaeze Chineke?
23 N’ihi otu ihe ndị ahụ anyị ekwesịghị ile nkwa Bible nke na ‘a gaje inwe mbilite n’ọnwụ’ nke ndị nwụrụ anwụ anya dị ka ihe karịrị ikwere ekwere. (Ọrụ 24:15) Ọbụna ọtụtụ afọ mgbe ọnwụ mmadụ gafesịrị, a pụrụ iweghachi olu mmadụ, ọdịdị ya, na ihe o meworo site n’ihe e ji ese foto ma ọ bụ ihe nkiri vidio. Onye ahụ kere mmadụ, onye mazuuru ọdịdị atọm na molecule nke mmadụ, ọ̀ gaghị enwe ike ime karịa nke ahụ nke ukwuu? Kọmputa ndị mmadụ mere pụrụ ichebe ma haziekwa ọtụtụ ijeri ihe ọmụma. Ma Chineke kere eluigwe na ụwa nke dị oké egwu bụ́ nke nwere ọtụtụ ijeri (ọtụtụ puku nde) nke ụyọkọ kpakpando, ụyọkọ nke ọ bụla nwere ọtụtụ ijeri kpakpando. Ọnụ ọgụgụ ha bụ ihe a na-apụghị ịgụta agụta! Ma Abụ Ọma 147:4 na-asị: “Ọ na-agụta ọnụ ọgụgụ kpakpando; ha nile ka ọ na-akpọ aha”! N’ezie ọ ga-adịrị Chineke mfe, bụ́ onye nwere ụdị ike dị ukwuu otú a icheta ihe, icheta ọdịdị ndị mmadụ n’otu n’otu iji weghachi ha ná ndụ.—Job 14:13.
24 Ọzọ, Jehova guzobere ihe atụ nke ihe ndị mere eme iji wusie okwukwe anyị ike n’olileanya nke a dị ebube. O nyere Ọkpara ya ike igosi n’ụzọ dị nta ihe nke ọ ga-eme n’ụzọ dị ukwuu n’oge ọchịchị ezi omume ya n’elu ala. Jisọs kpọlitere mmadụ ole na ole n’ọnwụ, mgbe mgbe n’ihu ọtụtụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ. Lazarọs, bụ́ onye ọ kpọlitere ná nso Jerusalem, anwụworị ogologo oge nke na ahụ ya amalitewo ire ure. N’eziokwu olileanya nke mbilite n’ọnwụ nwere ezi ihe ndabere.—Luk 7:11-17; 8:40-42, 49-56; Jọn 11:38-44.
Ike nke Ụwa Ịnagide Ụba Mmadụ Dị Otú Ahụ
25, 26. Mgbe a kpọlitesịrị ndị nwụrụ anwụ, olee ebe ohere ga-adị nye onye ọ bụla ibi?
25 Ụwa nke a ọ̀ pụrụ inye ohere ebe obibi doro ahụ maka ụdị ụba mmadụ nke a ga-enwe site ná mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ? O were ihe karịrị 5,000 afọ ka ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa ruo otu ijeri n’ime afọ ndị 1800. Taa, o ruwo ihe dị ka ijeri ise.
26 N’ihi ya, ndị dị ndụ taa nọchitere anya akụkụ buru ibu nke ngụkọta ọnụ ọgụgụ mmadụ ndị dịworo ndụ. Ụfọdụ amawo amụma na ngụkọta ụba mmadụ kemgbe mmadụ dịwara ndụ bụ ihe dị ka 15,000,000,000 mmadụ. Ohere ala nke ụwa dị ihe karịrị 36,000,000,000 eka (15,000,000,000 hekta). Nke ahụ ga-enye ohere ihe karịrị eka abụọ (otu hekta) nye otu onye. Ọ bụghị nanị na nke a ga-enye ohere maka imepụta ihe oriri kama ọ ga-enyekwa ohere maka oké ọhịa, ugwu, na ebe nlepụanya ndị ọzọ—n’adịghị mkpa ịbịakọta otu ebe n’ime Paradaịs. Ọzọkwa, Bible na-egosi na ọ bụghị ndị nile dị ndụ ugbu a ga-alanarị ma biri n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ ahụ. N’eziokwu, Jisọs kwuru sị, “Obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba.” O kwukwara na mgbe mbibi ụwa bịara, ndị ahụ na-adịghị eme uche Chineke ‘ga-apụ jee baa ná mbibi ebighị ebi.’—Matiu 7:13; 25:46.
27. Ala ọ̀ ga-enwe ike imepụta ihe oriri zuru ezu maka ndị ahụ nile?
27 Ma ala ọ̀ ga-enwe ike imepụta ihe oriri zuru ezu maka ọtụtụ ndị mmadụ? Ndị ọkà mmụta sayensi na-ekwu na ọ pụrụ, ọbụna n’ọnọdụ dị ugbu a. Otu akụkọ nke Toronto Star kwuru, sị: “Dị ka òtù United Nations Food and Agriculture Organization (FAO) kwuru, e nwewo nri zuru ezu a na-akọpụta n’ụwa nile ijiri 3,000 calory nke nri zụọ onye ọ bụla bi n’ụwa kwa ụbọchị, nke bụ . . . ihe dị ka 50 pasenti karịa otu a chọrọ ma ọ dịkarịa ala.”56 Banyere ọdịnihu, ọ kọwara na ọbụna n’okpuru ọnọdụ ndị dị ugbu a, a pụrụ inwe nri zuru ezu iji gboo mkpa ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ugbu a n’ụwa okpukpu abụọ. Tinyere nke ahụ, anyị kwesịrị icheta na Jehova ga-eduzi ndị ya ijiri ike ala nwere imepụta nri mee ihe n’ụzọ kasị mma, n’ihi na Abụ Ọma 72:16 na-emesi anyị obi ike, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.”
28. Gịnị mere na ihe ize ndụ adịghị na site ná ndị mmadụ ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, a ga-ejubiga ókè n’ụwa mgbe oge na-aga?
28 Anyị ga-arịba ama ihe bụ nzube Chineke, dị ka e buworo ụzọ gwa di na nwunye mbụ ahụ. A gwara ha ka ha “jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe” ha, na-agbasapụ ókèala Iden ruo ebe dịkarịsịrị anya nke ụwa. (Jenesis 1:28) O doro anya na nke a pụtara ijupụta ụwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, ọ bụghị mmadụ ijubiga ókè n’ime ya. Nke ahụ ka ga-enyekwa ohere maka ala ‘e budaworo’ ịbụ ogige obi ụtọ na ụdị ogige ebe obibi mara mma nke mmadụ nweworo na mbụ. Ya mere, iwu ahụ nke Chineke nyere na-egosi na n’oge Chineke, na site n’ụzọ ya, a ga-achịkwa mmụba nke ụba mmadụ.
Ntọala E Ji n’Aka maka Obi Ụtọ Na-adịgide Adịgide
29. Mmetụta dị aṅaa ka mmadụ isoro ndị ọzọ mekọọ ihe nwere n’obi ụtọ nke mmadụ?
29 Otú ọ dị, ọbụna èzí mara mma, ịba ụba nke ihe onwunwe, ọrụ dị mma, na ezi ahụ ike agaghị enye gị obi ụtọ na-adịgide adịgide. Ọtụtụ ndị nwere ihe ndị a ma ha enweghị obi ụtọ. N’ihi gịnị? N’ihi ndị nọ ha gburugburu, bụ́ ndị pụrụ ịbụ ndị na-achọ nanị maka ọdịmma ha, ndị na-achọ okwu, ndị ihu abụọ, ma ọ bụ ndị na-akpọ asị. Obi ụtọ na-adịgide adịgide n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke ga-abịa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu site ná mgbanwe zuru ụwa ọnụ n’akparamagwa ndị mmadụ. Ịhụnanya na nsọpụrụ ha maka Chineke na ọchịchọ ha ime nzube ya ga-eweta ụba ime mmụọ. Ma nke ahụ adịghị ya, ịba ụba ihe onwunwe ga-aghọ ihe na-adịghị eju afọ, ihe na-enweghịkwa isi.
30. Ànyị si aṅaa mara na ndị ga-ebi n’Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke ga-abụ mmadụ ndị na-achọ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke ndị ọzọ?
30 Ee, ọ bụ ihe obi ụtọ ịnọ n’etiti ndị mmadụ nwere obi ọma, ndị dị umeala, ndị enyi—mmadụ ndị ị pụrụ ịhụ n’anya ma tụkwasị obi n’ezie, ndị na-echekwa otu ihe ahụ banyere gị. (Abụ Ọma 133:1; Ilu 15:17) Ịhụ Chineke n’anya bụ ya na-akpata ezi ịhụnanya nke ndị agbata obi, bụ́ nke ga-eme ka ndụ bụrụ ihe obi ụtọ n’Usoro Ihe Ọhụrụ nke ezi omume Ya. Ndị nile Chineke ga-ekwere ka ha nweta ndụ ebighị ebi ga-egosipụtaworị ịhụnanya ha n’ebe Chineke na mmadụ ibe ha nọ. N’ihi inwe ụdị ndị agbata obi dị otú a, bụ́ ndị enyi, na ndị ha na mmadụ na-arụkọ ọrụ, ị ga-enwe ike ịnụ ụtọ ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi na obi ụtọ na-adịgide adịgide.—1 Jọn 4:7, 8, 20, 21.
31. Ọ bụrụ n’ezie na anyị chọrọ ndụ n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke, gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a?
31 N’eziokwu, olileanya ọma dị otú ahụ ghere oghe nye gị! Ya mere, ọ bụ ụzọ amamihe bara uru ịmata ihe a chọrọ iji nweta ya. Ugbu a bụ oge ime ka ndụ gị kwekọọ n’ihe Chineke chọrọ n’aka ndị ahụ a gaje ichebe ndụ gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịanụ.—2 Pita 3:11-13.
[Foto dị na peeji nke 98]
Oge na-abịa n’isi nso mgbe a ga-agbanwe ụwa nile ịghọ paradaịs